2 Samuel 6 (BOICB)

1 Emesịa, Devid chịkọtara iri puku ndị agha Izrel atọ a zụziri azụzi, 2 Ya na ndị ikom ya niile gara Baala nʼime Juda, isi nʼebe ahụ bugota igbe ọgbụgba ndụ Chineke, nke akpọkwasịrị Aha ya, bụ aha ONYENWE ANYỊ. Onye pụrụ ime ihe niile, onye na-anọkwasị nʼetiti cherubim. 3 Ha dọkwasịrị igbe Chineke ahụ nʼelu ụgbọala ọhụrụ ehi na-adọkpụ, buputa ya site nʼụlọ Abinadab nke dị nʼelu ugwu nta. Ọ bụ Ụza na Ahio, ụmụ Abinadab, na-edu ụgbọala ọhụrụ ahụ, 4 nke igbe ọgbụgba ndụ Chineke dị nʼelu ya, Ahio butere ụzọ na-aga nʼihu igbe ahụ. 5 Devid na ndị Izrel weere ike ha niile na-aṅụ ọṅụ nʼihu ONYENWE ANYỊ. Ha ji abụ, ụbọ akwara, opi, une na ogene na ihe egwu dị iche iche, dịka ịgba na ekwe na-eti egwu. 6 Mgbe ha rutere nʼebe ịzọcha ọka nke Nakọn, Ụza setịpụrụ aka ya, jide igbe ọgbụgba ndụ Chineke ahụ, nʼihi na ehi ahụ zọhiere ụkwụ. 7 Ma iwe ONYENWE ANYỊ dị ọkụ megide Ụza, nʼihi omume enweghị nsọpụrụ o mere. Ya mere, Chineke tigburu ya. Ọ nwụọ nʼebe ahụ nʼakụkụ igbe Chineke. 8 Mgbe ahụ, iwe were Devid, nʼihi ọnụma ONYENWE ANYỊ dakwasịrị Ụza. Ruo taa, a na-akpọ ebe ahụ Perez Ụza. 9 Devid tụrụ egwu ONYENWE ANYỊ nʼụbọchị ahụ. O kwuru sị, “Igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYỊ ọ ga-esi aṅaa bịakwute m?” 10 O kweghị ebubata igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYỊ ahụ nʼime obodo Devid, kama o bugara ya nʼụlọ Obed-Edọm, onye Git. 11 Igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYỊ nọrọ nʼụlọ Obed-Edọm, onye Git ọnwa atọ. ONYENWE ANYỊ gọzikwara ya na ezinaụlọ ya niile. 12 Mgbe a gwara eze bụ Devid si, “ONYENWE ANYỊ agọziela ezinaụlọ Obed-Edọm na ihe niile o nwere, nʼihi igbe ọgbụgba ndụ Chineke.” Nʼihi nke a, Devid ji oke ọṅụ gaa nʼụlọ Obed-Edọm, nʼihi ibugote igbe ọgbụgba ndụ Chineke, buga nʼobodo Devid. 13 Mgbe ndị bu igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYỊ ahụ zọrọ nzọ ụkwụ isii; ọ na-eji oke ehi na nwa ehi gbara abụba chụọ aja. 14 Devid ji ike ya niile na-ete egwu nʼihu ONYENWE ANYỊ. Ọ yi uwe efọọd e ji akwa ọcha dụọ nʼụbọchị ahụ, 15 mgbe ya na ndị Izrel niile ji iti mkpu na ụda ịfụ opi ike na-ebubata igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYỊ. 16 Mgbe ha bu igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYỊ na-abata nʼobodo Devid, Mikal, nwa Sọl lepụrụ anya site na oghereikuku ụlọ. Mgbe ọ hụrụ eze Devid ka ọ na-awụli elu na-etekwa egwu nʼihu ONYENWE ANYỊ, o ledara ya anya nʼime obi ya. 17 Ha bubatara igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYỊ ahụ, guzobe ya nʼọnọdụ ya nʼime ụlọ ikwu nke Devid manyere maka ya. Devid chụrụ aja nsure ọkụ na aja udo nʼihu ONYENWE ANYỊ. 18 Mgbe ọ chụsịrị aja nsure ọkụ na aja udo ndị a, ọ gọziri ndị Izrel nʼaha ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile. 19 O nyekwara onye ọbụla nʼetiti igwe ndị Izrel niile ahụ, ma nwoke ma nwanyị, otu ogbe achịcha, ọkpụrụkpụ anụ na achịcha mkpụrụ osisi a mịkpọrọ amịkpọ. Ndị a niile lara, onye ọbụla nʼụlọ nke ya. 20 Mgbe Devid lọtara ka ọ gọzie ndị ụlọ ya, Mikal, ada Sọl pụtara izute ya, sị, “Lee ka eze Izrel si mee onwe ya onye dị ukwuu taa! Ọ gbara onwe ya ọtọ na mbara, nʼihu ndị ohu nwanyị nke ndị odibo ya dịka mmadụ efu.” 21 Ma Devid zara Mikal sị ya, “Ọ bụ nʼihu ONYENWE ANYỊ onye họpụtara m karịa nna gị maọbụ onye ọbụla ọzọ sitere nʼụlọ ya ka m tere egwu. E, ONYENWE ANYỊ ahụ họpụtara m ịbụ onyendu Izrel, ndị nke ya. Nʼezie, aga m aga nʼihu ịkpa agwa dịka onye nzuzu nʼihi ịsọpụrụ ONYENWE ANYỊ. 22 E, aga m aga nʼihu ịghọ onye na-enweghị uche, na onye e weturu ala nʼanya onwe m. Ma ụmụ agbọghọ ndị ahụ i kwuru okwu ha, ha ga-asọpụrụ m!” 23 Mikal, ada Sọl amụtaghị nwa ọbụla ruo nʼoge ọnwụ ya.

In Other Versions

2 Samuel 6 in the ANGEFD

2 Samuel 6 in the ANTPNG2D

2 Samuel 6 in the AS21

2 Samuel 6 in the BAGH

2 Samuel 6 in the BBPNG

2 Samuel 6 in the BBT1E

2 Samuel 6 in the BDS

2 Samuel 6 in the BEV

2 Samuel 6 in the BHAD

2 Samuel 6 in the BIB

2 Samuel 6 in the BLPT

2 Samuel 6 in the BNT

2 Samuel 6 in the BNTABOOT

2 Samuel 6 in the BNTLV

2 Samuel 6 in the BOATCB

2 Samuel 6 in the BOATCB2

2 Samuel 6 in the BOBCV

2 Samuel 6 in the BOCNT

2 Samuel 6 in the BOECS

2 Samuel 6 in the BOGWICC

2 Samuel 6 in the BOHCB

2 Samuel 6 in the BOHCV

2 Samuel 6 in the BOHLNT

2 Samuel 6 in the BOHNTLTAL

2 Samuel 6 in the BOILNTAP

2 Samuel 6 in the BOITCV

2 Samuel 6 in the BOKCV

2 Samuel 6 in the BOKCV2

2 Samuel 6 in the BOKHWOG

2 Samuel 6 in the BOKSSV

2 Samuel 6 in the BOLCB

2 Samuel 6 in the BOLCB2

2 Samuel 6 in the BOMCV

2 Samuel 6 in the BONAV

2 Samuel 6 in the BONCB

2 Samuel 6 in the BONLT

2 Samuel 6 in the BONUT2

2 Samuel 6 in the BOPLNT

2 Samuel 6 in the BOSCB

2 Samuel 6 in the BOSNC

2 Samuel 6 in the BOTLNT

2 Samuel 6 in the BOVCB

2 Samuel 6 in the BOYCB

2 Samuel 6 in the BPBB

2 Samuel 6 in the BPH

2 Samuel 6 in the BSB

2 Samuel 6 in the CCB

2 Samuel 6 in the CUV

2 Samuel 6 in the CUVS

2 Samuel 6 in the DBT

2 Samuel 6 in the DGDNT

2 Samuel 6 in the DHNT

2 Samuel 6 in the DNT

2 Samuel 6 in the ELBE

2 Samuel 6 in the EMTV

2 Samuel 6 in the ESV

2 Samuel 6 in the FBV

2 Samuel 6 in the FEB

2 Samuel 6 in the GGMNT

2 Samuel 6 in the GNT

2 Samuel 6 in the HARY

2 Samuel 6 in the HNT

2 Samuel 6 in the IRVA

2 Samuel 6 in the IRVB

2 Samuel 6 in the IRVG

2 Samuel 6 in the IRVH

2 Samuel 6 in the IRVK

2 Samuel 6 in the IRVM

2 Samuel 6 in the IRVM2

2 Samuel 6 in the IRVO

2 Samuel 6 in the IRVP

2 Samuel 6 in the IRVT

2 Samuel 6 in the IRVT2

2 Samuel 6 in the IRVU

2 Samuel 6 in the ISVN

2 Samuel 6 in the JSNT

2 Samuel 6 in the KAPI

2 Samuel 6 in the KBT1ETNIK

2 Samuel 6 in the KBV

2 Samuel 6 in the KJV

2 Samuel 6 in the KNFD

2 Samuel 6 in the LBA

2 Samuel 6 in the LBLA

2 Samuel 6 in the LNT

2 Samuel 6 in the LSV

2 Samuel 6 in the MAAL

2 Samuel 6 in the MBV

2 Samuel 6 in the MBV2

2 Samuel 6 in the MHNT

2 Samuel 6 in the MKNFD

2 Samuel 6 in the MNG

2 Samuel 6 in the MNT

2 Samuel 6 in the MNT2

2 Samuel 6 in the MRS1T

2 Samuel 6 in the NAA

2 Samuel 6 in the NASB

2 Samuel 6 in the NBLA

2 Samuel 6 in the NBS

2 Samuel 6 in the NBVTP

2 Samuel 6 in the NET2

2 Samuel 6 in the NIV11

2 Samuel 6 in the NNT

2 Samuel 6 in the NNT2

2 Samuel 6 in the NNT3

2 Samuel 6 in the PDDPT

2 Samuel 6 in the PFNT

2 Samuel 6 in the RMNT

2 Samuel 6 in the SBIAS

2 Samuel 6 in the SBIBS

2 Samuel 6 in the SBIBS2

2 Samuel 6 in the SBICS

2 Samuel 6 in the SBIDS

2 Samuel 6 in the SBIGS

2 Samuel 6 in the SBIHS

2 Samuel 6 in the SBIIS

2 Samuel 6 in the SBIIS2

2 Samuel 6 in the SBIIS3

2 Samuel 6 in the SBIKS

2 Samuel 6 in the SBIKS2

2 Samuel 6 in the SBIMS

2 Samuel 6 in the SBIOS

2 Samuel 6 in the SBIPS

2 Samuel 6 in the SBISS

2 Samuel 6 in the SBITS

2 Samuel 6 in the SBITS2

2 Samuel 6 in the SBITS3

2 Samuel 6 in the SBITS4

2 Samuel 6 in the SBIUS

2 Samuel 6 in the SBIVS

2 Samuel 6 in the SBT

2 Samuel 6 in the SBT1E

2 Samuel 6 in the SCHL

2 Samuel 6 in the SNT

2 Samuel 6 in the SUSU

2 Samuel 6 in the SUSU2

2 Samuel 6 in the SYNO

2 Samuel 6 in the TBIAOTANT

2 Samuel 6 in the TBT1E

2 Samuel 6 in the TBT1E2

2 Samuel 6 in the TFTIP

2 Samuel 6 in the TFTU

2 Samuel 6 in the TGNTATF3T

2 Samuel 6 in the THAI

2 Samuel 6 in the TNFD

2 Samuel 6 in the TNT

2 Samuel 6 in the TNTIK

2 Samuel 6 in the TNTIL

2 Samuel 6 in the TNTIN

2 Samuel 6 in the TNTIP

2 Samuel 6 in the TNTIZ

2 Samuel 6 in the TOMA

2 Samuel 6 in the TTENT

2 Samuel 6 in the UBG

2 Samuel 6 in the UGV

2 Samuel 6 in the UGV2

2 Samuel 6 in the UGV3

2 Samuel 6 in the VBL

2 Samuel 6 in the VDCC

2 Samuel 6 in the YALU

2 Samuel 6 in the YAPE

2 Samuel 6 in the YBVTP

2 Samuel 6 in the ZBP