Acts 17 (BOICB)

1 Mgbe ha gafechara obodo Amfipolis na Apolonia, ha bịaruru obodo Tesalonaịka, ebe ụlọ nzukọ ndị Juu dị. 2 Pọl bakwuuru ha, dịka ọ na-eme oge niile. Ọ nọnyere ha izu ụka atọ, ya na ha na-atụgharị uche nʼAkwụkwọ Nsọ, 3 na-akọwara ha na-edokwa ha anya na ọ dị mkpa na Kraịst ga-ahụ ahụhụ, ma sitekwa nʼọnwụ bilie. Ọ sịrị, “Jisọs a, nke m na-ekwusara unu bụ Kraịst ahụ.” 4 Ụfọdụ nʼime ndị Juu ahụ ka e mere ka ha kwere ma sonyere Pọl na Saịlas, otu aka ahụ, igwe mmadụ ndị na-atụ egwu Chineke nʼetiti ndị Griik na ụmụ nwanyị ụfọdụ a maara aha ha. 5 Ma ndị Juu jupụtara nʼekworo, nʼihi ya, ha kpaliri obi ụfọdụ mmadụ efu nʼetiti ha nʼọma ahịa. Ndị a malitekwara ọgbaaghara nʼụzọ dị iche nʼime obodo. Ha tikasịrị ụlọ Jesin, nʼihi na ha chọrọ ịdọpụta ha nyefee ha nʼaka ọha mmadụ. 6 Ma mgbe ha na-achọtaghị ha nʼebe ahụ, ha dọpụtara Jesin na ụmụnna anyị ụfọdụ, duru ha jekwuru ndị ikpe nke obodo ahụ, na-eti mkpu, “Ndị a kpuru ụwa ihu nʼala abịala inye obodo ukwu anyị nsogbu. 7 Ma Jesin nabatara ha nʼụlọ ya. Ha na-emebi iwu Siza nʼihi na ha na-asịkwa na ọ dị eze ọzọ dị nke a na-akpọ Jisọs.” 8 Okwu dị otu a wetara obi ịlọ mmiri nʼetiti ndị ikpe na mmadụ niile. 9 Ha hapụrụ Jesin na ndị ọzọ, naanị mgbe ndị akaebe bịara kwụọ ụgwọ e jiri gbapụta ha. 10 Ma nʼabalị ahụ, ndị kwere ekwe mere ngwangwa zipụ Pọl na Saịlas ka ha gaa obodo Beria. Ma mgbe ha ruru nʼebe ahụ, ha banyere nʼụlọ nzukọ ndị Juu. 11 Ma ndị bi na Beria jiri obi ghere oghe nabata okwu a karịa ndị bi na Tesalonaịka. Nʼihi na ha ji ịnụ ọkụ nʼobi nara okwu ahụ, na-enyocha Akwụkwọ Nsọ kwa ụbọchị, ka ha mara ma ihe ha na-ekwu ọ bụ eziokwu. Ha mere nke a ụbọchị niile. 12 Ọtụtụ nʼime ha kweere, ụfọdụ ụmụ nwanyị na ụmụ nwoke ndị Griik a maara aha ha chegharịkwara. 13 Ma mgbe ndị Juu bi na Tesalonaịka nụrụ na Pọl na-ekwusa oziọma Chineke na obodo Beria, ụfọdụ ha gara nʼebe ahụ na-akpali igwe ndị mmadụ nʼihi iwebata ọgbaaghara. 14 Ndị kwere ekwe mere ngwangwa zipụ Pọl ka ọ gaa nʼakụkụ oke osimiri dị nʼebe ahụ. Ma ha hapụrụ Saịlas na Timoti ka ha na ha nọdụ. 15 Ma ndị dupuru Pọl sooro ya ruo obodo Atens. Ha lawara, hapụrụ Saịlas na Timoti ozi ka ha bịakwute ya na-atụfughị oge. 16 Mgbe Pọl nọ na-echere ha nʼAtens, o wutere mmụọ ya nke ukwuu nʼihi arụsị niile ọ hụrụ, nke jupụtara nʼobodo ahụ. 17 Nʼihi nke a, ya na ndị Juu na ndị na-atụ egwu Chineke, na-anọgide nʼụlọ nzukọ na-arụrịta ụka. Kwa ụbọchị, ọ na-apụkwa nʼọma ahịa na-agwa ndị niile o zutere okwu. 18 Ya na ụfọdụ ndị Epikuri na ndị Stoịk bụ ndị ọkachamara na-arụrịta ụka. Ndị ụfọdụ na-asị, “gịnị ka onye ekwurekwu a ga-ekwu?” Ndị ọzọ sịrị, “ọ dịka onye na-ekwusa ụmụ mmụọ ndị ala ọzọ.” Ha kwuru nke a nʼihi na ọ na-ekwusa oziọma banyere Jisọs na mbilite nʼọnwụ ya. 19 Ha kpọbatara ya nʼebe ha zukọrọ, ebe a na-akpọ Areopagọs, ebe ha nọ sị ya, “Anyị enwere ike ịmata ihe banyere ozizi ọhụrụ gị a? 20 Ị na-ekwu ihe ndị na-agbagwoju anyị anya. Anyị chọrọ ịmata ihe ndị a nke ọma.” 21 (Ndị Atens niile na ndị ala ọzọ bi nʼobodo ahụ, enweghị ohere ime ihe ọbụla, ọ gwụchaala ọrụ ikwu na ịnụ banyere ihe dị ọhụrụ.) 22 Mgbe ahụ Pọl guzoro na nzukọ Areopagọs sị, “Unu ndị Atens, ahụla m na ọ na-anụ unu ọkụ nʼobi ịsọpụrụ mmụọ nke unu na-efe ofufe. 23 Nʼihi na mgbe m na-ejegharị nʼobodo unu, ahụrụ m ụlọ chi dị iche iche, ahụrụ m otu ebe ịchụ aja nke e dekwasịrị nʼelu ya:Ihe e nyere chi nke amaghị ama.Ya mere, ihe ahụ unu na-efe ofufe nʼamaghị ama nke a ka m na-ekwusara unu. 24 “Chineke onye kere ụwa na ihe niile dị nʼime ya. Ebe ọ bụ onye nwe eluigwe na ụwa, ọ dịghị ebikwa nʼụlọnsọ e jiri aka wuo. 25 Otu aka ahụ, ọ dịghị anara ije ozi site nʼaka mmadụ, dịka a ga-asị na o nwere ihe kọrọ ya. Ya onwe ya na-enye ndụ na ume na ihe niile. Ọ na-egbokwa mkpa niile. 26 O sitere nʼaka otu onye, bụ mmadụ mbụ ahụ, kee agbụrụ niile nke mmadụ nʼotu nʼotu, ka ha biri nʼelu ụwa dum. O jiri aka ya kewachaa oge ọgbọ ọbụla ga-anọ na oke niile nke ebe obibi ha. 27 Ma nzube ya banyere ihe niile bụ ka onye ọbụla chọsie Chineke ike. Eleghị anya, mmadụ nwere ike lezie ụzọ ya anya, si otu a chọta ya. Ọ nọkwaghị mmadụ ọbụla nʼebe dị anya. 28 ‘Nʼihi nʼime ya ka anyị na-ebi, anyị na-ejegharịkwa nʼime ya na-adịkwa ndụ.’ Dịka ụfọdụ nʼime unu ndị ode abụ na-ekwu sị, ‘Anyị onwe anyị bụ ụmụ ya.’ 29 “Ebe anyị bụ ndị Chineke mụrụ, o kwesighị ka anyị na-eche na ihe akpọrọ Chineke yiri ọlaọcha maọbụ ọlaedo, maọbụ nkume, ihe apịrị apị site na ǹka na ihe dị nʼobi mmadụ. 30 Ma Chineke lefuru enweghị nghọta nke mmadụ anya banyere ihe ndị a niile nʼoge gara aga. Ma ugbu a, ọ chọrọ ka mmadụ niile chegharịa. 31 Nʼihi na o debela otu ụbọchị mgbe ọ ga-ekpe ụwa niile ikpe nʼụzọ ezi omume, site nʼaka otu nwoke ọ họpụtara. O mekwara ka nke a guzosie ike, mgbe o mere ka onye ahụ sị nʼọnwụ bilie.” 32 Mgbe ha nụrụ ihe banyere mbilite nʼọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ, ha chịrị ya ọchị. Ma ụfọdụ nʼime ha sịrị, “Nʼoge ọzọ anyị ga-achọ ịnụ okwu ndị a.” 33 Nʼoge a, Pọl hapụrụ ha. 34 Mmadụ ole na ole sooro ya, bụrụkwa ndị kwere ekwe. Otu onye nʼime ha bụ Dionisiọs onye Areopagọs. Onye ọzọ bụ nwanyị a na-akpọ Damaris na ndị ọzọkwa.

In Other Versions

Acts 17 in the ANGEFD

Acts 17 in the ANTPNG2D

Acts 17 in the AS21

Acts 17 in the BAGH

Acts 17 in the BBPNG

Acts 17 in the BBT1E

Acts 17 in the BDS

Acts 17 in the BEV

Acts 17 in the BHAD

Acts 17 in the BIB

Acts 17 in the BLPT

Acts 17 in the BNT

Acts 17 in the BNTABOOT

Acts 17 in the BNTLV

Acts 17 in the BOATCB

Acts 17 in the BOATCB2

Acts 17 in the BOBCV

Acts 17 in the BOCNT

Acts 17 in the BOECS

Acts 17 in the BOGWICC

Acts 17 in the BOHCB

Acts 17 in the BOHCV

Acts 17 in the BOHLNT

Acts 17 in the BOHNTLTAL

Acts 17 in the BOILNTAP

Acts 17 in the BOITCV

Acts 17 in the BOKCV

Acts 17 in the BOKCV2

Acts 17 in the BOKHWOG

Acts 17 in the BOKSSV

Acts 17 in the BOLCB

Acts 17 in the BOLCB2

Acts 17 in the BOMCV

Acts 17 in the BONAV

Acts 17 in the BONCB

Acts 17 in the BONLT

Acts 17 in the BONUT2

Acts 17 in the BOPLNT

Acts 17 in the BOSCB

Acts 17 in the BOSNC

Acts 17 in the BOTLNT

Acts 17 in the BOVCB

Acts 17 in the BOYCB

Acts 17 in the BPBB

Acts 17 in the BPH

Acts 17 in the BSB

Acts 17 in the CCB

Acts 17 in the CUV

Acts 17 in the CUVS

Acts 17 in the DBT

Acts 17 in the DGDNT

Acts 17 in the DHNT

Acts 17 in the DNT

Acts 17 in the ELBE

Acts 17 in the EMTV

Acts 17 in the ESV

Acts 17 in the FBV

Acts 17 in the FEB

Acts 17 in the GGMNT

Acts 17 in the GNT

Acts 17 in the HARY

Acts 17 in the HNT

Acts 17 in the IRVA

Acts 17 in the IRVB

Acts 17 in the IRVG

Acts 17 in the IRVH

Acts 17 in the IRVK

Acts 17 in the IRVM

Acts 17 in the IRVM2

Acts 17 in the IRVO

Acts 17 in the IRVP

Acts 17 in the IRVT

Acts 17 in the IRVT2

Acts 17 in the IRVU

Acts 17 in the ISVN

Acts 17 in the JSNT

Acts 17 in the KAPI

Acts 17 in the KBT1ETNIK

Acts 17 in the KBV

Acts 17 in the KJV

Acts 17 in the KNFD

Acts 17 in the LBA

Acts 17 in the LBLA

Acts 17 in the LNT

Acts 17 in the LSV

Acts 17 in the MAAL

Acts 17 in the MBV

Acts 17 in the MBV2

Acts 17 in the MHNT

Acts 17 in the MKNFD

Acts 17 in the MNG

Acts 17 in the MNT

Acts 17 in the MNT2

Acts 17 in the MRS1T

Acts 17 in the NAA

Acts 17 in the NASB

Acts 17 in the NBLA

Acts 17 in the NBS

Acts 17 in the NBVTP

Acts 17 in the NET2

Acts 17 in the NIV11

Acts 17 in the NNT

Acts 17 in the NNT2

Acts 17 in the NNT3

Acts 17 in the PDDPT

Acts 17 in the PFNT

Acts 17 in the RMNT

Acts 17 in the SBIAS

Acts 17 in the SBIBS

Acts 17 in the SBIBS2

Acts 17 in the SBICS

Acts 17 in the SBIDS

Acts 17 in the SBIGS

Acts 17 in the SBIHS

Acts 17 in the SBIIS

Acts 17 in the SBIIS2

Acts 17 in the SBIIS3

Acts 17 in the SBIKS

Acts 17 in the SBIKS2

Acts 17 in the SBIMS

Acts 17 in the SBIOS

Acts 17 in the SBIPS

Acts 17 in the SBISS

Acts 17 in the SBITS

Acts 17 in the SBITS2

Acts 17 in the SBITS3

Acts 17 in the SBITS4

Acts 17 in the SBIUS

Acts 17 in the SBIVS

Acts 17 in the SBT

Acts 17 in the SBT1E

Acts 17 in the SCHL

Acts 17 in the SNT

Acts 17 in the SUSU

Acts 17 in the SUSU2

Acts 17 in the SYNO

Acts 17 in the TBIAOTANT

Acts 17 in the TBT1E

Acts 17 in the TBT1E2

Acts 17 in the TFTIP

Acts 17 in the TFTU

Acts 17 in the TGNTATF3T

Acts 17 in the THAI

Acts 17 in the TNFD

Acts 17 in the TNT

Acts 17 in the TNTIK

Acts 17 in the TNTIL

Acts 17 in the TNTIN

Acts 17 in the TNTIP

Acts 17 in the TNTIZ

Acts 17 in the TOMA

Acts 17 in the TTENT

Acts 17 in the UBG

Acts 17 in the UGV

Acts 17 in the UGV2

Acts 17 in the UGV3

Acts 17 in the VBL

Acts 17 in the VDCC

Acts 17 in the YALU

Acts 17 in the YAPE

Acts 17 in the YBVTP

Acts 17 in the ZBP