Amos 4 (BOICB)

1 Nụrụ okwu a, unu nne ehi nke Bashan, ndị na-ebi nʼelu ugwu Sameria,unu ndị inyom na-emegbu ndị ogbenye, ma zọpịakwa ndị mkpa na-akpa,ndị na-asị di ha, “welatara anyị ihe ọṅụṅụ” 2 Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ ewerela ịdị nsọ ya ṅụọ iyi, sị,“Ụbọchị ahụ aghaghị ịbịamgbe a ga-eji nko dọkpụrụ unu pụọ;jiri nko azụ dọkpụrụ ọ bụladị onye ikpeazụ nʼime unu. 3 Ọ bụ site nʼoghere dị iche iche e mere na mgbidi obodo,ka onye ọbụla ga-esi nʼahịrị nʼahịrị pụọ,a ga-atụga unu nʼụzọ Hamon.”Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara. 4 “Gaanụ na Betel, ma jehie.Jeenụ Gilgal mee ka mmehie baa ụba.Butenụ ihe aja unu ụtụtụ niile.Webatakwanụ onyinye otu ụzọ nʼụzọ iri unu nʼụbọchị atọ ọbụla. 5 Chụọnụ aja nsure ọkụ dịka aja ekele, site nʼachịcha koro eko;kpọsaakwanụ banyere onyinye afọ ofufu niile unu na-enye,nyaanụ isi banyere ha, unu bụ ndị Izrel,nʼihi na nke a bụ ihe unu hụrụ nʼanya ime.”Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara. 6 “E mere m ka unu nwee eze dị ọcha nʼobodo unu niile,mekwa ka ụkọ nri dị nʼọnụmara unu niilema unu alọghachikwuteghị m.”Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara. 7 “Ọzọkwa, Mụ onwe m gbochikwara mmiri izoro unu,mgbe ọ fọdụrụ ọnwa atọ tupu owuwe ihe ubi ebido.Enyere m otu obodo mmiri ozuzo,ma gbochie ya izoro obodo nke ọzọ.Mmiri zoro nʼotu ubi,ma nke mmiri ezoghị na ya kpọnwụrụ. 8 Ndị si obodo abụọ maọbụ atọ chọrọ mmiri ọṅụṅụ jee nʼobodo ọzọ,ma ha enwetaghị nke ha ji aṅụju afọ,ma nʼime ihe ndị a niile unu alọghachikwuteghị m.”Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara. 9 “Ezitere m ọrịa nchakpọ nʼubi unu niile a gbara ogige, ya na ubi vaịnị unu niile, ọtụtụ oge,werekwa ọrịa na-eripịa ihe ubi na ọmụma ebu bibie ha,zitekwa igurube nke richapụrụ osisi fiig na osisi oliv unu niile,ma nke a emeghị ka unu lọghachikwute m.”Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara. 10 “Ezitere m nʼetiti unu ajọ ọrịa na-efe efedịka ndị ahụ m zitere ndị Ijipt.Ejiri m mma agha gbuo ụmụ okorobịa unu,mee ka a dọta ịnyịnya agha unu nʼagha.Emere m ka isisi ọjọọ ndị niile nwuru nʼọmụma ụlọ ikwu unu jupụta imi unu,ma nke a emeghị ka unu lọghachikwute m.”Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara. 11 “Akwaturu m ụfọdụ nʼime unudịka mgbe Chineke kwaturu Sọdọm na Gọmọra.Unu dịka ọlọkọ nkụ ọkụ alọpụtara site nʼọkụ,ma unu alọghachikwuteghị m,”otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri. 12 “Nʼihi ya, ihe ndị a ka m na-aga ime gị, gị bụ Izrel.Ebe ọ bụkwa na ejikerela m ime gị ihe ndị a,jikere, O Izrel, izute Chineke gị.” 13 Ma lee, onye na-akpụ ugwu niile,onye na-ekekwa ifufe,nke na-ekpughekwa echiche uche ya nye mmadụ,onye na-emekwa ka chi ọbụbọ ghọọ ọchịchịrị,na-azọchakwa ugwu niile nʼọbụụkwụ ya,Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile bụ aha ya.

In Other Versions

Amos 4 in the ANGEFD

Amos 4 in the ANTPNG2D

Amos 4 in the AS21

Amos 4 in the BAGH

Amos 4 in the BBPNG

Amos 4 in the BBT1E

Amos 4 in the BDS

Amos 4 in the BEV

Amos 4 in the BHAD

Amos 4 in the BIB

Amos 4 in the BLPT

Amos 4 in the BNT

Amos 4 in the BNTABOOT

Amos 4 in the BNTLV

Amos 4 in the BOATCB

Amos 4 in the BOATCB2

Amos 4 in the BOBCV

Amos 4 in the BOCNT

Amos 4 in the BOECS

Amos 4 in the BOGWICC

Amos 4 in the BOHCB

Amos 4 in the BOHCV

Amos 4 in the BOHLNT

Amos 4 in the BOHNTLTAL

Amos 4 in the BOILNTAP

Amos 4 in the BOITCV

Amos 4 in the BOKCV

Amos 4 in the BOKCV2

Amos 4 in the BOKHWOG

Amos 4 in the BOKSSV

Amos 4 in the BOLCB

Amos 4 in the BOLCB2

Amos 4 in the BOMCV

Amos 4 in the BONAV

Amos 4 in the BONCB

Amos 4 in the BONLT

Amos 4 in the BONUT2

Amos 4 in the BOPLNT

Amos 4 in the BOSCB

Amos 4 in the BOSNC

Amos 4 in the BOTLNT

Amos 4 in the BOVCB

Amos 4 in the BOYCB

Amos 4 in the BPBB

Amos 4 in the BPH

Amos 4 in the BSB

Amos 4 in the CCB

Amos 4 in the CUV

Amos 4 in the CUVS

Amos 4 in the DBT

Amos 4 in the DGDNT

Amos 4 in the DHNT

Amos 4 in the DNT

Amos 4 in the ELBE

Amos 4 in the EMTV

Amos 4 in the ESV

Amos 4 in the FBV

Amos 4 in the FEB

Amos 4 in the GGMNT

Amos 4 in the GNT

Amos 4 in the HARY

Amos 4 in the HNT

Amos 4 in the IRVA

Amos 4 in the IRVB

Amos 4 in the IRVG

Amos 4 in the IRVH

Amos 4 in the IRVK

Amos 4 in the IRVM

Amos 4 in the IRVM2

Amos 4 in the IRVO

Amos 4 in the IRVP

Amos 4 in the IRVT

Amos 4 in the IRVT2

Amos 4 in the IRVU

Amos 4 in the ISVN

Amos 4 in the JSNT

Amos 4 in the KAPI

Amos 4 in the KBT1ETNIK

Amos 4 in the KBV

Amos 4 in the KJV

Amos 4 in the KNFD

Amos 4 in the LBA

Amos 4 in the LBLA

Amos 4 in the LNT

Amos 4 in the LSV

Amos 4 in the MAAL

Amos 4 in the MBV

Amos 4 in the MBV2

Amos 4 in the MHNT

Amos 4 in the MKNFD

Amos 4 in the MNG

Amos 4 in the MNT

Amos 4 in the MNT2

Amos 4 in the MRS1T

Amos 4 in the NAA

Amos 4 in the NASB

Amos 4 in the NBLA

Amos 4 in the NBS

Amos 4 in the NBVTP

Amos 4 in the NET2

Amos 4 in the NIV11

Amos 4 in the NNT

Amos 4 in the NNT2

Amos 4 in the NNT3

Amos 4 in the PDDPT

Amos 4 in the PFNT

Amos 4 in the RMNT

Amos 4 in the SBIAS

Amos 4 in the SBIBS

Amos 4 in the SBIBS2

Amos 4 in the SBICS

Amos 4 in the SBIDS

Amos 4 in the SBIGS

Amos 4 in the SBIHS

Amos 4 in the SBIIS

Amos 4 in the SBIIS2

Amos 4 in the SBIIS3

Amos 4 in the SBIKS

Amos 4 in the SBIKS2

Amos 4 in the SBIMS

Amos 4 in the SBIOS

Amos 4 in the SBIPS

Amos 4 in the SBISS

Amos 4 in the SBITS

Amos 4 in the SBITS2

Amos 4 in the SBITS3

Amos 4 in the SBITS4

Amos 4 in the SBIUS

Amos 4 in the SBIVS

Amos 4 in the SBT

Amos 4 in the SBT1E

Amos 4 in the SCHL

Amos 4 in the SNT

Amos 4 in the SUSU

Amos 4 in the SUSU2

Amos 4 in the SYNO

Amos 4 in the TBIAOTANT

Amos 4 in the TBT1E

Amos 4 in the TBT1E2

Amos 4 in the TFTIP

Amos 4 in the TFTU

Amos 4 in the TGNTATF3T

Amos 4 in the THAI

Amos 4 in the TNFD

Amos 4 in the TNT

Amos 4 in the TNTIK

Amos 4 in the TNTIL

Amos 4 in the TNTIN

Amos 4 in the TNTIP

Amos 4 in the TNTIZ

Amos 4 in the TOMA

Amos 4 in the TTENT

Amos 4 in the UBG

Amos 4 in the UGV

Amos 4 in the UGV2

Amos 4 in the UGV3

Amos 4 in the VBL

Amos 4 in the VDCC

Amos 4 in the YALU

Amos 4 in the YAPE

Amos 4 in the YBVTP

Amos 4 in the ZBP