Daniel 8 (BOICB)

1 Nʼafọ nke atọ site na mgbe eze Belshaza bidoro ịbụ eze, mụ bụ Daniel hụrụ ọhụ ọzọ. 2 Nʼime ọhụ, ahụrụ m onwe m nʼobodo Susa, nke bụ obodo ukwu ebe eze nwere isi ọchịchị ya, nʼobodo dị na mpaghara Elam. Eguzokwara m nʼakụkụ osimiri Ulai. 3 Eweliri m anya elu, hụ otu ebule nwere mpi ogologo abụọ ka o guzo nʼakụkụ iyi, otu nʼime mpi abụọ ya ahụ bidoro ito ogologo karịa nke ọzọ. 4 Mgbe m na-ele anya, ebule ahụ malitere iji mpi ya na-asọ ihe o bụla dị nʼọdịda anyanwụ na nʼugwu nakwa na ndịda. O nweghị anụ ọbụla nwere ike iguzogide ya, o nwekwaghị onye ọbụla pụrụ inyere ndị ọ lụsoro ọgụ aka. O mere ihe ọbụla masịrị ya si otu a dị ukwuu. 5 Mgbe m nọ na-atule nke a, na mberede ahụrụ m otu mkpi si nʼọdịda anyanwụ pụta, na-agafe ụwa niile ma ụkwụ erughị ya ala. Mkpi a, nwere otu mpi nʼetiti anya abụọ ya. 6 Ọ bịaruru nso ebule ahụ nwere mpi abụọ nke m hụrụ guzo nʼakụkụ mmiri, were oke iwe na-agbata ọsọ nʼebe ọ nọ. 7 Ahụrụ m ka o ji oke iwe lụso ebule ahụ ọgụ kujipụ mpi abụọ ya. Ebule ahụ enweghị ike iguzogide ya. Ọ tụdara ya nʼala, were ụkwụ ya zọda ya, ma na o nweghị onye ọbụla nwere ike ịnapụta ebule ahụ site nʼike ya. 8 Mkpi ahụ, dịịrị ike nke ukwu, ma nʼuju ike ya a gbajipụrụ mpi ukwu ya. Nʼọnọdụ mpi ahụ mpi anọ puputara chee ihu nʼakụkụ anọ nke eluigwe, 9 Otu ntakịrị mpi sitere nʼime otu nʼime mpi ndị ahụ pụta, tokwaa ma buo ibu nke ukwuu ruo na ndịda, na ọwụwa anyanwụ, ruokwa nʼala ọma ahụ 10 O toro tutu o ruo usuu nke eluigwe. Ọ kwatukwara ụfọdụ nʼime usuu nke eluigwe na ụfọdụ nʼime kpakpando nʼala, zọtọọ ha. 11 O mere onwe ya ka ọ dị ukwuu megide onyeisi nke usuu eluigwe, ọ napụrụ ya aja niile a na-achụ kwa ụbọchị ma tụdakwa ebe nsọ ya nʼala. 12 Nʼihi nnupu isi, e nyefere usuu ndị nsọ na aja nsure ọkụ a na-esure kwa ụbọchị nʼaka ya. Ọ gara nʼihu nʼihe niile o mere. E mekwara ka eziokwu daa nʼala. 13 Mgbe ahụ, anụrụ m ka otu mmụọ ozi na-ajụ ibe ya sị, “Olee mgbe ọ ga-akwụsị bụ ọhụ maka aja nsure ọkụ a na-achụ kwa ụbọchị, njehie nke na-eweta ịtọgbọ nʼefu, inyefe ebe nsọ na maka ndị nsọ a na-azọtọ ụkwụ?” 14 Ọ gwara m, “A ga-echere tutu puku ụbọchị abụọ na narị ụbọchị atọ agafee, mgbe ahụ a ga-eme ka ebe nsọ ahụ dịghachikwa otu ọ dị na mbụ.” 15 Mgbe mụ bụ Daniel nọ na-ele ọhụ ahụ na-achọkwa ịghọta ya, o nwere otu onye dịka nwoke bịara guzo nʼihu m. 16 Ma anụrụ m olu otu onye na-akpọ oku site na mmiri Ulai sị, “Gebrel, kọwaara nwoke a ihe ọhụ a pụtara.” 17 Mgbe ọ bịara m nso nʼebe m guzo, egwu tụrụ m nke ukwu. Adara m, kpuo ihu m nʼala. Ma ọ gwara m, “Nwa nke mmadụ, ghọta na ọhụ a bụ maka ọgwụgwụ oge.” 18 Mgbe ahụ ọ na-agwa m okwu, adara m nʼoke ụra, kpuo ihu nʼala. Ma o metụrụ m aka, nyere m aka iguzo ọtọ nʼụkwụ m. 19 Ọ sịrị, “Lee, aga m agwa gị ihe na-aga ime nʼoge oke iwe. Nʼihi na ọhụ a bụ maka oge ọgwụgwụ ihe niile nke a kara aka. 20 Ma banyere ebule ahụ ị hụrụ nke nwere mpi abụọ, na-egosi eze Midia na Peshịa. 21 Mkpi ahụ ị hụrụ na-egosi eze ndị Griis, nnukwu mpi nke dị nʼetiti anya ya abụọ bụ eze nke mbụ. 22 Dịka mpi ahụ siri gbajie, mpi anọ ọzọ pupụta nʼọnọdụ ya, otu a ka alaeze anọ ga-esi pụta na mba ya, ma ike ha agaghị eru ka nke mbụ ahụ. 23 “Ma na mgbe ọgwụgwụ alaeze ahụ, mgbe iko ndị nnupu isi juru, otu eze nke nwere ihu dị ike, na akọnuche na obi aghụghọ ga-ebili. 24 Ọ ga-adị ike nke ukwuu, ma ọ bụghị nʼike onwe ya, ọ ga-eweta mbibi ga-eju anya. Ihe niile o metụrụ aka ga-agara ya nke ọma. Ọ ga-alakwa ndị dị ike na ndị nsọ nʼiyi. 25 Ọ ga-eme ka aghụghọ baa ụba, ọ ga-ahụta onwe ya dịka onye dị elu karịa, mgbe ndị mmadụ na-eche na udo dị, ọ ga-ebibi ọtụtụ ndị. Ọ ga-eguzo megide Onyeisi nke ndịisi, a ga-ebibi ya ma ọ bụghị nʼike nke mmadụ. 26 “Ọhụ a ị hụrụ, maka ụtụtụ na anyasị nke ekpughere gị bụ eziokwu, ma zobe ọhụ a, nʼihi na ọ dịrị ọtụtụ oge ka dị nʼihu.” 27 Mụ bụ Daniel, nọrọ nʼọnọdụ ike ọgwụgwụ na ahụ esighị ike. Mgbe ụbọchị ole na ole gafekwara, ebiliri m bidokwa na-agagharị, na-arụkwa ọrụ eze, ma obi jọrọ m njọ nke ukwuu nʼihi nrọ ahụ, nʼihi na ọ karịrị m nghọta.

In Other Versions

Daniel 8 in the ANGEFD

Daniel 8 in the ANTPNG2D

Daniel 8 in the AS21

Daniel 8 in the BAGH

Daniel 8 in the BBPNG

Daniel 8 in the BBT1E

Daniel 8 in the BDS

Daniel 8 in the BEV

Daniel 8 in the BHAD

Daniel 8 in the BIB

Daniel 8 in the BLPT

Daniel 8 in the BNT

Daniel 8 in the BNTABOOT

Daniel 8 in the BNTLV

Daniel 8 in the BOATCB

Daniel 8 in the BOATCB2

Daniel 8 in the BOBCV

Daniel 8 in the BOCNT

Daniel 8 in the BOECS

Daniel 8 in the BOGWICC

Daniel 8 in the BOHCB

Daniel 8 in the BOHCV

Daniel 8 in the BOHLNT

Daniel 8 in the BOHNTLTAL

Daniel 8 in the BOILNTAP

Daniel 8 in the BOITCV

Daniel 8 in the BOKCV

Daniel 8 in the BOKCV2

Daniel 8 in the BOKHWOG

Daniel 8 in the BOKSSV

Daniel 8 in the BOLCB

Daniel 8 in the BOLCB2

Daniel 8 in the BOMCV

Daniel 8 in the BONAV

Daniel 8 in the BONCB

Daniel 8 in the BONLT

Daniel 8 in the BONUT2

Daniel 8 in the BOPLNT

Daniel 8 in the BOSCB

Daniel 8 in the BOSNC

Daniel 8 in the BOTLNT

Daniel 8 in the BOVCB

Daniel 8 in the BOYCB

Daniel 8 in the BPBB

Daniel 8 in the BPH

Daniel 8 in the BSB

Daniel 8 in the CCB

Daniel 8 in the CUV

Daniel 8 in the CUVS

Daniel 8 in the DBT

Daniel 8 in the DGDNT

Daniel 8 in the DHNT

Daniel 8 in the DNT

Daniel 8 in the ELBE

Daniel 8 in the EMTV

Daniel 8 in the ESV

Daniel 8 in the FBV

Daniel 8 in the FEB

Daniel 8 in the GGMNT

Daniel 8 in the GNT

Daniel 8 in the HARY

Daniel 8 in the HNT

Daniel 8 in the IRVA

Daniel 8 in the IRVB

Daniel 8 in the IRVG

Daniel 8 in the IRVH

Daniel 8 in the IRVK

Daniel 8 in the IRVM

Daniel 8 in the IRVM2

Daniel 8 in the IRVO

Daniel 8 in the IRVP

Daniel 8 in the IRVT

Daniel 8 in the IRVT2

Daniel 8 in the IRVU

Daniel 8 in the ISVN

Daniel 8 in the JSNT

Daniel 8 in the KAPI

Daniel 8 in the KBT1ETNIK

Daniel 8 in the KBV

Daniel 8 in the KJV

Daniel 8 in the KNFD

Daniel 8 in the LBA

Daniel 8 in the LBLA

Daniel 8 in the LNT

Daniel 8 in the LSV

Daniel 8 in the MAAL

Daniel 8 in the MBV

Daniel 8 in the MBV2

Daniel 8 in the MHNT

Daniel 8 in the MKNFD

Daniel 8 in the MNG

Daniel 8 in the MNT

Daniel 8 in the MNT2

Daniel 8 in the MRS1T

Daniel 8 in the NAA

Daniel 8 in the NASB

Daniel 8 in the NBLA

Daniel 8 in the NBS

Daniel 8 in the NBVTP

Daniel 8 in the NET2

Daniel 8 in the NIV11

Daniel 8 in the NNT

Daniel 8 in the NNT2

Daniel 8 in the NNT3

Daniel 8 in the PDDPT

Daniel 8 in the PFNT

Daniel 8 in the RMNT

Daniel 8 in the SBIAS

Daniel 8 in the SBIBS

Daniel 8 in the SBIBS2

Daniel 8 in the SBICS

Daniel 8 in the SBIDS

Daniel 8 in the SBIGS

Daniel 8 in the SBIHS

Daniel 8 in the SBIIS

Daniel 8 in the SBIIS2

Daniel 8 in the SBIIS3

Daniel 8 in the SBIKS

Daniel 8 in the SBIKS2

Daniel 8 in the SBIMS

Daniel 8 in the SBIOS

Daniel 8 in the SBIPS

Daniel 8 in the SBISS

Daniel 8 in the SBITS

Daniel 8 in the SBITS2

Daniel 8 in the SBITS3

Daniel 8 in the SBITS4

Daniel 8 in the SBIUS

Daniel 8 in the SBIVS

Daniel 8 in the SBT

Daniel 8 in the SBT1E

Daniel 8 in the SCHL

Daniel 8 in the SNT

Daniel 8 in the SUSU

Daniel 8 in the SUSU2

Daniel 8 in the SYNO

Daniel 8 in the TBIAOTANT

Daniel 8 in the TBT1E

Daniel 8 in the TBT1E2

Daniel 8 in the TFTIP

Daniel 8 in the TFTU

Daniel 8 in the TGNTATF3T

Daniel 8 in the THAI

Daniel 8 in the TNFD

Daniel 8 in the TNT

Daniel 8 in the TNTIK

Daniel 8 in the TNTIL

Daniel 8 in the TNTIN

Daniel 8 in the TNTIP

Daniel 8 in the TNTIZ

Daniel 8 in the TOMA

Daniel 8 in the TTENT

Daniel 8 in the UBG

Daniel 8 in the UGV

Daniel 8 in the UGV2

Daniel 8 in the UGV3

Daniel 8 in the VBL

Daniel 8 in the VDCC

Daniel 8 in the YALU

Daniel 8 in the YAPE

Daniel 8 in the YBVTP

Daniel 8 in the ZBP