Daniel 9 (BOICB)

1 Nʼafọ mbụ, nke Daraiọs nwa Ahasuerọs (onye agbụrụ Midia), onye e mere eze nke alaeze ndị Kaldịa, 2 nʼafọ mbụ nke ọchịchị ya, ka mụ onwe m, bụ Daniel ghọtara site nʼakwụkwọ, dịka okwu ONYENWE ANYỊ nyere Jeremaya onye amụma, nke ga-emezu mgbe Jerusalem ga-anọ na mbibi iri afọ asaa. 3 Nʼihi nke a, echere m Onyenwe anyị Chineke ihu, rịọ ya arịrịọ, site nʼekpere na arịrịọ amara, nʼibu ọnụ, na iyikwa akwa mkpe na ntụ. 4 Ekpere m ekpere nye ONYENWE ANYỊ bụ Chineke m, ma kwupụta sị,“Onyenwe anyị, onye dị ukwuu, dị oke egwu. Onye na-edebe ọgbụgba ndụ nke ịhụnanya nke ndị hụrụ ya nʼanya na-edebekwa iwu ya niile. 5 Ma anyị emehiela meekwa ihe nʼadịghị mma megide gị. Anyị emeela ajọ omume, anyị enupula isi megide gị, gbakụtakwa iwu gị niile azụ. 6 Anyị e geghịkwa ndị ozi gị bụ ndị amụma ntị, bụ ndị gwara ndị eze anyị, na ndị ọchịchị anyị, na nna anyị ha, ma mmadụ niile bi nʼala anyị okwu nʼaha gị. 7 “Onyenwe anyị, ị bụ onye ezi omume, ma nʼụbọchị taa anyị bụ ndị ihere dịrị, ndị Juda, ndị Jerusalem na ndị Izrel niile, ndị nọ nso ma ndị nọ nʼebe dị anya ebe ị chụgara ha nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi anyị nye gị. 8 ONYENWE ANYỊ, ihere emegbuola anyị. Ihere dịrị ndị eze anyị, dịkwara ndịisi anyị na ndị nna anyị, nʼihi na anyị emeela mmehie megide gị. 9 Ma Onyenwe anyị Chineke anyị ka obi ebere na mgbaghara niile dịrị, nʼihi na anyị enupurula gị isi. 10 Anyị erubeghị isi nye ONYENWE ANYỊ Chineke anyị, maọbụ debe iwu ahụ o nyere anyị site nʼaka ndị ohu ha bụ ndị amụma. 11 Ndị Izrel niile enupula isi nʼiwu gị, wezuga onwe ha, jụ ige gị ntị.“Ya mere, ọbụbụ ọnụ ahụ niile e dere nʼiwu Mosis, odibo nke Chineke adakwasịla anyị, nʼihi na anyị emehiela megide gị. 12 O meela ka okwu ya guzosie ike, bụ nke o kwuru megide anyị na ndị ndu anyị site nʼiwetara anyị oke mbibi a. Nke bụ na o nwebeghị mgbe ọbụla e merela ụdị ihe emere na Jerusalem nʼokpuru eluigwe. 13 Ọ bụ dịka e si dee ya nʼiwu Mosis, ka mbibi a niile bịakwasịrị anyị, ma anyị achọbeghị ihuọma ONYENWE ANYỊ Chineke anyị, na ichegharị site na mmehie anyị chee uche banyere eziokwu gị. 14 ONYENWE ANYỊ kpachara anya mee ka nsogbu a bịakwasị anyị. Nʼihi na ONYENWE ANYỊ, Chineke anyị, bụ onye ezi omume nʼihe niile ọ na-eme, ma anyị jụrụ irubere ya isi. 15 “Ma ugbu a, Onyenwe anyị Chineke, onye ji aka dị ike kpọpụta ndị nke ya nʼala Ijipt, i meere onwe gị aha nke na-adịgide ruo taa. Anyị mere mmehie, ma mejọọkwa. 16 Onyenwe anyị, dịka ezi omume gị si dị, wezuga iwe gị na oke iwe gị nʼebe Jerusalem nọ, bụ obodo gị, na ugwu nsọ gị. Mmehie anyị na njehie nna anyị ha emeela ka Jerusalem na ndị gị bụrụ ihe ịkwa emo nye ndị gbara anyị gburugburu. 17 “Ma ugbu a, Chineke anyị, biko nụrụ ekpere na arịrịọ ohu gị. Nʼihi aha gị, Onyenwe anyị jiri amara mee ka ihe si nʼihu gị mụkwasị ụlọnsọ gị nke tọgbọrọ nʼefu. 18 Chineke m, tọọ ntị gị nʼala nụrụ arịrịọ m. Meghee anya gị abụọ ka ị hụrụ ọnọdụ mbibi nke obodo a na-akpọ aha gị nọ. Anyị anaghị arịọ ka i nyere anyị aka nʼihi na anyị bụ ndị ezi omume, kama anyị na-arịọ nʼihi na ebere gị dị ukwuu. 19 Onyenwe anyị nụrụ! Onyenwe anyị, gbaghara anyị! Onyenwe anyị biko, gee ntị ma zaa anyị. Nʼihi aha gị, O Chineke m, anọkwala ọdụ, nʼihi obodo gị, na ndị nke gị bụ aha gị ka a na-akpọ ha.” 20 Mgbe m nọ na-ekwu okwu na-ekpe ekpere, na-ekwupụta mmehie m na mmehie ndị m Izrel, na-arịọkwa amara nʼihu ONYENWE ANYỊ bụ Chineke m maka ugwu dị nsọ nke Chineke m, 21 ebe m ka nọ na-ekpere, Gebrel, nwoke ahụ m hụrụ nʼọhụ na mbụ, feere ọsịịsọ bịakwute m nʼoge a na-achụ aja nke uhuruchi. 22 Ọ bịara sị m, “Daniel, a bịara m ugbu a inye gị uche na nghọta. 23 Na mbido oge ị malitere ịrịọ arịrịọ, ka okwu ọsịsa pụtara. Abịara m ịgwa gị ya, nʼihi na ị bụ onye a na-akwanyere ugwu nke ukwuu. Ya mere, tụgharịa uche nʼokwu a, ghọtakwa ọhụ a. 24 “Iri izu ụka asaa, ka e dere nʼiwu nye ndị gị na obodo nsọ gị iji kwụsị njehie, ime ka mmehie kwụsị, na ịchụ aja maka ikpuchi ajọ omume na iweta ezi omume nke ga-adị ruo mgbe ebighị ebi, na ịkachi ọhụ na amụma ahụ akara, nakwa ite Ebe ahụ Kachasị Nsọ mmanụ. 25 “Ma mara, werekwa uche ghọta nke a: Site nʼoge e nyere iwu ka e wugharịa Jerusalem tutu ruo mgbe Onye ahụ e tere mmanụ, onyendu ahụ ga-abịa, ga-abụ izu ụka asaa, na izu ụka iri isii na abụọ, a ga-ewughachi ya, na okporoụzọ ya, na olulu mmiri ya, maọbụ nʼime oge nsogbu. 26 Mgbe izu ụka iri isii na abụọ gasịrị, Onye ahụ e tere mmanụ ka a ga-egbu, ma o nweghị ihe ọ ga-enwe. Usuu agha nke onye ọchịchị ga-abịa bibie obodo na ụlọnsọ. Oge ikpeazụ ga-abịa dịka idee mmiri; agha ga-adịgide ruo nʼoge ọgwụgwụ, e kpebiela na ịla nʼiyi ga-adị. 27 Ya na ọtụtụ ndị mmadụ ga-enwe ọgbụgba ndụ nʼotu ‘izu ụka,’ ọ bụkwa nʼọkara izu ụka ahụ, ka ọ ga-eme ka ịchụ aja na inye onyinye kwụsị. Ọ ga-emekwa ihe arụ dị egwu nʼime ụlọnsọ ahụ, ruo mgbe a ga-awụkwasị ya ọgwụgwụ ahụ bụ nke akara aka nʼahụ onye ọjọọ ahụ.”

In Other Versions

Daniel 9 in the ANGEFD

Daniel 9 in the ANTPNG2D

Daniel 9 in the AS21

Daniel 9 in the BAGH

Daniel 9 in the BBPNG

Daniel 9 in the BBT1E

Daniel 9 in the BDS

Daniel 9 in the BEV

Daniel 9 in the BHAD

Daniel 9 in the BIB

Daniel 9 in the BLPT

Daniel 9 in the BNT

Daniel 9 in the BNTABOOT

Daniel 9 in the BNTLV

Daniel 9 in the BOATCB

Daniel 9 in the BOATCB2

Daniel 9 in the BOBCV

Daniel 9 in the BOCNT

Daniel 9 in the BOECS

Daniel 9 in the BOGWICC

Daniel 9 in the BOHCB

Daniel 9 in the BOHCV

Daniel 9 in the BOHLNT

Daniel 9 in the BOHNTLTAL

Daniel 9 in the BOILNTAP

Daniel 9 in the BOITCV

Daniel 9 in the BOKCV

Daniel 9 in the BOKCV2

Daniel 9 in the BOKHWOG

Daniel 9 in the BOKSSV

Daniel 9 in the BOLCB

Daniel 9 in the BOLCB2

Daniel 9 in the BOMCV

Daniel 9 in the BONAV

Daniel 9 in the BONCB

Daniel 9 in the BONLT

Daniel 9 in the BONUT2

Daniel 9 in the BOPLNT

Daniel 9 in the BOSCB

Daniel 9 in the BOSNC

Daniel 9 in the BOTLNT

Daniel 9 in the BOVCB

Daniel 9 in the BOYCB

Daniel 9 in the BPBB

Daniel 9 in the BPH

Daniel 9 in the BSB

Daniel 9 in the CCB

Daniel 9 in the CUV

Daniel 9 in the CUVS

Daniel 9 in the DBT

Daniel 9 in the DGDNT

Daniel 9 in the DHNT

Daniel 9 in the DNT

Daniel 9 in the ELBE

Daniel 9 in the EMTV

Daniel 9 in the ESV

Daniel 9 in the FBV

Daniel 9 in the FEB

Daniel 9 in the GGMNT

Daniel 9 in the GNT

Daniel 9 in the HARY

Daniel 9 in the HNT

Daniel 9 in the IRVA

Daniel 9 in the IRVB

Daniel 9 in the IRVG

Daniel 9 in the IRVH

Daniel 9 in the IRVK

Daniel 9 in the IRVM

Daniel 9 in the IRVM2

Daniel 9 in the IRVO

Daniel 9 in the IRVP

Daniel 9 in the IRVT

Daniel 9 in the IRVT2

Daniel 9 in the IRVU

Daniel 9 in the ISVN

Daniel 9 in the JSNT

Daniel 9 in the KAPI

Daniel 9 in the KBT1ETNIK

Daniel 9 in the KBV

Daniel 9 in the KJV

Daniel 9 in the KNFD

Daniel 9 in the LBA

Daniel 9 in the LBLA

Daniel 9 in the LNT

Daniel 9 in the LSV

Daniel 9 in the MAAL

Daniel 9 in the MBV

Daniel 9 in the MBV2

Daniel 9 in the MHNT

Daniel 9 in the MKNFD

Daniel 9 in the MNG

Daniel 9 in the MNT

Daniel 9 in the MNT2

Daniel 9 in the MRS1T

Daniel 9 in the NAA

Daniel 9 in the NASB

Daniel 9 in the NBLA

Daniel 9 in the NBS

Daniel 9 in the NBVTP

Daniel 9 in the NET2

Daniel 9 in the NIV11

Daniel 9 in the NNT

Daniel 9 in the NNT2

Daniel 9 in the NNT3

Daniel 9 in the PDDPT

Daniel 9 in the PFNT

Daniel 9 in the RMNT

Daniel 9 in the SBIAS

Daniel 9 in the SBIBS

Daniel 9 in the SBIBS2

Daniel 9 in the SBICS

Daniel 9 in the SBIDS

Daniel 9 in the SBIGS

Daniel 9 in the SBIHS

Daniel 9 in the SBIIS

Daniel 9 in the SBIIS2

Daniel 9 in the SBIIS3

Daniel 9 in the SBIKS

Daniel 9 in the SBIKS2

Daniel 9 in the SBIMS

Daniel 9 in the SBIOS

Daniel 9 in the SBIPS

Daniel 9 in the SBISS

Daniel 9 in the SBITS

Daniel 9 in the SBITS2

Daniel 9 in the SBITS3

Daniel 9 in the SBITS4

Daniel 9 in the SBIUS

Daniel 9 in the SBIVS

Daniel 9 in the SBT

Daniel 9 in the SBT1E

Daniel 9 in the SCHL

Daniel 9 in the SNT

Daniel 9 in the SUSU

Daniel 9 in the SUSU2

Daniel 9 in the SYNO

Daniel 9 in the TBIAOTANT

Daniel 9 in the TBT1E

Daniel 9 in the TBT1E2

Daniel 9 in the TFTIP

Daniel 9 in the TFTU

Daniel 9 in the TGNTATF3T

Daniel 9 in the THAI

Daniel 9 in the TNFD

Daniel 9 in the TNT

Daniel 9 in the TNTIK

Daniel 9 in the TNTIL

Daniel 9 in the TNTIN

Daniel 9 in the TNTIP

Daniel 9 in the TNTIZ

Daniel 9 in the TOMA

Daniel 9 in the TTENT

Daniel 9 in the UBG

Daniel 9 in the UGV

Daniel 9 in the UGV2

Daniel 9 in the UGV3

Daniel 9 in the VBL

Daniel 9 in the VDCC

Daniel 9 in the YALU

Daniel 9 in the YAPE

Daniel 9 in the YBVTP

Daniel 9 in the ZBP