Deuteronomy 10 (BOICB)
        
        
          1 Nʼoge ahụ, ONYENWE ANYỊ gwara m, sị, “Wapụta mbadamba nkume abụọ dịka nke mbụ, were ha bịakwute m nʼelu ugwu. Ọzọ, wuokwara onwe gị igbe osisi. 2 Aga m edekwasị nʼelu mbadamba nkume ndị a, okwu niile nke dị nʼelu mbadamba nkume ndị mbụ, bụ nke ị tụpịasịrị. Ị ga-etinyekwa ha nʼime igbe ahụ.”  3 Ya mere, eji m osisi akashia kwaa igbe ahụ. A wapụtakwara m mbadamba nkume abụọ yiri ndị nke mbụ, were ha rigoro ugwu ahụ. 4 ONYENWE ANYỊ dere nʼelu mbadamba nkume ahụ ihe ndị ahụ o dere na mbụ, bụ iwu iri ndị ahụ o gwara unu nʼelu ugwu site nʼime ọkụ, nʼụbọchị mkpọkọta ahụ. ONYENWE ANYỊ nyekwara m ha. 5 Mgbe m si nʼugwu ahụ rịdata, etinyere m mbadamba nkume abụọ ahụ nʼime igbe ahụ m kwara, dịka ONYENWE ANYỊ nyere m nʼiwu. Ha dịkwa nʼebe ahụ ruo taa.  6 (Ụmụ Izrel gara ije site nʼolulu mmiri nke Bene Jaakan garuo Mosera, nʼebe ahụ ka Erọn nọ nwụọ, e lie ya nʼebe ahụ. Elieza, bụ ọkpara ya nọchiri ọnọdụ ya dịka onye nchụaja. 7 Site nʼebe ahụ, ha gagidere ije ruo Gudgoda, sitekwa na ya ruo Jotbata, ala nke iyi na-asọ asọ juru nʼime ya. 8 Nʼoge ahụ, ONYENWE ANYỊ kewapụtara ebo Livayị ibu igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYỊ, na iguzo nʼihu ONYENWE ANYỊ ijere ya ozi na ikwupụta ngọzị nʼaha ya, dịka ha sị eme ruo taa. 9 Ọ bụ nke a mere ndị Livayị enweghị oke maọbụ ihe nketa nʼetiti ndị Izrel ibe ha; ONYENWE ANYỊ bụ ihe nketa ha, dịka ONYENWE ANYỊ Chineke unu gwara ha.)  10 Ugbu a, anọọla m nʼelu ugwu ahụ iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị, dịka m mere nʼoge mbụ, ONYENWE ANYỊ gekwara m ntị nʼoge ugbu a. Ọ bụghị ọchịchọ ONYENWE ANYỊ ibibi unu. 11 ONYENWE ANYỊ gwara m, “Bilie, gaa ka i duru ndị a gaa na njem ha, ka ha banye, ma nwetakwa ala ahụ nke m kwere nna nna ha na nkwa inye ha.”  12 Ugbu a, Izrel, gịnị ka ONYENWE ANYỊ Chineke gị na-ana nʼaka gị ma ọ bụghị ka ị tụọ egwu ONYENWE ANYỊ bụ Chineke gị, jee ije na nrube isi nye ya, ịhụ ya nʼanya, na iwere obi gị niile na mmụọ gị niile fee ya ofufe, 13 na ilezi anya debezuo iwu na ụkpụrụ ONYENWE ANYỊ, ndị m na-enye gị taa, nʼihi ọdịmma gị.  14 Ụwa na eluigwe na ebe niile kachasị elu nke eluigwe, na ihe niile dị nʼime ha, bụ nke ONYENWE ANYỊ Chineke gị. 15 Ma ONYENWE ANYỊ nwere mmasị nʼahụ nna nna unu ha, hụkwa ha nʼanya, ọ họrọ unu, na naanị ụmụ ha niile, site nʼetiti mba niile dịka ọ dị taa. 16 Nʼihi nke a, biekwanụ obi unu ugwu, kwụsịkwanụ ibi ndụ nke isiike. 17 Nʼihi na ONYENWE ANYỊ, bụ Chineke unu bụ Chineke kachasị chi niile, bụrụkwa Onyenwe kachasị ndị nwenụ niile. Chineke ukwu ahụ, onye dị ike dịkwa egwu, onye na-adịghị ele mmadụ anya nʼihu, ọ nakwaghị eri ngarị. 18 Ọ na-alụrụ ndị na-enweghị nna, na ụmụ nwanyị na-enweghị di ọgụ. Ọ na-ahụ ndị ọbịa nʼanya, na-enyekwa ha nri na uwe. 19 Ya mere, unu onwe unu kwa, hụnụ ndị ọbịa nʼanya, nʼihi na unu onwe unu bụrụrị ndị ọbịa nʼala Ijipt. 20 Tụọ ONYENWE ANYỊ Chineke gị egwu, feekwa ya ofufe. Ya ka ị ga-arapara nʼahụ,  ọ bụkwa naanị nʼaha ya ka ị ga-aṅụ iyi. 21 Ọ bụ ya bụ onye ị ga-eto otuto, ọ bụ ya bụ Chineke gị, onye rụrụ gị ọrụ ndị ahụ dị oke egwu na ebube, nke gị onwe gị ji anya gị hụ. 22 Nna nna unu ndị gara nʼIjipt dị naanị iri mmadụ asaa, ma ugbu a, ONYENWE ANYỊ Chineke gị emeela ka ịmụbaa dịka kpakpando nke mbara igwe.
        
        
          In Other Versions
        
        
  
    Deuteronomy 10 in the ANGEFD
  
  
    Deuteronomy 10 in the ANTPNG2D
  
  
    Deuteronomy 10 in the AS21
  
  
    Deuteronomy 10 in the BAGH
  
  
    Deuteronomy 10 in the BBPNG
  
  
    Deuteronomy 10 in the BBT1E
  
  
    Deuteronomy 10 in the BDS
  
  
    Deuteronomy 10 in the BEV
  
  
    Deuteronomy 10 in the BHAD
  
  
    Deuteronomy 10 in the BIB
  
  
    Deuteronomy 10 in the BLPT
  
  
    Deuteronomy 10 in the BNT
  
  
    Deuteronomy 10 in the BNTABOOT
  
  
    Deuteronomy 10 in the BNTLV
  
  
    Deuteronomy 10 in the BOATCB
  
  
    Deuteronomy 10 in the BOATCB2
  
  
    Deuteronomy 10 in the BOBCV
  
  
    Deuteronomy 10 in the BOCNT
  
  
    Deuteronomy 10 in the BOECS
  
  
    Deuteronomy 10 in the BOGWICC
  
  
    Deuteronomy 10 in the BOHCB
  
  
    Deuteronomy 10 in the BOHCV
  
  
    Deuteronomy 10 in the BOHLNT
  
  
    Deuteronomy 10 in the BOHNTLTAL
  
  
    Deuteronomy 10 in the BOILNTAP
  
  
    Deuteronomy 10 in the BOITCV
  
  
    Deuteronomy 10 in the BOKCV
  
  
    Deuteronomy 10 in the BOKCV2
  
  
    Deuteronomy 10 in the BOKHWOG
  
  
    Deuteronomy 10 in the BOKSSV
  
  
    Deuteronomy 10 in the BOLCB
  
  
    Deuteronomy 10 in the BOLCB2
  
  
    Deuteronomy 10 in the BOMCV
  
  
    Deuteronomy 10 in the BONAV
  
  
    Deuteronomy 10 in the BONCB
  
  
    Deuteronomy 10 in the BONLT
  
  
    Deuteronomy 10 in the BONUT2
  
  
    Deuteronomy 10 in the BOPLNT
  
  
    Deuteronomy 10 in the BOSCB
  
  
    Deuteronomy 10 in the BOSNC
  
  
    Deuteronomy 10 in the BOTLNT
  
  
    Deuteronomy 10 in the BOVCB
  
  
    Deuteronomy 10 in the BOYCB
  
  
    Deuteronomy 10 in the BPBB
  
  
    Deuteronomy 10 in the BPH
  
  
    Deuteronomy 10 in the BSB
  
  
    Deuteronomy 10 in the CCB
  
  
    Deuteronomy 10 in the CUV
  
  
    Deuteronomy 10 in the CUVS
  
  
    Deuteronomy 10 in the DBT
  
  
    Deuteronomy 10 in the DGDNT
  
  
    Deuteronomy 10 in the DHNT
  
  
    Deuteronomy 10 in the DNT
  
  
    Deuteronomy 10 in the ELBE
  
  
    Deuteronomy 10 in the EMTV
  
  
    Deuteronomy 10 in the ESV
  
  
    Deuteronomy 10 in the FBV
  
  
    Deuteronomy 10 in the FEB
  
  
    Deuteronomy 10 in the GGMNT
  
  
    Deuteronomy 10 in the GNT
  
  
    Deuteronomy 10 in the HARY
  
  
    Deuteronomy 10 in the HNT
  
  
    Deuteronomy 10 in the IRVA
  
  
    Deuteronomy 10 in the IRVB
  
  
    Deuteronomy 10 in the IRVG
  
  
    Deuteronomy 10 in the IRVH
  
  
    Deuteronomy 10 in the IRVK
  
  
    Deuteronomy 10 in the IRVM
  
  
    Deuteronomy 10 in the IRVM2
  
  
    Deuteronomy 10 in the IRVO
  
  
    Deuteronomy 10 in the IRVP
  
  
    Deuteronomy 10 in the IRVT
  
  
    Deuteronomy 10 in the IRVT2
  
  
    Deuteronomy 10 in the IRVU
  
  
    Deuteronomy 10 in the ISVN
  
  
    Deuteronomy 10 in the JSNT
  
  
    Deuteronomy 10 in the KAPI
  
  
    Deuteronomy 10 in the KBT1ETNIK
  
  
    Deuteronomy 10 in the KBV
  
  
    Deuteronomy 10 in the KJV
  
  
    Deuteronomy 10 in the KNFD
  
  
    Deuteronomy 10 in the LBA
  
  
    Deuteronomy 10 in the LBLA
  
  
    Deuteronomy 10 in the LNT
  
  
    Deuteronomy 10 in the LSV
  
  
    Deuteronomy 10 in the MAAL
  
  
    Deuteronomy 10 in the MBV
  
  
    Deuteronomy 10 in the MBV2
  
  
    Deuteronomy 10 in the MHNT
  
  
    Deuteronomy 10 in the MKNFD
  
  
    Deuteronomy 10 in the MNG
  
  
    Deuteronomy 10 in the MNT
  
  
    Deuteronomy 10 in the MNT2
  
  
    Deuteronomy 10 in the MRS1T
  
  
    Deuteronomy 10 in the NAA
  
  
    Deuteronomy 10 in the NASB
  
  
    Deuteronomy 10 in the NBLA
  
  
    Deuteronomy 10 in the NBS
  
  
    Deuteronomy 10 in the NBVTP
  
  
    Deuteronomy 10 in the NET2
  
  
    Deuteronomy 10 in the NIV11
  
  
    Deuteronomy 10 in the NNT
  
  
    Deuteronomy 10 in the NNT2
  
  
    Deuteronomy 10 in the NNT3
  
  
    Deuteronomy 10 in the PDDPT
  
  
    Deuteronomy 10 in the PFNT
  
  
    Deuteronomy 10 in the RMNT
  
  
    Deuteronomy 10 in the SBIAS
  
  
    Deuteronomy 10 in the SBIBS
  
  
    Deuteronomy 10 in the SBIBS2
  
  
    Deuteronomy 10 in the SBICS
  
  
    Deuteronomy 10 in the SBIDS
  
  
    Deuteronomy 10 in the SBIGS
  
  
    Deuteronomy 10 in the SBIHS
  
  
    Deuteronomy 10 in the SBIIS
  
  
    Deuteronomy 10 in the SBIIS2
  
  
    Deuteronomy 10 in the SBIIS3
  
  
    Deuteronomy 10 in the SBIKS
  
  
    Deuteronomy 10 in the SBIKS2
  
  
    Deuteronomy 10 in the SBIMS
  
  
    Deuteronomy 10 in the SBIOS
  
  
    Deuteronomy 10 in the SBIPS
  
  
    Deuteronomy 10 in the SBISS
  
  
    Deuteronomy 10 in the SBITS
  
  
    Deuteronomy 10 in the SBITS2
  
  
    Deuteronomy 10 in the SBITS3
  
  
    Deuteronomy 10 in the SBITS4
  
  
    Deuteronomy 10 in the SBIUS
  
  
    Deuteronomy 10 in the SBIVS
  
  
    Deuteronomy 10 in the SBT
  
  
    Deuteronomy 10 in the SBT1E
  
  
    Deuteronomy 10 in the SCHL
  
  
    Deuteronomy 10 in the SNT
  
  
    Deuteronomy 10 in the SUSU
  
  
    Deuteronomy 10 in the SUSU2
  
  
    Deuteronomy 10 in the SYNO
  
  
    Deuteronomy 10 in the TBIAOTANT
  
  
    Deuteronomy 10 in the TBT1E
  
  
    Deuteronomy 10 in the TBT1E2
  
  
    Deuteronomy 10 in the TFTIP
  
  
    Deuteronomy 10 in the TFTU
  
  
    Deuteronomy 10 in the TGNTATF3T
  
  
    Deuteronomy 10 in the THAI
  
  
    Deuteronomy 10 in the TNFD
  
  
    Deuteronomy 10 in the TNT
  
  
    Deuteronomy 10 in the TNTIK
  
  
    Deuteronomy 10 in the TNTIL
  
  
    Deuteronomy 10 in the TNTIN
  
  
    Deuteronomy 10 in the TNTIP
  
  
    Deuteronomy 10 in the TNTIZ
  
  
    Deuteronomy 10 in the TOMA
  
  
    Deuteronomy 10 in the TTENT
  
  
    Deuteronomy 10 in the UBG
  
  
    Deuteronomy 10 in the UGV
  
  
    Deuteronomy 10 in the UGV2
  
  
    Deuteronomy 10 in the UGV3
  
  
    Deuteronomy 10 in the VBL
  
  
    Deuteronomy 10 in the VDCC
  
  
    Deuteronomy 10 in the YALU
  
  
    Deuteronomy 10 in the YAPE
  
  
    Deuteronomy 10 in the YBVTP
  
  
    Deuteronomy 10 in the ZBP