Deuteronomy 13 (BOICB)
1 Ọ bụrụ na onye amụma, maọbụ onye na-akọwa nrọ apụta nʼetiti gị kwee nkwa na ihe ịrịbama maọbụ ihe dị ebube na-aga ime, 2 ọ bụrụkwa na ihe ịrịbama ahụ maọbụ ihe ebube ahụ e kwuru maka ya emezuo, emesịa onye amụma ahụ na-asị, “Ka anyị gbaso chi ndị ọzọ dị iche, ka anyị feekwa ha,” bụ chi ndị ị na-amaghị, 3 egela okwu onye amụma maọbụ ọrọ nrọ ahụ ntị. Nʼihi na ONYENWE ANYỊ bụ Chineke unu na-ele unu ule ịmata ma unu jikwa obi unu, na uche unu hụ ya nʼanya. 4 Ọ bụ ONYENWE ANYỊ bụ Chineke unu ka unu ga-eso, naanị ya ka unu ga-atụ egwu. Debenụ iwu ya niile na-erubekwara ya isi, na-ejere ya ozi, jidesiekwa ya ike. 5 A ga-egbu onye amụma ahụ maọbụ onye ọrọ nrọ ahụ nke chọrọ iduhie unu, nʼihi na ọ chọrọ iweta nnupu isi megide ONYENWE ANYỊ bụ Chineke unu, onye kpọpụtara unu site nʼala Ijipt, onye gbapụtara unu site nʼọnọdụ ịbụ ndị ohu. Ihe ọ chọrọ ime bụ iduhie gị, ka ị ghara ibi ụdị ndụ ahụ ONYENWE ANYỊ Chineke gị chọrọ ka i bie. Ọnwụ ya ga-eme ka i wezuga ihe ọjọọ site nʼetiti gị. 6 Ọ bụrụ na ezi enyi gị maọbụ nwanne gị nwoke maọbụ nwa gị nwoke maọbụ nwunye gị ị hụrụ nʼanya ejiri aghụghọ gwa gị okwu sị gị, “Bịa ka anyị gaa fee chi ndị ọzọ ofufe” (bụ chi ndị ị na-amaghị maọbụ nke nna gị ha na-amaghị, 7 chi nke ndị ala ahụ gbara unu gburugburu, ma ha bụ ndị bi gị nso ma ha bụ ndị bi nʼebe dị anya, site nʼotu nsọtụ nke ala ahụ ruo nsọtụ nke ọzọ), 8 ekwenyekwala maọbụ ṅaa ntị nʼihe ọ na-ekwu. Enwekwala obi ebere nʼebe ọ nọ, ekpuchikwala atụmatụ ọjọọ ya niile. 9 Ị ghaghị igbu ha. Buru ụzọ setịpụ aka gị tụọ ya nkume, ka ndị ọzọ soro gị tugbuo ya. 10 Jiri nkume tugbuo ya, nʼihi na ọ chọrọ ime ka i site nʼiso ONYENWE ANYỊ Chineke, wezuga onwe gị, ka ị pụọ, ma chigharịa site nʼiso ya, bụ ONYENWE ANYỊ, onye mere ka i site nʼala Ijipt pụta, ala ebe ị nọ nʼime ya dịka ohu. 11 Izrel niile ga-anụkwa banyere ihe ọjọọ o mere, ha ga-atụkwa ihe ọjọọ dị otu a egwu, ọ dịkwaghị onye ọbụla nʼetiti gị ga-achọkwa ime ihe ọjọọ dị otu ahụ. 12 Mgbe i bi nʼobodo ndị ahụ ONYENWE ANYỊ Chineke gị na-enye gị, ọ bụrụ na akụkọ esite nʼotu obodo ndị a ruo gị ntị sị, 13 na ụfọdụ ndị mmadụ jọgburu onwe ha eduhiela ndị obodo ha, na-asị, “Ka anyị gaa fee chi ndị ọzọ ofufe” (bụ chi ndị ị na-amaghị na mbụ), 14 tupu i mee ihe ọbụla, ị ga-eburu ụzọ jụọ ase, jụpụta nke ọma, ma nyochapụta ma okwu ahụ ọ bụ eziokwu. Ọ bụrụ na ọ bụ eziokwu na-achọpụtakwara nʼihe arụ dị otu a mere nʼetiti unu, 15 ị ghaghị ibuso obodo ahụ agha jiri mma agha gbuo ndị mmadụ niile bi nʼime obodo ahụ. Ị ghaghị ibibi ya kpamkpam, ma ndị mmadụ ma anụ ụlọ ha. 16 Ihe nkwata niile i si nʼobodo ahụ kwata ka ị ga-ekpokọta nʼotu ebe, nʼama dị nʼetiti obodo ahụ. A ga-akpọkwa ha niile ọkụ, gbaakwa obodo ahụ niile ọkụ, dịka aja nsure ọkụ nye ONYENWE ANYỊ bụ Chineke unu. Ruo mgbe ebighị ebi, obodo ahụ ga-abụ mkpọmkpọ ebe, a gaghị ewugharịkwa ya ọzọ. 17 Ọ dịghị ihe ndị ahụ e debere nye mbibi nke e kwesiri ịhụ nʼaka gị. Nke a ga-emekwa ka iwe ọkụ ONYENWE ANYỊ dajụọ, ka o gosikwa gị obi ebere. Ọ ga-enwekwa ọmịiko nʼahụ gị, meekwa ka ị baa ụba nʼọnụọgụgụ, dịka o ji ịṅụ iyi kwee nna nna gị ha na nkwa. 18 ONYENWE ANYỊ Chineke gị ga-eme ihe ndị a ma ọ bụrụ na ị na-erubere ya isi, na-edebezukwa iwu ya niile, nke m na-enye gị taa, ma na-eme ihe ziri ezi nʼanya ONYENWE ANYỊ Chineke gị.
In Other Versions
Deuteronomy 13 in the ANGEFD
Deuteronomy 13 in the ANTPNG2D
Deuteronomy 13 in the AS21
Deuteronomy 13 in the BAGH
Deuteronomy 13 in the BBPNG
Deuteronomy 13 in the BBT1E
Deuteronomy 13 in the BDS
Deuteronomy 13 in the BEV
Deuteronomy 13 in the BHAD
Deuteronomy 13 in the BIB
Deuteronomy 13 in the BLPT
Deuteronomy 13 in the BNT
Deuteronomy 13 in the BNTABOOT
Deuteronomy 13 in the BNTLV
Deuteronomy 13 in the BOATCB
Deuteronomy 13 in the BOATCB2
Deuteronomy 13 in the BOBCV
Deuteronomy 13 in the BOCNT
Deuteronomy 13 in the BOECS
Deuteronomy 13 in the BOGWICC
Deuteronomy 13 in the BOHCB
Deuteronomy 13 in the BOHCV
Deuteronomy 13 in the BOHLNT
Deuteronomy 13 in the BOHNTLTAL
Deuteronomy 13 in the BOILNTAP
Deuteronomy 13 in the BOITCV
Deuteronomy 13 in the BOKCV
Deuteronomy 13 in the BOKCV2
Deuteronomy 13 in the BOKHWOG
Deuteronomy 13 in the BOKSSV
Deuteronomy 13 in the BOLCB
Deuteronomy 13 in the BOLCB2
Deuteronomy 13 in the BOMCV
Deuteronomy 13 in the BONAV
Deuteronomy 13 in the BONCB
Deuteronomy 13 in the BONLT
Deuteronomy 13 in the BONUT2
Deuteronomy 13 in the BOPLNT
Deuteronomy 13 in the BOSCB
Deuteronomy 13 in the BOSNC
Deuteronomy 13 in the BOTLNT
Deuteronomy 13 in the BOVCB
Deuteronomy 13 in the BOYCB
Deuteronomy 13 in the BPBB
Deuteronomy 13 in the BPH
Deuteronomy 13 in the BSB
Deuteronomy 13 in the CCB
Deuteronomy 13 in the CUV
Deuteronomy 13 in the CUVS
Deuteronomy 13 in the DBT
Deuteronomy 13 in the DGDNT
Deuteronomy 13 in the DHNT
Deuteronomy 13 in the DNT
Deuteronomy 13 in the ELBE
Deuteronomy 13 in the EMTV
Deuteronomy 13 in the ESV
Deuteronomy 13 in the FBV
Deuteronomy 13 in the FEB
Deuteronomy 13 in the GGMNT
Deuteronomy 13 in the GNT
Deuteronomy 13 in the HARY
Deuteronomy 13 in the HNT
Deuteronomy 13 in the IRVA
Deuteronomy 13 in the IRVB
Deuteronomy 13 in the IRVG
Deuteronomy 13 in the IRVH
Deuteronomy 13 in the IRVK
Deuteronomy 13 in the IRVM
Deuteronomy 13 in the IRVM2
Deuteronomy 13 in the IRVO
Deuteronomy 13 in the IRVP
Deuteronomy 13 in the IRVT
Deuteronomy 13 in the IRVT2
Deuteronomy 13 in the IRVU
Deuteronomy 13 in the ISVN
Deuteronomy 13 in the JSNT
Deuteronomy 13 in the KAPI
Deuteronomy 13 in the KBT1ETNIK
Deuteronomy 13 in the KBV
Deuteronomy 13 in the KJV
Deuteronomy 13 in the KNFD
Deuteronomy 13 in the LBA
Deuteronomy 13 in the LBLA
Deuteronomy 13 in the LNT
Deuteronomy 13 in the LSV
Deuteronomy 13 in the MAAL
Deuteronomy 13 in the MBV
Deuteronomy 13 in the MBV2
Deuteronomy 13 in the MHNT
Deuteronomy 13 in the MKNFD
Deuteronomy 13 in the MNG
Deuteronomy 13 in the MNT
Deuteronomy 13 in the MNT2
Deuteronomy 13 in the MRS1T
Deuteronomy 13 in the NAA
Deuteronomy 13 in the NASB
Deuteronomy 13 in the NBLA
Deuteronomy 13 in the NBS
Deuteronomy 13 in the NBVTP
Deuteronomy 13 in the NET2
Deuteronomy 13 in the NIV11
Deuteronomy 13 in the NNT
Deuteronomy 13 in the NNT2
Deuteronomy 13 in the NNT3
Deuteronomy 13 in the PDDPT
Deuteronomy 13 in the PFNT
Deuteronomy 13 in the RMNT
Deuteronomy 13 in the SBIAS
Deuteronomy 13 in the SBIBS
Deuteronomy 13 in the SBIBS2
Deuteronomy 13 in the SBICS
Deuteronomy 13 in the SBIDS
Deuteronomy 13 in the SBIGS
Deuteronomy 13 in the SBIHS
Deuteronomy 13 in the SBIIS
Deuteronomy 13 in the SBIIS2
Deuteronomy 13 in the SBIIS3
Deuteronomy 13 in the SBIKS
Deuteronomy 13 in the SBIKS2
Deuteronomy 13 in the SBIMS
Deuteronomy 13 in the SBIOS
Deuteronomy 13 in the SBIPS
Deuteronomy 13 in the SBISS
Deuteronomy 13 in the SBITS
Deuteronomy 13 in the SBITS2
Deuteronomy 13 in the SBITS3
Deuteronomy 13 in the SBITS4
Deuteronomy 13 in the SBIUS
Deuteronomy 13 in the SBIVS
Deuteronomy 13 in the SBT
Deuteronomy 13 in the SBT1E
Deuteronomy 13 in the SCHL
Deuteronomy 13 in the SNT
Deuteronomy 13 in the SUSU
Deuteronomy 13 in the SUSU2
Deuteronomy 13 in the SYNO
Deuteronomy 13 in the TBIAOTANT
Deuteronomy 13 in the TBT1E
Deuteronomy 13 in the TBT1E2
Deuteronomy 13 in the TFTIP
Deuteronomy 13 in the TFTU
Deuteronomy 13 in the TGNTATF3T
Deuteronomy 13 in the THAI
Deuteronomy 13 in the TNFD
Deuteronomy 13 in the TNT
Deuteronomy 13 in the TNTIK
Deuteronomy 13 in the TNTIL
Deuteronomy 13 in the TNTIN
Deuteronomy 13 in the TNTIP
Deuteronomy 13 in the TNTIZ
Deuteronomy 13 in the TOMA
Deuteronomy 13 in the TTENT
Deuteronomy 13 in the UBG
Deuteronomy 13 in the UGV
Deuteronomy 13 in the UGV2
Deuteronomy 13 in the UGV3
Deuteronomy 13 in the VBL
Deuteronomy 13 in the VDCC
Deuteronomy 13 in the YALU
Deuteronomy 13 in the YAPE
Deuteronomy 13 in the YBVTP
Deuteronomy 13 in the ZBP