Deuteronomy 19 (BOICB)
1 Mgbe ONYENWE ANYỊ Chineke gị bibiri mba ndị ahụ nwe ala ahụ ọ na-enye gị, mgbe ị chụpụrụ ha bichie nʼobodo ha nakwa ụlọ ha niile, 2 mgbe ahụ, kewapụta obodo atọ nʼala ahụ ONYENWE ANYỊ Chineke gị na-enye gị inweta, doo ha iche. 3 Kewaa ala ahụ ONYENWE ANYỊ Chineke gị na-enye gị dịka ihe nketa ụzọ atọ ka otu obodo mgbaba dịrị nʼotu akụkụ. Wuzie ụzọ e si aga nʼobodo ndị a ka ọ dịrị onye na-agba ọsọ mfe ịgbaje nʼebe ahụ. 4 Nke a bụ iwu banyere onye ọbụla gburu mmadụ gbaba nʼebe ahụ maka izere ndụ. Ọ bụrụ na mmadụ esite na-amaghị ama gbuo onye agbataobi ya, bụ onye ọ na-akpọghị asị nʼoge gara aga, ọ ga-agbaba nʼobodo ahụ nʼihi ize ndụ ya. 5 Ọ bụrụ na mmadụ na ibe ya agaa nʼọhịa ịwa nkụ ma isi anyụike ya esite nʼosisi ya dapụ dagbuo nwoke ahụ so ya gaa ịwa nkụ, nwoke ahụ na-awa nkụ ga-agbala nʼime otu obodo ndị a ichebe ndụ ya. 6 Ma ọ bụghị otu a, onye ahụ na-agba ụgwọ ọchụ ga-esite nʼọnụma juru ya obi chụọ nwoke ahụ ọsọ, chụkwute ya, gbuo ya ma ọ bụrụ na obodo mgbaba ahụ adịrị nʼebe dị anya, ọ bụ ezie na nwoke ahụ abụghị onye kwesiri ọnwụ, ebe ọ bụ na o siteghị nʼekworo gbuo onye o gburu. 7 Ọ bụ nke a mere m ji nye unu iwu ka unu wepụtara onwe unu obodo mgbaba atọ. 8 Ọ bụrụ na ONYENWE ANYỊ Chineke gị emee ka oke ala gị saa mbara dịka ọ ṅụụrụ nna nna gị ha nʼiyi na ọ ga-eme, ọ bụrụkwa na o nye gị ala niile dịka o kwere na nkwa, 9 nʼihi na i leziri anya gbasoo iwu ndị a m nyere gị taa ịhụ ONYENWE ANYỊ Chineke gị nʼanya, na ije ije dịka ụzọ ya si dị, mgbe ahụ, i nwere ike họpụta obodo atọ ọzọ, nke ga-abụ obodo izere ndụ. 10 Nʼụzọ dị otu a, ị ga-enwe ike gbochie ọnwụ ndị aka ha dị ọcha. Ọbara onye na-adịghị ihe o mere agaghị adịkwa gị nʼisi, nʼala ahụ ONYENWE ANYỊ Chineke gị na-enye gị dịka ihe nketa. 11 Ma ọ bụrụ na nwoke ọbụla echere onye ọ kpọrọ asị nʼụzọ, gbuo ya, mesịa gbara ọsọ gaa nʼime otu obodo ndị a, 12 ndị okenye obodo ya ga-ezi ndị mmadụ ka ha gaa kpụta ya site nʼebe ahụ. Ha ga-ewerekwa ya nyefee nʼaka onye ga-abọrọ onye ahụ nwụrụ anwụ ọbọ, ka o gbuo ya. 13 Emerela ya ebere. Ị ghaghị ikpochapụ site nʼIzrel ikpe ọmụma nke so iwufu ọbara ndị aka ha dị ọcha, ka ihe gaara gị nke ọma. 14 Mgbe ị batara nʼala ahụ ONYENWE ANYỊ Chineke gị na-aga inye gị dịka ihe nketa, ehigharịla oke ala onye agbataobi gị nʼala ahụ enyere gị inweta. 15 Amala onye ọbụla ikpe mmehie nʼihi ama otu onye gbara. E kwesiri inwe ndị akaebe abụọ, maọbụ atọ tupu a maa mmadụ ikpe. 16 Ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ imegide onye ọzọ site nʼịgba ama ụgha, 17 a ga-eduru mmadụ abụọ ahụ bịa nʼihu ONYENWE ANYỊ na nʼihu ndị nchụaja na ndị ikpe na-arụ ọrụ nʼoge ahụ. 18 Ndị ikpe ga-enyocha okwu ahụ nke ọma. Ọ bụrụ na a chọpụta na onye akaebe ahụ gbara ama ụgha, 19 ọ ga-ata ahụhụ ahụ nwoke ahụ ọ gbagidere akaebe gaara ata. Nʼụzọ dị otu a, ị ga-ekpochapụ ndị ọjọọ site nʼetiti gị. 20 Ndị niile nụrụ ya ga-atụ egwu, ha agaghị emekwa ihe ọjọọ dị otu ahụ ọzọ. 21 Emekwala ebere ọbụla. Ndụ laara ndụ, anya laara anya, eze laara eze, aka laara aka, ụkwụ laara ụkwụ.
In Other Versions
Deuteronomy 19 in the ANGEFD
Deuteronomy 19 in the ANTPNG2D
Deuteronomy 19 in the AS21
Deuteronomy 19 in the BAGH
Deuteronomy 19 in the BBPNG
Deuteronomy 19 in the BBT1E
Deuteronomy 19 in the BDS
Deuteronomy 19 in the BEV
Deuteronomy 19 in the BHAD
Deuteronomy 19 in the BIB
Deuteronomy 19 in the BLPT
Deuteronomy 19 in the BNT
Deuteronomy 19 in the BNTABOOT
Deuteronomy 19 in the BNTLV
Deuteronomy 19 in the BOATCB
Deuteronomy 19 in the BOATCB2
Deuteronomy 19 in the BOBCV
Deuteronomy 19 in the BOCNT
Deuteronomy 19 in the BOECS
Deuteronomy 19 in the BOGWICC
Deuteronomy 19 in the BOHCB
Deuteronomy 19 in the BOHCV
Deuteronomy 19 in the BOHLNT
Deuteronomy 19 in the BOHNTLTAL
Deuteronomy 19 in the BOILNTAP
Deuteronomy 19 in the BOITCV
Deuteronomy 19 in the BOKCV
Deuteronomy 19 in the BOKCV2
Deuteronomy 19 in the BOKHWOG
Deuteronomy 19 in the BOKSSV
Deuteronomy 19 in the BOLCB
Deuteronomy 19 in the BOLCB2
Deuteronomy 19 in the BOMCV
Deuteronomy 19 in the BONAV
Deuteronomy 19 in the BONCB
Deuteronomy 19 in the BONLT
Deuteronomy 19 in the BONUT2
Deuteronomy 19 in the BOPLNT
Deuteronomy 19 in the BOSCB
Deuteronomy 19 in the BOSNC
Deuteronomy 19 in the BOTLNT
Deuteronomy 19 in the BOVCB
Deuteronomy 19 in the BOYCB
Deuteronomy 19 in the BPBB
Deuteronomy 19 in the BPH
Deuteronomy 19 in the BSB
Deuteronomy 19 in the CCB
Deuteronomy 19 in the CUV
Deuteronomy 19 in the CUVS
Deuteronomy 19 in the DBT
Deuteronomy 19 in the DGDNT
Deuteronomy 19 in the DHNT
Deuteronomy 19 in the DNT
Deuteronomy 19 in the ELBE
Deuteronomy 19 in the EMTV
Deuteronomy 19 in the ESV
Deuteronomy 19 in the FBV
Deuteronomy 19 in the FEB
Deuteronomy 19 in the GGMNT
Deuteronomy 19 in the GNT
Deuteronomy 19 in the HARY
Deuteronomy 19 in the HNT
Deuteronomy 19 in the IRVA
Deuteronomy 19 in the IRVB
Deuteronomy 19 in the IRVG
Deuteronomy 19 in the IRVH
Deuteronomy 19 in the IRVK
Deuteronomy 19 in the IRVM
Deuteronomy 19 in the IRVM2
Deuteronomy 19 in the IRVO
Deuteronomy 19 in the IRVP
Deuteronomy 19 in the IRVT
Deuteronomy 19 in the IRVT2
Deuteronomy 19 in the IRVU
Deuteronomy 19 in the ISVN
Deuteronomy 19 in the JSNT
Deuteronomy 19 in the KAPI
Deuteronomy 19 in the KBT1ETNIK
Deuteronomy 19 in the KBV
Deuteronomy 19 in the KJV
Deuteronomy 19 in the KNFD
Deuteronomy 19 in the LBA
Deuteronomy 19 in the LBLA
Deuteronomy 19 in the LNT
Deuteronomy 19 in the LSV
Deuteronomy 19 in the MAAL
Deuteronomy 19 in the MBV
Deuteronomy 19 in the MBV2
Deuteronomy 19 in the MHNT
Deuteronomy 19 in the MKNFD
Deuteronomy 19 in the MNG
Deuteronomy 19 in the MNT
Deuteronomy 19 in the MNT2
Deuteronomy 19 in the MRS1T
Deuteronomy 19 in the NAA
Deuteronomy 19 in the NASB
Deuteronomy 19 in the NBLA
Deuteronomy 19 in the NBS
Deuteronomy 19 in the NBVTP
Deuteronomy 19 in the NET2
Deuteronomy 19 in the NIV11
Deuteronomy 19 in the NNT
Deuteronomy 19 in the NNT2
Deuteronomy 19 in the NNT3
Deuteronomy 19 in the PDDPT
Deuteronomy 19 in the PFNT
Deuteronomy 19 in the RMNT
Deuteronomy 19 in the SBIAS
Deuteronomy 19 in the SBIBS
Deuteronomy 19 in the SBIBS2
Deuteronomy 19 in the SBICS
Deuteronomy 19 in the SBIDS
Deuteronomy 19 in the SBIGS
Deuteronomy 19 in the SBIHS
Deuteronomy 19 in the SBIIS
Deuteronomy 19 in the SBIIS2
Deuteronomy 19 in the SBIIS3
Deuteronomy 19 in the SBIKS
Deuteronomy 19 in the SBIKS2
Deuteronomy 19 in the SBIMS
Deuteronomy 19 in the SBIOS
Deuteronomy 19 in the SBIPS
Deuteronomy 19 in the SBISS
Deuteronomy 19 in the SBITS
Deuteronomy 19 in the SBITS2
Deuteronomy 19 in the SBITS3
Deuteronomy 19 in the SBITS4
Deuteronomy 19 in the SBIUS
Deuteronomy 19 in the SBIVS
Deuteronomy 19 in the SBT
Deuteronomy 19 in the SBT1E
Deuteronomy 19 in the SCHL
Deuteronomy 19 in the SNT
Deuteronomy 19 in the SUSU
Deuteronomy 19 in the SUSU2
Deuteronomy 19 in the SYNO
Deuteronomy 19 in the TBIAOTANT
Deuteronomy 19 in the TBT1E
Deuteronomy 19 in the TBT1E2
Deuteronomy 19 in the TFTIP
Deuteronomy 19 in the TFTU
Deuteronomy 19 in the TGNTATF3T
Deuteronomy 19 in the THAI
Deuteronomy 19 in the TNFD
Deuteronomy 19 in the TNT
Deuteronomy 19 in the TNTIK
Deuteronomy 19 in the TNTIL
Deuteronomy 19 in the TNTIN
Deuteronomy 19 in the TNTIP
Deuteronomy 19 in the TNTIZ
Deuteronomy 19 in the TOMA
Deuteronomy 19 in the TTENT
Deuteronomy 19 in the UBG
Deuteronomy 19 in the UGV
Deuteronomy 19 in the UGV2
Deuteronomy 19 in the UGV3
Deuteronomy 19 in the VBL
Deuteronomy 19 in the VDCC
Deuteronomy 19 in the YALU
Deuteronomy 19 in the YAPE
Deuteronomy 19 in the YBVTP
Deuteronomy 19 in the ZBP