Deuteronomy 26 (BOICB)
1 Mgbe ị ga-aba nʼala ahụ ONYENWE ANYỊ Chineke gị na-enye gị dịka ihe nketa, mgbe ị nwetara ya, birikwa nʼime ya, 2 ị ga-ewere ụfọdụ nʼime mkpụrụ niile si nʼala ahụ ONYENWE ANYỊ Chineke gị na-enye gị, tinye ya nʼime nkata, were ya gaa nʼebe ahụ ONYENWE ANYỊ Chineke unu ga-ahọpụta, dịka ebe a kpọkwasịrị aha ya. 3 Ị ga-agwakwa onye nchụaja nọ nʼọrụ nʼoge ahụ okwu sị: “Ana m ekwupụta taa nye ONYENWE ANYỊ Chineke gị na abịala m nʼala ahụ ONYENWE ANYỊ ṅụụrụ nna nna anyị ha nʼiyi inye anyị.” 4 Onye nchụaja ahụ ga-anara nkata ahụ, dọba ya nʼihu ebe ịchụ aja ONYENWE ANYỊ Chineke gị. 5 Mgbe ahụ, ị ga-ekwupụta nʼihu ONYENWE ANYỊ Chineke gị sị, “Nna nna m bụ onye Aram na-awagharị awagharị, onye jere Ijipt izere ndụ. Ha dị ole na ole mgbe ha gara Ijipt, ma nʼIjipt ha ghọrọ mba dị ukwuu, ndị dị ike, na ndị bara ụba nʼọnụọgụgụ. 6 Ma ndị Ijipt mejọrọ anyị, mee ka anyị taa ahụhụ nʼihi ọrụ dị ike nke ha bokwasịrị anyị. 7 Mgbe ahụ, anyị tikuru ONYENWE ANYỊ Chineke nna nna anyị. ONYENWE ANYỊ nụrụ olu anyị, hụkwa mmegbu a na-emegbu anyị, na ndọgbu anyị na-adọgbu onwe anyị nʼọrụ, na ọnọdụ ọjọọ anyị. 8 ONYENWE ANYỊ ji aka dị ike na ogwe aka o setịrị eseti, nʼọtụtụ ihe oke egwu na ọrụ ịrịbama, na ihe ebube, si nʼIjipt kpọpụta anyị. 9 Ọ kpọbatara anyị nʼebe a, nye anyị ala a, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya. 10 Ya mere, ugbu a, ONYENWE ANYỊ, lee, ewebatala m mkpụrụ mbụ sitere nʼala i nyere m.” Dọba nkata ahụ nʼihu ONYENWE ANYỊ Chineke gị, kpọọkwa isiala nye ya nʼebe ahụ. 11 Mgbe ahụ, gị na ndị Livayị, na ndị mbịarambịa bi nʼetiti unu, ga-aṅụrị ọṅụ nʼihe ọma niile ONYENWE ANYỊ Chineke gị nyere gị na ezinaụlọ gị. 12 Nʼafọ nke atọ ọbụla, ị ga-enye onyinye pụrụ iche, onyinye otu ụzọ nʼụzọ iri, nke ihe ubi gị. Nʼafọ ahụ, ị ga-enye ndị Livayị, na ndị ọbịa, na ụmụ mgbei, na ndị inyom di ha nwụrụ, onyinye otu ụzọ nʼụzọ iri gị, ka ha rie ya nʼobodo gị dị iche iche, ka afọ jukwa ha. 13 Ị ga-ekwupụta nʼihu ONYENWE ANYỊ Chineke gị sị, “Esitela m nʼụlọ wepụ oke ahụ dị nsọ, nye ha ndị Livayị, na ndị ọbịa, na ụmụ mgbei, na ndị inyom di ha nwụrụ, dịka i nyere m nʼiwu, enupughị m isi maọbụ chefuo iwu gị ọbụla. 14 Erighị m ihe ọbụla si nʼime ya mgbe m na-eru ụjụ maọbụ wepụ ihe ọbụla nʼime ya nʼọnọdụ adịghị ọcha m, ọ dịkwaghị nke m ji chụọrọ ndị nwụrụ anwụ aja. Egeela m ntị nʼolu ONYENWE ANYỊ Chineke m, meekwa ihe niile i nyere m nʼiwu. 15 Site nʼebe obibi nsọ gị dị nʼeluigwe ledata anya gị, gọzie ndị gị Izrel na ala a i nyere anyị, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya, dịka i kwere nna nna anyị ha na nkwa.” 16 ONYENWE ANYỊ Chineke gị na-enye gị iwu taa si gị gbaso ụkpụrụ ndị a na iwu ndị a. Lezie anya hụ na i ji obi gị niile na mkpụrụobi gị niile debe ha. 17 I kwupụtala taa na ONYENWE ANYỊ bụ Chineke gị, i kweekwala nkwa na ị ga-ege ya ntị, debe iwu ya niile, na ụkpụrụ ya niile, na ị ga-emekwa ihe niile ọ sị gị mee. 18 Taa kwa, ONYENWE ANYỊ ekwupụtala na unu bụ ndị nke aka ya, dịka o kwere na nkwa, na ị ga-edebekwa ihe niile o nyere nʼiwu. 19 O kwuru na ọ ga-emekwa ka i karịa mba niile o kere elu, nʼotuto, nʼaha, nsọpụrụ na ịja mma. Na unu ga-abụkwa mba dị nsọ nye ONYENWE ANYỊ Chineke unu, dịka o kwere na nkwa.
In Other Versions
Deuteronomy 26 in the ANGEFD
Deuteronomy 26 in the ANTPNG2D
Deuteronomy 26 in the AS21
Deuteronomy 26 in the BAGH
Deuteronomy 26 in the BBPNG
Deuteronomy 26 in the BBT1E
Deuteronomy 26 in the BDS
Deuteronomy 26 in the BEV
Deuteronomy 26 in the BHAD
Deuteronomy 26 in the BIB
Deuteronomy 26 in the BLPT
Deuteronomy 26 in the BNT
Deuteronomy 26 in the BNTABOOT
Deuteronomy 26 in the BNTLV
Deuteronomy 26 in the BOATCB
Deuteronomy 26 in the BOATCB2
Deuteronomy 26 in the BOBCV
Deuteronomy 26 in the BOCNT
Deuteronomy 26 in the BOECS
Deuteronomy 26 in the BOGWICC
Deuteronomy 26 in the BOHCB
Deuteronomy 26 in the BOHCV
Deuteronomy 26 in the BOHLNT
Deuteronomy 26 in the BOHNTLTAL
Deuteronomy 26 in the BOILNTAP
Deuteronomy 26 in the BOITCV
Deuteronomy 26 in the BOKCV
Deuteronomy 26 in the BOKCV2
Deuteronomy 26 in the BOKHWOG
Deuteronomy 26 in the BOKSSV
Deuteronomy 26 in the BOLCB
Deuteronomy 26 in the BOLCB2
Deuteronomy 26 in the BOMCV
Deuteronomy 26 in the BONAV
Deuteronomy 26 in the BONCB
Deuteronomy 26 in the BONLT
Deuteronomy 26 in the BONUT2
Deuteronomy 26 in the BOPLNT
Deuteronomy 26 in the BOSCB
Deuteronomy 26 in the BOSNC
Deuteronomy 26 in the BOTLNT
Deuteronomy 26 in the BOVCB
Deuteronomy 26 in the BOYCB
Deuteronomy 26 in the BPBB
Deuteronomy 26 in the BPH
Deuteronomy 26 in the BSB
Deuteronomy 26 in the CCB
Deuteronomy 26 in the CUV
Deuteronomy 26 in the CUVS
Deuteronomy 26 in the DBT
Deuteronomy 26 in the DGDNT
Deuteronomy 26 in the DHNT
Deuteronomy 26 in the DNT
Deuteronomy 26 in the ELBE
Deuteronomy 26 in the EMTV
Deuteronomy 26 in the ESV
Deuteronomy 26 in the FBV
Deuteronomy 26 in the FEB
Deuteronomy 26 in the GGMNT
Deuteronomy 26 in the GNT
Deuteronomy 26 in the HARY
Deuteronomy 26 in the HNT
Deuteronomy 26 in the IRVA
Deuteronomy 26 in the IRVB
Deuteronomy 26 in the IRVG
Deuteronomy 26 in the IRVH
Deuteronomy 26 in the IRVK
Deuteronomy 26 in the IRVM
Deuteronomy 26 in the IRVM2
Deuteronomy 26 in the IRVO
Deuteronomy 26 in the IRVP
Deuteronomy 26 in the IRVT
Deuteronomy 26 in the IRVT2
Deuteronomy 26 in the IRVU
Deuteronomy 26 in the ISVN
Deuteronomy 26 in the JSNT
Deuteronomy 26 in the KAPI
Deuteronomy 26 in the KBT1ETNIK
Deuteronomy 26 in the KBV
Deuteronomy 26 in the KJV
Deuteronomy 26 in the KNFD
Deuteronomy 26 in the LBA
Deuteronomy 26 in the LBLA
Deuteronomy 26 in the LNT
Deuteronomy 26 in the LSV
Deuteronomy 26 in the MAAL
Deuteronomy 26 in the MBV
Deuteronomy 26 in the MBV2
Deuteronomy 26 in the MHNT
Deuteronomy 26 in the MKNFD
Deuteronomy 26 in the MNG
Deuteronomy 26 in the MNT
Deuteronomy 26 in the MNT2
Deuteronomy 26 in the MRS1T
Deuteronomy 26 in the NAA
Deuteronomy 26 in the NASB
Deuteronomy 26 in the NBLA
Deuteronomy 26 in the NBS
Deuteronomy 26 in the NBVTP
Deuteronomy 26 in the NET2
Deuteronomy 26 in the NIV11
Deuteronomy 26 in the NNT
Deuteronomy 26 in the NNT2
Deuteronomy 26 in the NNT3
Deuteronomy 26 in the PDDPT
Deuteronomy 26 in the PFNT
Deuteronomy 26 in the RMNT
Deuteronomy 26 in the SBIAS
Deuteronomy 26 in the SBIBS
Deuteronomy 26 in the SBIBS2
Deuteronomy 26 in the SBICS
Deuteronomy 26 in the SBIDS
Deuteronomy 26 in the SBIGS
Deuteronomy 26 in the SBIHS
Deuteronomy 26 in the SBIIS
Deuteronomy 26 in the SBIIS2
Deuteronomy 26 in the SBIIS3
Deuteronomy 26 in the SBIKS
Deuteronomy 26 in the SBIKS2
Deuteronomy 26 in the SBIMS
Deuteronomy 26 in the SBIOS
Deuteronomy 26 in the SBIPS
Deuteronomy 26 in the SBISS
Deuteronomy 26 in the SBITS
Deuteronomy 26 in the SBITS2
Deuteronomy 26 in the SBITS3
Deuteronomy 26 in the SBITS4
Deuteronomy 26 in the SBIUS
Deuteronomy 26 in the SBIVS
Deuteronomy 26 in the SBT
Deuteronomy 26 in the SBT1E
Deuteronomy 26 in the SCHL
Deuteronomy 26 in the SNT
Deuteronomy 26 in the SUSU
Deuteronomy 26 in the SUSU2
Deuteronomy 26 in the SYNO
Deuteronomy 26 in the TBIAOTANT
Deuteronomy 26 in the TBT1E
Deuteronomy 26 in the TBT1E2
Deuteronomy 26 in the TFTIP
Deuteronomy 26 in the TFTU
Deuteronomy 26 in the TGNTATF3T
Deuteronomy 26 in the THAI
Deuteronomy 26 in the TNFD
Deuteronomy 26 in the TNT
Deuteronomy 26 in the TNTIK
Deuteronomy 26 in the TNTIL
Deuteronomy 26 in the TNTIN
Deuteronomy 26 in the TNTIP
Deuteronomy 26 in the TNTIZ
Deuteronomy 26 in the TOMA
Deuteronomy 26 in the TTENT
Deuteronomy 26 in the UBG
Deuteronomy 26 in the UGV
Deuteronomy 26 in the UGV2
Deuteronomy 26 in the UGV3
Deuteronomy 26 in the VBL
Deuteronomy 26 in the VDCC
Deuteronomy 26 in the YALU
Deuteronomy 26 in the YAPE
Deuteronomy 26 in the YBVTP
Deuteronomy 26 in the ZBP