Esther 6 (BOICB)
1 Nʼabalị ahụ, ụra abịaghị eze nʼanya ma ọlị. Nʼihi ya, o metụrụ ya nʼobi ịgụ akwụkwọ ihe ncheta. Ya mere, o nyere iwu ka e wetara ya akwụkwọ a na-edekọta ihe niile e mere nʼoge ọchịchị ya. 2 Nʼime ya, ọ gụtara ihe e dere banyere Mọdekai, otu o si kpughee izuzu ọjọọ Bigtan na Teresh, ndị onozi eze na-eche nche nʼọnụ ụzọ ụlọeze, gbara igbu eze Sekses. 3 Mgbe ahụ eze jụrụ ajụjụ sị, “Gịnị bụ ihe ọma e meerela Mọdekai nʼihi ihe a o mere?”Ndị ozi ya zara, “O nwebeghị ihe ọbụla e meere ya!” 4 Eze sịrị, “Onye nọ nʼogige?” Ma Heman ka batachara na mbata ogige ụlọeze, ịgwa eze banyere mkwugbu Mọdekai nʼelu osisi nke o guzobere nʼihi ya. 5 Ndị na-ejere ya ozi zara, “Heman na-eguzo nʼogige.”Eze sịrị, “Kpọbata ya.” 6 Mgbe Heman batara, eze jụrụ ya ajụjụ sị, “Gịnị bụ ugwu m kwesiri inye onye mere ihe na-atọ m ụtọ?”Heman chere nʼime onwe ya sị, “Oleekwanụ onye ọzọ eze ga-achọ inye ugwu karịa mụ onwe m?” 7 Ya mere ọ zara eze, “Banyere nwoke ahụ ọ masịrị eze ịkwanyere ugwu, 8 nye iwu ka e wepụta uwe gị, nke gị bụ eze yitụrụla, na ịnyịnya gị, nke eze gbaarala, nke e kpukwasịrị oyiyi okpueze nʼisi ya. 9 Ka enye uwe ahụ na ịnyịnya ahụ nʼaka otu onye kachasị nwee ugwu nʼime ụmụ eze, ka ha yikwasị nwoke ahụ nke eze chọrọ ịsọpụrụ uwe ahụ, ka ịnyịnya buru ya dịka ha dọkpụ ya na-ejegharị nʼokporoụzọ niile nʼobodo, na-ekwusa nʼihu ya na-asị, ‘Otu a ka a na-emere nwoke ahụ ọ masịrị eze inye nsọpụrụ!’ ” 10 Mgbe ahụ eze nyere Heman iwu, sị; “Ahaa! Ntụpụta gị dị mma nke ukwuu! Mee ngwangwa, were uwe ndị a, na ịnyịnya m, meekwara Mọdekai onye Juu ahụ na-anọdụ nʼọnụ ụzọ ama ụlọeze ihe niile ndị a i kwuru. Hụkwa na i mechasịrị ihe ndị a niile i kwuru.” 11 Ya mere, Heman chịịrị uwe eze ahụ yikwasị ya Mọdekai nʼahụ. O mekwara ka ọ nọdụ nʼelu ịnyịnya eze. Emesịa, o duuru ya jegharịa nʼakụkụ obodo ahụ niile na-eti mkpu na-asị, “Otu a ka eze ga-esi sọpụrụ nwoke ahụ ihe ya dị ya mma.” 12 Emesịa, Mọdekai lọghachiri nʼọnụ ụzọ ama eze. Ma Heman mere ngwangwa laa nʼụlọ ya, kpuchiekwa isi ya nʼiru ụjụ, 13 ọ kọọrọ Zeresh nwunye ya, na ndị enyi ya niile ihe niile nke mere ya.Ndị ndụmọdụ ya na nwunye ya Zeresh sịrị ya, “Ebe ọ bụ na Mọdekai, onye ị bidoro ịda nʼihu ya, bụ onye Juu, ị gaghị enwe ike emegide ya, ị ghaghị ịla nʼiyi.” 14 Mgbe ha na ya nọ na-akparịta ụka, ndị onozi eze bịaruru duru Heman ngwangwa maka ịga nʼoriri ahụ Esta kwadoro.
In Other Versions
Esther 6 in the ANGEFD
Esther 6 in the ANTPNG2D
Esther 6 in the AS21
Esther 6 in the BAGH
Esther 6 in the BBPNG
Esther 6 in the BBT1E
Esther 6 in the BDS
Esther 6 in the BEV
Esther 6 in the BHAD
Esther 6 in the BIB
Esther 6 in the BLPT
Esther 6 in the BNT
Esther 6 in the BNTABOOT
Esther 6 in the BNTLV
Esther 6 in the BOATCB
Esther 6 in the BOATCB2
Esther 6 in the BOBCV
Esther 6 in the BOCNT
Esther 6 in the BOECS
Esther 6 in the BOGWICC
Esther 6 in the BOHCB
Esther 6 in the BOHCV
Esther 6 in the BOHLNT
Esther 6 in the BOHNTLTAL
Esther 6 in the BOILNTAP
Esther 6 in the BOITCV
Esther 6 in the BOKCV
Esther 6 in the BOKCV2
Esther 6 in the BOKHWOG
Esther 6 in the BOKSSV
Esther 6 in the BOLCB
Esther 6 in the BOLCB2
Esther 6 in the BOMCV
Esther 6 in the BONAV
Esther 6 in the BONCB
Esther 6 in the BONLT
Esther 6 in the BONUT2
Esther 6 in the BOPLNT
Esther 6 in the BOSCB
Esther 6 in the BOSNC
Esther 6 in the BOTLNT
Esther 6 in the BOVCB
Esther 6 in the BOYCB
Esther 6 in the BPBB
Esther 6 in the BPH
Esther 6 in the BSB
Esther 6 in the CCB
Esther 6 in the CUV
Esther 6 in the CUVS
Esther 6 in the DBT
Esther 6 in the DGDNT
Esther 6 in the DHNT
Esther 6 in the DNT
Esther 6 in the ELBE
Esther 6 in the EMTV
Esther 6 in the ESV
Esther 6 in the FBV
Esther 6 in the FEB
Esther 6 in the GGMNT
Esther 6 in the GNT
Esther 6 in the HARY
Esther 6 in the HNT
Esther 6 in the IRVA
Esther 6 in the IRVB
Esther 6 in the IRVG
Esther 6 in the IRVH
Esther 6 in the IRVK
Esther 6 in the IRVM
Esther 6 in the IRVM2
Esther 6 in the IRVO
Esther 6 in the IRVP
Esther 6 in the IRVT
Esther 6 in the IRVT2
Esther 6 in the IRVU
Esther 6 in the ISVN
Esther 6 in the JSNT
Esther 6 in the KAPI
Esther 6 in the KBT1ETNIK
Esther 6 in the KBV
Esther 6 in the KJV
Esther 6 in the KNFD
Esther 6 in the LBA
Esther 6 in the LBLA
Esther 6 in the LNT
Esther 6 in the LSV
Esther 6 in the MAAL
Esther 6 in the MBV
Esther 6 in the MBV2
Esther 6 in the MHNT
Esther 6 in the MKNFD
Esther 6 in the MNG
Esther 6 in the MNT
Esther 6 in the MNT2
Esther 6 in the MRS1T
Esther 6 in the NAA
Esther 6 in the NASB
Esther 6 in the NBLA
Esther 6 in the NBS
Esther 6 in the NBVTP
Esther 6 in the NET2
Esther 6 in the NIV11
Esther 6 in the NNT
Esther 6 in the NNT2
Esther 6 in the NNT3
Esther 6 in the PDDPT
Esther 6 in the PFNT
Esther 6 in the RMNT
Esther 6 in the SBIAS
Esther 6 in the SBIBS
Esther 6 in the SBIBS2
Esther 6 in the SBICS
Esther 6 in the SBIDS
Esther 6 in the SBIGS
Esther 6 in the SBIHS
Esther 6 in the SBIIS
Esther 6 in the SBIIS2
Esther 6 in the SBIIS3
Esther 6 in the SBIKS
Esther 6 in the SBIKS2
Esther 6 in the SBIMS
Esther 6 in the SBIOS
Esther 6 in the SBIPS
Esther 6 in the SBISS
Esther 6 in the SBITS
Esther 6 in the SBITS2
Esther 6 in the SBITS3
Esther 6 in the SBITS4
Esther 6 in the SBIUS
Esther 6 in the SBIVS
Esther 6 in the SBT
Esther 6 in the SBT1E
Esther 6 in the SCHL
Esther 6 in the SNT
Esther 6 in the SUSU
Esther 6 in the SUSU2
Esther 6 in the SYNO
Esther 6 in the TBIAOTANT
Esther 6 in the TBT1E
Esther 6 in the TBT1E2
Esther 6 in the TFTIP
Esther 6 in the TFTU
Esther 6 in the TGNTATF3T
Esther 6 in the THAI
Esther 6 in the TNFD
Esther 6 in the TNT
Esther 6 in the TNTIK
Esther 6 in the TNTIL
Esther 6 in the TNTIN
Esther 6 in the TNTIP
Esther 6 in the TNTIZ
Esther 6 in the TOMA
Esther 6 in the TTENT
Esther 6 in the UBG
Esther 6 in the UGV
Esther 6 in the UGV2
Esther 6 in the UGV3
Esther 6 in the VBL
Esther 6 in the VDCC
Esther 6 in the YALU
Esther 6 in the YAPE
Esther 6 in the YBVTP
Esther 6 in the ZBP