Exodus 1 (BOICB)
1 Ndị a bụ aha ụmụ ndị ikom Izrel, ndị sooro Jekọb gaa biri nʼala Ijipt, onye ọbụla nʼime ha kpọ ezinaụlọ ya. 2 Ruben, Simiọn, Livayị na Juda; 3 Isaka, Zebụlọn na Benjamin; 4 Dan, na Naftalị;Gad na Asha. 5 Ọnụọgụgụ ụmụ Jekọb ndị sooro ya gaa biri nʼIjipt dị iri mmadụ asaa. Ma Josef nọrịị nʼIjipt. 6 Emesịa, Josef na ụmụnne ya niile nwụrụ, ma ọgbọ ahụ niile nwụkwara. 7 Ma ihe gaara ụmụ ụmụ Izrel nke ọma, ha mụbara, dị ukwuu nʼọnụọgụgụ, jupụta ala ahụ niile. 8 Ma mgbe eze ọhụrụ nke na-amaghị Josef malitere ịchị ọchịchị nʼala Ijipt, 9 ọ sịrị ndị ya, “Lee, ndị Izrel abaala ụba nke ukwuu nʼọnụọgụgụ dịkwa ike karịa anyị. 10 Ngwanụ, ka anyị were amamihe meso ha mmeso ọjọọ, ma ọ bụghị otu a, ha ga-amụba karịa, mgbe agha ga-adapụta nʼetiti anyị na ndị iro anyị, ha ga-esoro ndị iro anyị lụso anyị agha, site nʼala a gbapụ.” 11 Nʼihi nke a, ha tinyere ndịisi ohu ga na eledo ha, bụ ndị ga-eji ọrụ mmanye kpagbuo ha. Ha wuuru Fero obodo Payitọm na Ramesis, ebe ọ na-echekwa ihe. 12 Ma dịka a na-ata ụmụ Izrel ahụhụ na-eleghị anya nʼazụ, otu a kwa ka ụmụ Izrel gara nʼihu na-amụba nʼọnụọgụgụ na-agbasakwa. Nke a mere ka ndị Ijipt tụọ ndị Izrel egwu. 13 Ha ji oke ọrụ mekpaa ụmụ Izrel ahụ nke ukwuu, 14 mee ka ndụ ụmụ Izrel bụrụ ndụ jupụtara nʼihe ilu. Ha nyere ha ọrụ ike nke ịkpụ brik na ụrọ, tinyere ọrụ dị iche iche nʼubi ha. Nʼime ọrụ niile ha na-arụ, ndị Ijipt mesiri ha ike nke ukwuu. 15 Mgbe ahụ kwa, eze Ijipt gwara ndị inyom Hibru na-aghọ nwa, ndị aha ha bụ Shifra na Pua sị, 16 “Mgbe ọbụla unu na-aghọ nwa ndị inyom Hibru, unu lezie anya nʼokwute e ji amụ nwa, ọ bụrụ nwoke, gbuonụ ya, ma ọ bụrụkwanụ nwanyị, hapụnụ ya ka ọ dịrị ndụ.” 17 Ma ndị inyom ndị a na-aghọ nwa emeghị ihe eze Ijipt gwara ha, nʼihi na ha tụrụ egwu Chineke. Kama ha hapụrụ ụmụ ndị ikom ndị a ndụ. 18 Emesịa, eze Ijipt kpọrọ ndị inyom abụọ ahụ jụọ ha sị, “Gịnị mere unu ji nupu isi nʼiwu m nyere unu site nʼịhapụ igbu ụmụntakịrị ndị ikom Hibru a mụrụ, dịka m gwara unu?” 19 Ndị inyom ahụ zara Fero sị, “Ndị inyom Hibru na-adị ike karịa ndị inyom Ijipt nʼịmụ nwa. Ha na-amụpụtacharị ụmụ ha tupu anyị erute.” 20 Ya mere, Chineke gọziri ndị inyom ndị ahụ na-aghọ nwa. Ụmụ Izrel gara nʼihu na-amụba, ghọọ mba dị ukwuu. 21 Chineke nʼonwe ya, nyekwara ndị inyom ahụ na-aghọ nwa ezinaụlọ nke aka ha nʼihi na ha tụrụ egwu Chineke. 22 Mgbe ahụ, Fero nyere ndị ya niile iwu a, “A ga-atụnye ụmụntakịrị ndị ikom Hibru niile a mụrụ ọhụrụ nʼime osimiri Naịl, ma a ga-edebe ụmụntakịrị ọhụrụ bụ ndị inyom ndụ.”
In Other Versions
Exodus 1 in the ANGEFD
Exodus 1 in the ANTPNG2D
Exodus 1 in the AS21
Exodus 1 in the BAGH
Exodus 1 in the BBPNG
Exodus 1 in the BBT1E
Exodus 1 in the BDS
Exodus 1 in the BEV
Exodus 1 in the BHAD
Exodus 1 in the BIB
Exodus 1 in the BLPT
Exodus 1 in the BNT
Exodus 1 in the BNTABOOT
Exodus 1 in the BNTLV
Exodus 1 in the BOATCB
Exodus 1 in the BOATCB2
Exodus 1 in the BOBCV
Exodus 1 in the BOCNT
Exodus 1 in the BOECS
Exodus 1 in the BOGWICC
Exodus 1 in the BOHCB
Exodus 1 in the BOHCV
Exodus 1 in the BOHLNT
Exodus 1 in the BOHNTLTAL
Exodus 1 in the BOILNTAP
Exodus 1 in the BOITCV
Exodus 1 in the BOKCV
Exodus 1 in the BOKCV2
Exodus 1 in the BOKHWOG
Exodus 1 in the BOKSSV
Exodus 1 in the BOLCB
Exodus 1 in the BOLCB2
Exodus 1 in the BOMCV
Exodus 1 in the BONAV
Exodus 1 in the BONCB
Exodus 1 in the BONLT
Exodus 1 in the BONUT2
Exodus 1 in the BOPLNT
Exodus 1 in the BOSCB
Exodus 1 in the BOSNC
Exodus 1 in the BOTLNT
Exodus 1 in the BOVCB
Exodus 1 in the BOYCB
Exodus 1 in the BPBB
Exodus 1 in the BPH
Exodus 1 in the BSB
Exodus 1 in the CCB
Exodus 1 in the CUV
Exodus 1 in the CUVS
Exodus 1 in the DBT
Exodus 1 in the DGDNT
Exodus 1 in the DHNT
Exodus 1 in the DNT
Exodus 1 in the ELBE
Exodus 1 in the EMTV
Exodus 1 in the ESV
Exodus 1 in the FBV
Exodus 1 in the FEB
Exodus 1 in the GGMNT
Exodus 1 in the GNT
Exodus 1 in the HARY
Exodus 1 in the HNT
Exodus 1 in the IRVA
Exodus 1 in the IRVB
Exodus 1 in the IRVG
Exodus 1 in the IRVH
Exodus 1 in the IRVK
Exodus 1 in the IRVM
Exodus 1 in the IRVM2
Exodus 1 in the IRVO
Exodus 1 in the IRVP
Exodus 1 in the IRVT
Exodus 1 in the IRVT2
Exodus 1 in the IRVU
Exodus 1 in the ISVN
Exodus 1 in the JSNT
Exodus 1 in the KAPI
Exodus 1 in the KBT1ETNIK
Exodus 1 in the KBV
Exodus 1 in the KJV
Exodus 1 in the KNFD
Exodus 1 in the LBA
Exodus 1 in the LBLA
Exodus 1 in the LNT
Exodus 1 in the LSV
Exodus 1 in the MAAL
Exodus 1 in the MBV
Exodus 1 in the MBV2
Exodus 1 in the MHNT
Exodus 1 in the MKNFD
Exodus 1 in the MNG
Exodus 1 in the MNT
Exodus 1 in the MNT2
Exodus 1 in the MRS1T
Exodus 1 in the NAA
Exodus 1 in the NASB
Exodus 1 in the NBLA
Exodus 1 in the NBS
Exodus 1 in the NBVTP
Exodus 1 in the NET2
Exodus 1 in the NIV11
Exodus 1 in the NNT
Exodus 1 in the NNT2
Exodus 1 in the NNT3
Exodus 1 in the PDDPT
Exodus 1 in the PFNT
Exodus 1 in the RMNT
Exodus 1 in the SBIAS
Exodus 1 in the SBIBS
Exodus 1 in the SBIBS2
Exodus 1 in the SBICS
Exodus 1 in the SBIDS
Exodus 1 in the SBIGS
Exodus 1 in the SBIHS
Exodus 1 in the SBIIS
Exodus 1 in the SBIIS2
Exodus 1 in the SBIIS3
Exodus 1 in the SBIKS
Exodus 1 in the SBIKS2
Exodus 1 in the SBIMS
Exodus 1 in the SBIOS
Exodus 1 in the SBIPS
Exodus 1 in the SBISS
Exodus 1 in the SBITS
Exodus 1 in the SBITS2
Exodus 1 in the SBITS3
Exodus 1 in the SBITS4
Exodus 1 in the SBIUS
Exodus 1 in the SBIVS
Exodus 1 in the SBT
Exodus 1 in the SBT1E
Exodus 1 in the SCHL
Exodus 1 in the SNT
Exodus 1 in the SUSU
Exodus 1 in the SUSU2
Exodus 1 in the SYNO
Exodus 1 in the TBIAOTANT
Exodus 1 in the TBT1E
Exodus 1 in the TBT1E2
Exodus 1 in the TFTIP
Exodus 1 in the TFTU
Exodus 1 in the TGNTATF3T
Exodus 1 in the THAI
Exodus 1 in the TNFD
Exodus 1 in the TNT
Exodus 1 in the TNTIK
Exodus 1 in the TNTIL
Exodus 1 in the TNTIN
Exodus 1 in the TNTIP
Exodus 1 in the TNTIZ
Exodus 1 in the TOMA
Exodus 1 in the TTENT
Exodus 1 in the UBG
Exodus 1 in the UGV
Exodus 1 in the UGV2
Exodus 1 in the UGV3
Exodus 1 in the VBL
Exodus 1 in the VDCC
Exodus 1 in the YALU
Exodus 1 in the YAPE
Exodus 1 in the YBVTP
Exodus 1 in the ZBP