Exodus 13 (BOICB)

1 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu sị, 2 “Dooro m nsọ onye ọbụla bụ ọkpara, onye ọbụla e bụ ụzọ mụọ nʼetiti ụmụ Izrel, na nʼetiti mmadụ ma nʼetiti anụ ụlọ, nke m ka ọ bụ.” 3 Mosis gwara ndị Izrel sị, “Chetanụ ụbọchị taa, ụbọchị unu si nʼala Ijipt pụta, ala ebe unu bụ ndị ohu, nʼihi na ONYENWE ANYỊ sitere nʼike aka ya dị ukwu kpọpụta unu site nʼebe ahụ. Unu erikwala achịcha ọbụla e ji ihe na-eko achịcha mee. 4 Taa, nʼọnwa Abib, bụ ụbọchị unu na-ahapụ ala Ijipt. 5 Mgbe ONYENWE ANYỊ dubatara unu nʼala ndị Kenan, ndị Het, ndị Amọrait, ndị Hiv na ndị Jebus bi nʼime ya, bụ ala ahụ ọ ṅụrụ nʼiyi nye nna nna unu ha na ọ ga-enye unu, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya, unu ga-eme ofufe mmemme a nʼọnwa a. 6 Unu ga-eri achịcha na-ekoghị eko ụbọchị asaa ahụ. Nʼụbọchị nke ikpeazụ nʼime ụbọchị asaa ahụ, unu ga-eme mmemme oke oriri nʼihu ONYENWE ANYỊ. 7 Rienụ achịcha na-ekoghị eko nʼime ụbọchị asaa ndị ahụ. Achịcha e ji ihe na-eko achịcha mee agaghị adị nʼụlọ unu. Achịcha e ji ihe na-eko achịcha mee agaghị adị nʼoke ala unu niile. 8 Nʼoge ọbụla ị na-eme mmemme a, kọwaara nwa gị nwoke ihe kpatara i ji eme mmemme a, si ya, ‘Ana m eme mmemme a maka icheta ihe ONYENWE ANYỊ meere m, mgbe m si nʼIjipt pụta.’ 9 Imezu mmemme a ga-adịrị unu dịka ihe ịrịbama nʼala unu, dịrịkwa ka ihe ngosi nʼegedege ihu unu, ichetara unu na ONYENWE ANYỊ ji aka ike ya dupụta anyị site nʼala Ijipt. 10 Unu ga na-eme mmemme a nʼoge a kara aka nʼafọ ọbụla. 11 “Mgbe ONYENWE ANYỊ dubatara unu nʼala ndị Kenan, nyefee unu ala ahụ dịka ọ ṅụrụ nʼiyi nye nna nna unu ha, 12 unu ga-enyefe ONYENWE ANYỊ ụmụ ndị ikom unu niile e bụ ụzọ mụọ. Ọzọ, ụmụ oke anụ ụlọ niile e bụ ụzọ mụọ bụ nke ONYENWE ANYỊ. 13 Jiri nwa atụrụ gbapụta nwa ịnyịnya ibu mbụ e bụ ụzọ mụọ. Ọ bụrụ na unu achọghị ịgbara nwa ịnyịnya ibu ahụ, unu aghaghị ịgbaji ya olu. Ma unu aghaghị ịgbara ụmụ ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ. 14 “Nʼoge dị nʼihu, mgbe nwa gị nwoke ga-ajụ gị sị, ‘Gịnị ka ihe ndị a pụtara?’ Ị ga-azaghachi ya sị, ‘ONYENWE ANYỊ jiri aka ike dị ukwu dupụta anyị site nʼIjipt, site nʼala nke ohu. 15 Mgbe Fero mesiri obi ya ike, jụ ka anyị si nʼala ya pụọ, ONYENWE ANYỊ gburu ụmụ ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ nʼala Ijipt, ma mmadụ ma anụ ụlọ. Nʼihi ya, ana m eji ụmụ oke anụ ụlọ niile e bụ ụzọ mụọ achụ aja nye ONYENWE ANYỊ. Ma ụmụ m ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ ka m na-agbapụta.’ 16 Mmemme a ga-adị ka ihe ịrịbama nʼanya unu, dịrịkwa ka ihe ngosi nʼegedege ihu unu, ichetara unu na ONYENWE ANYỊ ji aka ike ya dupụta anyị site nʼala Ijipt.” 17 Mgbe Fero mesịrị kwere ka ụmụ Izrel laa, Chineke edughị ha site nʼụzọ ahụ gafere ala ndị Filistia. Ọ bụ ezie na ụzọ ahụ dị nso karịa. Chineke mere nke a nʼihi na o chere nʼobi ya sị, “Ọ bụrụ na ndị a ezute agha, ha nwere ike ịgbanwe obi ha tụgharịa ịlaghachi azụ nʼIjipt.” 18 Ya mere, Chineke duuru ha ga nʼụzọ Osimiri Uhie, nke gara nʼụzọ nke ọzara. Ụmụ Izrel kwadokwara akwado ibu agha mgbe ha si nʼala Ijipt pụọ. 19 Mosis buuru ọkpụkpụ Josef mgbe ha na-ala. Nʼihi na o mere ka ụmụ Izrel ṅụọ iyi na ha ga-eme otu a, na-asị, “Chineke ga-eleta unu nʼezie, mgbe ahụ, unu aghaghị iburu ọkpụkpụ m si nʼebe a pụọ.” 20 Ha si Sukọt bilie ije, maa ụlọ ikwu ha na Etam, na nsọtụ ọzara. 21 ONYENWE ANYỊ ji ogidi igwe ojii na-eje nʼihu ha nʼehihie, idu ha nʼụzọ ha niile. Nʼabalị, o ji ogidi ọkụ, inye ha ìhè ka ha nwee ike ịga njem nʼehihie nakwa nʼabalị. 22 Ma ogidi igwe ojii nʼehihie na ogidi ọkụ ahụ nʼabalị, ọ dịghị nke hapụrụ ọnọdụ ya nʼihu ha.

In Other Versions

Exodus 13 in the ANGEFD

Exodus 13 in the ANTPNG2D

Exodus 13 in the AS21

Exodus 13 in the BAGH

Exodus 13 in the BBPNG

Exodus 13 in the BBT1E

Exodus 13 in the BDS

Exodus 13 in the BEV

Exodus 13 in the BHAD

Exodus 13 in the BIB

Exodus 13 in the BLPT

Exodus 13 in the BNT

Exodus 13 in the BNTABOOT

Exodus 13 in the BNTLV

Exodus 13 in the BOATCB

Exodus 13 in the BOATCB2

Exodus 13 in the BOBCV

Exodus 13 in the BOCNT

Exodus 13 in the BOECS

Exodus 13 in the BOGWICC

Exodus 13 in the BOHCB

Exodus 13 in the BOHCV

Exodus 13 in the BOHLNT

Exodus 13 in the BOHNTLTAL

Exodus 13 in the BOILNTAP

Exodus 13 in the BOITCV

Exodus 13 in the BOKCV

Exodus 13 in the BOKCV2

Exodus 13 in the BOKHWOG

Exodus 13 in the BOKSSV

Exodus 13 in the BOLCB

Exodus 13 in the BOLCB2

Exodus 13 in the BOMCV

Exodus 13 in the BONAV

Exodus 13 in the BONCB

Exodus 13 in the BONLT

Exodus 13 in the BONUT2

Exodus 13 in the BOPLNT

Exodus 13 in the BOSCB

Exodus 13 in the BOSNC

Exodus 13 in the BOTLNT

Exodus 13 in the BOVCB

Exodus 13 in the BOYCB

Exodus 13 in the BPBB

Exodus 13 in the BPH

Exodus 13 in the BSB

Exodus 13 in the CCB

Exodus 13 in the CUV

Exodus 13 in the CUVS

Exodus 13 in the DBT

Exodus 13 in the DGDNT

Exodus 13 in the DHNT

Exodus 13 in the DNT

Exodus 13 in the ELBE

Exodus 13 in the EMTV

Exodus 13 in the ESV

Exodus 13 in the FBV

Exodus 13 in the FEB

Exodus 13 in the GGMNT

Exodus 13 in the GNT

Exodus 13 in the HARY

Exodus 13 in the HNT

Exodus 13 in the IRVA

Exodus 13 in the IRVB

Exodus 13 in the IRVG

Exodus 13 in the IRVH

Exodus 13 in the IRVK

Exodus 13 in the IRVM

Exodus 13 in the IRVM2

Exodus 13 in the IRVO

Exodus 13 in the IRVP

Exodus 13 in the IRVT

Exodus 13 in the IRVT2

Exodus 13 in the IRVU

Exodus 13 in the ISVN

Exodus 13 in the JSNT

Exodus 13 in the KAPI

Exodus 13 in the KBT1ETNIK

Exodus 13 in the KBV

Exodus 13 in the KJV

Exodus 13 in the KNFD

Exodus 13 in the LBA

Exodus 13 in the LBLA

Exodus 13 in the LNT

Exodus 13 in the LSV

Exodus 13 in the MAAL

Exodus 13 in the MBV

Exodus 13 in the MBV2

Exodus 13 in the MHNT

Exodus 13 in the MKNFD

Exodus 13 in the MNG

Exodus 13 in the MNT

Exodus 13 in the MNT2

Exodus 13 in the MRS1T

Exodus 13 in the NAA

Exodus 13 in the NASB

Exodus 13 in the NBLA

Exodus 13 in the NBS

Exodus 13 in the NBVTP

Exodus 13 in the NET2

Exodus 13 in the NIV11

Exodus 13 in the NNT

Exodus 13 in the NNT2

Exodus 13 in the NNT3

Exodus 13 in the PDDPT

Exodus 13 in the PFNT

Exodus 13 in the RMNT

Exodus 13 in the SBIAS

Exodus 13 in the SBIBS

Exodus 13 in the SBIBS2

Exodus 13 in the SBICS

Exodus 13 in the SBIDS

Exodus 13 in the SBIGS

Exodus 13 in the SBIHS

Exodus 13 in the SBIIS

Exodus 13 in the SBIIS2

Exodus 13 in the SBIIS3

Exodus 13 in the SBIKS

Exodus 13 in the SBIKS2

Exodus 13 in the SBIMS

Exodus 13 in the SBIOS

Exodus 13 in the SBIPS

Exodus 13 in the SBISS

Exodus 13 in the SBITS

Exodus 13 in the SBITS2

Exodus 13 in the SBITS3

Exodus 13 in the SBITS4

Exodus 13 in the SBIUS

Exodus 13 in the SBIVS

Exodus 13 in the SBT

Exodus 13 in the SBT1E

Exodus 13 in the SCHL

Exodus 13 in the SNT

Exodus 13 in the SUSU

Exodus 13 in the SUSU2

Exodus 13 in the SYNO

Exodus 13 in the TBIAOTANT

Exodus 13 in the TBT1E

Exodus 13 in the TBT1E2

Exodus 13 in the TFTIP

Exodus 13 in the TFTU

Exodus 13 in the TGNTATF3T

Exodus 13 in the THAI

Exodus 13 in the TNFD

Exodus 13 in the TNT

Exodus 13 in the TNTIK

Exodus 13 in the TNTIL

Exodus 13 in the TNTIN

Exodus 13 in the TNTIP

Exodus 13 in the TNTIZ

Exodus 13 in the TOMA

Exodus 13 in the TTENT

Exodus 13 in the UBG

Exodus 13 in the UGV

Exodus 13 in the UGV2

Exodus 13 in the UGV3

Exodus 13 in the VBL

Exodus 13 in the VDCC

Exodus 13 in the YALU

Exodus 13 in the YAPE

Exodus 13 in the YBVTP

Exodus 13 in the ZBP