Exodus 25 (BOICB)

1 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis sị, 2 “Gwa ụmụ Izrel ka ha wetara m onyinye. Ị ga-anabatara m onyinye ahụ site nʼaka nwoke ọbụla onye o metụrụ nʼobi inye onyinye a. 3 “Ndị a bụ Onyinye ị ga-anata nʼaka ha: “ọlaọcha, ọlaedo na bronz. 4 Ogho na-acha anụnụ anụnụ, nke odo odo, nke uhie uhie, nke ezi akwa ọcha,na nke ajị ewu; 5 akpụkpọ anụ ebule e sijiri uhie uhie, akpụkpọ ehi mmiri,na osisi akashia; 6 mmanụ oliv nke a ga-etinye nʼiheọkụ,ụda isi ụtọ a na-etinye na mmanụ nsọ, na ụda na-eme ka aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ; 7 nkume ọma ọniks, na nkume ndị ọzọ a na-ahịọnye nʼefọọd, na nke a na-ahịọnyekwa nʼihe mgbochi obi. 8 “Mee ka ha wuoro m ebe nsọ. Mụ onwe m ga-ebikwa nʼetiti ha. 9 Wuo ụlọ nzute a na ihe ịchọ ya mma niile, ka ọ bụrụ otu ihe dịka oyiyi m ga-egosi gị. 10 “Ha ga-eji osisi akashia wuo igbe ọgbụgba ndụ nke ịdị ogologo ya ga-abụ otu mita na sentimita iri. Obosara ya bụ sentimita iri isii na asatọ. Ịla elu ya ga-abụkwa sentimita iri isii na asatọ. 11 Machie ọlaedo a nụchara anụcha nʼime na azụ ya niile, jiri ọlaedo kpụọ ihe gburugburu akụkụ ya niile. 12 Kpụọ mgbaaka ọlaedo anọ maka ya, kwụnye ha nʼụkwụ anọ ya, ya bụ mgbaaka abụọ nʼotu akụkụ, mgbaaka abụọ nʼakụkụ nke ọzọ ya 13 Jirikwa osisi akashia mee mkpara ogologo. Emesịa, were ọlaedo machie mkpara ndị a. 14 Ị ga-etinye mkpara ndị ahụ nʼime mgbaaka ahụ dị nʼakụkụ igbe ahụ, ka ọ bụrụ ihe iji na-ebu ya. 15 Nʼihi nke a, mkpara ọlaedo ndị ahụ ga-adịgide nʼime mgbaaka ọlaedo igbe a oge niile. 16 Ya mere, mgbe a rụsịrị igbe ọgbụgba ndụ ahụ, tinye Ihe Ama ahụ m nyere gị nʼime ya. 17 “Ị ga-ejikwa ọlaedo a nụchara anụcha mee ihe mkpuchi igbe ọgbụgba ndụ ahụ. Ogologo ya ga-adị nzọ ụkwụ anọ. Obosara ya ga-abụ nzọ ụkwụ abụọ na ọkara. 18 Ị ga-eji ọlaedo a nụchara anụcha, nke e tipịara etipịa kpụọ cherubim abụọ na nsọtụ abụọ nke ebe mkpuchi ahụ. 19 Rụọ otu cherub nʼotu nsọtụ, otu cherub na nsọtụ nke ọzọ; mee ka cherubim ndị a na okwuchi igbe ahụ bụrụ otu na nsọtụ abụọ ahụ. 20 Cherubim ndị a ga-agbasa nku ha laa elu, were ha na-ekpuchi okwuchi ahụ. Cherubim ndị ahụ ga-eche onwe ha ihu, na-ele anya nʼebe okwuchi ahụ dị. 21 Tụkwasị ihe mkpuchi ahụ nʼelu igbe ọgbụgba ndụ ahụ. Tinyekwa Ihe Ama ahụ m nyere gị nʼime igbe ahụ. 22 Nʼebe ahụ, nʼetiti cherubim abụọ ndị ahụ dị nʼelu ihe mkpuchi igbe ọgbụgba ndụ, ka m ga-ezute gị, nye gị iwu niile ị ga-enye ndị Izrel. 23 “Jiri osisi akashia mee tebul nke ogologo ya ga-adị iri sentimita itoolu. Obosara ya ga-abụ iri sentimita anọ na ise. Ịla elu ya ga-abụ iri sentimita isii na asaa. 24 Ị ga-eji ọlaedo a nụchara anụcha machie ya nke ọma, jirikwa ọlaedo kpụọ ọnụ ọnụ ya gburugburu. 25 Ị ga-etinye ihe njikọta a kpụrụ akpụ gburugburu ọnụ ọnụ ya, nke ga-aha ka otu ọbụ aka dimkpa. A ga-eji mpempe ọlaedo techie ihe njikọta ahụ gburugburu. 26 Kpụọ mgbaaka ọlaedo anọ maka tebul ahụ, kwụnye ha nʼakụkụ anọ ahụ nke ụkwụ anọ ya. 27 Mgbaaka ndị ahụ ga-adị nso nso, ihe njikọ ahụ ka ha jide mkpara ndị ahụ, i ji ebu tebul ahụ. 28 Jiri osisi akashia mee mkpara a ga-eji na-ebu tebul ahụ. Jiri ọlaedo techie ha. 29 Ọzọkwa, jiri ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ efere dị iche iche, na iko dị iche iche, na ọkwa dị iche iche, nke e ji awụpụ onyinye. 30 Dọkwasị achịcha nke iche nʼIhu nʼelu tebul ahụ, nʼihu m, oge niile. 31 “Jiri ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ ihe ịdọkwasị oriọna. Kpụọ ụkwụ ala ala ya, na alaka ya, mee ka iko ya niile yiri okoko osisi, na isi ya niile, na ifuru ya niile bụrụ otu ya na ahụ ya. 32 Alaka isii ga-esite nʼakụkụ abụọ nke ihe ịdọkwasị oriọna ahụ wapụta, alaka atọ nʼotu akụkụ ya, alaka atọ nʼakụkụ nke ọzọ. 33 Iko atọ e mere dịka okoko osisi alụmọnd ya na ifuru, ya na okoko ya niile ga-adị nʼotu alaka, iko atọ nʼalaka nke ọzọ, otu a ka ọ ga-adị nʼalaka isii niile ahụ na-awapụta site nʼihe ịdọkwasị oriọna ahụ. 34 Nʼelu ihe ịdọba oriọna ahụ, ọ ga-adị iko anọ dịka ifuru osisi alụmọnd, ya na ebe o si awapụta na okoko ya. 35 Otu isi ga-adịkwa nʼokpuru alaka abụọ si nʼetiti ihe ịdọba oriọna ahụ pụta. Isi nke abụọ ga-adị nʼokpuru alaka abụọ nke ọzọ. Isi nke atọ ga-adị nʼokpuru alaka nke atọ, ya bụ ha niile alaka isii. 36 Isi nwapụta ya na alaka ya niile ga-adịkọtakwa ọnụ, ha na ihe ịdọkwasị oriọna ahụ, nke e ji ọlaedo a nụchara anụcha rụọ. 37 “Ị ga-eme oriọna asaa, dọba ha nʼelu ihe ịdọkwasị iheọkụ ahụ, ka ha na-enye ìhè naanị nʼebe ihu ya. 38 Mkpa ya na ihe ịkpakepụ ọkụ ya niile, ga-abụ ọlaedo a nụchara anụcha. 39 Ọlaedo a nụchara anụcha nke dị iri kilogram atọ na anọ ka a ga-eji kpụọ ihe ịdọkwasị oriọna ahụ na ngwongwo ndị a niile. 40 Lezie anya hụ na i mere ihe ndị a niile nʼusoro ihe atụ nke e gosiri gị nʼelu ugwu.

In Other Versions

Exodus 25 in the ANGEFD

Exodus 25 in the ANTPNG2D

Exodus 25 in the AS21

Exodus 25 in the BAGH

Exodus 25 in the BBPNG

Exodus 25 in the BBT1E

Exodus 25 in the BDS

Exodus 25 in the BEV

Exodus 25 in the BHAD

Exodus 25 in the BIB

Exodus 25 in the BLPT

Exodus 25 in the BNT

Exodus 25 in the BNTABOOT

Exodus 25 in the BNTLV

Exodus 25 in the BOATCB

Exodus 25 in the BOATCB2

Exodus 25 in the BOBCV

Exodus 25 in the BOCNT

Exodus 25 in the BOECS

Exodus 25 in the BOGWICC

Exodus 25 in the BOHCB

Exodus 25 in the BOHCV

Exodus 25 in the BOHLNT

Exodus 25 in the BOHNTLTAL

Exodus 25 in the BOILNTAP

Exodus 25 in the BOITCV

Exodus 25 in the BOKCV

Exodus 25 in the BOKCV2

Exodus 25 in the BOKHWOG

Exodus 25 in the BOKSSV

Exodus 25 in the BOLCB

Exodus 25 in the BOLCB2

Exodus 25 in the BOMCV

Exodus 25 in the BONAV

Exodus 25 in the BONCB

Exodus 25 in the BONLT

Exodus 25 in the BONUT2

Exodus 25 in the BOPLNT

Exodus 25 in the BOSCB

Exodus 25 in the BOSNC

Exodus 25 in the BOTLNT

Exodus 25 in the BOVCB

Exodus 25 in the BOYCB

Exodus 25 in the BPBB

Exodus 25 in the BPH

Exodus 25 in the BSB

Exodus 25 in the CCB

Exodus 25 in the CUV

Exodus 25 in the CUVS

Exodus 25 in the DBT

Exodus 25 in the DGDNT

Exodus 25 in the DHNT

Exodus 25 in the DNT

Exodus 25 in the ELBE

Exodus 25 in the EMTV

Exodus 25 in the ESV

Exodus 25 in the FBV

Exodus 25 in the FEB

Exodus 25 in the GGMNT

Exodus 25 in the GNT

Exodus 25 in the HARY

Exodus 25 in the HNT

Exodus 25 in the IRVA

Exodus 25 in the IRVB

Exodus 25 in the IRVG

Exodus 25 in the IRVH

Exodus 25 in the IRVK

Exodus 25 in the IRVM

Exodus 25 in the IRVM2

Exodus 25 in the IRVO

Exodus 25 in the IRVP

Exodus 25 in the IRVT

Exodus 25 in the IRVT2

Exodus 25 in the IRVU

Exodus 25 in the ISVN

Exodus 25 in the JSNT

Exodus 25 in the KAPI

Exodus 25 in the KBT1ETNIK

Exodus 25 in the KBV

Exodus 25 in the KJV

Exodus 25 in the KNFD

Exodus 25 in the LBA

Exodus 25 in the LBLA

Exodus 25 in the LNT

Exodus 25 in the LSV

Exodus 25 in the MAAL

Exodus 25 in the MBV

Exodus 25 in the MBV2

Exodus 25 in the MHNT

Exodus 25 in the MKNFD

Exodus 25 in the MNG

Exodus 25 in the MNT

Exodus 25 in the MNT2

Exodus 25 in the MRS1T

Exodus 25 in the NAA

Exodus 25 in the NASB

Exodus 25 in the NBLA

Exodus 25 in the NBS

Exodus 25 in the NBVTP

Exodus 25 in the NET2

Exodus 25 in the NIV11

Exodus 25 in the NNT

Exodus 25 in the NNT2

Exodus 25 in the NNT3

Exodus 25 in the PDDPT

Exodus 25 in the PFNT

Exodus 25 in the RMNT

Exodus 25 in the SBIAS

Exodus 25 in the SBIBS

Exodus 25 in the SBIBS2

Exodus 25 in the SBICS

Exodus 25 in the SBIDS

Exodus 25 in the SBIGS

Exodus 25 in the SBIHS

Exodus 25 in the SBIIS

Exodus 25 in the SBIIS2

Exodus 25 in the SBIIS3

Exodus 25 in the SBIKS

Exodus 25 in the SBIKS2

Exodus 25 in the SBIMS

Exodus 25 in the SBIOS

Exodus 25 in the SBIPS

Exodus 25 in the SBISS

Exodus 25 in the SBITS

Exodus 25 in the SBITS2

Exodus 25 in the SBITS3

Exodus 25 in the SBITS4

Exodus 25 in the SBIUS

Exodus 25 in the SBIVS

Exodus 25 in the SBT

Exodus 25 in the SBT1E

Exodus 25 in the SCHL

Exodus 25 in the SNT

Exodus 25 in the SUSU

Exodus 25 in the SUSU2

Exodus 25 in the SYNO

Exodus 25 in the TBIAOTANT

Exodus 25 in the TBT1E

Exodus 25 in the TBT1E2

Exodus 25 in the TFTIP

Exodus 25 in the TFTU

Exodus 25 in the TGNTATF3T

Exodus 25 in the THAI

Exodus 25 in the TNFD

Exodus 25 in the TNT

Exodus 25 in the TNTIK

Exodus 25 in the TNTIL

Exodus 25 in the TNTIN

Exodus 25 in the TNTIP

Exodus 25 in the TNTIZ

Exodus 25 in the TOMA

Exodus 25 in the TTENT

Exodus 25 in the UBG

Exodus 25 in the UGV

Exodus 25 in the UGV2

Exodus 25 in the UGV3

Exodus 25 in the VBL

Exodus 25 in the VDCC

Exodus 25 in the YALU

Exodus 25 in the YAPE

Exodus 25 in the YBVTP

Exodus 25 in the ZBP