Exodus 40 (BOICB)

1 Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu sị ya, 2 “Guzobe ụlọ nzute ahụ nʼụbọchị mbụ nke ọnwa mbụ. 3 Dọnye igbe ọgbụgba ndụ nke Ihe Ama ahụ nʼime ya. Konyekwa akwa mgbochi nke ga-ezo ya. 4 Webata tebul ahụ, na ngwongwo dị nʼelu ya, webatakwa ihe ịdọba oriọna ahụ. Mụnyekwa oriọna ndị ahụ ọkụ. 5 Doo ebe ịchụ aja ọlaedo ahụ nke e mere maka ịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼihu igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ. Konyekwa akwa mgbochi nke kwesiri ịdị nʼọnụ ụzọ e si abata nʼime ụlọ nzute ahụ. 6 “Doo ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ ahụ nʼihu ọnụ ụzọ ịbata nʼụlọ nzute bụ ụlọ ikwu ahụ. 7 Dọnye efere ukwu ịsa mmiri ahụ nʼetiti ụlọ nzute na ebe ịchụ aja ahụ. Gbajukwaa ya mmiri. 8 Guzobe ogige gburugburu ụlọ nzute ahụ. Konyekwa akwa mgbochi nʼọnụ ụzọ ogige ahụ. 9 “Were mmanụ nsọ ahụ tee ụlọ nzute ahụ, ya na ihe niile dị nʼime ya, si otu a doo ha nsọ ma ngwongwo ịchọ mma ya niile. Ọ ga-abụ ebe dị nsọ. 10 Mgbe ahụ, tee ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ ahụ mmanụ ya na ihe ya niile e ji eje ozi. Doo ebe ịchụ aja ahụ nsọ, ọ ga-abụkwa ebe dịkarịsịrị nsọ. 11 Tekwaa efere ukwu ịsa mmiri ahụ na ụkwụ ya mmanụ. Doo ha nsọ. 12 “Kpọbata Erọn na ụmụ ya ndị ikom nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute. Jiri mmiri saa ha ahụ nʼebe ahụ. 13 Yikwasị Erọn uwe nsọ ya. Tekwaa ya mmanụ, ido ya nsọ maka i jere m ozi dịka onye nchụaja. 14 Mekwaa ka ụmụ ya ndị ikom bịaruo nso, yikwasịkwa ha uwe ime ahụ. 15 Tee ha mmanụ dịka i si tee nna ha, ime ka ha bụrụ ndị na-ejere m ozi dịka ndị nchụaja. Otite mmanụ ha ga-abụ nye ọrụ nchụaja ha nke ga-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.” 16 Mosis mezuru ihe niile dịka ONYENWE ANYỊ nyere ya nʼiwu ime. 17 O ruo, nʼụbọchị mbụ nke ọnwa mbụ, nʼafọ nke abụọ, e mere ka ụlọ nzute ahụ guzo ọtọ. 18 Mosis mere ka ụlọ nzute ahụ guzo ọtọ site nʼitinye mbudo ibo ya niile, ụkwụ ya na mkpọrọ osisi ya niile nʼọnọdụ ha. 19 Emesịa, ọ gbasapụrụ ihe mkpuchi nʼelu ụlọ nzute ahụ, tụkwasịkwa okpukpu ihe mkpuchi nke abụọ nʼelu ya dịka ONYENWE ANYỊ nyere ya iwu. 20 O tinyere Ihe Ama nʼime igbe ọgbụgba ndụ ahụ. Emesịa, ọ tụkwasịkwara mkpara e ji ebu igbe ahụ nʼakụkụ igbe ahụ, were okwuchi igbe ahụ, nke bụ Oche Ebere ahụ, kpuchie igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ. 21 Emesịa, o bubatara igbe ahụ nʼime ụlọ nzute ahụ, kwụnyekwa akwa mgbochi nke mgbochi, kewapụ igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ, dịka ONYENWE ANYỊ nyere ya nʼiwu. 22 Mosis dọnyere tebul ahụ nʼakụkụ ugwu nke ụlọ nzute ahụ, na mpụta nke akwa mgbochi ahụ. 23 Ọ dọkwasịrị achịcha ahụ a na-edo nʼihu ONYENWE ANYỊ nʼelu tebul ahụ, dịka ONYENWE ANYỊ nyere ya nʼiwu. 24 Ọ dọkwasịrị ihe ịdọba oriọna ahụ nʼime ụlọ nzute nʼakụkụ tebul ahụ, nʼakụkụ ndịda nke ụlọ nzute ahụ. 25 Ọ mụnyere oriọna ndị ahụ nʼihu ONYENWE ANYỊ dịka ONYENWE ANYỊ si nye nʼiwu. 26 Mosis debere ebe ịchụ aja ọlaedo ahụ nʼime ụlọ nzute nso nso ebe akwa mgbochi ahụ dị, 27 surekwaa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼelu ya, dịka ONYENWE ANYỊ nyere ya nʼiwu. 28 Ọ kwụbara akwa mgbochi nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ. 29 Debekwa ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ ahụ nso ọnụ ụzọ ịba ụlọ nzute ahụ. O surekwara aja nsure ọkụ nʼelu ya, na aja onyinye mkpụrụ ọka dịka ONYENWE ANYỊ si nye ya nʼiwu. 30 Ọ dọbara efere ịsa mmiri ahụ nʼetiti ụlọ nzute na ebe ịchụ aja, wụjuo ya mmiri, maka iji sachaa ihe. 31 Mosis, na Erọn, na ụmụ ya ndị ikom na-eji ya akwọcha aka ha, sakwaa ụkwụ ha. 32 Mgbe ọbụla ha na-abanye nʼụlọ nzute na mgbe ha na-abịa nso ebe ịchụ aja, ha na-asacha, dịka ONYENWE ANYỊ nyere ya Mosis nʼiwu. 33 Mosis guzobere ogige ahụ gburugburu ụlọ nzute ahụ na ebe ịchụ aja ahụ. O konyekwara akwa mgbochi nʼụzọ mbata nke ogige ụlọ nzute ahụ. Otu a, Mosis rụzuru ọrụ niile ahụ. 34 Mgbe ahụ, igwe ojii kpuchiri ụlọ nzute ahụ, ebube ONYENWE ANYỊ jupụtakwara nʼime ya. 35 Mosis nʼonwe ya enweghị ike ịbanye nʼime ụlọ nzute ahụ nʼihi igwe ojii kpuchiri elu ya na ebube ONYENWE ANYỊ jupụtara nʼụlọ nzute ahụ. 36 Nʼime njegharị ha niile, mgbe ọbụla igwe ojii ahụ si nʼelu ụlọ nzute ahụ bilie, mgbe ahụ ka ụmụ Izrel na-ebuli njem. 37 Ma ọ bụrụ na igwe ojii ahụ ebilighị, ụmụ Izrel adịghị ebulikwa njem tutuu ruo mgbe o biliri. 38 Igwe ojii ONYENWE ANYỊ ahụ na-anọgide nʼelu ụlọ nzute ahụ nʼehihie ma nʼabalị, ọkụ na-esi nʼime ya na-enwupụta. Ndị Izrel niile na-ahụkwa ya anya ụbọchị niile nke ha jegharịrị nʼọzara.

In Other Versions

Exodus 40 in the ANGEFD

Exodus 40 in the ANTPNG2D

Exodus 40 in the AS21

Exodus 40 in the BAGH

Exodus 40 in the BBPNG

Exodus 40 in the BBT1E

Exodus 40 in the BDS

Exodus 40 in the BEV

Exodus 40 in the BHAD

Exodus 40 in the BIB

Exodus 40 in the BLPT

Exodus 40 in the BNT

Exodus 40 in the BNTABOOT

Exodus 40 in the BNTLV

Exodus 40 in the BOATCB

Exodus 40 in the BOATCB2

Exodus 40 in the BOBCV

Exodus 40 in the BOCNT

Exodus 40 in the BOECS

Exodus 40 in the BOGWICC

Exodus 40 in the BOHCB

Exodus 40 in the BOHCV

Exodus 40 in the BOHLNT

Exodus 40 in the BOHNTLTAL

Exodus 40 in the BOILNTAP

Exodus 40 in the BOITCV

Exodus 40 in the BOKCV

Exodus 40 in the BOKCV2

Exodus 40 in the BOKHWOG

Exodus 40 in the BOKSSV

Exodus 40 in the BOLCB

Exodus 40 in the BOLCB2

Exodus 40 in the BOMCV

Exodus 40 in the BONAV

Exodus 40 in the BONCB

Exodus 40 in the BONLT

Exodus 40 in the BONUT2

Exodus 40 in the BOPLNT

Exodus 40 in the BOSCB

Exodus 40 in the BOSNC

Exodus 40 in the BOTLNT

Exodus 40 in the BOVCB

Exodus 40 in the BOYCB

Exodus 40 in the BPBB

Exodus 40 in the BPH

Exodus 40 in the BSB

Exodus 40 in the CCB

Exodus 40 in the CUV

Exodus 40 in the CUVS

Exodus 40 in the DBT

Exodus 40 in the DGDNT

Exodus 40 in the DHNT

Exodus 40 in the DNT

Exodus 40 in the ELBE

Exodus 40 in the EMTV

Exodus 40 in the ESV

Exodus 40 in the FBV

Exodus 40 in the FEB

Exodus 40 in the GGMNT

Exodus 40 in the GNT

Exodus 40 in the HARY

Exodus 40 in the HNT

Exodus 40 in the IRVA

Exodus 40 in the IRVB

Exodus 40 in the IRVG

Exodus 40 in the IRVH

Exodus 40 in the IRVK

Exodus 40 in the IRVM

Exodus 40 in the IRVM2

Exodus 40 in the IRVO

Exodus 40 in the IRVP

Exodus 40 in the IRVT

Exodus 40 in the IRVT2

Exodus 40 in the IRVU

Exodus 40 in the ISVN

Exodus 40 in the JSNT

Exodus 40 in the KAPI

Exodus 40 in the KBT1ETNIK

Exodus 40 in the KBV

Exodus 40 in the KJV

Exodus 40 in the KNFD

Exodus 40 in the LBA

Exodus 40 in the LBLA

Exodus 40 in the LNT

Exodus 40 in the LSV

Exodus 40 in the MAAL

Exodus 40 in the MBV

Exodus 40 in the MBV2

Exodus 40 in the MHNT

Exodus 40 in the MKNFD

Exodus 40 in the MNG

Exodus 40 in the MNT

Exodus 40 in the MNT2

Exodus 40 in the MRS1T

Exodus 40 in the NAA

Exodus 40 in the NASB

Exodus 40 in the NBLA

Exodus 40 in the NBS

Exodus 40 in the NBVTP

Exodus 40 in the NET2

Exodus 40 in the NIV11

Exodus 40 in the NNT

Exodus 40 in the NNT2

Exodus 40 in the NNT3

Exodus 40 in the PDDPT

Exodus 40 in the PFNT

Exodus 40 in the RMNT

Exodus 40 in the SBIAS

Exodus 40 in the SBIBS

Exodus 40 in the SBIBS2

Exodus 40 in the SBICS

Exodus 40 in the SBIDS

Exodus 40 in the SBIGS

Exodus 40 in the SBIHS

Exodus 40 in the SBIIS

Exodus 40 in the SBIIS2

Exodus 40 in the SBIIS3

Exodus 40 in the SBIKS

Exodus 40 in the SBIKS2

Exodus 40 in the SBIMS

Exodus 40 in the SBIOS

Exodus 40 in the SBIPS

Exodus 40 in the SBISS

Exodus 40 in the SBITS

Exodus 40 in the SBITS2

Exodus 40 in the SBITS3

Exodus 40 in the SBITS4

Exodus 40 in the SBIUS

Exodus 40 in the SBIVS

Exodus 40 in the SBT

Exodus 40 in the SBT1E

Exodus 40 in the SCHL

Exodus 40 in the SNT

Exodus 40 in the SUSU

Exodus 40 in the SUSU2

Exodus 40 in the SYNO

Exodus 40 in the TBIAOTANT

Exodus 40 in the TBT1E

Exodus 40 in the TBT1E2

Exodus 40 in the TFTIP

Exodus 40 in the TFTU

Exodus 40 in the TGNTATF3T

Exodus 40 in the THAI

Exodus 40 in the TNFD

Exodus 40 in the TNT

Exodus 40 in the TNTIK

Exodus 40 in the TNTIL

Exodus 40 in the TNTIN

Exodus 40 in the TNTIP

Exodus 40 in the TNTIZ

Exodus 40 in the TOMA

Exodus 40 in the TTENT

Exodus 40 in the UBG

Exodus 40 in the UGV

Exodus 40 in the UGV2

Exodus 40 in the UGV3

Exodus 40 in the VBL

Exodus 40 in the VDCC

Exodus 40 in the YALU

Exodus 40 in the YAPE

Exodus 40 in the YBVTP

Exodus 40 in the ZBP