Exodus 5 (BOICB)

1 Emesịa, Mosis na Erọn jekwuuru Fero guzo nʼihu ya gwa ya okwu sị, “Ihe a ka ONYENWE ANYỊ, Chineke Izrel kwuru, ‘Hapụ ndị m ka ha gaa meere m mmemme dị nsọ nʼime ọzara.’ ” 2 Fero zara sị, “Onye ka ONYENWE ANYỊ bụ m ga-eji gee ntị nʼolu ya ịhapụ ụmụ Izrel ka ha si nʼebe a pụọ? Amaghị m onye ọ bụ, agaghị m ekwekwa ka Izrel gaa ebe ọbụla.” 3 Ha zara sị, “Chineke ndị Hibru zutere anyị. Biko kwere ka anyị gaa njem ụbọchị atọ nʼime ọzara nọọ nʼebe ahụ chụọrọ ONYENWE ANYỊ Chineke anyị aja. Ọ bụrụ na anyị ajụ ige ntị nʼolu ya, ọ ga-eji ọrịa ọjọọ maọbụ mma agha kpochapụ anyị.” 4 Eze Ijipt zara ha sị, “Mosis na Erọn, gịnị mere unu ji na-ewepụ ụmụ Izrel aka site nʼọrụ ha? Laghachinụ nʼọrụ unu!” 5 Fero gara nʼihu sị, “Lee, ka ndị obodo a si dị ọtụtụ ugbu a, ihe unu na-eme bụ naanị igbochi ha ịrụ ọrụ ha.” 6 Nʼụbọchị ahụ kwa, Fero nyere ndị nlekọta ụmụ Izrel na ndị o mere ndịisi nʼebe ụmụ Izrel nọ iwu sị, 7 “Unu enyekwala ụmụ Izrel ahịhịa ha ga-eji kpụọ brik dịka unu na-eme nʼoge gara aga. Kama, ha ga-achọta ahịhịa ahụ nʼonwe ha. 8 Ọzọ, meenụ ka ọnụọgụgụ brik ha na-akpụ dịrị ka ọ dị na mbụ, unu emela ka ọ dịrị ala. Ha bụ ndị umengwụ. Ọ bụ ya mere ha ji na-eti mkpu, ‘Ka anyị gaa nʼọzara gaa chụọrọ Chineke anyị aja.’ 9 Nyenụ ha ọrụ dị ike, nke ga-ezi ha na ha ekwesighị ịṅa ntị nʼokwu ụgha Mosis na Erọn na-ekwuru ha.” 10 Ndị na-achị ndị ohu na ndị nlekọta jekwuuru ụmụ Izrel sị ha, “Ihe a ka Fero kwuru: ‘Agaghị m enyekwa unu ahịhịa ọzọ. 11 Gaanụ chọtara onwe unu okporo ahịhịa ebe ọbụla unu nwere ike ịchọta ya, ma nke a agaghị eme ka e gbubilata ọrụ unu kwesiri ịrụ.’ ” 12 Ya mere ndị ha gbasasịrị nʼala Ijipt niile ịchịkọta okporo ahịhịa ha ji akpụ brik. 13 Ndị na-achị ha nọgidere na-akwagide ha sị ha, “Rụchaanụ ọrụ unu kwesiri ịrụ nʼụbọchị dịka unu si arụ ya mgbe a na-enye unu ahịhịa.” 14 Ndịisi ọrụ Fero malitere iti ndị Izrel ha họpụtara maka inyere ha aka ilekọta ndị ọrụ ihe, na-ajụ ha ajụjụ sị, “Gịnị mere unu akpụtaghị oke ọnụọgụgụ brik unu kwesiri ịkpụta ụnyaahụ maọbụ taa?” 15 Mgbe ahụ, ndịisi ọrụ ndị Izrel bịakwutere Fero kwaara ya akwa sị ya, “Gịnị mere i ji si otu a na-emeso ndị ohu gị mmeso? 16 Ọ dịghị okporo ahịhịa a na-enye ndị ohu gị, ma ha na-asị anyị, ‘Kpụọnụ brik!’ A na-etikwa ndị ohu gị ihe, ma ịta ụta ekwesighị ịdịrị anyị kama ịta ụta dịrị ndị gị.” 17 Fero zaghachiri ha sị, “Ndị umengwụ! Nʼezie ndị umengwụ ka unu bụ. Ọ bụ ya mere unu ji nọgide na-asị, ‘Ka anyị gaa chụọrọ ONYENWE ANYỊ aja.’ 18 Laghachinụ azụ ugbu a nʼọrụ unu. A gaghị enye unu okporo ahịhịa ọbụla. Ma unu ga-arụpụtarịrị ọnụọgụgụ brik dị ka a chọrọ nʼaka unu.” 19 Ndịisi ọrụ ụmụ Izrel ghọtara na ha nọ na nsogbu mgbe a gwara ha okwu sị ha, “Unu ga-akpụtarịrị ọnụọgụgụ brik unu kwesiri ịkpụ kwa ụbọchị.” 20 Mgbe ha si nʼihu Fero pụọ, ha zutere Mosis na Erọn ebe ha nọ na-eche ha. 21 Ndị nlekọta ọrụ ndị a gwara Mosis na Erọn okwu sị, “Ka ONYENWE ANYỊ lee unu anya ma kpee unu ikpe. Unu emeela ka anyị bụrụ ihe na-esi ajọ isi nʼihu Fero na ndị na-ejere ya ozi. Unu etinyela mma agha nʼaka ha nke ha ga-eji gbuo anyị.” 22 Mgbe ahụ Mosis laghachikwuru ONYENWE ANYỊ jụọ ya sị, “Onyenwe anyị, gịnị mere i ji butere ndị a nsogbu? Gịnị mere i ji zite m? 23 Nʼihi na site na mgbe m jekwuuru Fero gwa ya okwu nʼaha gị, o meela ka nsogbu dakwasị ndị a, ma ị napụtabeghị ndị gị.”

In Other Versions

Exodus 5 in the ANGEFD

Exodus 5 in the ANTPNG2D

Exodus 5 in the AS21

Exodus 5 in the BAGH

Exodus 5 in the BBPNG

Exodus 5 in the BBT1E

Exodus 5 in the BDS

Exodus 5 in the BEV

Exodus 5 in the BHAD

Exodus 5 in the BIB

Exodus 5 in the BLPT

Exodus 5 in the BNT

Exodus 5 in the BNTABOOT

Exodus 5 in the BNTLV

Exodus 5 in the BOATCB

Exodus 5 in the BOATCB2

Exodus 5 in the BOBCV

Exodus 5 in the BOCNT

Exodus 5 in the BOECS

Exodus 5 in the BOGWICC

Exodus 5 in the BOHCB

Exodus 5 in the BOHCV

Exodus 5 in the BOHLNT

Exodus 5 in the BOHNTLTAL

Exodus 5 in the BOILNTAP

Exodus 5 in the BOITCV

Exodus 5 in the BOKCV

Exodus 5 in the BOKCV2

Exodus 5 in the BOKHWOG

Exodus 5 in the BOKSSV

Exodus 5 in the BOLCB

Exodus 5 in the BOLCB2

Exodus 5 in the BOMCV

Exodus 5 in the BONAV

Exodus 5 in the BONCB

Exodus 5 in the BONLT

Exodus 5 in the BONUT2

Exodus 5 in the BOPLNT

Exodus 5 in the BOSCB

Exodus 5 in the BOSNC

Exodus 5 in the BOTLNT

Exodus 5 in the BOVCB

Exodus 5 in the BOYCB

Exodus 5 in the BPBB

Exodus 5 in the BPH

Exodus 5 in the BSB

Exodus 5 in the CCB

Exodus 5 in the CUV

Exodus 5 in the CUVS

Exodus 5 in the DBT

Exodus 5 in the DGDNT

Exodus 5 in the DHNT

Exodus 5 in the DNT

Exodus 5 in the ELBE

Exodus 5 in the EMTV

Exodus 5 in the ESV

Exodus 5 in the FBV

Exodus 5 in the FEB

Exodus 5 in the GGMNT

Exodus 5 in the GNT

Exodus 5 in the HARY

Exodus 5 in the HNT

Exodus 5 in the IRVA

Exodus 5 in the IRVB

Exodus 5 in the IRVG

Exodus 5 in the IRVH

Exodus 5 in the IRVK

Exodus 5 in the IRVM

Exodus 5 in the IRVM2

Exodus 5 in the IRVO

Exodus 5 in the IRVP

Exodus 5 in the IRVT

Exodus 5 in the IRVT2

Exodus 5 in the IRVU

Exodus 5 in the ISVN

Exodus 5 in the JSNT

Exodus 5 in the KAPI

Exodus 5 in the KBT1ETNIK

Exodus 5 in the KBV

Exodus 5 in the KJV

Exodus 5 in the KNFD

Exodus 5 in the LBA

Exodus 5 in the LBLA

Exodus 5 in the LNT

Exodus 5 in the LSV

Exodus 5 in the MAAL

Exodus 5 in the MBV

Exodus 5 in the MBV2

Exodus 5 in the MHNT

Exodus 5 in the MKNFD

Exodus 5 in the MNG

Exodus 5 in the MNT

Exodus 5 in the MNT2

Exodus 5 in the MRS1T

Exodus 5 in the NAA

Exodus 5 in the NASB

Exodus 5 in the NBLA

Exodus 5 in the NBS

Exodus 5 in the NBVTP

Exodus 5 in the NET2

Exodus 5 in the NIV11

Exodus 5 in the NNT

Exodus 5 in the NNT2

Exodus 5 in the NNT3

Exodus 5 in the PDDPT

Exodus 5 in the PFNT

Exodus 5 in the RMNT

Exodus 5 in the SBIAS

Exodus 5 in the SBIBS

Exodus 5 in the SBIBS2

Exodus 5 in the SBICS

Exodus 5 in the SBIDS

Exodus 5 in the SBIGS

Exodus 5 in the SBIHS

Exodus 5 in the SBIIS

Exodus 5 in the SBIIS2

Exodus 5 in the SBIIS3

Exodus 5 in the SBIKS

Exodus 5 in the SBIKS2

Exodus 5 in the SBIMS

Exodus 5 in the SBIOS

Exodus 5 in the SBIPS

Exodus 5 in the SBISS

Exodus 5 in the SBITS

Exodus 5 in the SBITS2

Exodus 5 in the SBITS3

Exodus 5 in the SBITS4

Exodus 5 in the SBIUS

Exodus 5 in the SBIVS

Exodus 5 in the SBT

Exodus 5 in the SBT1E

Exodus 5 in the SCHL

Exodus 5 in the SNT

Exodus 5 in the SUSU

Exodus 5 in the SUSU2

Exodus 5 in the SYNO

Exodus 5 in the TBIAOTANT

Exodus 5 in the TBT1E

Exodus 5 in the TBT1E2

Exodus 5 in the TFTIP

Exodus 5 in the TFTU

Exodus 5 in the TGNTATF3T

Exodus 5 in the THAI

Exodus 5 in the TNFD

Exodus 5 in the TNT

Exodus 5 in the TNTIK

Exodus 5 in the TNTIL

Exodus 5 in the TNTIN

Exodus 5 in the TNTIP

Exodus 5 in the TNTIZ

Exodus 5 in the TOMA

Exodus 5 in the TTENT

Exodus 5 in the UBG

Exodus 5 in the UGV

Exodus 5 in the UGV2

Exodus 5 in the UGV3

Exodus 5 in the VBL

Exodus 5 in the VDCC

Exodus 5 in the YALU

Exodus 5 in the YAPE

Exodus 5 in the YBVTP

Exodus 5 in the ZBP