Exodus 6 (BOICB)

1 Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu sị, “Ugbu a, ị ga-ahụ ihe m ga-eme Fero. Nʼihi ike aka m, ọ ga-ezipụ ha. Nʼihi ike aka, ọ ga-achụpụ ha site nʼala ya.” 2 Chineke gara nʼihu gwa Mosis sị, “Mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ.” 3 Egosiri m Ebraham na Aịzik na Jekọb onwe m dịka Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile. Ma ọ dịghị mgbe m mere ka ha mata aha m dịka ONYENWE ANYỊ. 4 Emere m ka ọgbụgba ndụ m guzosie ike nʼetiti mụ na ha, ọgbụgba ndụ nke inye ha ala Kenan ebe ha biri dịka ndị ọbịa. 5 Ugbu a, anụla m ịsụ ude ụmụ Izrel, bụ ndị ahụ ndị Ijipt mere ka ha bụrụ ndị ohu. Echetakwala m ọgbụgba ndụ m. 6 “Ya mere, gwa ụmụ Izrel, ‘Abụ m ONYENWE ANYỊ. Aga m akpọpụta unu site nʼọnọdụ ịbụ ohu ndị Ijipt. Aga m eme ka unu nwere onwe unu site nʼọnọdụ ịbụ ndị ohu nye ha. Aga m eji aka ike m nke m ga-esetipụ, ya na ihe ngosipụta dị ukwuu nke ikpe ikpe m, gbapụta unu. 7 Mgbe ahụ, aga m ewere unu ka unu bụrụ ndị m. Aga m abụ Chineke unu. Unu ga-amata na m bụ ONYENWE ANYỊ, onye kpọpụtara unu site nʼaka ịbụ ohu nʼala Ijipt. 8 Aga m akpọbata unu nʼala ahụ m weliri aka m elu, ṅụọ nʼiyi, nye Ebraham, na Aịzik, na Jekọb, ime ka ọ bụrụ ihe nketa unu. Abụ m ONYENWE ANYỊ.’ ” 9 Mosis gwara ụmụ Izrel ihe ndị a, ma ha egeghị ntị nʼihi ịda mba nke obi ha na ahụhụ sitere na ndọgbu nʼọrụ ha. 10 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu ọzọ sị, 11 “Gaa gwa Fero eze Ijipt, ka ọ hapụ ụmụ Izrel ka ha pụọ nʼala ya.” 12 Mosis kwuru nʼihu ONYENWE ANYỊ sị, “Mgbe ụmụ Izrel na-aṅaghị m ntị, olee otu Fero ga-esi ṅaa m ntị? Nke ka nke, enweghị m ike ikwu okwu nke ọma.” 13 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis na Erọn okwu banyere ụmụ Izrel na banyere Fero eze Ijipt. O nyere ha iwu sị ha site nʼala Ijipt kpọpụta ụmụ Izrel. 14 Ndị a bụ aha ndịisi ebo Izrel niile. Ụmụ ndị ikom Ruben, ọkpara Izrel bụ,Hanok na Palu, Hezrọn na Kami.Ndị a bụ agbụrụ Ruben. 15 Ụmụ ndị ikom Simiọn bụ,Jemuel, Jamin, Ohad, Jakin, Zoha na Shaul (onye nne ya bụ onye Kenan).Ndị a bụ agbụrụ Simiọn. 16 Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Livayị nʼusoro e si mụọ ha:Geshọn, Kohat na Merari.Livayị nʼonwe ya gbara narị afọ na iri afọ atọ na asaa mgbe ọ nwụrụ. 17 Ụmụ ndị ikom Geshọn, nʼagbụrụ ha,bụ Libni na Shimei, nʼusoro ezinaụlọ ha. 18 Ụmụ ndị ikom Kohat bụ,Amram, Izha, Hebrọn na Uziel.Kohat gbara narị afọ na iri afọ atọ na atọ mgbe ọ nwụrụ. 19 Ụmụ ndị ikom Merari bụMahali na Mushi.Ndị a niile si nʼagbụrụ Livayị, dịka ihe e dere banyere ha si dị. 20 Amram lụrụ Jokebed, nwanne nna ya. Erọn na Mosis bụ ụmụ ha ndị ikom.Ma Amram gbara narị afọ na iri afọ atọ na asaa mgbe ọ nwụrụ. 21 Ụmụ ndị ikom Izha bụKora, Nefeg na Zikri. 22 Ụmụ ndị ikom Uziel bụ,Mishael, Elzafan na Sitri. 23 Erọn lụrụ Elisheba, nwa Aminadab, na nwanne nwanyị Nashọn. Ụmụ ha bụ, Nadab, na Abihu, Elieza na Itama. 24 Ụmụ ndị ikom Kora bụ,Asịa, Elkena na Abiasaf.Ndị a bụ ndị ikwu Kora. 25 Elieza, nwa Erọn lụrụ otu nʼime ụmụ Putiel, onye mụtaara ya Finehaz. Ndị a bụ aha ndịisi ezinaụlọ Livayị dịka ikwu ha si dị. 26 Ọ bụkwa Mosis na Erọn ka ONYENWE ANYỊ gwara okwu sị, “Sitenụ nʼala Ijipt dupụta ụmụ Izrel dịka ọnụọgụgụ ha si dị.” 27 Ha bụ ndị gwara Fero, eze Ijipt okwu banyere ime ka ụmụ Izrel site nʼala Ijipt pụọ. Ọ bụkwa otu Mosis na Erọn ahụ. 28 Otu ụbọchị, ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu nʼIjipt, 29 ọ sịrị ya, “Mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ, gaa gwa Fero eze Ijipt ihe niile m gwara gị.” 30 Mosis kwuru nʼihu ONYENWE ANYỊ sị, “Lee, abụ m onye na-adịghị ekwuzi okwu nke ọma, gịnị mere Fero ga-eji gee ntị nʼihe m ga-agwa ya?”

In Other Versions

Exodus 6 in the ANGEFD

Exodus 6 in the ANTPNG2D

Exodus 6 in the AS21

Exodus 6 in the BAGH

Exodus 6 in the BBPNG

Exodus 6 in the BBT1E

Exodus 6 in the BDS

Exodus 6 in the BEV

Exodus 6 in the BHAD

Exodus 6 in the BIB

Exodus 6 in the BLPT

Exodus 6 in the BNT

Exodus 6 in the BNTABOOT

Exodus 6 in the BNTLV

Exodus 6 in the BOATCB

Exodus 6 in the BOATCB2

Exodus 6 in the BOBCV

Exodus 6 in the BOCNT

Exodus 6 in the BOECS

Exodus 6 in the BOGWICC

Exodus 6 in the BOHCB

Exodus 6 in the BOHCV

Exodus 6 in the BOHLNT

Exodus 6 in the BOHNTLTAL

Exodus 6 in the BOILNTAP

Exodus 6 in the BOITCV

Exodus 6 in the BOKCV

Exodus 6 in the BOKCV2

Exodus 6 in the BOKHWOG

Exodus 6 in the BOKSSV

Exodus 6 in the BOLCB

Exodus 6 in the BOLCB2

Exodus 6 in the BOMCV

Exodus 6 in the BONAV

Exodus 6 in the BONCB

Exodus 6 in the BONLT

Exodus 6 in the BONUT2

Exodus 6 in the BOPLNT

Exodus 6 in the BOSCB

Exodus 6 in the BOSNC

Exodus 6 in the BOTLNT

Exodus 6 in the BOVCB

Exodus 6 in the BOYCB

Exodus 6 in the BPBB

Exodus 6 in the BPH

Exodus 6 in the BSB

Exodus 6 in the CCB

Exodus 6 in the CUV

Exodus 6 in the CUVS

Exodus 6 in the DBT

Exodus 6 in the DGDNT

Exodus 6 in the DHNT

Exodus 6 in the DNT

Exodus 6 in the ELBE

Exodus 6 in the EMTV

Exodus 6 in the ESV

Exodus 6 in the FBV

Exodus 6 in the FEB

Exodus 6 in the GGMNT

Exodus 6 in the GNT

Exodus 6 in the HARY

Exodus 6 in the HNT

Exodus 6 in the IRVA

Exodus 6 in the IRVB

Exodus 6 in the IRVG

Exodus 6 in the IRVH

Exodus 6 in the IRVK

Exodus 6 in the IRVM

Exodus 6 in the IRVM2

Exodus 6 in the IRVO

Exodus 6 in the IRVP

Exodus 6 in the IRVT

Exodus 6 in the IRVT2

Exodus 6 in the IRVU

Exodus 6 in the ISVN

Exodus 6 in the JSNT

Exodus 6 in the KAPI

Exodus 6 in the KBT1ETNIK

Exodus 6 in the KBV

Exodus 6 in the KJV

Exodus 6 in the KNFD

Exodus 6 in the LBA

Exodus 6 in the LBLA

Exodus 6 in the LNT

Exodus 6 in the LSV

Exodus 6 in the MAAL

Exodus 6 in the MBV

Exodus 6 in the MBV2

Exodus 6 in the MHNT

Exodus 6 in the MKNFD

Exodus 6 in the MNG

Exodus 6 in the MNT

Exodus 6 in the MNT2

Exodus 6 in the MRS1T

Exodus 6 in the NAA

Exodus 6 in the NASB

Exodus 6 in the NBLA

Exodus 6 in the NBS

Exodus 6 in the NBVTP

Exodus 6 in the NET2

Exodus 6 in the NIV11

Exodus 6 in the NNT

Exodus 6 in the NNT2

Exodus 6 in the NNT3

Exodus 6 in the PDDPT

Exodus 6 in the PFNT

Exodus 6 in the RMNT

Exodus 6 in the SBIAS

Exodus 6 in the SBIBS

Exodus 6 in the SBIBS2

Exodus 6 in the SBICS

Exodus 6 in the SBIDS

Exodus 6 in the SBIGS

Exodus 6 in the SBIHS

Exodus 6 in the SBIIS

Exodus 6 in the SBIIS2

Exodus 6 in the SBIIS3

Exodus 6 in the SBIKS

Exodus 6 in the SBIKS2

Exodus 6 in the SBIMS

Exodus 6 in the SBIOS

Exodus 6 in the SBIPS

Exodus 6 in the SBISS

Exodus 6 in the SBITS

Exodus 6 in the SBITS2

Exodus 6 in the SBITS3

Exodus 6 in the SBITS4

Exodus 6 in the SBIUS

Exodus 6 in the SBIVS

Exodus 6 in the SBT

Exodus 6 in the SBT1E

Exodus 6 in the SCHL

Exodus 6 in the SNT

Exodus 6 in the SUSU

Exodus 6 in the SUSU2

Exodus 6 in the SYNO

Exodus 6 in the TBIAOTANT

Exodus 6 in the TBT1E

Exodus 6 in the TBT1E2

Exodus 6 in the TFTIP

Exodus 6 in the TFTU

Exodus 6 in the TGNTATF3T

Exodus 6 in the THAI

Exodus 6 in the TNFD

Exodus 6 in the TNT

Exodus 6 in the TNTIK

Exodus 6 in the TNTIL

Exodus 6 in the TNTIN

Exodus 6 in the TNTIP

Exodus 6 in the TNTIZ

Exodus 6 in the TOMA

Exodus 6 in the TTENT

Exodus 6 in the UBG

Exodus 6 in the UGV

Exodus 6 in the UGV2

Exodus 6 in the UGV3

Exodus 6 in the VBL

Exodus 6 in the VDCC

Exodus 6 in the YALU

Exodus 6 in the YAPE

Exodus 6 in the YBVTP

Exodus 6 in the ZBP