Ezekiel 1 (BOICB)

1 O ruo nʼafọ nke iri atọ, nʼọnwa nke anọ, nʼụbọchị nke ise ya, mgbe mụ onwe m na ndị ahụ e mere ka ha gaa biri na mba ọzọ nọ nʼakụkụ iyi ukwu Keba, na e meghere eluigwe mee ka m hụ ọhụ dị iche iche site nʼaka Chineke. 2 Nʼụbọchị nke ise nʼọnwa ahụ, ọ bụ nʼafọ nke ise mgbe a dọkpụụrụ eze Jehoiakin jee mba ọzọ, 3 okwu ONYENWE ANYỊ ruru Izikiel onye nchụaja nwa Buzi ntị, mgbe ọ nọ nʼakụkụ iyi ukwu Keba, nke dị nʼala ndị Kaldịa. Nʼebe ahụ kwa ka aka ONYENWE ANYỊ nọ dịkwasị ya nʼahụ. 4 Elere m anya hụ oke ifufe nke si nʼugwu na-abịa, ahụkwara m oke igwe ojii na amụma nke na-egbuke egbuke; ìhè nke na-enwu nnọọ vaa gbara ya gburugburu. Etiti ọkụ ahụ nwere ihe dịka ọlaọkụ na-amụke amụke. 5 Ihe e kere eke anọ dị ndụ, nke yiri mmadụ nʼụdịdị ha, nọkwa nʼetiti oke ihe ahụ. 6 Nke ọbụla nʼime ha nwere ihu anọ, na nku anọ. 7 Ụkwụ ha guzoro kwem; ọbụ ụkwụ ha dịka nke nwa ehi, na-amụkekwa dịka bronz e hichara nke ọma. 8 Nʼokpuru nku ha, ha nwere aka yiri aka mmadụ nʼakụkụ anọ ha niile. Otu a ka ihu ha na nku anọ dị. 9 Nku ha na-emetụ na nke ibe ha. Mgbe ha na-efe, ha na-eche ihu ha nʼotu ụzọ, ha adịghị agha anya ha nʼazụ mgbe ha na-aga. 10 Maka oyiyi ihu ha: Ha anọ nwere ihu mmadụ, nʼakụkụ aka nri ha nwere ihu ọdụm, nʼakụkụ aka ekpe ha bụ ihu ehi, onye ọbụla nwekwara ihu ugo. 11 Otu ahụ ka ihu ha niile dị. Ha gbasara nku ha nʼelu, nke ọbụla nwere nku abụọ, otu nʼime nku ndị a na-emetụ nku nke ibe ya, ebe abụọ kpuchiri ahụ ha. 12 Ha niile gawara nʼihu. Ebe ọbụla mmụọ ahụ gara ka ha na-aga, na-eleghị anya nʼazụ. 13 Nʼetiti ihe ndị a dị ndụ, e nwere ihe dịka icheku ọkụ na-enwu enwu, dịkwa ka ọwa na-enwu ọkụ. Ọkụ na-esi nʼetiti ihe ndị ahụ dị ndụ na-aga ihu na azụ, ọkụ ahụ nwupụrụ enwupụ, amụma eluigwe sikwa na ya egbupụta. 14 Ihe ndị ahụ dị ndụ na-efegharị nʼebe a, na-efegharịkwa nʼebe nke ọzọ, dịka mgbe amụma na-egbu. 15 Mgbe m na-ele ihe e kere eke dị ndụ ndị a anya, ahụrụ m ụkwụ ụgbọ agha anọ nke dị nʼala nʼokpuru ha. Onye ọbụla nwere nke ya. 16 Ụkwụ ụgbọala ahụ niile dị ka ihe e ji nkume na-egbu maramara a na-akpọ beril kpụọ. Nke ọbụla nʼime ha anọ yikwara ibe ya. Ha niile dịkwa ka wịịlu a kpụrụ tinye nʼetiti ụkwụ ụgbọala buru ibu. 17 Mgbe ha pụrụ, ha na-aga nʼakụkụ anọ nke ha chere ihu ha, ma ụkwụ ụgbọ agha ahụ adịghị echigharị echigharị mgbe ha na-aga. 18 Azụ ụkwụ ụgbọ agha ha dị elu, dịkwa egwu. Anya jupụtakwara nʼazụ ụkwụ ụgbọ agha ndị ahụ. 19 Mgbe ihe ndị a dị ndụ fepụrụ gaa nʼihu, ụkwụ ụgbọala ndị ahụ dị nʼakụkụ ha na-eso ha. Mgbe ha feliri elu, ụkwụ ndị ahụ na-esokwa. 20 Ebe ọbụla mmụọ ha jere, ebe ahụ ka ha na-aga, ụkwụ ụgbọ agha ahụ na-esokwa ha, nʼihi na mmụọ nke anụ ndị ahụ dị ndụ dị nʼụkwụ ụgbọ agha ndị ahụ. 21 Mgbe ha biliri, ndị ọzọ na-ebilikwa. Mgbe ha guzoro otu ebe, ndị ọzọ na-eguzokwa. Mgbe ha feliri elu, ụkwụ ụgbọala ahụ na-eso ha. Nʼihi na mmụọ anụ ndị ahụ dị ndụ dị nʼime ụkwụ ụgbọ agha ndị ahụ. 22 A tụsara ihe sara mbara dịka mbara eluigwe nʼelu isi ihe ndị ahụ dị ndụ. Ọ na-eyi egwu, ma na-egbukwa nweghenweghe dịka kristal. 23 Nʼokpuru ihe ahụ ka ha gbasapụrụ nku ha, ka ọ na-emetụ nke ibe ya. Ha niile nʼotu nʼotu nwere nku abụọ nke na-ekpuchi ahụ ya. 24 Mgbe ha na-aga, nku ha na-eme mkpọtụ dị ka mkpọtụ ebili mmiri na-amagharị amagharị. Mkpọtụ ahụ dịkwa ka ịda ụda nke olu Onye pụrụ ime ihe niile, ka olu iti mkpu nke usuu ndị agha. Mgbe ọbụla ha guzoro, ha na-achịtu nku ha. 25 Mgbe ahụ ha kwụsịrị mechie nku ha olu sitere nʼime ihe ahụ dịka mbara eluigwe nke dị nʼelu isi ha na-abịa. 26 Nʼelu mbara eluigwe ahụ, o nwere ihe dịka ocheeze e ji nkume dị oke ọnụahịa a na-akpọ safaia wuo. Otu onye, nke ụdịdị ya dị ka nwoke, nọkwasịkwara nʼelu oche ahụ. 27 Site nʼụkwụ ya ruo nʼisi ya, ahụ onye ahụ na-egbu maramara dịka ọkụ. Site nʼụkwụ ya ruo nʼukwu ya, ọ dị ka ọkụ na-enwu enwu, ìhè nke na-enwukwa ka ọkụ gbara ya gburugburu. 28 Ìhè ahụ gbara ya gburugburu, nke a na-ahụ anya, dịkwa ka ìhè eke na egwurugwu, nke a na-ahụ anya nʼoge mmiri na-ezo.Otu a ka ebube ONYENWE ANYỊ si gosi m onwe ya. Mgbe m hụrụ ya, adara m nʼala kpuo ihu m nʼala. Mgbe ahụ, anụrụ m olu onye na-ekwu okwu.

In Other Versions

Ezekiel 1 in the ANGEFD

Ezekiel 1 in the ANTPNG2D

Ezekiel 1 in the AS21

Ezekiel 1 in the BAGH

Ezekiel 1 in the BBPNG

Ezekiel 1 in the BBT1E

Ezekiel 1 in the BDS

Ezekiel 1 in the BEV

Ezekiel 1 in the BHAD

Ezekiel 1 in the BIB

Ezekiel 1 in the BLPT

Ezekiel 1 in the BNT

Ezekiel 1 in the BNTABOOT

Ezekiel 1 in the BNTLV

Ezekiel 1 in the BOATCB

Ezekiel 1 in the BOATCB2

Ezekiel 1 in the BOBCV

Ezekiel 1 in the BOCNT

Ezekiel 1 in the BOECS

Ezekiel 1 in the BOGWICC

Ezekiel 1 in the BOHCB

Ezekiel 1 in the BOHCV

Ezekiel 1 in the BOHLNT

Ezekiel 1 in the BOHNTLTAL

Ezekiel 1 in the BOILNTAP

Ezekiel 1 in the BOITCV

Ezekiel 1 in the BOKCV

Ezekiel 1 in the BOKCV2

Ezekiel 1 in the BOKHWOG

Ezekiel 1 in the BOKSSV

Ezekiel 1 in the BOLCB

Ezekiel 1 in the BOLCB2

Ezekiel 1 in the BOMCV

Ezekiel 1 in the BONAV

Ezekiel 1 in the BONCB

Ezekiel 1 in the BONLT

Ezekiel 1 in the BONUT2

Ezekiel 1 in the BOPLNT

Ezekiel 1 in the BOSCB

Ezekiel 1 in the BOSNC

Ezekiel 1 in the BOTLNT

Ezekiel 1 in the BOVCB

Ezekiel 1 in the BOYCB

Ezekiel 1 in the BPBB

Ezekiel 1 in the BPH

Ezekiel 1 in the BSB

Ezekiel 1 in the CCB

Ezekiel 1 in the CUV

Ezekiel 1 in the CUVS

Ezekiel 1 in the DBT

Ezekiel 1 in the DGDNT

Ezekiel 1 in the DHNT

Ezekiel 1 in the DNT

Ezekiel 1 in the ELBE

Ezekiel 1 in the EMTV

Ezekiel 1 in the ESV

Ezekiel 1 in the FBV

Ezekiel 1 in the FEB

Ezekiel 1 in the GGMNT

Ezekiel 1 in the GNT

Ezekiel 1 in the HARY

Ezekiel 1 in the HNT

Ezekiel 1 in the IRVA

Ezekiel 1 in the IRVB

Ezekiel 1 in the IRVG

Ezekiel 1 in the IRVH

Ezekiel 1 in the IRVK

Ezekiel 1 in the IRVM

Ezekiel 1 in the IRVM2

Ezekiel 1 in the IRVO

Ezekiel 1 in the IRVP

Ezekiel 1 in the IRVT

Ezekiel 1 in the IRVT2

Ezekiel 1 in the IRVU

Ezekiel 1 in the ISVN

Ezekiel 1 in the JSNT

Ezekiel 1 in the KAPI

Ezekiel 1 in the KBT1ETNIK

Ezekiel 1 in the KBV

Ezekiel 1 in the KJV

Ezekiel 1 in the KNFD

Ezekiel 1 in the LBA

Ezekiel 1 in the LBLA

Ezekiel 1 in the LNT

Ezekiel 1 in the LSV

Ezekiel 1 in the MAAL

Ezekiel 1 in the MBV

Ezekiel 1 in the MBV2

Ezekiel 1 in the MHNT

Ezekiel 1 in the MKNFD

Ezekiel 1 in the MNG

Ezekiel 1 in the MNT

Ezekiel 1 in the MNT2

Ezekiel 1 in the MRS1T

Ezekiel 1 in the NAA

Ezekiel 1 in the NASB

Ezekiel 1 in the NBLA

Ezekiel 1 in the NBS

Ezekiel 1 in the NBVTP

Ezekiel 1 in the NET2

Ezekiel 1 in the NIV11

Ezekiel 1 in the NNT

Ezekiel 1 in the NNT2

Ezekiel 1 in the NNT3

Ezekiel 1 in the PDDPT

Ezekiel 1 in the PFNT

Ezekiel 1 in the RMNT

Ezekiel 1 in the SBIAS

Ezekiel 1 in the SBIBS

Ezekiel 1 in the SBIBS2

Ezekiel 1 in the SBICS

Ezekiel 1 in the SBIDS

Ezekiel 1 in the SBIGS

Ezekiel 1 in the SBIHS

Ezekiel 1 in the SBIIS

Ezekiel 1 in the SBIIS2

Ezekiel 1 in the SBIIS3

Ezekiel 1 in the SBIKS

Ezekiel 1 in the SBIKS2

Ezekiel 1 in the SBIMS

Ezekiel 1 in the SBIOS

Ezekiel 1 in the SBIPS

Ezekiel 1 in the SBISS

Ezekiel 1 in the SBITS

Ezekiel 1 in the SBITS2

Ezekiel 1 in the SBITS3

Ezekiel 1 in the SBITS4

Ezekiel 1 in the SBIUS

Ezekiel 1 in the SBIVS

Ezekiel 1 in the SBT

Ezekiel 1 in the SBT1E

Ezekiel 1 in the SCHL

Ezekiel 1 in the SNT

Ezekiel 1 in the SUSU

Ezekiel 1 in the SUSU2

Ezekiel 1 in the SYNO

Ezekiel 1 in the TBIAOTANT

Ezekiel 1 in the TBT1E

Ezekiel 1 in the TBT1E2

Ezekiel 1 in the TFTIP

Ezekiel 1 in the TFTU

Ezekiel 1 in the TGNTATF3T

Ezekiel 1 in the THAI

Ezekiel 1 in the TNFD

Ezekiel 1 in the TNT

Ezekiel 1 in the TNTIK

Ezekiel 1 in the TNTIL

Ezekiel 1 in the TNTIN

Ezekiel 1 in the TNTIP

Ezekiel 1 in the TNTIZ

Ezekiel 1 in the TOMA

Ezekiel 1 in the TTENT

Ezekiel 1 in the UBG

Ezekiel 1 in the UGV

Ezekiel 1 in the UGV2

Ezekiel 1 in the UGV3

Ezekiel 1 in the VBL

Ezekiel 1 in the VDCC

Ezekiel 1 in the YALU

Ezekiel 1 in the YAPE

Ezekiel 1 in the YBVTP

Ezekiel 1 in the ZBP