Ezekiel 10 (BOICB)

1 Mgbe ahụ, elere m anya hụ ocheeze ọma e ji nkume safaia wuo ka ọ pụtara ihe na mbara eluigwe, nʼelu ebe ahụ isi cherubim ndị ahụ dị. 2 Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ sịrị nwoke ahụ yi uwe akwa ọcha, “Baa nʼetiti ụkwụ ụgbọala ahụ dị nʼokpuru cherubim ndị ahụ. Site nʼetiti cherubim ndị ahụ kpojuo icheku ọkụ nke na-ere ere nʼaka gị, fesachaa ha nʼime obodo ahụ niile.” Ọ bara nʼime ka m nʼele ya anya. 3 Cherubim ndị ahụ na-eguzo nʼakụkụ ndịda nke ụlọnsọ ahụ mgbe nwoke ahụ banyere. Igwe ojii jupụtakwara nʼogige ime ụlọnsọ ahụ. 4 Mgbe ahụ, ebube ONYENWE ANYỊ sitere nʼelu cherubim bilie, bịa guzo nʼọnụ ụzọ ụlọnsọ ahụ. Ụlọnsọ ahụ jupụtakwara nʼigwe ojii, ihe nke ebube ONYENWE ANYỊ jupụtakwara nʼogige ụlọnsọ ahụ. 5 Ụzụ nke nku cherubim ndị ahụ na-eme dịkwa ka olu Chineke Onye pụrụ ime ihe niile. A na-anụkwa ụzụ nku ndị ahụ nʼogige ụlọnsọ ahụ dị nʼezi. 6 Mgbe ONYENWE ANYỊ nyere nwoke ahụ yi uwe ezi akwa ọcha iwu, sị, “Gaa nʼetiti cherubim ahụ gụta ụfọdụ icheku ọkụ dị nʼetiti wịịlu ụgbọala ahụ,” nwoke ahụ banyere guzo nʼakụkụ otu wịịlu ahụ. 7 Mgbe ahụ, otu nʼime ndị cherubim ahụ setịpụrụ aka ya nʼebe ọkụ ahụ dị nʼetiti ha. Ọ gụtara ụfọdụ icheku ọkụ tinye nʼaka nwoke ahụ yi uwe akwa ọcha onye weere ya pụọ. 8 Nʼokpuru nku ndị cherubim ahụ ka a na-ahụta ihe yiri aka mmadụ. 9 Elere m anya hụ wịịlu anọ, nke dị nʼakụkụ cherubim ndị ahụ. Cherubim ọbụla nwere otu wịịlu nʼakụkụ ya. Wịịlu ndị a niile na-egbu maramara dịka nkume beril. 10 Wịịlu anọ ndị ahụ yiri onwe ha. Nke ọbụla nʼime ha dịka wịịlu a rụnyere nʼetiti wịịlu ọzọ. 11 Mgbe ha na-aga, ha niile na-eche ihu nʼakụkụ ọbụla nke cherubim ndị ahụ chere ihu. Wịịlu ndị a adịghị echigharị echigharị mgbe cherubim ndị a na-agagharị. Kama ebe isi cherubim ndị ahụ chere ihu ka wịịlu ndị ahụ na-aga. Ha adịghị elekwa anya nʼazụ dịka ha na-aga. 12 Gburugburu ha, nʼanụ ahụ ha niile, ma nʼazụ ha, ma nʼaka ha, ma na nku ha, ma na wịịlu ndị ahụ, ihe jupụtara ha bụ anya. Anya dị nʼakụkụ ha niile. 13 Aha m nụrụ a na-akpọ wịịlu ndị ahụ bụ, Ọgba gburugburu. 14 Nke ọbụla nʼime cherubim ndị a nwere ihu anọ. Ihu nke mbụ dịka ihu cherub. Nke abụọ dịka ihu mmadụ; nke atọ dịka ihu ọdụm, ma nke anọ dịka ihu ugo. 15 Mgbe ahụ, Cherubim ndị ahụ buliri onwe ha elu. Ndị a bụ ihe ndị ahụ dị ndụ nke m hụrụ na mbụ nʼakụkụ osimiri Keba. 16 Mgbe cherubim ndị ahụ na-aga, wịịlu ndị ahụ dị nʼakụkụ ha na-eso ha na-aga. Mgbe ha na-achili nku ha i si nʼala bulie onwe ha elu, wịịlu ha na-anọgidekwa nʼakụkụ ha. 17 Mgbe cherubim ndị ahụ guzoro nʼotu ebe, wịịlu ahụ na-eguzokwa. Mgbe ha na-ebuli onwe ha elu, wịịlu ndị ahụ na-ebulikwa onwe ha elu, nʼihi na mmụọ nke ihe ahụ dị ndụ dị nʼime ha. 18 Emesịa, ebube nke ONYENWE ANYỊ sitere na mbata ọnụ ụzọ ụlọnsọ ahụ pụọ, gaa guzo nʼelu cherubim ndị ahụ. 19 Mgbe m nọ na-ele anya, cherubim ahụ gbasapụrụ nku ha felie, wịịlu ha niile dịkwa nʼakụkụ ha. Ha guzoro na mbata ọnụ ụzọ nke dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke ụlọ ONYENWE ANYỊ, na ebube nke Chineke nke Izrel dịkwa nʼelu ha. 20 Ndị a bụ ihe ndị ahụ dị ndụ, nke m hụrụ nʼokpuru Chineke Izrel nʼakụkụ osimiri Keba, amatara m na ha bụ cherubim. 21 Nke ọbụla nʼime ha nwere ihu anọ na nku anọ, na ihe yiri aka mmadụ nʼokpuru nku ha. 22 Ihu ha yikwara ihu ihe ndị ahụ m hụrụ nʼakụkụ osimiri Keba. Nke ọbụla na-agakwa ije nʼihu ihu na-eleghị anya nʼazụ.

In Other Versions

Ezekiel 10 in the ANGEFD

Ezekiel 10 in the ANTPNG2D

Ezekiel 10 in the AS21

Ezekiel 10 in the BAGH

Ezekiel 10 in the BBPNG

Ezekiel 10 in the BBT1E

Ezekiel 10 in the BDS

Ezekiel 10 in the BEV

Ezekiel 10 in the BHAD

Ezekiel 10 in the BIB

Ezekiel 10 in the BLPT

Ezekiel 10 in the BNT

Ezekiel 10 in the BNTABOOT

Ezekiel 10 in the BNTLV

Ezekiel 10 in the BOATCB

Ezekiel 10 in the BOATCB2

Ezekiel 10 in the BOBCV

Ezekiel 10 in the BOCNT

Ezekiel 10 in the BOECS

Ezekiel 10 in the BOGWICC

Ezekiel 10 in the BOHCB

Ezekiel 10 in the BOHCV

Ezekiel 10 in the BOHLNT

Ezekiel 10 in the BOHNTLTAL

Ezekiel 10 in the BOILNTAP

Ezekiel 10 in the BOITCV

Ezekiel 10 in the BOKCV

Ezekiel 10 in the BOKCV2

Ezekiel 10 in the BOKHWOG

Ezekiel 10 in the BOKSSV

Ezekiel 10 in the BOLCB

Ezekiel 10 in the BOLCB2

Ezekiel 10 in the BOMCV

Ezekiel 10 in the BONAV

Ezekiel 10 in the BONCB

Ezekiel 10 in the BONLT

Ezekiel 10 in the BONUT2

Ezekiel 10 in the BOPLNT

Ezekiel 10 in the BOSCB

Ezekiel 10 in the BOSNC

Ezekiel 10 in the BOTLNT

Ezekiel 10 in the BOVCB

Ezekiel 10 in the BOYCB

Ezekiel 10 in the BPBB

Ezekiel 10 in the BPH

Ezekiel 10 in the BSB

Ezekiel 10 in the CCB

Ezekiel 10 in the CUV

Ezekiel 10 in the CUVS

Ezekiel 10 in the DBT

Ezekiel 10 in the DGDNT

Ezekiel 10 in the DHNT

Ezekiel 10 in the DNT

Ezekiel 10 in the ELBE

Ezekiel 10 in the EMTV

Ezekiel 10 in the ESV

Ezekiel 10 in the FBV

Ezekiel 10 in the FEB

Ezekiel 10 in the GGMNT

Ezekiel 10 in the GNT

Ezekiel 10 in the HARY

Ezekiel 10 in the HNT

Ezekiel 10 in the IRVA

Ezekiel 10 in the IRVB

Ezekiel 10 in the IRVG

Ezekiel 10 in the IRVH

Ezekiel 10 in the IRVK

Ezekiel 10 in the IRVM

Ezekiel 10 in the IRVM2

Ezekiel 10 in the IRVO

Ezekiel 10 in the IRVP

Ezekiel 10 in the IRVT

Ezekiel 10 in the IRVT2

Ezekiel 10 in the IRVU

Ezekiel 10 in the ISVN

Ezekiel 10 in the JSNT

Ezekiel 10 in the KAPI

Ezekiel 10 in the KBT1ETNIK

Ezekiel 10 in the KBV

Ezekiel 10 in the KJV

Ezekiel 10 in the KNFD

Ezekiel 10 in the LBA

Ezekiel 10 in the LBLA

Ezekiel 10 in the LNT

Ezekiel 10 in the LSV

Ezekiel 10 in the MAAL

Ezekiel 10 in the MBV

Ezekiel 10 in the MBV2

Ezekiel 10 in the MHNT

Ezekiel 10 in the MKNFD

Ezekiel 10 in the MNG

Ezekiel 10 in the MNT

Ezekiel 10 in the MNT2

Ezekiel 10 in the MRS1T

Ezekiel 10 in the NAA

Ezekiel 10 in the NASB

Ezekiel 10 in the NBLA

Ezekiel 10 in the NBS

Ezekiel 10 in the NBVTP

Ezekiel 10 in the NET2

Ezekiel 10 in the NIV11

Ezekiel 10 in the NNT

Ezekiel 10 in the NNT2

Ezekiel 10 in the NNT3

Ezekiel 10 in the PDDPT

Ezekiel 10 in the PFNT

Ezekiel 10 in the RMNT

Ezekiel 10 in the SBIAS

Ezekiel 10 in the SBIBS

Ezekiel 10 in the SBIBS2

Ezekiel 10 in the SBICS

Ezekiel 10 in the SBIDS

Ezekiel 10 in the SBIGS

Ezekiel 10 in the SBIHS

Ezekiel 10 in the SBIIS

Ezekiel 10 in the SBIIS2

Ezekiel 10 in the SBIIS3

Ezekiel 10 in the SBIKS

Ezekiel 10 in the SBIKS2

Ezekiel 10 in the SBIMS

Ezekiel 10 in the SBIOS

Ezekiel 10 in the SBIPS

Ezekiel 10 in the SBISS

Ezekiel 10 in the SBITS

Ezekiel 10 in the SBITS2

Ezekiel 10 in the SBITS3

Ezekiel 10 in the SBITS4

Ezekiel 10 in the SBIUS

Ezekiel 10 in the SBIVS

Ezekiel 10 in the SBT

Ezekiel 10 in the SBT1E

Ezekiel 10 in the SCHL

Ezekiel 10 in the SNT

Ezekiel 10 in the SUSU

Ezekiel 10 in the SUSU2

Ezekiel 10 in the SYNO

Ezekiel 10 in the TBIAOTANT

Ezekiel 10 in the TBT1E

Ezekiel 10 in the TBT1E2

Ezekiel 10 in the TFTIP

Ezekiel 10 in the TFTU

Ezekiel 10 in the TGNTATF3T

Ezekiel 10 in the THAI

Ezekiel 10 in the TNFD

Ezekiel 10 in the TNT

Ezekiel 10 in the TNTIK

Ezekiel 10 in the TNTIL

Ezekiel 10 in the TNTIN

Ezekiel 10 in the TNTIP

Ezekiel 10 in the TNTIZ

Ezekiel 10 in the TOMA

Ezekiel 10 in the TTENT

Ezekiel 10 in the UBG

Ezekiel 10 in the UGV

Ezekiel 10 in the UGV2

Ezekiel 10 in the UGV3

Ezekiel 10 in the VBL

Ezekiel 10 in the VDCC

Ezekiel 10 in the YALU

Ezekiel 10 in the YAPE

Ezekiel 10 in the YBVTP

Ezekiel 10 in the ZBP