Ezekiel 11 (BOICB)

1 Mgbe ahụ, Mmụọ nke Chineke buliri m mee ka m bịaruo nʼọnụ ụzọ ama ụlọ ONYENWE ANYỊ, nke dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ. Nʼebe ahụ, nʼoghere nke ọnụ ụzọ ama ahụ, ahụrụ m iri mmadụ abụọ na ise. Ahụkwara m nʼetiti ha, Jaazanaya nwa Azoa na Pelataya nwa Benaya, bụ ndịisi ndị Izrel. 2 Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ndị a bụ ndị ikom na-agba izu ajọ ihe, na-enyekwa ndụmọdụ ọjọọ niile a na-enye nʼobodo a. 3 Ha na-asị, ‘Oge a ga-ewuzi ụlọ ndị ahụ ọ dịghị nso? Obodo a bụ ite igwe, anyị onwe anyị bụkwa anụ dị nʼime ya.’ 4 Nʼihi ya, nwa nke mmadụ, buo amụma megide ha.” 5 Mgbe ahụ, Mmụọ nke ONYENWE ANYỊ bịakwasịrị m sị m kwuo, “Otu a ka ONYENWE ANYỊ sịrị: otu a ka unu na-ekwukwa, unu ndị ndu ụlọ Izrel, ma amaara m ihe unu bụ nʼuche. 6 Unu egbuola ọtụtụ mmadụ nʼime obodo a, meekwa ka okporoụzọ ya jupụta nʼozu ndị nwụrụ anwụ. 7 “Nʼihi ya ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ ji sị, ozu ndị ahụ niile tọgbọ nʼokporoụzọ obodo unu bụ anụ ndị ahụ unu gburu egbu, obodo a bụkwa ite. Ma aga m eme ka unu site nʼime ya pụta. 8 Mma agha ahụ unu na-atụ egwu ya ka m ga-eme ka ọ bịakwasị unu. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwubiri ya. 9 Aga m esitekwa nʼetiti ya kpọpụta unu, were unu nyefee nʼaka ndị mba ọzọ, ma kpekwa unu ikpe. 10 Unu ga-ada site na mma agha. Ọ bụ nʼoke ala Izrel niile ka m ga-anọ kpee unu ikpe. Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ. 11 E, obodo a agaghị abụrụ unu ite. Unu agaghị anọkwa nʼime ya dịka anụ. Aga m ekpe unu ikpe nʼoke ala Izrel niile. 12 Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ. Nʼihi na unu bụ ndị na-enupu isi site nʼiwu m na ụkpụrụ m. Ma unu na-agbaso nzọ ụkwụ nke mba ndị ahụ niile gbara unu gburugburu.” 13 Mgbe m ka nọ na-ebu amụma, Pelataya nwa Benaya nwụrụ. Mụ onwe m kpuo ihu m nʼala kwaa akwa sị, “Ewoo, Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ ị ga-ebibi ndị niile fọdụrụ nʼala Izrel?” 14 Okwu ONYENWE ANYỊ ruru m ntị, sị, 15 “Nwa nke mmadụ, ụmụ nke nna gị, ọ bụladị ụmụnna gị, na ndị mgbapụta gị na ezinaụlọ Izrel niile, ọ bụ ha ka ndị bi na Jerusalem sịrị, ‘Ha esitela nʼebe ONYENWE ANYỊ nọ gaa ebe dị anya, ọ bụkwa anyị ka enyere ala nke a ka ọ bụrụ ihe nnweta anyị,’ 16 “Nʼihi nke a, kwuo, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ na-asị, Nʼagbanyeghị na m zipụrụ ha gaa ebe dị anya nʼetiti mba dị iche iche, chụsakwaa ha nʼetiti ala dị iche iche, ma nwa mgbe nta, a bụụrụ m ha ebe dị nsọ nʼala niile ahụ bụ ebe ha gara.’ 17 “Ya mere kwuo, ‘Nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ na-ekwu: Aga m achịkọtakwa unu ọnụ ọzọ, site nʼobodo niile bụ ebe unu gbasara, nyeghachikwa unu ala Izrel.’ 18 “Ha ga-alọghachi nʼebe ahụ, sitekwa nʼetiti ya wezuga oyiyi ihe arụ niile, na arụsị niile bụkwa ihe arụ. 19 Aga m enyekwa ha otu obi, tinyekwa mmụọ ọhụrụ nʼime ha. Aga m ewepụ site nʼime ha obi kpọrọ nkụ ma nye ha obi nke anụ ahụ. 20 Nke a ga-eme ka ha soro ụkpụrụ m na iwu m niile, leziekwa anya idebe ha. Ha ga-abụ ndị nke m, mụ onwe m ga-abụkwa Chineke ha. 21 Ma banyere ndị ahụ obi ha na-agbaso ihe ọjọọ na ihe niile rụrụ arụ, mmehie ha ka m ga-atụkwasị nʼisi ha; otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwubiri ya.” 22 Mgbe ahụ, cherubim ndị ahụ weliri nku ha elu, wịịlu ndị ahụ dịkwa nʼakụkụ ha ma ebube nke Chineke nke Izrel guzokwa nʼelu ha. 23 Ebube ONYENWE ANYỊ sitere nʼetiti obodo ahụ rigoo, guzo nʼelu ugwu, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ. 24 Nʼime ọhụ, Mmụọ nke Chineke buliri m elu bubata m na Kaldịa, ebe ndị a dọkpụụrụ gaa mba ọzọ nọ.Otu a ka ọhụ m hụrụ si hapụ m. 25 Agwakwara m ndị niile ahụ e mere ka ha jee biri na mba ọzọ ihe niile nke ONYENWE ANYỊ gosiri m.

In Other Versions

Ezekiel 11 in the ANGEFD

Ezekiel 11 in the ANTPNG2D

Ezekiel 11 in the AS21

Ezekiel 11 in the BAGH

Ezekiel 11 in the BBPNG

Ezekiel 11 in the BBT1E

Ezekiel 11 in the BDS

Ezekiel 11 in the BEV

Ezekiel 11 in the BHAD

Ezekiel 11 in the BIB

Ezekiel 11 in the BLPT

Ezekiel 11 in the BNT

Ezekiel 11 in the BNTABOOT

Ezekiel 11 in the BNTLV

Ezekiel 11 in the BOATCB

Ezekiel 11 in the BOATCB2

Ezekiel 11 in the BOBCV

Ezekiel 11 in the BOCNT

Ezekiel 11 in the BOECS

Ezekiel 11 in the BOGWICC

Ezekiel 11 in the BOHCB

Ezekiel 11 in the BOHCV

Ezekiel 11 in the BOHLNT

Ezekiel 11 in the BOHNTLTAL

Ezekiel 11 in the BOILNTAP

Ezekiel 11 in the BOITCV

Ezekiel 11 in the BOKCV

Ezekiel 11 in the BOKCV2

Ezekiel 11 in the BOKHWOG

Ezekiel 11 in the BOKSSV

Ezekiel 11 in the BOLCB

Ezekiel 11 in the BOLCB2

Ezekiel 11 in the BOMCV

Ezekiel 11 in the BONAV

Ezekiel 11 in the BONCB

Ezekiel 11 in the BONLT

Ezekiel 11 in the BONUT2

Ezekiel 11 in the BOPLNT

Ezekiel 11 in the BOSCB

Ezekiel 11 in the BOSNC

Ezekiel 11 in the BOTLNT

Ezekiel 11 in the BOVCB

Ezekiel 11 in the BOYCB

Ezekiel 11 in the BPBB

Ezekiel 11 in the BPH

Ezekiel 11 in the BSB

Ezekiel 11 in the CCB

Ezekiel 11 in the CUV

Ezekiel 11 in the CUVS

Ezekiel 11 in the DBT

Ezekiel 11 in the DGDNT

Ezekiel 11 in the DHNT

Ezekiel 11 in the DNT

Ezekiel 11 in the ELBE

Ezekiel 11 in the EMTV

Ezekiel 11 in the ESV

Ezekiel 11 in the FBV

Ezekiel 11 in the FEB

Ezekiel 11 in the GGMNT

Ezekiel 11 in the GNT

Ezekiel 11 in the HARY

Ezekiel 11 in the HNT

Ezekiel 11 in the IRVA

Ezekiel 11 in the IRVB

Ezekiel 11 in the IRVG

Ezekiel 11 in the IRVH

Ezekiel 11 in the IRVK

Ezekiel 11 in the IRVM

Ezekiel 11 in the IRVM2

Ezekiel 11 in the IRVO

Ezekiel 11 in the IRVP

Ezekiel 11 in the IRVT

Ezekiel 11 in the IRVT2

Ezekiel 11 in the IRVU

Ezekiel 11 in the ISVN

Ezekiel 11 in the JSNT

Ezekiel 11 in the KAPI

Ezekiel 11 in the KBT1ETNIK

Ezekiel 11 in the KBV

Ezekiel 11 in the KJV

Ezekiel 11 in the KNFD

Ezekiel 11 in the LBA

Ezekiel 11 in the LBLA

Ezekiel 11 in the LNT

Ezekiel 11 in the LSV

Ezekiel 11 in the MAAL

Ezekiel 11 in the MBV

Ezekiel 11 in the MBV2

Ezekiel 11 in the MHNT

Ezekiel 11 in the MKNFD

Ezekiel 11 in the MNG

Ezekiel 11 in the MNT

Ezekiel 11 in the MNT2

Ezekiel 11 in the MRS1T

Ezekiel 11 in the NAA

Ezekiel 11 in the NASB

Ezekiel 11 in the NBLA

Ezekiel 11 in the NBS

Ezekiel 11 in the NBVTP

Ezekiel 11 in the NET2

Ezekiel 11 in the NIV11

Ezekiel 11 in the NNT

Ezekiel 11 in the NNT2

Ezekiel 11 in the NNT3

Ezekiel 11 in the PDDPT

Ezekiel 11 in the PFNT

Ezekiel 11 in the RMNT

Ezekiel 11 in the SBIAS

Ezekiel 11 in the SBIBS

Ezekiel 11 in the SBIBS2

Ezekiel 11 in the SBICS

Ezekiel 11 in the SBIDS

Ezekiel 11 in the SBIGS

Ezekiel 11 in the SBIHS

Ezekiel 11 in the SBIIS

Ezekiel 11 in the SBIIS2

Ezekiel 11 in the SBIIS3

Ezekiel 11 in the SBIKS

Ezekiel 11 in the SBIKS2

Ezekiel 11 in the SBIMS

Ezekiel 11 in the SBIOS

Ezekiel 11 in the SBIPS

Ezekiel 11 in the SBISS

Ezekiel 11 in the SBITS

Ezekiel 11 in the SBITS2

Ezekiel 11 in the SBITS3

Ezekiel 11 in the SBITS4

Ezekiel 11 in the SBIUS

Ezekiel 11 in the SBIVS

Ezekiel 11 in the SBT

Ezekiel 11 in the SBT1E

Ezekiel 11 in the SCHL

Ezekiel 11 in the SNT

Ezekiel 11 in the SUSU

Ezekiel 11 in the SUSU2

Ezekiel 11 in the SYNO

Ezekiel 11 in the TBIAOTANT

Ezekiel 11 in the TBT1E

Ezekiel 11 in the TBT1E2

Ezekiel 11 in the TFTIP

Ezekiel 11 in the TFTU

Ezekiel 11 in the TGNTATF3T

Ezekiel 11 in the THAI

Ezekiel 11 in the TNFD

Ezekiel 11 in the TNT

Ezekiel 11 in the TNTIK

Ezekiel 11 in the TNTIL

Ezekiel 11 in the TNTIN

Ezekiel 11 in the TNTIP

Ezekiel 11 in the TNTIZ

Ezekiel 11 in the TOMA

Ezekiel 11 in the TTENT

Ezekiel 11 in the UBG

Ezekiel 11 in the UGV

Ezekiel 11 in the UGV2

Ezekiel 11 in the UGV3

Ezekiel 11 in the VBL

Ezekiel 11 in the VDCC

Ezekiel 11 in the YALU

Ezekiel 11 in the YAPE

Ezekiel 11 in the YBVTP

Ezekiel 11 in the ZBP