Ezekiel 22 (BOICB)

1 Okwu nke ONYENWE ANYỊ ruru m ntị, sị: 2 “Ma gị onwe gị, Nwa nke mmadụ, ị ga-ekpe ya ikpe? Ị ga-ekpe obodo ọbara a ikpe? Mgbe ahụ, ị ga-eguzogide ya ihu nʼihu mee ka ọ mara ihe arụ niile o mere. 3 ‘Ị ga-asị, Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ na-ekwu: Gị obodo nke na-ewetara onwe gị mbibi nʼihi ọbara niile a na-awụsi nʼetiti gị, na arụsị niile i ji na-emerụ onwe gị. 4 Lee ka i si bụrụ onye ikpe mara nʼihi ọbara ị wụsiri. Leekwa ka i si bụrụ onye e merụrụ emerụ site nʼarụsị niile ị kpụrụ. I jirila aka gị mee ka ọgwụgwụ gị dị nso, leekwa na ọgwụgwụ gị dị nso, leekwa na ọgwụgwụ gị abịala nʼezie. Nʼihi ya, aga m eme gị ka ị bụrụ ihe nkọcha nye mba niile, na ihe ịkwa emo nye mba dị iche iche. 5 Ndị nọ gị nso na ndị nọ gị ebe dị anya ga-achị gị ọchị, gị obodo rụrụ arụ, na nke jupụtara nʼọgbaaghara. 6 “ ‘Lee ka ndịisi Izrel nọ nʼime gị si e ji ike ha nwere na-awụsi ọbara. 7 A na-elelị nne na nna nʼime gị. Ndị mbịarambịa ka e ji anya ike na-emegbu. Ndị na-enweghị nna na ndị inyom di ha nwụrụ ka a na-akpagbu, na-emejọkwa. 8 I lelịala ihe nsọ m niile, merụọkwa ụbọchị izuike m niile. 9 Ndị nkwutọ, ndị na-awụsi ọbara nọ nʼime gị. Ndị na-eri nri nʼihu arụsị niile dị nʼelu ugwu, na ndị na-eme omume rụrụ arụ nọkwa nʼime gị. 10 Nʼime gị ka ndị na-akwaso nwunye nna ha iko dị, nʼime gị ka ndị na-awakpo ụmụ nwanyị mgbe ha nọ na nsọ ha, bụ mgbe ha nọ nʼọnọdụ adịghị ọcha. 11 Nʼime gị ka otu nwoke na-eme ihe arụ ya na nwunye onye agbataobi ya, onye ọzọ na-enweghị ihere emerụọla nwunye nwa ya, onye ọzọkwa, emerụkwala nwanne ya nwanyị, bụ ada nke nna ya mụrụ. 12 E nwekwara ndị na-anara ego gbuo mmadụ ibe ha nʼime gị. Gị onwe gị na-anarakwa ndị i binyere ego ụma buru ibu, na-esitekwa nʼaka ike na-anara ndị mmadụ ihe ha. I chefuokwala m. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwubiri. 13 “ ‘Lee, aghaghị m ịkụkọta ọbụ aka m abụọ nʼihi uru nke na-ezighị ezi ị na-eri, na ọbara niile nke ị wụsiri nʼetiti gị. 14 Obi gị ọ ga-esikwa ike? Ị ga-eguzokwa nʼụbọchị m ga-ekpe gị ikpe? Nʼihi na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ ekwuola. Aga m emezukwa ya. 15 Aga m achụsa unu nʼetiti mba niile, fesaa unu nʼetiti mba niile. Aga m emekwa ka adịghị ọcha unu kwụsị. 16 Mgbe e mere ka ị ghara ịdị nsọ nʼanya ndị mba dị iche iche, ị ga-amatakwa na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ.’ ” 17 Mgbe ahụ, okwu ONYENWE ANYỊ ruru m ntị, sị, 18 “Nwa nke mmadụ, ụlọ Izrel aghọọlara m ihe efu. Ha niile aghọọla ọla, na gbamgbam, na igwe, na ọla opu a hapụrụ nʼọkụ. Ha bụ nnọọ ihe efu nke ọlaọcha. 19 Nʼihi ya, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwuru: ‘Nʼihi na unu niile aghọọla ihe efu, aga m achịkọta unu nʼime Jerusalem. 20 Dịka a na-achịkọta ọlaọcha, na ọla, na igwe, na opu, na gbamgbam, tinye ha nʼoke ọkụ ka ha gbazee, otu a ka m ga-esite nʼiwe m na ọnụma m chịkọtaa unu nʼime obodo ahụ gbazee unu. 21 Aga m achịkọta unu, fụkwasị unu ọkụ nke ọnụma m, mee ka unu gbazee nʼime ya. 22 Dịka ọlaọcha si agbaze nʼọkụ, otu a ka unu ga-esi gbazee nʼime ya. Unu ga-amatakwa nʼezie na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ awụkwasịla unu iwe m.’ ” 23 Ọzọkwa, okwu ONYENWE ANYỊ ruru m ntị, sị, 24 “Nwa nke mmadụ, gwa ala ahụ okwu, ‘Ị bụ ala nke a na-emebeghị ka ọ dị ọcha, maọbụ mmiri izokwasị ya nʼụbọchị ọnụma.’ 25 E nwere izuzu ọjọọ nke ndị ụmụ eze nọ nʼime ya, dịka ọdụm nke na-agbọ ụja na-adọgbu anụ ọ na-eri eri, ha na-eripịa ndị mmadụ. Ha ewerela akụ ha na ihe ha niile dị oke ọnụahịa, mekwa ka ụmụ nwanyị na-enweghị di baa ụba nʼetiti ya. 26 Ndị nchụaja ya na-enupu isi nʼiwu m niile, mee ka ihe nsọ m niile gharakwa ịdị nsọ, nʼebe nsọ m. Ha adịghị akpakwa oke nʼetiti ihe dị nsọ na ihe na-adịghị nsọ. Ha na-ezi ndị m na ihe dị iche ọbụla adịghị nʼetiti ihe dị ọcha na ihe na-adịghị ọcha. Ha adịghị akpọkwa ụbọchị izuike m ihe ọbụla. Nʼihi ya, e mere ka m ghara ịdịkwa nsọ nʼetiti ha. 27 Ndịisi nọ nʼime gị dịka nkịta ọhịa na-adọgbu anụ o gbutara. Ha na-awụsi ọbara, ime ka mkpụrụobi mmadụ laa nʼiyi nʼihi uru akpa ha. 28 Ndị amụma ha eteela nzu nʼọrụ ha niile site nʼọhụ ụgha nʼịgba afa ụgha mgbe ha na-ahụghị ọhụ ọbụla. Ha na-asị, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ sịrị,’ mgbe ONYENWE ANYỊ na-ekwughị ihe ọbụla. 29 Ndị ala a na-eji aka ike na-apụnara ndị ọzọ ihe ha nwere na-ezukwa ohi. Ha na-emegbu ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa, na-emegbukwa ndị ọbịa site nʼụzọ ekpeghị ikpe ziri ezi. 30 “Achọrọ m otu onye nʼetiti ha bụ onye nke ga-ewuzi mgbidi ogige, guzokwa nʼihu m ikwuchite ọnụ ala a, ka m ghara ịla ala a nʼiyi, ma ọ dịghị onye m hụrụ. 31 Nʼihi ya, aga m awụkwasị ha ọnụma m, jirikwa iwe m dị ọkụ rechapụ ha. Aga m ebokwasịkwa ahụhụ niile nke mmehie ha, nʼisi ha, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwubiri.”

In Other Versions

Ezekiel 22 in the ANGEFD

Ezekiel 22 in the ANTPNG2D

Ezekiel 22 in the AS21

Ezekiel 22 in the BAGH

Ezekiel 22 in the BBPNG

Ezekiel 22 in the BBT1E

Ezekiel 22 in the BDS

Ezekiel 22 in the BEV

Ezekiel 22 in the BHAD

Ezekiel 22 in the BIB

Ezekiel 22 in the BLPT

Ezekiel 22 in the BNT

Ezekiel 22 in the BNTABOOT

Ezekiel 22 in the BNTLV

Ezekiel 22 in the BOATCB

Ezekiel 22 in the BOATCB2

Ezekiel 22 in the BOBCV

Ezekiel 22 in the BOCNT

Ezekiel 22 in the BOECS

Ezekiel 22 in the BOGWICC

Ezekiel 22 in the BOHCB

Ezekiel 22 in the BOHCV

Ezekiel 22 in the BOHLNT

Ezekiel 22 in the BOHNTLTAL

Ezekiel 22 in the BOILNTAP

Ezekiel 22 in the BOITCV

Ezekiel 22 in the BOKCV

Ezekiel 22 in the BOKCV2

Ezekiel 22 in the BOKHWOG

Ezekiel 22 in the BOKSSV

Ezekiel 22 in the BOLCB

Ezekiel 22 in the BOLCB2

Ezekiel 22 in the BOMCV

Ezekiel 22 in the BONAV

Ezekiel 22 in the BONCB

Ezekiel 22 in the BONLT

Ezekiel 22 in the BONUT2

Ezekiel 22 in the BOPLNT

Ezekiel 22 in the BOSCB

Ezekiel 22 in the BOSNC

Ezekiel 22 in the BOTLNT

Ezekiel 22 in the BOVCB

Ezekiel 22 in the BOYCB

Ezekiel 22 in the BPBB

Ezekiel 22 in the BPH

Ezekiel 22 in the BSB

Ezekiel 22 in the CCB

Ezekiel 22 in the CUV

Ezekiel 22 in the CUVS

Ezekiel 22 in the DBT

Ezekiel 22 in the DGDNT

Ezekiel 22 in the DHNT

Ezekiel 22 in the DNT

Ezekiel 22 in the ELBE

Ezekiel 22 in the EMTV

Ezekiel 22 in the ESV

Ezekiel 22 in the FBV

Ezekiel 22 in the FEB

Ezekiel 22 in the GGMNT

Ezekiel 22 in the GNT

Ezekiel 22 in the HARY

Ezekiel 22 in the HNT

Ezekiel 22 in the IRVA

Ezekiel 22 in the IRVB

Ezekiel 22 in the IRVG

Ezekiel 22 in the IRVH

Ezekiel 22 in the IRVK

Ezekiel 22 in the IRVM

Ezekiel 22 in the IRVM2

Ezekiel 22 in the IRVO

Ezekiel 22 in the IRVP

Ezekiel 22 in the IRVT

Ezekiel 22 in the IRVT2

Ezekiel 22 in the IRVU

Ezekiel 22 in the ISVN

Ezekiel 22 in the JSNT

Ezekiel 22 in the KAPI

Ezekiel 22 in the KBT1ETNIK

Ezekiel 22 in the KBV

Ezekiel 22 in the KJV

Ezekiel 22 in the KNFD

Ezekiel 22 in the LBA

Ezekiel 22 in the LBLA

Ezekiel 22 in the LNT

Ezekiel 22 in the LSV

Ezekiel 22 in the MAAL

Ezekiel 22 in the MBV

Ezekiel 22 in the MBV2

Ezekiel 22 in the MHNT

Ezekiel 22 in the MKNFD

Ezekiel 22 in the MNG

Ezekiel 22 in the MNT

Ezekiel 22 in the MNT2

Ezekiel 22 in the MRS1T

Ezekiel 22 in the NAA

Ezekiel 22 in the NASB

Ezekiel 22 in the NBLA

Ezekiel 22 in the NBS

Ezekiel 22 in the NBVTP

Ezekiel 22 in the NET2

Ezekiel 22 in the NIV11

Ezekiel 22 in the NNT

Ezekiel 22 in the NNT2

Ezekiel 22 in the NNT3

Ezekiel 22 in the PDDPT

Ezekiel 22 in the PFNT

Ezekiel 22 in the RMNT

Ezekiel 22 in the SBIAS

Ezekiel 22 in the SBIBS

Ezekiel 22 in the SBIBS2

Ezekiel 22 in the SBICS

Ezekiel 22 in the SBIDS

Ezekiel 22 in the SBIGS

Ezekiel 22 in the SBIHS

Ezekiel 22 in the SBIIS

Ezekiel 22 in the SBIIS2

Ezekiel 22 in the SBIIS3

Ezekiel 22 in the SBIKS

Ezekiel 22 in the SBIKS2

Ezekiel 22 in the SBIMS

Ezekiel 22 in the SBIOS

Ezekiel 22 in the SBIPS

Ezekiel 22 in the SBISS

Ezekiel 22 in the SBITS

Ezekiel 22 in the SBITS2

Ezekiel 22 in the SBITS3

Ezekiel 22 in the SBITS4

Ezekiel 22 in the SBIUS

Ezekiel 22 in the SBIVS

Ezekiel 22 in the SBT

Ezekiel 22 in the SBT1E

Ezekiel 22 in the SCHL

Ezekiel 22 in the SNT

Ezekiel 22 in the SUSU

Ezekiel 22 in the SUSU2

Ezekiel 22 in the SYNO

Ezekiel 22 in the TBIAOTANT

Ezekiel 22 in the TBT1E

Ezekiel 22 in the TBT1E2

Ezekiel 22 in the TFTIP

Ezekiel 22 in the TFTU

Ezekiel 22 in the TGNTATF3T

Ezekiel 22 in the THAI

Ezekiel 22 in the TNFD

Ezekiel 22 in the TNT

Ezekiel 22 in the TNTIK

Ezekiel 22 in the TNTIL

Ezekiel 22 in the TNTIN

Ezekiel 22 in the TNTIP

Ezekiel 22 in the TNTIZ

Ezekiel 22 in the TOMA

Ezekiel 22 in the TTENT

Ezekiel 22 in the UBG

Ezekiel 22 in the UGV

Ezekiel 22 in the UGV2

Ezekiel 22 in the UGV3

Ezekiel 22 in the VBL

Ezekiel 22 in the VDCC

Ezekiel 22 in the YALU

Ezekiel 22 in the YAPE

Ezekiel 22 in the YBVTP

Ezekiel 22 in the ZBP