Ezekiel 25 (BOICB)

1 Okwu ONYENWE ANYỊ ruru m ntị, sị, 2 “Nwa nke mmadụ, chee ihu gị nʼala ụmụ Amọn buo amụma megide ha. 3 Gwa ndị Amọn, ‘Nụrụnụ okwu nke Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwuru: Nʼihi na ị sịrị “Aha!” megide ebe nsọ m mgbe e merụrụ ya na megide ala Izrel, mgbe e mere ka ọ tọgbọrọ nʼefu, na mgbe a dọtara ndị Juda nʼagha duru ha gaa mba ọzọ dịka ohu, 4 nʼihi ya, aga m ewere gị nyefee nʼaka ndị si nʼọwụwa anyanwụ pụta, ka ị bụrụ ihe nketa ha. Ha ga-ewu ebe obibi nʼetiti gị, rie mkpụrụ ubi gị, ṅụọkwa mmiri ara ehi gị. 5 Aga m eme ka obodo Raba ghọọ ebe ịta nri nye ịnyịnya kamel, meekwa ka ala Amọn ghọọ ebe igwe ewu na atụrụ na-amakpu. Mgbe ahụ, ị ga-amata na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ. 6 Nʼihi na otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ na-ekwu: Nʼihi na ị kụrụ aka gị, zọọ ụkwụ gị nʼala gidim, ma sitekwa nʼịkpọ asị nke obi gị ṅụrịa ọṅụ megide ala Izrel, 7 nʼihi ya, lee, aga m esetipụ aka m megide gị, were gị nyefee nʼaka ọtụtụ mba, ndị ga-alụta gị nʼagha. Aga m eme ka ị gwụsịa, mee ka ị hapụ ịdịkwa ọzọ. Aga m ala gị nʼiyi. Ị ga-amatakwa na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ.’ ” 8 “Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ na-ekwu, ‘Nʼihi na Moab na Sia sịrị, “Lee, Juda adịrịla ka mba ndị ọzọ niile,” 9 nʼihi nke a, aga m emeghe akụkụ Moab, site nʼobodo nke nsọtụ oke ala ya niile, bụ Bet-Jeshimọt, Baal-Meon na Kiriatem, nke bụ ebube nke ala ahụ. 10 Aga m ewere Moab na Amọn nyefee ha nʼaka ndị ga-esi nʼọwụwa anyanwụ pụta, ka ọ bụrụ nke ha. Nʼụzọ dị otu a, a gaghị agụkwa maọbụ cheta Amọn nʼetiti mba niile. 11 Aga m ata Moab ahụhụ. Mgbe ahụ, ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ.’ ” 12 “Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ na-ekwu, ‘Nʼihi na Edọm bọọrọ onwe ha ọbọ megide ụlọ Juda sitekwa nʼịbọ ọbọ ha bụrụ ndị ikpe mara, 13 nʼihi nke a, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwuru: Aga m esetipụ aka m megide Edọm, gbuo ndị bi nʼime ya, ma mmadụ ma anụmanụ. Aga m eme ka ọ tọgbọrọ nʼefu. Ndị niile bi nʼala ahụ site na Teman ruo na Dedan ka a ga-eji mma agha gbuo. 14 Ọ bụ site nʼaka ndị nke m Izrel ka m ga-esi bọọ ọbọ megide Edọm, ha ga-emeso ndị Edọm dịka ịba ụba nke iwe m na ọnụma m si dị, ha ga-amata ihe ịbọ ọbọ bụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwubiri.’ ” 15 “Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwuru: ‘Nʼihi na ndị Filistia esitela na mmụọ nke ịbọ ọbọ, na mmụọ ịkpọ asị nke dị ha nʼobi bọọrọ onwe ha ọbọ, chọọ ịla ha nʼiyi. 16 Ya mere, ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwuru, ana m aga isetipụ aka m megide ndị Filistia. Aga m ebipụ ndị Keret, bibie ndị ahụ niile bi nʼọnụ mmiri osimiri. 17 Aga m esite nʼoke ọnụma bọọ ha ọbọ site na ịta ha ahụhụ. Mgbe ahụ ha ga-amata na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ, mgbe m ga-abọgwata ha ọbọ.’ ”

In Other Versions

Ezekiel 25 in the ANGEFD

Ezekiel 25 in the ANTPNG2D

Ezekiel 25 in the AS21

Ezekiel 25 in the BAGH

Ezekiel 25 in the BBPNG

Ezekiel 25 in the BBT1E

Ezekiel 25 in the BDS

Ezekiel 25 in the BEV

Ezekiel 25 in the BHAD

Ezekiel 25 in the BIB

Ezekiel 25 in the BLPT

Ezekiel 25 in the BNT

Ezekiel 25 in the BNTABOOT

Ezekiel 25 in the BNTLV

Ezekiel 25 in the BOATCB

Ezekiel 25 in the BOATCB2

Ezekiel 25 in the BOBCV

Ezekiel 25 in the BOCNT

Ezekiel 25 in the BOECS

Ezekiel 25 in the BOGWICC

Ezekiel 25 in the BOHCB

Ezekiel 25 in the BOHCV

Ezekiel 25 in the BOHLNT

Ezekiel 25 in the BOHNTLTAL

Ezekiel 25 in the BOILNTAP

Ezekiel 25 in the BOITCV

Ezekiel 25 in the BOKCV

Ezekiel 25 in the BOKCV2

Ezekiel 25 in the BOKHWOG

Ezekiel 25 in the BOKSSV

Ezekiel 25 in the BOLCB

Ezekiel 25 in the BOLCB2

Ezekiel 25 in the BOMCV

Ezekiel 25 in the BONAV

Ezekiel 25 in the BONCB

Ezekiel 25 in the BONLT

Ezekiel 25 in the BONUT2

Ezekiel 25 in the BOPLNT

Ezekiel 25 in the BOSCB

Ezekiel 25 in the BOSNC

Ezekiel 25 in the BOTLNT

Ezekiel 25 in the BOVCB

Ezekiel 25 in the BOYCB

Ezekiel 25 in the BPBB

Ezekiel 25 in the BPH

Ezekiel 25 in the BSB

Ezekiel 25 in the CCB

Ezekiel 25 in the CUV

Ezekiel 25 in the CUVS

Ezekiel 25 in the DBT

Ezekiel 25 in the DGDNT

Ezekiel 25 in the DHNT

Ezekiel 25 in the DNT

Ezekiel 25 in the ELBE

Ezekiel 25 in the EMTV

Ezekiel 25 in the ESV

Ezekiel 25 in the FBV

Ezekiel 25 in the FEB

Ezekiel 25 in the GGMNT

Ezekiel 25 in the GNT

Ezekiel 25 in the HARY

Ezekiel 25 in the HNT

Ezekiel 25 in the IRVA

Ezekiel 25 in the IRVB

Ezekiel 25 in the IRVG

Ezekiel 25 in the IRVH

Ezekiel 25 in the IRVK

Ezekiel 25 in the IRVM

Ezekiel 25 in the IRVM2

Ezekiel 25 in the IRVO

Ezekiel 25 in the IRVP

Ezekiel 25 in the IRVT

Ezekiel 25 in the IRVT2

Ezekiel 25 in the IRVU

Ezekiel 25 in the ISVN

Ezekiel 25 in the JSNT

Ezekiel 25 in the KAPI

Ezekiel 25 in the KBT1ETNIK

Ezekiel 25 in the KBV

Ezekiel 25 in the KJV

Ezekiel 25 in the KNFD

Ezekiel 25 in the LBA

Ezekiel 25 in the LBLA

Ezekiel 25 in the LNT

Ezekiel 25 in the LSV

Ezekiel 25 in the MAAL

Ezekiel 25 in the MBV

Ezekiel 25 in the MBV2

Ezekiel 25 in the MHNT

Ezekiel 25 in the MKNFD

Ezekiel 25 in the MNG

Ezekiel 25 in the MNT

Ezekiel 25 in the MNT2

Ezekiel 25 in the MRS1T

Ezekiel 25 in the NAA

Ezekiel 25 in the NASB

Ezekiel 25 in the NBLA

Ezekiel 25 in the NBS

Ezekiel 25 in the NBVTP

Ezekiel 25 in the NET2

Ezekiel 25 in the NIV11

Ezekiel 25 in the NNT

Ezekiel 25 in the NNT2

Ezekiel 25 in the NNT3

Ezekiel 25 in the PDDPT

Ezekiel 25 in the PFNT

Ezekiel 25 in the RMNT

Ezekiel 25 in the SBIAS

Ezekiel 25 in the SBIBS

Ezekiel 25 in the SBIBS2

Ezekiel 25 in the SBICS

Ezekiel 25 in the SBIDS

Ezekiel 25 in the SBIGS

Ezekiel 25 in the SBIHS

Ezekiel 25 in the SBIIS

Ezekiel 25 in the SBIIS2

Ezekiel 25 in the SBIIS3

Ezekiel 25 in the SBIKS

Ezekiel 25 in the SBIKS2

Ezekiel 25 in the SBIMS

Ezekiel 25 in the SBIOS

Ezekiel 25 in the SBIPS

Ezekiel 25 in the SBISS

Ezekiel 25 in the SBITS

Ezekiel 25 in the SBITS2

Ezekiel 25 in the SBITS3

Ezekiel 25 in the SBITS4

Ezekiel 25 in the SBIUS

Ezekiel 25 in the SBIVS

Ezekiel 25 in the SBT

Ezekiel 25 in the SBT1E

Ezekiel 25 in the SCHL

Ezekiel 25 in the SNT

Ezekiel 25 in the SUSU

Ezekiel 25 in the SUSU2

Ezekiel 25 in the SYNO

Ezekiel 25 in the TBIAOTANT

Ezekiel 25 in the TBT1E

Ezekiel 25 in the TBT1E2

Ezekiel 25 in the TFTIP

Ezekiel 25 in the TFTU

Ezekiel 25 in the TGNTATF3T

Ezekiel 25 in the THAI

Ezekiel 25 in the TNFD

Ezekiel 25 in the TNT

Ezekiel 25 in the TNTIK

Ezekiel 25 in the TNTIL

Ezekiel 25 in the TNTIN

Ezekiel 25 in the TNTIP

Ezekiel 25 in the TNTIZ

Ezekiel 25 in the TOMA

Ezekiel 25 in the TTENT

Ezekiel 25 in the UBG

Ezekiel 25 in the UGV

Ezekiel 25 in the UGV2

Ezekiel 25 in the UGV3

Ezekiel 25 in the VBL

Ezekiel 25 in the VDCC

Ezekiel 25 in the YALU

Ezekiel 25 in the YAPE

Ezekiel 25 in the YBVTP

Ezekiel 25 in the ZBP