Ezekiel 37 (BOICB)

1 Aka nke ONYENWE ANYỊ dịkwasịrị m, o sitekwara nʼike Mmụọ nke Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ bulie m, debe m nʼetiti ndagwurugwu nke jupụtara nʼọkpụkpụ. 2 O mere ka m jegharịa nʼetiti ha. Ahụrụ m ọkpụkpụ kpọrọ nkụ, nke dị ukwuu nʼọnụọgụgụ, ka ha ghasa na ndagwurugwu ahụ. 3 Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ọkpụkpụ ndị a ha pụrụ ịdị ndị ọzọ?”Asịrị m, “Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ ọ bụ naanị gị onwe gị maara.” 4 Mgbe ahụ, ọ sịrị m, “Buo amụma nye ọkpụkpụ ndị ahụ, gwa ha, ‘Unu ọkpụkpụ niile kpọrọ nkụ, geenụ ntị nʼokwu nke ONYENWE ANYỊ. 5 Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ na-agwa ọkpụkpụ ndị a. Lee, aga m eme ka ume baa nʼime unu, unu ga-adịkwa ndụ. 6 Aga m etinyekwasị unu akwara, na anụ ahụ, werekwa akpụkpọ ahụ kpuchie unu. Aga m etinye ume nʼime unu, unu ga-adịkwa ndụ. Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ.’ ” 7 Ya mere, eburu m amụma dịka e sị nye m nʼiwu. Mgbe m nọ na-ebu amụma ahụ, anụrụ m ụzụ, ụzụ mkpọtụ. Ma lee, ọkpụkpụ ndị ahụ niile bịara ibe ha nso; ọkpụkpụ malitekwara ijikọta onwe ha ọnụ. 8 Mgbe m nọkwa na-ele anya, lee, ahụrụ m ka akwara na anụ ahụ malitere ịbịakwasị nʼelu ọkpụkpụ ndị ahụ, akpụkpọ ahụ kpuchikwara elu ha. Ma nʼoge a ume ọbụla adịghị nʼime ha. 9 Mgbe ahụ, ọ sịrị m, “Buo amụma nye ifufe; buo amụma, nwa nke mmadụ, sị ifufe, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwuru: site nʼakụkụ anọ nke ụwa bịa, gị ume na-enye ndụ, kukwasị ndị a e gburu egbu ka ha dịkwa ndụ ọzọ.’ ” 10 Ya mere, eburu m amụma dịka o si nye m nʼiwu. Ume ndụ banyekwara nʼime ha. Ha niile dịịrị ndụ, bilie ọtọ, guzo nʼụkwụ ha, ghọọ usuu ndị agha dị ukwuu nʼọnụọgụgụ. 11 Mgbe ahụ, ọ gwara m, “Nwa nke mmadụ, ọkpụkpụ ndị a nọchiri anya ụlọ Izrel niile. Ha na-asị, ‘Anyị aghọọla ọkpụkpụ kpọrọ nkụ, olileanya niile agwụkwala, anyị abụrụla ndị e bipụrụ.’ 12 Nʼihi ya, buo amụma gwa ha, ‘otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwuru, Ndị m, aga m emeghe ili unu, si nʼebe ahụ wepụta unu. Aga m eme ka unu lọghachitakwa nʼala Izrel. 13 Nʼikpeazụ, mgbe m meghere ili unu mee ka unu si nʼime ya pụta, unu bụ ndị m ga-amata na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ. 14 Aga m etinye Mmụọ m nʼime unu, unu ga-adị ndụ, lọghachikwa nʼala unu ọzọ. Unu ga-amatakwa na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ, ekwuola ya, meekwa ya, otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri.’ ” 15 Okwu ONYENWE ANYỊ ruru m ntị, sị, 16 “Nwa nke mmadụ, were osisi dee ihe ndị a nʼelu ya, ‘Osisi a nọchiri anya Juda na ndị Izrel e kekọtara ya na ha ọnụ.’ Werekwa osisi ọzọ deekwa okwu ndị a nʼelu ya. ‘Osisi a nọchiri anya Ifrem, na Josef, na ndị Izrel niile e jikọtara ha na ndị a ọnụ.’ 17 Jidekọtaa osisi abụọ ndị a ọnụ, mee ka ha bụrụ otu osisi nʼaka gị. 18 “Mgbe ndị gị jụrụ gị, ‘Ị gaghị egosi anyị ihe nke a pụtara?’ 19 gwa ha, sị, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ na-ekwu: Lee, agaje m iwere osisi Josef, nke dị Ifrem nʼaka, nke bụkwa ihe nọchiri anya ebo ụfọdụ ndị Izrel, jidekọtaa ya na osisi nọchiri anya Juda, mee ha ka ha ghọọ otu osisi, bụrụkwa otu nʼaka m.’ 20 Were mkpirisi osisi ndị ahụ i dere ihe nke dị nʼaka gị, gosi ha, 21 ma gwakwa ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ na-ekwu: Aga m esite na mba niile ndị Izrel jere biri kpọpụta ha. Aga m achịkọtakwa ha site nʼakụkụ niile, kpọbata ha nʼala nke aka ha. 22 Aga m eme ha ka ha bụrụ otu mba nʼala ahụ, nʼugwu niile nke Izrel. Ha ga-enwe naanị otu eze nke ga-achị ha niile. Ha agaghị abụkwa mba abụọ maọbụ alaeze abụọ ọzọ. 23 Ha agaghị ejikwa arụsị ha niile, maọbụ ihe a pịrị apị rụrụ arụ, maọbụ jiri ihe ọjọọ ndị ọzọ dị iche iche merụọ onwe ha ọzọ. Nʼihi na aga m azọpụta ha site na ịlaghachi azụ nʼụzọ mmehie ha niile, meekwa ka ha dị ọcha. Ha ga-abụ ndị m, mụ onwe m ga-abụkwa Chineke ha. 24 “ ‘Ohu m, Devid, ga-abụ eze ga-achị ha, ha ga-enwekwa otu onye ọzụzụ atụrụ. Ha ga-edebezu iwu m niile, na ụkpụrụ m niile. 25 Ha ga-ebi nʼala ahụ m nyere ohu m Jekọb, ala ebe nna nna ha biri. Ha na ụmụ ha ga-ebi nʼime ya. Ụmụ ụmụ ha ruo ọgbọ niile ga-ebikwa nʼime ya. Ohu m Devid ga-abụ eze ha ruo ebighị ebi. 26 Mụ na ha ga-agba ndụ udo, ọgbụgba ndụ nke ga-adị ruo mgbe ebighị ebi. Aga m agọzi ha, mee ka ha baa ụba. Nʼetiti ha kwa ka ụlọnsọ m ga-adị ruo mgbe ebighị ebi. 27 Ebe obibi m ga-abụkwa nʼetiti ha. E, aga m abụ Chineke ha, ha ga-abụkwa ndị m. 28 Mgbe ụlọnsọ m ga-adị nʼetiti ha ruo ebighị ebi, mba niile ga-amata na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ na-edo Izrel nsọ.’ ”

In Other Versions

Ezekiel 37 in the ANGEFD

Ezekiel 37 in the ANTPNG2D

Ezekiel 37 in the AS21

Ezekiel 37 in the BAGH

Ezekiel 37 in the BBPNG

Ezekiel 37 in the BBT1E

Ezekiel 37 in the BDS

Ezekiel 37 in the BEV

Ezekiel 37 in the BHAD

Ezekiel 37 in the BIB

Ezekiel 37 in the BLPT

Ezekiel 37 in the BNT

Ezekiel 37 in the BNTABOOT

Ezekiel 37 in the BNTLV

Ezekiel 37 in the BOATCB

Ezekiel 37 in the BOATCB2

Ezekiel 37 in the BOBCV

Ezekiel 37 in the BOCNT

Ezekiel 37 in the BOECS

Ezekiel 37 in the BOGWICC

Ezekiel 37 in the BOHCB

Ezekiel 37 in the BOHCV

Ezekiel 37 in the BOHLNT

Ezekiel 37 in the BOHNTLTAL

Ezekiel 37 in the BOILNTAP

Ezekiel 37 in the BOITCV

Ezekiel 37 in the BOKCV

Ezekiel 37 in the BOKCV2

Ezekiel 37 in the BOKHWOG

Ezekiel 37 in the BOKSSV

Ezekiel 37 in the BOLCB

Ezekiel 37 in the BOLCB2

Ezekiel 37 in the BOMCV

Ezekiel 37 in the BONAV

Ezekiel 37 in the BONCB

Ezekiel 37 in the BONLT

Ezekiel 37 in the BONUT2

Ezekiel 37 in the BOPLNT

Ezekiel 37 in the BOSCB

Ezekiel 37 in the BOSNC

Ezekiel 37 in the BOTLNT

Ezekiel 37 in the BOVCB

Ezekiel 37 in the BOYCB

Ezekiel 37 in the BPBB

Ezekiel 37 in the BPH

Ezekiel 37 in the BSB

Ezekiel 37 in the CCB

Ezekiel 37 in the CUV

Ezekiel 37 in the CUVS

Ezekiel 37 in the DBT

Ezekiel 37 in the DGDNT

Ezekiel 37 in the DHNT

Ezekiel 37 in the DNT

Ezekiel 37 in the ELBE

Ezekiel 37 in the EMTV

Ezekiel 37 in the ESV

Ezekiel 37 in the FBV

Ezekiel 37 in the FEB

Ezekiel 37 in the GGMNT

Ezekiel 37 in the GNT

Ezekiel 37 in the HARY

Ezekiel 37 in the HNT

Ezekiel 37 in the IRVA

Ezekiel 37 in the IRVB

Ezekiel 37 in the IRVG

Ezekiel 37 in the IRVH

Ezekiel 37 in the IRVK

Ezekiel 37 in the IRVM

Ezekiel 37 in the IRVM2

Ezekiel 37 in the IRVO

Ezekiel 37 in the IRVP

Ezekiel 37 in the IRVT

Ezekiel 37 in the IRVT2

Ezekiel 37 in the IRVU

Ezekiel 37 in the ISVN

Ezekiel 37 in the JSNT

Ezekiel 37 in the KAPI

Ezekiel 37 in the KBT1ETNIK

Ezekiel 37 in the KBV

Ezekiel 37 in the KJV

Ezekiel 37 in the KNFD

Ezekiel 37 in the LBA

Ezekiel 37 in the LBLA

Ezekiel 37 in the LNT

Ezekiel 37 in the LSV

Ezekiel 37 in the MAAL

Ezekiel 37 in the MBV

Ezekiel 37 in the MBV2

Ezekiel 37 in the MHNT

Ezekiel 37 in the MKNFD

Ezekiel 37 in the MNG

Ezekiel 37 in the MNT

Ezekiel 37 in the MNT2

Ezekiel 37 in the MRS1T

Ezekiel 37 in the NAA

Ezekiel 37 in the NASB

Ezekiel 37 in the NBLA

Ezekiel 37 in the NBS

Ezekiel 37 in the NBVTP

Ezekiel 37 in the NET2

Ezekiel 37 in the NIV11

Ezekiel 37 in the NNT

Ezekiel 37 in the NNT2

Ezekiel 37 in the NNT3

Ezekiel 37 in the PDDPT

Ezekiel 37 in the PFNT

Ezekiel 37 in the RMNT

Ezekiel 37 in the SBIAS

Ezekiel 37 in the SBIBS

Ezekiel 37 in the SBIBS2

Ezekiel 37 in the SBICS

Ezekiel 37 in the SBIDS

Ezekiel 37 in the SBIGS

Ezekiel 37 in the SBIHS

Ezekiel 37 in the SBIIS

Ezekiel 37 in the SBIIS2

Ezekiel 37 in the SBIIS3

Ezekiel 37 in the SBIKS

Ezekiel 37 in the SBIKS2

Ezekiel 37 in the SBIMS

Ezekiel 37 in the SBIOS

Ezekiel 37 in the SBIPS

Ezekiel 37 in the SBISS

Ezekiel 37 in the SBITS

Ezekiel 37 in the SBITS2

Ezekiel 37 in the SBITS3

Ezekiel 37 in the SBITS4

Ezekiel 37 in the SBIUS

Ezekiel 37 in the SBIVS

Ezekiel 37 in the SBT

Ezekiel 37 in the SBT1E

Ezekiel 37 in the SCHL

Ezekiel 37 in the SNT

Ezekiel 37 in the SUSU

Ezekiel 37 in the SUSU2

Ezekiel 37 in the SYNO

Ezekiel 37 in the TBIAOTANT

Ezekiel 37 in the TBT1E

Ezekiel 37 in the TBT1E2

Ezekiel 37 in the TFTIP

Ezekiel 37 in the TFTU

Ezekiel 37 in the TGNTATF3T

Ezekiel 37 in the THAI

Ezekiel 37 in the TNFD

Ezekiel 37 in the TNT

Ezekiel 37 in the TNTIK

Ezekiel 37 in the TNTIL

Ezekiel 37 in the TNTIN

Ezekiel 37 in the TNTIP

Ezekiel 37 in the TNTIZ

Ezekiel 37 in the TOMA

Ezekiel 37 in the TTENT

Ezekiel 37 in the UBG

Ezekiel 37 in the UGV

Ezekiel 37 in the UGV2

Ezekiel 37 in the UGV3

Ezekiel 37 in the VBL

Ezekiel 37 in the VDCC

Ezekiel 37 in the YALU

Ezekiel 37 in the YAPE

Ezekiel 37 in the YBVTP

Ezekiel 37 in the ZBP