Ezekiel 39 (BOICB)

1 “Ma gị, nwa nke mmadụ buo amụma megide Gog, sị, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ na-ekwu: Ana m emegide gị, Gog, onyeisi nke Meshek na Tubal. 2 Aga m echigharị gị, kpụrụ gị na-aga. Aga m esi nʼebe dịkarịsịrị anya nʼakụkụ ugwu kpọta gị, ziga gị ka i buso ugwu niile nke Izrel agha. 3 Mgbe ahụ, aga m etichapụ ụta dị gị nʼaka ekpe, meekwa ka àkụ niile nke dị nʼaka nri gị dachapụ. 4 Nʼelu ugwu niile nke Izrel ka ị ga-ada, gị onwe gị, na usuu ndị agha gị niile, na mba niile dị iche iche ndị na-eso gị. Udele niile dị iche iche na anụ ọhịa niile ka m ga-enyefe anụ ahụ unu ka ha were unu mere ihe oriri. 5 Ị ga-ada nʼọhịa na-enweghị ebe nzobe, nʼihi na m ekwuola ya. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwubiri. 6 Aga m awụkwasị ọkụ nʼahụ Magog, na nʼahụ ndị ahụ niile bi nʼudo, nʼọnụ mmiri niile. Ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ. 7 “ ‘Aga m eme ka amara aha nsọ m nʼetiti ndị m bụ Izrel. Agaghị m ekwekwa ka e lelịa aha nsọ m anya ọzọ. Mba niile dị iche iche ga-amatakwa na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ, bụ Onye nsọ nọ nʼIzrel. 8 Lee, ọ na-abịa, nʼezie, ọ ga-emekwa, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwubiri. Nke a bụ ụbọchị ahụ nke m kwuru ihe banyere ya. 9 “ ‘Nʼoge ahụ, ndị bi nʼobodo niile nke Izrel ga-apụ tụtụkọtaa ngwa agha ndị ahụ, were fụnwue ọkụ, surekwaa ha ọkụ, ma ọta ukwu ma ọta nta niile, ụta na àkụ niile, ma mkpọ agha na ùbe niile. Ọ bụ afọ asaa ka ha ga-eji ha mere nkụ. 10 Ha agaghị akpatakwa nkụ site nʼọhịa ọzọ, maọbụ gbuta ha site nʼoke ọhịa, nʼihi na ha ga-eji ngwa agha ndị a mere ihe ịfụnwu ọkụ. Mgbe ahụ, ha ga-akwata ihe onwunwe nke ndị ahụ kwakọrọ ihe onwunwe ha nʼagha, lụtakwa ihe onwunwe nke ndị ahụ lụnara ha ihe onwunwe ha nʼike. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwubiri. 11 “ ‘Nʼụbọchị ahụ, aga m enye Gog ebe olili ya nʼIzrel, nʼime ndagwurugwu si ọwụwa anyanwụ gawa nʼụzọ oke osimiri. Ọ ga-anọchi ụzọ ndị ije nʼihi na ebe ahụ ka a ga-eli Gog na usuu ndị agha ya. Ya mere, a ga-akpọ ya Ndagwurugwu Hamọn Gog. 12 “ ‘Ọnwa asaa ka ọ ga-ewe ndị Izrel ili ozu ahụ niile, ime ka ala ahụ dị ọcha. 13 Ndị niile nke ala ahụ ga-eli ha, ụbọchị ahụ m ga-eme ka ebube m pụta ìhè ga-abụ ụbọchị ihe ncheta nye ha. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwubiri. 14 A ga-ekewapụtakwa ndị ọrụ ha ga-abụ naanị ime ka ala ahụ dị ọcha. Ha ga-ejegharị nʼala ahụ niile, ha na ndị ọzọ, na-eli ozu ọbụla bụ ndị tọgbọrọ nʼala.“ ‘Mgbe ọnwa asaa zuru, ha ga-edo anya chọgharịa nʼala ahụ ma o nwere ebe ozu ọzọ dị. 15 Mgbe ahụ, ha na-ejegharị, ọ bụrụ na onye ọbụla achọta ọkpụkpụ mmadụ ọ ga-amanye ihe ịrịbama nʼakụkụ ya, ka ndị na-eli ozu hụ ha, kporokwa ha gaa na Ndagwurugwu Gog na ndị agha ya lie ha. 16 Ọzọkwa, otu obodo aha ya bụ Hamona, nke pụtara ọtụtụ, ga-adị nʼebe ahụ. Otu a ka ha ga-esi mee ka ala ahụ dị ọcha.’ 17 “Nwa nke mmadụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwuru, kpọọ ụmụ nnụnụ niile oku, na anụ ọhịa niile dị iche iche, sị ha, ‘Chịkọtaanụ onwe unu, site nʼakụkụ niile bịanụ nʼọchụchụ aja m, nke mụ onwe m na-achụ nʼihi unu, bụ aja dị ukwuu nke m na-achụ nʼelu ugwu niile dị nʼIzrel. Nʼebe ahụ ka unu ga-anọ taa anụ, ṅụọkwa ọbara. 18 Anụ ahụ ndị dị ike ka unu ga-eri, ọ bụkwa ọbara ndịisi niile nke ụwa ka unu ga-aṅụ, dịka a ga-asị na ha bụ ebule na ụmụ atụrụ, na mkpi, na oke ehi, anụ mara abụba nke si na Bashan. 19 Unu ga-erijukwa abụba afọ, ṅụbigakwa ọbara oke ruo mgbe ọ ga-ebu unu, site nʼaja mmemme nke m na-achụ nʼihi unu. 20 Afọ anụ ịnyịnya, na ụgbọala, na nke ndị dike, na nke ndị agha niile ga-eju unu na tebul m.’ Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwubiri ya. 21 “Mgbe ahụ, aga m egosi ebube m na nsọpụrụ m nʼetiti mba niile dị iche iche. Mba niile ga-ahụkwa ahụhụ nke m tara ha, na aka m nke m tụkwasịrị ha. 22 Site nʼụbọchị ahụ gaa nʼihu, ụlọ Izrel ga-amata na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ Chineke ha. 23 Mba niile ga-amatakwa na ọ bụ nʼihi mmehie ka e ji dọta Izrel nʼagha, buru ha jee mba dị iche iche. Ha ga-amata na ihe dị otu a dakwasịrị ha nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi ha. Ọ bụ nʼihi ya ka m ji zoo ihu m site nʼebe ha nọ, were ha nyefee nʼaka ndị iro ha. Ha niile dakwara site na mma agha. 24 Atara m ha ahụhụ dịka adịghị ọcha ha na ajọ omume ha si dị. Ezokwara m ihu m site nʼebe ha nọ. 25 “Nʼihi ya, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwuru, Aga m eme ka Jekọb a dọtara nʼagha lọta. Aga m enwekwa obi ebere nʼahụ ndị Izrel niile. Aga m esitekwa nʼekworo mee ka aha m dịgide nsọ. 26 Ha ga-echezọkwa ihe ihere ha, na-ekwesighị ntụkwasị obi ha niile, nke ha gosiri m, mgbe ha biri nʼudo nʼala ha, na-enweghị onye na-eme ka ha tụọ egwu. 27 Mgbe m mere ka ha site na mba dị iche iche pụta, mgbe m sitere nʼala niile nke ndị iro ha kpọpụta ha, aga m esite na ha gosi ịdị nsọ m nye mba dị iche iche. 28 Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ Chineke ha. Ha ga-amata na ọ bụ ezie na ọ bụ m mere ka a dọta ha nʼagha buru ha jee mba dị iche iche, na m ga-achịkọta ha mee ka ha lọghachi nʼala nke aka ha. Ọ dịkwaghị onye a ga-ahapụ na mba ọzọ. 29 Agaghị m ezokwa ihu m ọzọ nʼebe ha nọ, nʼihi na aga m awụkwasị ụlọ Izrel Mmụọ m. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwubiri ya.”

In Other Versions

Ezekiel 39 in the ANGEFD

Ezekiel 39 in the ANTPNG2D

Ezekiel 39 in the AS21

Ezekiel 39 in the BAGH

Ezekiel 39 in the BBPNG

Ezekiel 39 in the BBT1E

Ezekiel 39 in the BDS

Ezekiel 39 in the BEV

Ezekiel 39 in the BHAD

Ezekiel 39 in the BIB

Ezekiel 39 in the BLPT

Ezekiel 39 in the BNT

Ezekiel 39 in the BNTABOOT

Ezekiel 39 in the BNTLV

Ezekiel 39 in the BOATCB

Ezekiel 39 in the BOATCB2

Ezekiel 39 in the BOBCV

Ezekiel 39 in the BOCNT

Ezekiel 39 in the BOECS

Ezekiel 39 in the BOGWICC

Ezekiel 39 in the BOHCB

Ezekiel 39 in the BOHCV

Ezekiel 39 in the BOHLNT

Ezekiel 39 in the BOHNTLTAL

Ezekiel 39 in the BOILNTAP

Ezekiel 39 in the BOITCV

Ezekiel 39 in the BOKCV

Ezekiel 39 in the BOKCV2

Ezekiel 39 in the BOKHWOG

Ezekiel 39 in the BOKSSV

Ezekiel 39 in the BOLCB

Ezekiel 39 in the BOLCB2

Ezekiel 39 in the BOMCV

Ezekiel 39 in the BONAV

Ezekiel 39 in the BONCB

Ezekiel 39 in the BONLT

Ezekiel 39 in the BONUT2

Ezekiel 39 in the BOPLNT

Ezekiel 39 in the BOSCB

Ezekiel 39 in the BOSNC

Ezekiel 39 in the BOTLNT

Ezekiel 39 in the BOVCB

Ezekiel 39 in the BOYCB

Ezekiel 39 in the BPBB

Ezekiel 39 in the BPH

Ezekiel 39 in the BSB

Ezekiel 39 in the CCB

Ezekiel 39 in the CUV

Ezekiel 39 in the CUVS

Ezekiel 39 in the DBT

Ezekiel 39 in the DGDNT

Ezekiel 39 in the DHNT

Ezekiel 39 in the DNT

Ezekiel 39 in the ELBE

Ezekiel 39 in the EMTV

Ezekiel 39 in the ESV

Ezekiel 39 in the FBV

Ezekiel 39 in the FEB

Ezekiel 39 in the GGMNT

Ezekiel 39 in the GNT

Ezekiel 39 in the HARY

Ezekiel 39 in the HNT

Ezekiel 39 in the IRVA

Ezekiel 39 in the IRVB

Ezekiel 39 in the IRVG

Ezekiel 39 in the IRVH

Ezekiel 39 in the IRVK

Ezekiel 39 in the IRVM

Ezekiel 39 in the IRVM2

Ezekiel 39 in the IRVO

Ezekiel 39 in the IRVP

Ezekiel 39 in the IRVT

Ezekiel 39 in the IRVT2

Ezekiel 39 in the IRVU

Ezekiel 39 in the ISVN

Ezekiel 39 in the JSNT

Ezekiel 39 in the KAPI

Ezekiel 39 in the KBT1ETNIK

Ezekiel 39 in the KBV

Ezekiel 39 in the KJV

Ezekiel 39 in the KNFD

Ezekiel 39 in the LBA

Ezekiel 39 in the LBLA

Ezekiel 39 in the LNT

Ezekiel 39 in the LSV

Ezekiel 39 in the MAAL

Ezekiel 39 in the MBV

Ezekiel 39 in the MBV2

Ezekiel 39 in the MHNT

Ezekiel 39 in the MKNFD

Ezekiel 39 in the MNG

Ezekiel 39 in the MNT

Ezekiel 39 in the MNT2

Ezekiel 39 in the MRS1T

Ezekiel 39 in the NAA

Ezekiel 39 in the NASB

Ezekiel 39 in the NBLA

Ezekiel 39 in the NBS

Ezekiel 39 in the NBVTP

Ezekiel 39 in the NET2

Ezekiel 39 in the NIV11

Ezekiel 39 in the NNT

Ezekiel 39 in the NNT2

Ezekiel 39 in the NNT3

Ezekiel 39 in the PDDPT

Ezekiel 39 in the PFNT

Ezekiel 39 in the RMNT

Ezekiel 39 in the SBIAS

Ezekiel 39 in the SBIBS

Ezekiel 39 in the SBIBS2

Ezekiel 39 in the SBICS

Ezekiel 39 in the SBIDS

Ezekiel 39 in the SBIGS

Ezekiel 39 in the SBIHS

Ezekiel 39 in the SBIIS

Ezekiel 39 in the SBIIS2

Ezekiel 39 in the SBIIS3

Ezekiel 39 in the SBIKS

Ezekiel 39 in the SBIKS2

Ezekiel 39 in the SBIMS

Ezekiel 39 in the SBIOS

Ezekiel 39 in the SBIPS

Ezekiel 39 in the SBISS

Ezekiel 39 in the SBITS

Ezekiel 39 in the SBITS2

Ezekiel 39 in the SBITS3

Ezekiel 39 in the SBITS4

Ezekiel 39 in the SBIUS

Ezekiel 39 in the SBIVS

Ezekiel 39 in the SBT

Ezekiel 39 in the SBT1E

Ezekiel 39 in the SCHL

Ezekiel 39 in the SNT

Ezekiel 39 in the SUSU

Ezekiel 39 in the SUSU2

Ezekiel 39 in the SYNO

Ezekiel 39 in the TBIAOTANT

Ezekiel 39 in the TBT1E

Ezekiel 39 in the TBT1E2

Ezekiel 39 in the TFTIP

Ezekiel 39 in the TFTU

Ezekiel 39 in the TGNTATF3T

Ezekiel 39 in the THAI

Ezekiel 39 in the TNFD

Ezekiel 39 in the TNT

Ezekiel 39 in the TNTIK

Ezekiel 39 in the TNTIL

Ezekiel 39 in the TNTIN

Ezekiel 39 in the TNTIP

Ezekiel 39 in the TNTIZ

Ezekiel 39 in the TOMA

Ezekiel 39 in the TTENT

Ezekiel 39 in the UBG

Ezekiel 39 in the UGV

Ezekiel 39 in the UGV2

Ezekiel 39 in the UGV3

Ezekiel 39 in the VBL

Ezekiel 39 in the VDCC

Ezekiel 39 in the YALU

Ezekiel 39 in the YAPE

Ezekiel 39 in the YBVTP

Ezekiel 39 in the ZBP