Ezekiel 45 (BOICB)

1 “ ‘Mgbe unu ga-eke ala ahụ dịka ihe nketa, unu ga-ebu ụzọ nye ONYENWE ANYỊ otu oke nʼime ya ka ọ bụrụ oke dị nsọ nke ala ahụ. Ogologo ya ga-adị kilomita iri na atọ, obosara ya ga-abụ kilomita iri na otu. Ihe dị nsọ ka ala ahụ niile ga-abụ gbaa gburugburu. 2 Site nʼala, otu akụkụ dị narị mita abụọ na iri itoolu na otu, na iri sentimita asaa na ise, ga-abụ maka ebe nsọ. A ga-ahapụ ala dị iri mita abụọ na itoolu gburugburu ya. 3 Site nʼoke ebe ahụ dị nsọ, tụpụta oke ogologo ya dị kilomita iri na atọ, obosara ya kilomita ise na ọkara. Ọ bụ nʼime ya ka ebe nsọ, ya bụ Ebe ahụ Kachasị Nsọ ga-adị. 4 Ọ ga-abụ oke ala ndị nchụaja, ndị na-eje ozi nʼebe nsọ, na ndị na-abịa nso ije ozi nʼihu ONYENWE ANYỊ. Ọ ga-abụkwa ebe ụlọ obibi ha ga-adị, bụrụkwa ebe dị nsọ maka ebe nsọ ahụ. 5 Ala ọzọ dị ya nʼakụkụ, nke ga-adị kilomita iri na atọ nʼogologo, kilomita ise na ọkara nʼobosara ya, ga-abụ ebe obibi ndị Livayị, ndị na-arụ ọrụ nʼụlọnsọ ukwuu ahụ. 6 “ ‘Nʼakụkụ obodo nsọ ka a ga-ekewapụta ala nke ogologo ya dị kilomita iri na atọ, nke obosara ya dịkwa kilomita abụọ na ọkara, nke a ga-abụ nke ndị Izrel. 7 “ ‘A ga-ewepụta ala pụrụ iche maka nwa eze. Ala a ga-adị nʼakụkụ abụọ nke ala nsọ ahụ, na obodo ahụ. Ala a ga-agbatịrị site nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ebe oke ya dị ruo nʼosimiri Mediterenịa. Ọ ga-esitekwa nʼoke ala ya nʼọwụwa anyanwụ gbatịrị ruo nʼebe ebo Izrel nwere ala ha. Nʼụzọ dị otu a, ala a ga-aha ka ala ebo Izrel ketara. 8 Ala a ga-abụrụ ya ihe nketa nʼIzrel. Ndịisi m agaghị emegbu ndị m ọzọ, ma ha ga-ahapụ ndị Izrel ka ha keta ala ndị a dịka ebo niile ha si dị. 9 “ ‘Nke a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwuru: O zuolara unu, unu ụmụ ndị eze Izrel. Kwụsịnụ ịpụnara ndị m ihe ha nwere nʼike, kpeenụ ikpe ziri ezi na-emekwa ihe kwesiri ekwesi. Kwụsịnụ ịchụpụ ndị m site nʼihe ha, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwupụtara. 10 Ka ihe ọtụtụ unu ji ere ahịa unu bụrụ ezigbo efa na ezigbo baf nke a na-ejighị aghụghọ kpụọ. 11 Ka ihe ọtụtụ homa bụrụ ihe unu ga-eji na-atụ ihe niile, ma mmanụ, ma ọka. Ihe ọtụtụ ndị ọzọ unu ga-enwe ga-abụ efa, nke bụ otu ụzọ nʼụzọ iri nke homa, maka ịtụ ihe dịka ọka. Nke ọzọ bụ baf, nke bụkwa otu ụzọ nʼụzọ iri nke homa, maka ịtụ ihe dịka mmanụ. 12 Ihe ọtụtụ a ga-eji mata ịdị arọ nke ihe ọbụla ga-abụ shekel. Ihe a ga-eji gbanwere shekel a bụ iri gera abụọ naanị. Iri shekel isii ka a ga-ejikwa gbanwere otu mina. 13 “ ‘Nke a bụ onyinye pụrụ iche unu ga-enye: otu ụzọ nʼụzọ isii nke efa, site nʼotu homa nke ọka wiiti unu. Unu ga-enyekwa otu ụzọ nʼụzọ isii nke efa site nʼotu homa ọka balị unu. 14 Dịka e nyere ya nʼiwu, unu ga-eji ihe ọtụtụ baf, weta mmanụ oliv bụ otu ụzọ nʼime ụzọ iri site nʼotu kọ ọbụla (kọ na-erita baf iri, nʼihi na baf iri, bụ ọtụtụ otu homa). 15 Ọzọkwa, otu atụrụ nke sitere nʼigwe atụrụ dị narị atụrụ abụọ, nke si nʼebe ịta nri nke Izrel a gbara mmiri nke ọma ka unu ga-eweta. A ga-eji ndị a chụọ aja mkpụrụ ọka, na aja nsure ọkụ, na aja udo, maka ikpuchiri ndị wetara ha mmehie ha. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwubiri ya. 16 Ndị niile nke nʼala ahụ ga-eso nwa eze Izrel bute onyinye ndị a. 17 Nwa eze ahụ ka ọ dịrị iweta ihe eji achụ aja nsure ọkụ niile, aja mkpụrụ ọka, aja ihe ọṅụṅụ niile, na nke Ọnwa ọhụrụ nakwa nke ụbọchị izuike niile, nʼoge mmemme niile nke ndị Izrel. Ọ ga-ewetakwa ihe eji achụ aja mmehie, aja mkpụrụ ọka, aja nsure ọkụ, aja udo maka ikpuchiri ụmụ Izrel mmehie ha. 18 “ ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwuru: Nʼụbọchị mbụ nke ọnwa mbụ ọbụla, unu ga-ewere nwa oke ehi nke na-enweghị ntụpọ, chụọ aja ido ụlọnsọ m nsọ. 19 Onye nchụaja ga-ewere ụfọdụ ọbara nke aja mmehie ahụ tee ya nʼakụkụ ọnụ ụzọ ụlọnsọ m, na nʼakụkụ anọ nke ọnụ ebe ịchụ aja, na nʼahụ ibo nke ọnụ ụzọ ogige ime. 20 Unu ga-emekwa otu ihe ahụ nʼabalị asaa nke ọnwa ahụ nʼihi onye ọbụla mehiere na-amaghị ama, maka ikpuchi mmehie metụtara ụlọnsọ m. 21 “ ‘Nʼụbọchị nke iri na anọ nke ọnwa mbụ, ka unu ga-edebe Mmemme Ngabiga. Ọ ga-abụ mmemme abalị asaa. Nʼụbọchị ndị a, naanị achịcha nke a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee ka unu ga-eri. 22 Nʼụbọchị ahụ, onyeisi ga-eweta otu nwa oke ehi maka aja mmehie nke onwe ya, na maka mmehie mmadụ niile nke ala ahụ. 23 Nʼụbọchị asaa nke mmemme ahụ, kwa ụbọchị, ọ ga-eweta oke ehi asaa na ebule asaa, ndị na-enweghị ntụpọ ọbụla, dịka ihe ịchụ aja nsure ọkụ nye ONYENWE ANYỊ. Ọ ga-enyekwa nwa mkpi kwa ụbọchị maka aja mmehie. 24 Ọ ga-ewetakwa nʼihi onyinye ịnata ihuọma, narị lita ọka anọ na iri itoolu, nke bụ otu ọtụtụ otu oke ehi, otu ọtụtụ otu ebule. Tinyere lita mmanụ oliv atọ na ụma asatọ. Lita mmanụ atọ na ụma asatọ dịkwara otu efaf ọka. 25 “ ‘Nʼoge mmemme ụbọchị asaa ahụ, nke ga-ebido nʼụbọchị iri na ise nke ọnwa asaa, ọ ga-ewetakwa ihe a ga-eji chụọ aja mmehie na aja nsure ọkụ, na aja mkpụrụ ọka, na mmanụ.

In Other Versions

Ezekiel 45 in the ANGEFD

Ezekiel 45 in the ANTPNG2D

Ezekiel 45 in the AS21

Ezekiel 45 in the BAGH

Ezekiel 45 in the BBPNG

Ezekiel 45 in the BBT1E

Ezekiel 45 in the BDS

Ezekiel 45 in the BEV

Ezekiel 45 in the BHAD

Ezekiel 45 in the BIB

Ezekiel 45 in the BLPT

Ezekiel 45 in the BNT

Ezekiel 45 in the BNTABOOT

Ezekiel 45 in the BNTLV

Ezekiel 45 in the BOATCB

Ezekiel 45 in the BOATCB2

Ezekiel 45 in the BOBCV

Ezekiel 45 in the BOCNT

Ezekiel 45 in the BOECS

Ezekiel 45 in the BOGWICC

Ezekiel 45 in the BOHCB

Ezekiel 45 in the BOHCV

Ezekiel 45 in the BOHLNT

Ezekiel 45 in the BOHNTLTAL

Ezekiel 45 in the BOILNTAP

Ezekiel 45 in the BOITCV

Ezekiel 45 in the BOKCV

Ezekiel 45 in the BOKCV2

Ezekiel 45 in the BOKHWOG

Ezekiel 45 in the BOKSSV

Ezekiel 45 in the BOLCB

Ezekiel 45 in the BOLCB2

Ezekiel 45 in the BOMCV

Ezekiel 45 in the BONAV

Ezekiel 45 in the BONCB

Ezekiel 45 in the BONLT

Ezekiel 45 in the BONUT2

Ezekiel 45 in the BOPLNT

Ezekiel 45 in the BOSCB

Ezekiel 45 in the BOSNC

Ezekiel 45 in the BOTLNT

Ezekiel 45 in the BOVCB

Ezekiel 45 in the BOYCB

Ezekiel 45 in the BPBB

Ezekiel 45 in the BPH

Ezekiel 45 in the BSB

Ezekiel 45 in the CCB

Ezekiel 45 in the CUV

Ezekiel 45 in the CUVS

Ezekiel 45 in the DBT

Ezekiel 45 in the DGDNT

Ezekiel 45 in the DHNT

Ezekiel 45 in the DNT

Ezekiel 45 in the ELBE

Ezekiel 45 in the EMTV

Ezekiel 45 in the ESV

Ezekiel 45 in the FBV

Ezekiel 45 in the FEB

Ezekiel 45 in the GGMNT

Ezekiel 45 in the GNT

Ezekiel 45 in the HARY

Ezekiel 45 in the HNT

Ezekiel 45 in the IRVA

Ezekiel 45 in the IRVB

Ezekiel 45 in the IRVG

Ezekiel 45 in the IRVH

Ezekiel 45 in the IRVK

Ezekiel 45 in the IRVM

Ezekiel 45 in the IRVM2

Ezekiel 45 in the IRVO

Ezekiel 45 in the IRVP

Ezekiel 45 in the IRVT

Ezekiel 45 in the IRVT2

Ezekiel 45 in the IRVU

Ezekiel 45 in the ISVN

Ezekiel 45 in the JSNT

Ezekiel 45 in the KAPI

Ezekiel 45 in the KBT1ETNIK

Ezekiel 45 in the KBV

Ezekiel 45 in the KJV

Ezekiel 45 in the KNFD

Ezekiel 45 in the LBA

Ezekiel 45 in the LBLA

Ezekiel 45 in the LNT

Ezekiel 45 in the LSV

Ezekiel 45 in the MAAL

Ezekiel 45 in the MBV

Ezekiel 45 in the MBV2

Ezekiel 45 in the MHNT

Ezekiel 45 in the MKNFD

Ezekiel 45 in the MNG

Ezekiel 45 in the MNT

Ezekiel 45 in the MNT2

Ezekiel 45 in the MRS1T

Ezekiel 45 in the NAA

Ezekiel 45 in the NASB

Ezekiel 45 in the NBLA

Ezekiel 45 in the NBS

Ezekiel 45 in the NBVTP

Ezekiel 45 in the NET2

Ezekiel 45 in the NIV11

Ezekiel 45 in the NNT

Ezekiel 45 in the NNT2

Ezekiel 45 in the NNT3

Ezekiel 45 in the PDDPT

Ezekiel 45 in the PFNT

Ezekiel 45 in the RMNT

Ezekiel 45 in the SBIAS

Ezekiel 45 in the SBIBS

Ezekiel 45 in the SBIBS2

Ezekiel 45 in the SBICS

Ezekiel 45 in the SBIDS

Ezekiel 45 in the SBIGS

Ezekiel 45 in the SBIHS

Ezekiel 45 in the SBIIS

Ezekiel 45 in the SBIIS2

Ezekiel 45 in the SBIIS3

Ezekiel 45 in the SBIKS

Ezekiel 45 in the SBIKS2

Ezekiel 45 in the SBIMS

Ezekiel 45 in the SBIOS

Ezekiel 45 in the SBIPS

Ezekiel 45 in the SBISS

Ezekiel 45 in the SBITS

Ezekiel 45 in the SBITS2

Ezekiel 45 in the SBITS3

Ezekiel 45 in the SBITS4

Ezekiel 45 in the SBIUS

Ezekiel 45 in the SBIVS

Ezekiel 45 in the SBT

Ezekiel 45 in the SBT1E

Ezekiel 45 in the SCHL

Ezekiel 45 in the SNT

Ezekiel 45 in the SUSU

Ezekiel 45 in the SUSU2

Ezekiel 45 in the SYNO

Ezekiel 45 in the TBIAOTANT

Ezekiel 45 in the TBT1E

Ezekiel 45 in the TBT1E2

Ezekiel 45 in the TFTIP

Ezekiel 45 in the TFTU

Ezekiel 45 in the TGNTATF3T

Ezekiel 45 in the THAI

Ezekiel 45 in the TNFD

Ezekiel 45 in the TNT

Ezekiel 45 in the TNTIK

Ezekiel 45 in the TNTIL

Ezekiel 45 in the TNTIN

Ezekiel 45 in the TNTIP

Ezekiel 45 in the TNTIZ

Ezekiel 45 in the TOMA

Ezekiel 45 in the TTENT

Ezekiel 45 in the UBG

Ezekiel 45 in the UGV

Ezekiel 45 in the UGV2

Ezekiel 45 in the UGV3

Ezekiel 45 in the VBL

Ezekiel 45 in the VDCC

Ezekiel 45 in the YALU

Ezekiel 45 in the YAPE

Ezekiel 45 in the YBVTP

Ezekiel 45 in the ZBP