Ezekiel 8 (BOICB)

1 Nʼafọ nke isii, nʼọnwa nke isii, nʼụbọchị nke ise nke ọnwa ahụ, mgbe mụ onwe m nọdụ ala nʼụlọ m, ndị okenye Juda na-anọdụkwa ala nʼihu m, aka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ dịkwasịrị m nʼahụ nʼebe ahụ. 2 Ahụrụ m oyiyi yiri mmadụ. Akụkụ oyiyi a nke dị site nʼụkwụ ya ruo nʼala ya na-acha dịka ọkụ, sitekwanụ nʼụkwụ ya rigoo, ọ na-egbu nnọọ amụma dịka nkume amba dị oke ọnụahịa. 3 Oyiyi a setịpụrụ ihe dịka aka mmadụ, jiri ya jide m nʼagịrị isi m. Mgbe ahụ, Mmụọ nke Chineke buliri m elu nʼetiti ala na mbara eluigwe. Nʼime ọhụ nke Chineke, o buuru m jee Jerusalem, nʼọnụ ụzọ ama nke dị nʼugwu, nʼime ogige ya, ebe arụsị ahụ na-akpasu ekworo guzo. 4 Ma, lee, ebube Chineke Izrel jupụtara nʼebe ahụ, dị ka m si hụ ya na mbụ na ndagwurugwu. 5 Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, welie anya gị lee nʼụzọ nke ugwu.” Eweliri m anya m lee nʼụzọ ugwu, ma lee, nʼọnụ ụzọ e si abata nʼime ebe ịchụ aja, ahụrụ m oyiyi arụsị ekworo ka o guzo nʼakụkụ ugwu ya. 6 Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ị na-ahụ ihe ha na-eme, arụ dị egwu nke ụlọ Izrel na-eme nʼebe a, ihe ndị ga-achụpụ m nʼebe dị anya site nʼebe nsọ m? Ma ị ga-ahụkwa ihe arụ ndị dị ukwuu karịa ndị a.” 7 O mere ka m guzo nʼọnụ ụzọ ogige ahụ, mgbe m lere anya, ahụrụ m oghere dị nʼaja ụlọ ahụ. 8 Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ugbu a gwupuo aja ụlọ a.” Mgbe m gwupuru ya, ahụrụ m ọnụ ụzọ e si aba nʼebe ahụ. 9 Ọ sịrị m, “Banye nʼime ka ị hụ ihe arụ ọjọọ niile nke ha na-eme nʼebe a.” 10 Abanyere m hụ na ihe jupụtara nʼahụ ụlọ ahụ bụ naanị oyiyi e sere ese, nke ihe na-akpụ akpụ dịka agwọ dị iche iche, ngwere na anụmanụ rụrụ arụ dị iche iche, tinyekwara arụsị niile nke ụlọ Izrel na-efe. 11 Nʼihu ihe ndị a, ka iri ndị okenye asaa nke ụlọ Izrel, ha na Jaazanaya nwa Shefan guzo nʼebe ahụ. Onye ọbụla nʼime ha ji ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼaka ya, anwụrụ ọkụ si nʼihe nsure ọkụ ndị a na-agbagokwa elu. 12 Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ị hụla ihe ndị okenye ụlọ Izrel na-eme nʼọchịchịrị, onye ọbụla nʼime ụlọ ya nʼihu arụsị ya? Ma ha na-asị, ‘ONYENWE ANYỊ adịghị ahụ anyị, O sitela nʼala anyị wezuga onwe ya.’ ” 13 Ọzọ, ọ sịrị m, “Ị ga-ahụkwa oke ihe arụ karịrị ndị a ha na-eme!” 14 O mere ka m bịakwa nʼọnụ ụzọ ahụ dị nʼakụkụ ugwu nke ụlọnsọ nke ONYENWE ANYỊ. Nʼebe ahụ, ahụrụ m ndị inyom nọ na-akwa akwa nʼihi Tamuz, chi ha. 15 Mgbe ahụ, ọ sịrị m, “Ị hụla ihe ndị a, nwa nke mmadụ? Ị ga-ahụkwa ihe arụ ndị dị ukwuu karịa ndị a.” 16 O mere ka m baa nʼime ogige dị nʼime ụlọ ukwu nke ONYENWE ANYỊ, nʼebe ahụ, nʼọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu nke ONYENWE ANYỊ, nʼagbata ebe ịchụ aja na mpụta ọnụ ụlọ ahụ, ka ihe ruru iri mmadụ abụọ na ise guzo, chee ihu ha nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ na-efe anyanwụ. Ha gbakụtara ụlọnsọ ukwu nke ONYENWE ANYỊ azụ mgbe ha na-eche ihu nʼọwụwa anyanwụ na-akpọ isiala nye anyanwụ. 17 Ọ sịrị m, “Ị hụla nke a, nwa nke mmadụ? Ọ bụ ihe dị nta nye ụlọ Juda, bụ ime ihe arụ niile ndị a ha na-eme nʼebe a? Ha ga-ejikwa ihe ike mejupụta ala, siri otu a na-akpasu m iwe mgbe niile? Lee ka ha si nọgide na-akparị m, na-etinye alaka nʼimi ha. 18 Nʼihi ya, aga m eme ka ha nụrụ ụfụ iwe m, ọ dịkwaghị onye m ga-ahapụ. Ọ bụrụkwa na ha anọgide na-ebe akwa nʼoke olu, agaghị m aṅa ha ntị.”

In Other Versions

Ezekiel 8 in the ANGEFD

Ezekiel 8 in the ANTPNG2D

Ezekiel 8 in the AS21

Ezekiel 8 in the BAGH

Ezekiel 8 in the BBPNG

Ezekiel 8 in the BBT1E

Ezekiel 8 in the BDS

Ezekiel 8 in the BEV

Ezekiel 8 in the BHAD

Ezekiel 8 in the BIB

Ezekiel 8 in the BLPT

Ezekiel 8 in the BNT

Ezekiel 8 in the BNTABOOT

Ezekiel 8 in the BNTLV

Ezekiel 8 in the BOATCB

Ezekiel 8 in the BOATCB2

Ezekiel 8 in the BOBCV

Ezekiel 8 in the BOCNT

Ezekiel 8 in the BOECS

Ezekiel 8 in the BOGWICC

Ezekiel 8 in the BOHCB

Ezekiel 8 in the BOHCV

Ezekiel 8 in the BOHLNT

Ezekiel 8 in the BOHNTLTAL

Ezekiel 8 in the BOILNTAP

Ezekiel 8 in the BOITCV

Ezekiel 8 in the BOKCV

Ezekiel 8 in the BOKCV2

Ezekiel 8 in the BOKHWOG

Ezekiel 8 in the BOKSSV

Ezekiel 8 in the BOLCB

Ezekiel 8 in the BOLCB2

Ezekiel 8 in the BOMCV

Ezekiel 8 in the BONAV

Ezekiel 8 in the BONCB

Ezekiel 8 in the BONLT

Ezekiel 8 in the BONUT2

Ezekiel 8 in the BOPLNT

Ezekiel 8 in the BOSCB

Ezekiel 8 in the BOSNC

Ezekiel 8 in the BOTLNT

Ezekiel 8 in the BOVCB

Ezekiel 8 in the BOYCB

Ezekiel 8 in the BPBB

Ezekiel 8 in the BPH

Ezekiel 8 in the BSB

Ezekiel 8 in the CCB

Ezekiel 8 in the CUV

Ezekiel 8 in the CUVS

Ezekiel 8 in the DBT

Ezekiel 8 in the DGDNT

Ezekiel 8 in the DHNT

Ezekiel 8 in the DNT

Ezekiel 8 in the ELBE

Ezekiel 8 in the EMTV

Ezekiel 8 in the ESV

Ezekiel 8 in the FBV

Ezekiel 8 in the FEB

Ezekiel 8 in the GGMNT

Ezekiel 8 in the GNT

Ezekiel 8 in the HARY

Ezekiel 8 in the HNT

Ezekiel 8 in the IRVA

Ezekiel 8 in the IRVB

Ezekiel 8 in the IRVG

Ezekiel 8 in the IRVH

Ezekiel 8 in the IRVK

Ezekiel 8 in the IRVM

Ezekiel 8 in the IRVM2

Ezekiel 8 in the IRVO

Ezekiel 8 in the IRVP

Ezekiel 8 in the IRVT

Ezekiel 8 in the IRVT2

Ezekiel 8 in the IRVU

Ezekiel 8 in the ISVN

Ezekiel 8 in the JSNT

Ezekiel 8 in the KAPI

Ezekiel 8 in the KBT1ETNIK

Ezekiel 8 in the KBV

Ezekiel 8 in the KJV

Ezekiel 8 in the KNFD

Ezekiel 8 in the LBA

Ezekiel 8 in the LBLA

Ezekiel 8 in the LNT

Ezekiel 8 in the LSV

Ezekiel 8 in the MAAL

Ezekiel 8 in the MBV

Ezekiel 8 in the MBV2

Ezekiel 8 in the MHNT

Ezekiel 8 in the MKNFD

Ezekiel 8 in the MNG

Ezekiel 8 in the MNT

Ezekiel 8 in the MNT2

Ezekiel 8 in the MRS1T

Ezekiel 8 in the NAA

Ezekiel 8 in the NASB

Ezekiel 8 in the NBLA

Ezekiel 8 in the NBS

Ezekiel 8 in the NBVTP

Ezekiel 8 in the NET2

Ezekiel 8 in the NIV11

Ezekiel 8 in the NNT

Ezekiel 8 in the NNT2

Ezekiel 8 in the NNT3

Ezekiel 8 in the PDDPT

Ezekiel 8 in the PFNT

Ezekiel 8 in the RMNT

Ezekiel 8 in the SBIAS

Ezekiel 8 in the SBIBS

Ezekiel 8 in the SBIBS2

Ezekiel 8 in the SBICS

Ezekiel 8 in the SBIDS

Ezekiel 8 in the SBIGS

Ezekiel 8 in the SBIHS

Ezekiel 8 in the SBIIS

Ezekiel 8 in the SBIIS2

Ezekiel 8 in the SBIIS3

Ezekiel 8 in the SBIKS

Ezekiel 8 in the SBIKS2

Ezekiel 8 in the SBIMS

Ezekiel 8 in the SBIOS

Ezekiel 8 in the SBIPS

Ezekiel 8 in the SBISS

Ezekiel 8 in the SBITS

Ezekiel 8 in the SBITS2

Ezekiel 8 in the SBITS3

Ezekiel 8 in the SBITS4

Ezekiel 8 in the SBIUS

Ezekiel 8 in the SBIVS

Ezekiel 8 in the SBT

Ezekiel 8 in the SBT1E

Ezekiel 8 in the SCHL

Ezekiel 8 in the SNT

Ezekiel 8 in the SUSU

Ezekiel 8 in the SUSU2

Ezekiel 8 in the SYNO

Ezekiel 8 in the TBIAOTANT

Ezekiel 8 in the TBT1E

Ezekiel 8 in the TBT1E2

Ezekiel 8 in the TFTIP

Ezekiel 8 in the TFTU

Ezekiel 8 in the TGNTATF3T

Ezekiel 8 in the THAI

Ezekiel 8 in the TNFD

Ezekiel 8 in the TNT

Ezekiel 8 in the TNTIK

Ezekiel 8 in the TNTIL

Ezekiel 8 in the TNTIN

Ezekiel 8 in the TNTIP

Ezekiel 8 in the TNTIZ

Ezekiel 8 in the TOMA

Ezekiel 8 in the TTENT

Ezekiel 8 in the UBG

Ezekiel 8 in the UGV

Ezekiel 8 in the UGV2

Ezekiel 8 in the UGV3

Ezekiel 8 in the VBL

Ezekiel 8 in the VDCC

Ezekiel 8 in the YALU

Ezekiel 8 in the YAPE

Ezekiel 8 in the YBVTP

Ezekiel 8 in the ZBP