Ezra 7 (BOICB)

1 Mgbe nke a gasịrị, nʼoge ọchịchị Ataksekses bụ eze Peshịa. Ezra bụ nwa Seraya nwa Azaraya, Azaraya nwa Hilkaya, 2 bụ nwa Shalum, nwa Zadọk, nwa Ahitub, 3 nwa Amaraya, nwa Azaraya, nwa Meraiot, 4 Meraiot nwa Zerahaya; Zerahaya nwa Uzi, Uzi nwa Buki; 5 Buki nwa Abishua, Abishua nwa Finehaz; Finehaz nwa Elieza, Elieza nwa Erọn onyeisi nchụaja. 6 Ezra a si Babilọn bịarute. Ọ bụ onye ọka nʼihe gbasara iwu ahụ ONYENWE ANYỊ, Chineke Izrel nyere Mosis. Eze nyere ya ihe niile nke ọ rịọrọ, nʼihi na aka ONYENWE ANYỊ Chineke ya dịkwasịrị nʼahụ ya. 7 Ụfọdụ ndị Izrel, ndị nchụaja, ndị Livayị, ndị ọbụ abụ, ndị nche na ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ, soro ya jee Jerusalem nʼafọ asaa nke ọchịchị eze Ataksekses. 8 Ezra bịaruru Jerusalem nʼọnwa nke ise, nke afọ asaa nke ọchịchị eze. 9 Ọ hapụrụ Babilọn nʼabalị mbụ nke ọnwa mbụ, rute Jerusalem nʼabalị mbụ nke ọnwa ise nʼihi na Chineke nọnyeere ya. 10 Nke a mere nʼihi na Ezra kpebiri nʼobi ya ịmụ, na idebe iwu ONYENWE ANYỊ, na ịbụ onye ozizi nke okwu Chineke nye ụmụ Izrel. 11 Nke a bụ ndepụta akwụkwọ ozi eze, bụ Ataksekses degaara Ezra onye nchụaja, na onye ozizi, na onye ọka nʼihe gbasara iwu na ụkpụrụ nke ONYENWE ANYỊ nyere Izrel: 12 Ataksekses, eze na-achị ndị eze ọzọ,na-edegara Ezra akwụkwọ, bụ onye nchụaja, bụrụkwa onye nkuzi okwu Chineke nke eluigwe.Ndeewo! 13 Ugbu a, ana m enye iwu ka onye Izrel ọbụla bi nʼalaeze m, ma ndị nchụaja, na ndị Livayị, ndị wepụtara onwe ha ị soro gị gaa Jerusalem, ha nwere ike ịga. 14 Eze na mmadụ asaa ndị na-adụ ya ọdụ na-eziga gị Juda na Jerusalem ka ị gaa leba anya nʼiwu Chineke nke dị gị nʼaka. 15 Ọzọkwa, ịga e were onyinye ọlaedo na ọlaọcha ndị a eze na ndị ndụmọdụ ya ji afọ ofufu nye Chineke nke Izrel, onye ebe obibi ya dị na Jerusalem. 16 Tinyere ọlaedo na ọlaọcha nke i nwere ike ịnata nʼala ahụ niile nʼakụkụ niile nke Babilọn, tinyekwara onyinye ihuọma si nʼaka ndị mmadụ, na ndị nchụaja niile, maka ụlọnsọ ukwu Chineke ha dị na Jerusalem. 17 Ị ga-eji ego niile ndị a zụọ oke ehi, na ebule, na atụrụ, na onyinye mkpụrụ ọka, na onyinye ihe ọṅụṅụ, e ji achụ aja nʼebe ịchụ aja nke ụlọnsọ Chineke dị na Jerusalem. 18 Ọ bụrụ na ego amapụta nʼime ya, gị na ụmụnne gị ga-eji ya mee ihe unu maara bụ uche Chineke unu. 19 Ngwongwo niile e bunyere gị maka ije ozi nʼụlọnsọ Chineke, buru ha buruo nʼihu Chineke nke Jerusalem. 20 Ma ihe ndị ọzọ nke fọdụrụ nʼihi ụlọnsọ Chineke gị, nke kwesiri na i mere, ị nwere ike site nʼụlọakụ eze mee ha. 21 Mụ, bụ Ataksekses, na-eziga iwu a nye ndị na-elekọta ego nʼọdịda anyanwụ osimiri Yufretis sị ha, ihe ọbụla Ezra, onye nchụaja, na onye nkuzi okwu Chineke nke eluigwe chọrọ site nʼaka unu, unu nye ya. 22 Ọ bụladị ruo ọlaọcha dị otu narị talenti, ya na narị akpa ọka wiiti ise, na narị galọọnụ mmanya vaịnị isii, na narị efa nke mmanụ oliv na nnu nʼọtụtụ ọbụla, dịka ọ chọrọ ya. 23 Ihe ọbụla ọzọ, nke Chineke nke eluigwe chọrọ, ka e mee ha nʼụzọ kwesiri nye maka owuwu ụlọnsọ Chineke nke eluigwe. Nʼihi gịnị ka iwe Chineke ga-eji dakwasị eze na ụmụ ya ndị ikom? 24 Ana m enyekwa iwu na ndị nchụaja niile, ndị Livayị niile, ndị ọbụ abụ niile, ndị nche niile, ndị ozi ụlọnsọ niile, na ndị ọzọ niile na-arụrụ Chineke ọrụ, agaghị atụ ụtụ ọbụla. 25 “Ugbu a, Ezra, ị ga-eji amamihe Chineke gị nyere gị họpụta ndị ikpe, na ndịisi, ndị ga-achị obodo niile dị nʼọdịda anyanwụ nke osimiri Yufretis. Ọ bụrụ na ha amazighị iwu Chineke nke ọma, ị ga-akụziri ha. 26 Ahụhụ ga-adịrị onye ọbụla jụrụ idebe iwu Chineke, na iwu eze, ga-abụ ọnwụ, maọbụ nchụpụ site nʼala ya gaa mba ọzọ, maọbụ ịnakọrọ ya ihe niile o nwere, maọbụ ịtụba ya nʼụlọ mkpọrọ.” 27 Otuto dịrị ONYENWE ANYỊ Chineke nna nna anyị ha, onye mere ka eze kpebie ime ka ụlọnsọ ONYENWE ANYỊ dị na Jerusalem dị mma ile anya. 28 Keleekwa Chineke onye nyere m ihuọma nʼihu ndị ndụmọdụ ya, na nʼihu ụmụ eze, bụ ndịisi ọchịchị dị ike. Nʼihi na aka ONYENWE ANYỊ Chineke m nọnyeere m. Eji m obi ike chịkọta ndịisi site nʼIzrel ka ha soro m gaa.

In Other Versions

Ezra 7 in the ANGEFD

Ezra 7 in the ANTPNG2D

Ezra 7 in the AS21

Ezra 7 in the BAGH

Ezra 7 in the BBPNG

Ezra 7 in the BBT1E

Ezra 7 in the BDS

Ezra 7 in the BEV

Ezra 7 in the BHAD

Ezra 7 in the BIB

Ezra 7 in the BLPT

Ezra 7 in the BNT

Ezra 7 in the BNTABOOT

Ezra 7 in the BNTLV

Ezra 7 in the BOATCB

Ezra 7 in the BOATCB2

Ezra 7 in the BOBCV

Ezra 7 in the BOCNT

Ezra 7 in the BOECS

Ezra 7 in the BOGWICC

Ezra 7 in the BOHCB

Ezra 7 in the BOHCV

Ezra 7 in the BOHLNT

Ezra 7 in the BOHNTLTAL

Ezra 7 in the BOILNTAP

Ezra 7 in the BOITCV

Ezra 7 in the BOKCV

Ezra 7 in the BOKCV2

Ezra 7 in the BOKHWOG

Ezra 7 in the BOKSSV

Ezra 7 in the BOLCB

Ezra 7 in the BOLCB2

Ezra 7 in the BOMCV

Ezra 7 in the BONAV

Ezra 7 in the BONCB

Ezra 7 in the BONLT

Ezra 7 in the BONUT2

Ezra 7 in the BOPLNT

Ezra 7 in the BOSCB

Ezra 7 in the BOSNC

Ezra 7 in the BOTLNT

Ezra 7 in the BOVCB

Ezra 7 in the BOYCB

Ezra 7 in the BPBB

Ezra 7 in the BPH

Ezra 7 in the BSB

Ezra 7 in the CCB

Ezra 7 in the CUV

Ezra 7 in the CUVS

Ezra 7 in the DBT

Ezra 7 in the DGDNT

Ezra 7 in the DHNT

Ezra 7 in the DNT

Ezra 7 in the ELBE

Ezra 7 in the EMTV

Ezra 7 in the ESV

Ezra 7 in the FBV

Ezra 7 in the FEB

Ezra 7 in the GGMNT

Ezra 7 in the GNT

Ezra 7 in the HARY

Ezra 7 in the HNT

Ezra 7 in the IRVA

Ezra 7 in the IRVB

Ezra 7 in the IRVG

Ezra 7 in the IRVH

Ezra 7 in the IRVK

Ezra 7 in the IRVM

Ezra 7 in the IRVM2

Ezra 7 in the IRVO

Ezra 7 in the IRVP

Ezra 7 in the IRVT

Ezra 7 in the IRVT2

Ezra 7 in the IRVU

Ezra 7 in the ISVN

Ezra 7 in the JSNT

Ezra 7 in the KAPI

Ezra 7 in the KBT1ETNIK

Ezra 7 in the KBV

Ezra 7 in the KJV

Ezra 7 in the KNFD

Ezra 7 in the LBA

Ezra 7 in the LBLA

Ezra 7 in the LNT

Ezra 7 in the LSV

Ezra 7 in the MAAL

Ezra 7 in the MBV

Ezra 7 in the MBV2

Ezra 7 in the MHNT

Ezra 7 in the MKNFD

Ezra 7 in the MNG

Ezra 7 in the MNT

Ezra 7 in the MNT2

Ezra 7 in the MRS1T

Ezra 7 in the NAA

Ezra 7 in the NASB

Ezra 7 in the NBLA

Ezra 7 in the NBS

Ezra 7 in the NBVTP

Ezra 7 in the NET2

Ezra 7 in the NIV11

Ezra 7 in the NNT

Ezra 7 in the NNT2

Ezra 7 in the NNT3

Ezra 7 in the PDDPT

Ezra 7 in the PFNT

Ezra 7 in the RMNT

Ezra 7 in the SBIAS

Ezra 7 in the SBIBS

Ezra 7 in the SBIBS2

Ezra 7 in the SBICS

Ezra 7 in the SBIDS

Ezra 7 in the SBIGS

Ezra 7 in the SBIHS

Ezra 7 in the SBIIS

Ezra 7 in the SBIIS2

Ezra 7 in the SBIIS3

Ezra 7 in the SBIKS

Ezra 7 in the SBIKS2

Ezra 7 in the SBIMS

Ezra 7 in the SBIOS

Ezra 7 in the SBIPS

Ezra 7 in the SBISS

Ezra 7 in the SBITS

Ezra 7 in the SBITS2

Ezra 7 in the SBITS3

Ezra 7 in the SBITS4

Ezra 7 in the SBIUS

Ezra 7 in the SBIVS

Ezra 7 in the SBT

Ezra 7 in the SBT1E

Ezra 7 in the SCHL

Ezra 7 in the SNT

Ezra 7 in the SUSU

Ezra 7 in the SUSU2

Ezra 7 in the SYNO

Ezra 7 in the TBIAOTANT

Ezra 7 in the TBT1E

Ezra 7 in the TBT1E2

Ezra 7 in the TFTIP

Ezra 7 in the TFTU

Ezra 7 in the TGNTATF3T

Ezra 7 in the THAI

Ezra 7 in the TNFD

Ezra 7 in the TNT

Ezra 7 in the TNTIK

Ezra 7 in the TNTIL

Ezra 7 in the TNTIN

Ezra 7 in the TNTIP

Ezra 7 in the TNTIZ

Ezra 7 in the TOMA

Ezra 7 in the TTENT

Ezra 7 in the UBG

Ezra 7 in the UGV

Ezra 7 in the UGV2

Ezra 7 in the UGV3

Ezra 7 in the VBL

Ezra 7 in the VDCC

Ezra 7 in the YALU

Ezra 7 in the YAPE

Ezra 7 in the YBVTP

Ezra 7 in the ZBP