Genesis 2 (BOICB)

1 Otu a ka e si rụzuo ọrụ ike eluigwe na ụwa na ihe niile dị nʼime ha. 2 Nʼụbọchị nke asaa, Chineke kwụsịrị ọrụ ya nke ọ na-arụ, o zukwara ike site nʼọrụ ya niile. 3 Chineke gọziri ụbọchị nke asaa ahụ mee ya ka ọ bụrụ ụbọchị dị nsọ, nʼihi na ọ bụ nʼụbọchị ahụ ka ọ zuru ike site nʼọrụ nke ike ihe niile. 4 Nke a bụ akụkọ banyere usoro okike eluigwe na ụwa mgbe e kere ha, nʼụbọchị ahụ mgbe ONYENWE ANYỊ Chineke kere eluigwe na ụwa. 5 Ahịhịa ọbụla epupụtabeghị nʼọhịa, o nwekwaghị ihe ubi ọbụla sitere nʼala pupụta, nʼihi na ONYENWE ANYỊ Chineke ezitebeghị mmiri ozuzo nʼelu ụwa, o nwekwaghị mmadụ ọbụla nọ na-arụ ọrụ ubi, 6 ma mmiri si nʼala na-asọpụta na-asọ nʼelu ala niile. 7 ONYENWE ANYỊ Chineke kpụrụ mmadụ site nʼaja nke ala, kunye ya ume ndụ nʼimi ya, nke mere ka mmadụ ghọọ ihe dị ndụ. 8 ONYENWE ANYỊ Chineke kụrụ ubi a gbara ogige nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, nʼIden. O tinyere mmadụ ahụ ọ kpụrụ nʼime ubi a. 9 ONYENWE ANYỊ Chineke mere ka osisi dị iche iche si nʼala pupụta, osisi ndị dị mma ile anya na nke dịkwa mma iri eri. Nʼetiti ogige a, e nwere osisi na-enye ndụ, na osisi nke ịmata ihe ọma na ihe ọjọọ. 10 E nwere iyi si nʼIden na-asọpụta na-asọbanye nʼime ogige ahụ ime ka ala ahụ nwee mmiri. Site nʼebe ahụ, iyi a kewara nwee ngalaba anọ. 11 Aha ngalaba nke mbụ bụ Paịshọn. Ọ sọọrọ ogologo gafee ala niile nke Havila, ebe a na-enweta ọlaedo. 12 (Ọlaedo dị nʼala ahụ mara mma. Eso osisi na-esi isi ụtọ na nkume dị oke ọnụahịa a na-akpọ ọniks dịkwa nʼebe ahụ.) 13 Aha ngalaba nke abụọ bụ Gaihọn. O sitere nʼala Kush gafee. 14 Aha osimiri nke atọ bụ Taịgris. Ọ na-asọla nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke ala Ashọ. Aha osimiri nke anọ bụ Yufretis. 15 ONYENWE ANYỊ Chineke weere mmadụ ahụ tinye ya nʼogige Iden, ka ọ na-akọ ya ma bụrụkwa onye na-elekọta ya. 16 ONYENWE ANYỊ Chineke nyere mmadụ ahụ iwu sị ya “I nwere ike iri mkpụrụ osisi niile dị nʼubi a, 17 ma ị gaghị eri mkpụrụ si nʼosisi ịmata ihe ọma na ihe ọjọọ. Nʼihi na ụbọchị i riri ya ị ga-anwụrịrị.” 18 ONYENWE ANYỊ Chineke kwuru sị, “Ọ dịghị mma ka nwoke nọrọ naanị ya. Aga m emere ya onye inyeaka nke kwesiri ya.” 19 ONYENWE ANYỊ Chineke sitere nʼala kpụọ ụmụ anụmanụ niile nke ọhịa na ụmụ anụ ufe niile nke eluigwe. O dutere ha ka ọ mara ihe mmadụ ahụ ga-akpọ ha. Ihe ọbụla mmadụ ahụ kpọrọ ihe ọbụla ndị a nwere ndụ, nke ahụ bụkwa aha ya. 20 Ya mere, mmadụ ahụ nyere anụ ụlọ niile na anụ ufe niile na anụ ọhịa niile aha.Ma nʼebe Adam nọ, o nweghị onye inyeaka kwesiri ya. 21 Ya mere, ONYENWE ANYỊ Chineke mere ka nwoke ahụ daa nʼụra. Mgbe ọ nọ na-arahụ ụra, o wepụtara otu ọgịrịga site na ngụ dị ya nʼahụ, mechikwaa ebe o si wepụta ya. 22 Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ Chineke ji otu ọgịrịga o si nʼahụ nwoke ahụ wepụta, mee nwanyị, dutere ya nwoke ahụ. 23 Nwoke ahụ kwuru sị,“Nke a bụ ọkpụkpụ si nʼọkpụkpụ m,na anụ ahụ si nʼahụ m,a ga-akpọ ya ‘nwanyị,’nʼihi na e si nʼime nwoke wepụta ya.” 24 Ọ bụ nke a mere nwoke ga-eji hapụ nne na nna ya, e jikọta ya na nwunye ya, ha ga-abụ otu anụ ahụ. 25 Nwoke ahụ na nwunye ya gba ọtọ, ma ihere emeghị ha.

In Other Versions

Genesis 2 in the ANGEFD

Genesis 2 in the ANTPNG2D

Genesis 2 in the AS21

Genesis 2 in the BAGH

Genesis 2 in the BBPNG

Genesis 2 in the BBT1E

Genesis 2 in the BDS

Genesis 2 in the BEV

Genesis 2 in the BHAD

Genesis 2 in the BIB

Genesis 2 in the BLPT

Genesis 2 in the BNT

Genesis 2 in the BNTABOOT

Genesis 2 in the BNTLV

Genesis 2 in the BOATCB

Genesis 2 in the BOATCB2

Genesis 2 in the BOBCV

Genesis 2 in the BOCNT

Genesis 2 in the BOECS

Genesis 2 in the BOGWICC

Genesis 2 in the BOHCB

Genesis 2 in the BOHCV

Genesis 2 in the BOHLNT

Genesis 2 in the BOHNTLTAL

Genesis 2 in the BOILNTAP

Genesis 2 in the BOITCV

Genesis 2 in the BOKCV

Genesis 2 in the BOKCV2

Genesis 2 in the BOKHWOG

Genesis 2 in the BOKSSV

Genesis 2 in the BOLCB

Genesis 2 in the BOLCB2

Genesis 2 in the BOMCV

Genesis 2 in the BONAV

Genesis 2 in the BONCB

Genesis 2 in the BONLT

Genesis 2 in the BONUT2

Genesis 2 in the BOPLNT

Genesis 2 in the BOSCB

Genesis 2 in the BOSNC

Genesis 2 in the BOTLNT

Genesis 2 in the BOVCB

Genesis 2 in the BOYCB

Genesis 2 in the BPBB

Genesis 2 in the BPH

Genesis 2 in the BSB

Genesis 2 in the CCB

Genesis 2 in the CUV

Genesis 2 in the CUVS

Genesis 2 in the DBT

Genesis 2 in the DGDNT

Genesis 2 in the DHNT

Genesis 2 in the DNT

Genesis 2 in the ELBE

Genesis 2 in the EMTV

Genesis 2 in the ESV

Genesis 2 in the FBV

Genesis 2 in the FEB

Genesis 2 in the GGMNT

Genesis 2 in the GNT

Genesis 2 in the HARY

Genesis 2 in the HNT

Genesis 2 in the IRVA

Genesis 2 in the IRVB

Genesis 2 in the IRVG

Genesis 2 in the IRVH

Genesis 2 in the IRVK

Genesis 2 in the IRVM

Genesis 2 in the IRVM2

Genesis 2 in the IRVO

Genesis 2 in the IRVP

Genesis 2 in the IRVT

Genesis 2 in the IRVT2

Genesis 2 in the IRVU

Genesis 2 in the ISVN

Genesis 2 in the JSNT

Genesis 2 in the KAPI

Genesis 2 in the KBT1ETNIK

Genesis 2 in the KBV

Genesis 2 in the KJV

Genesis 2 in the KNFD

Genesis 2 in the LBA

Genesis 2 in the LBLA

Genesis 2 in the LNT

Genesis 2 in the LSV

Genesis 2 in the MAAL

Genesis 2 in the MBV

Genesis 2 in the MBV2

Genesis 2 in the MHNT

Genesis 2 in the MKNFD

Genesis 2 in the MNG

Genesis 2 in the MNT

Genesis 2 in the MNT2

Genesis 2 in the MRS1T

Genesis 2 in the NAA

Genesis 2 in the NASB

Genesis 2 in the NBLA

Genesis 2 in the NBS

Genesis 2 in the NBVTP

Genesis 2 in the NET2

Genesis 2 in the NIV11

Genesis 2 in the NNT

Genesis 2 in the NNT2

Genesis 2 in the NNT3

Genesis 2 in the PDDPT

Genesis 2 in the PFNT

Genesis 2 in the RMNT

Genesis 2 in the SBIAS

Genesis 2 in the SBIBS

Genesis 2 in the SBIBS2

Genesis 2 in the SBICS

Genesis 2 in the SBIDS

Genesis 2 in the SBIGS

Genesis 2 in the SBIHS

Genesis 2 in the SBIIS

Genesis 2 in the SBIIS2

Genesis 2 in the SBIIS3

Genesis 2 in the SBIKS

Genesis 2 in the SBIKS2

Genesis 2 in the SBIMS

Genesis 2 in the SBIOS

Genesis 2 in the SBIPS

Genesis 2 in the SBISS

Genesis 2 in the SBITS

Genesis 2 in the SBITS2

Genesis 2 in the SBITS3

Genesis 2 in the SBITS4

Genesis 2 in the SBIUS

Genesis 2 in the SBIVS

Genesis 2 in the SBT

Genesis 2 in the SBT1E

Genesis 2 in the SCHL

Genesis 2 in the SNT

Genesis 2 in the SUSU

Genesis 2 in the SUSU2

Genesis 2 in the SYNO

Genesis 2 in the TBIAOTANT

Genesis 2 in the TBT1E

Genesis 2 in the TBT1E2

Genesis 2 in the TFTIP

Genesis 2 in the TFTU

Genesis 2 in the TGNTATF3T

Genesis 2 in the THAI

Genesis 2 in the TNFD

Genesis 2 in the TNT

Genesis 2 in the TNTIK

Genesis 2 in the TNTIL

Genesis 2 in the TNTIN

Genesis 2 in the TNTIP

Genesis 2 in the TNTIZ

Genesis 2 in the TOMA

Genesis 2 in the TTENT

Genesis 2 in the UBG

Genesis 2 in the UGV

Genesis 2 in the UGV2

Genesis 2 in the UGV3

Genesis 2 in the VBL

Genesis 2 in the VDCC

Genesis 2 in the YALU

Genesis 2 in the YAPE

Genesis 2 in the YBVTP

Genesis 2 in the ZBP