Genesis 22 (BOICB)
1 Mgbe ihe ndị a gasịrị, Chineke nwara Ebraham. Ọ sịrị ya, “Ebraham.”Ebraham zara sị, “Lekwa m.” 2 Chineke sịrị, “Duru nwa gị nwoke, naanị otu nwa gị nwoke, Aịzik onye ị hụrụ nʼanya, gaa nʼala Mọrịa. Jiri ya chụọrọ m aja nsure ọkụ nʼelu otu nʼime ugwu dị nʼebe m ga-egosi gị.” 3 Nʼisi ụtụtụ echi ya, Ebraham biliri kwadoo ịnyịnya ibu ya. O duuru ndị ikom abụọ na-ejere ya ozi, na nwa ya nwoke Aịzik. O gbutere nkụ ga-ezuru ya ịchụ aja nsure ọkụ, bilie gawa ebe ahụ Chineke gwara ya maka ya. 4 Nʼụbọchị nke atọ, Ebraham lepụrụ anya hụ ebe ahụ nʼebe dị anya. 5 Ọ gwara ndị na-ejere ya ozi sị, “Nọdụnụ nʼebe a, unu na ịnyịnya ibu anyị, ka mụ na nwokorobịa a gaa nʼebe ahụ. Anyị feecha ofufe, anyị ga-alọghachikwute unu ọzọ.” 6 Ebraham boro nwa ya nwoke Aịzik ukwu nkụ ahụ e ji achụ aja nsure ọkụ nʼisi, ma ya onwe ya jidere ọkụ na mma. 7 Aịzik gwara nna ya Ebraham sị, “Nna m.”Ebraham zara, “Ehee, nwa m.”Aịzik sịrị, “Ọkụ na nkụ dị nʼebe a, olee nwa atụrụ e ji achụ aja nsure ọkụ?” 8 Ebraham zara, “Nwa m, Chineke nʼonwe ya ga-eweta nwa atụrụ e ji achụ aja nsure ọkụ.” Ha abụọ gakwara nʼihu nʼije ha. 9 Mgbe ha ruru ebe ahụ Chineke gwara ya maka ya, Ebraham wuru ebe ịchụ aja nʼebe ahụ, doo nkụ ndị ahụ niile nʼusoro nʼelu ya. O kere nwa ya Aịzik agbụ, tụkwasị ya nʼelu ebe ịchụ aja ahụ, na nʼelu nkụ ndị ahụ. 10 Mgbe ahụ Ebraham setịpụrụ aka ya, welite mma ka o gbuo nwa ya nwoke. 11 Ma mmụọ ozi ONYENWE ANYỊ si nʼeluigwe kpọọ ya oku sị ya, “Ebraham! Ebraham!”Ebraham zara, “Lekwa m nʼebe a.” 12 Ọ sịrị ya, “Emetụkwala nwokorobịa ahụ aka. Emekwala ya ihe ọbụla. Nʼihi na amatala m ugbu a na ị na-atụ egwu Chineke, ebe ọ bụ na i kwenyere iji nwa gị nwoke, naanị otu nwa nwoke i nwere chụọrọ m aja.” 13 Ebraham leliri anya hụ otu ebule nke eriri ọhịa jidere na mpi ya. Ebraham gara jide ebule ahụ, were ya chụọ aja nsure ọkụ nʼọnọdụ nwa ya nwoke. 14 Ya mere, Ebraham kpọrọ ebe ahụ, “ONYENWE ANYỊ ga-arọpụta.” Ya mere ruo taa a na-asị, “Nʼugwu ONYENWE ANYỊ, a ga-arọpụta.” 15 Mmụọ ozi ONYENWE ANYỊ sitere nʼeluigwe kpọọ Ebraham oku nke ugboro abụọ, 16 sị, “Mụ onwe m, bụ ONYENWE ANYỊ, ji onwe m na-aṅụ iyi na-ekwupụta sị, ebe ọ bụ na i mere ihe dị otu a, na i kwenyere iji nwa gị nwoke, naanị otu nwoke i nwere chụọrọ m aja, 17 aga m agọzi gị nʼezie, mekwa ka ụmụ ụmụ gị mụbaa nʼọnụọgụgụ dịka kpakpando nke mbara eluigwe na dịka aja dị nʼọnụ mmiri osimiri. Ụmụ ụmụ gị ga-enwetara onwe ha ọnụ ụzọ ama ndị iro ha. 18 Sitekwa na mkpụrụ gị ka a ga-agọzikwa agbụrụ niile nọ nʼụwa, nʼihi na i rubeere m isi.” 19 Emesịa, Ebraham laghachikwuru ndị na-ejere ya ozi. Ha niile laghachikwara Bịasheba. Ebraham birikwara na Bịasheba. 20 Mgbe ihe ndị a gasịrị, e ziri Ebraham ozi si ya, “Lee, Milka ya onwe ya amụkwaarala nwanne gị nwoke bụ Nahọ, ụmụ ndị ikom. 21 Aha ha bụ Uz, onye bụ ọkpara, na Buz nwanne ya,Kemuel bụ (nna Aram), 22 Kesed, Hazọ, Pildash, Jidlaf na Betuel.” 23 Betuel mụrụ Ribeka.Milka mụtaara Nahọ, nwanne Ebraham ụmụ ndị ikom asatọ ndị a. 24 Iko ya nwanyị, onye aha ya bụ Reuma, mụkwaara ya ụmụ ndị ikom.Ha bụ Teba, Gaham, Tahash na Maaka.
In Other Versions
Genesis 22 in the ANGEFD
Genesis 22 in the ANTPNG2D
Genesis 22 in the AS21
Genesis 22 in the BAGH
Genesis 22 in the BBPNG
Genesis 22 in the BBT1E
Genesis 22 in the BDS
Genesis 22 in the BEV
Genesis 22 in the BHAD
Genesis 22 in the BIB
Genesis 22 in the BLPT
Genesis 22 in the BNT
Genesis 22 in the BNTABOOT
Genesis 22 in the BNTLV
Genesis 22 in the BOATCB
Genesis 22 in the BOATCB2
Genesis 22 in the BOBCV
Genesis 22 in the BOCNT
Genesis 22 in the BOECS
Genesis 22 in the BOGWICC
Genesis 22 in the BOHCB
Genesis 22 in the BOHCV
Genesis 22 in the BOHLNT
Genesis 22 in the BOHNTLTAL
Genesis 22 in the BOILNTAP
Genesis 22 in the BOITCV
Genesis 22 in the BOKCV
Genesis 22 in the BOKCV2
Genesis 22 in the BOKHWOG
Genesis 22 in the BOKSSV
Genesis 22 in the BOLCB
Genesis 22 in the BOLCB2
Genesis 22 in the BOMCV
Genesis 22 in the BONAV
Genesis 22 in the BONCB
Genesis 22 in the BONLT
Genesis 22 in the BONUT2
Genesis 22 in the BOPLNT
Genesis 22 in the BOSCB
Genesis 22 in the BOSNC
Genesis 22 in the BOTLNT
Genesis 22 in the BOVCB
Genesis 22 in the BOYCB
Genesis 22 in the BPBB
Genesis 22 in the BPH
Genesis 22 in the BSB
Genesis 22 in the CCB
Genesis 22 in the CUV
Genesis 22 in the CUVS
Genesis 22 in the DBT
Genesis 22 in the DGDNT
Genesis 22 in the DHNT
Genesis 22 in the DNT
Genesis 22 in the ELBE
Genesis 22 in the EMTV
Genesis 22 in the ESV
Genesis 22 in the FBV
Genesis 22 in the FEB
Genesis 22 in the GGMNT
Genesis 22 in the GNT
Genesis 22 in the HARY
Genesis 22 in the HNT
Genesis 22 in the IRVA
Genesis 22 in the IRVB
Genesis 22 in the IRVG
Genesis 22 in the IRVH
Genesis 22 in the IRVK
Genesis 22 in the IRVM
Genesis 22 in the IRVM2
Genesis 22 in the IRVO
Genesis 22 in the IRVP
Genesis 22 in the IRVT
Genesis 22 in the IRVT2
Genesis 22 in the IRVU
Genesis 22 in the ISVN
Genesis 22 in the JSNT
Genesis 22 in the KAPI
Genesis 22 in the KBT1ETNIK
Genesis 22 in the KBV
Genesis 22 in the KJV
Genesis 22 in the KNFD
Genesis 22 in the LBA
Genesis 22 in the LBLA
Genesis 22 in the LNT
Genesis 22 in the LSV
Genesis 22 in the MAAL
Genesis 22 in the MBV
Genesis 22 in the MBV2
Genesis 22 in the MHNT
Genesis 22 in the MKNFD
Genesis 22 in the MNG
Genesis 22 in the MNT
Genesis 22 in the MNT2
Genesis 22 in the MRS1T
Genesis 22 in the NAA
Genesis 22 in the NASB
Genesis 22 in the NBLA
Genesis 22 in the NBS
Genesis 22 in the NBVTP
Genesis 22 in the NET2
Genesis 22 in the NIV11
Genesis 22 in the NNT
Genesis 22 in the NNT2
Genesis 22 in the NNT3
Genesis 22 in the PDDPT
Genesis 22 in the PFNT
Genesis 22 in the RMNT
Genesis 22 in the SBIAS
Genesis 22 in the SBIBS
Genesis 22 in the SBIBS2
Genesis 22 in the SBICS
Genesis 22 in the SBIDS
Genesis 22 in the SBIGS
Genesis 22 in the SBIHS
Genesis 22 in the SBIIS
Genesis 22 in the SBIIS2
Genesis 22 in the SBIIS3
Genesis 22 in the SBIKS
Genesis 22 in the SBIKS2
Genesis 22 in the SBIMS
Genesis 22 in the SBIOS
Genesis 22 in the SBIPS
Genesis 22 in the SBISS
Genesis 22 in the SBITS
Genesis 22 in the SBITS2
Genesis 22 in the SBITS3
Genesis 22 in the SBITS4
Genesis 22 in the SBIUS
Genesis 22 in the SBIVS
Genesis 22 in the SBT
Genesis 22 in the SBT1E
Genesis 22 in the SCHL
Genesis 22 in the SNT
Genesis 22 in the SUSU
Genesis 22 in the SUSU2
Genesis 22 in the SYNO
Genesis 22 in the TBIAOTANT
Genesis 22 in the TBT1E
Genesis 22 in the TBT1E2
Genesis 22 in the TFTIP
Genesis 22 in the TFTU
Genesis 22 in the TGNTATF3T
Genesis 22 in the THAI
Genesis 22 in the TNFD
Genesis 22 in the TNT
Genesis 22 in the TNTIK
Genesis 22 in the TNTIL
Genesis 22 in the TNTIN
Genesis 22 in the TNTIP
Genesis 22 in the TNTIZ
Genesis 22 in the TOMA
Genesis 22 in the TTENT
Genesis 22 in the UBG
Genesis 22 in the UGV
Genesis 22 in the UGV2
Genesis 22 in the UGV3
Genesis 22 in the VBL
Genesis 22 in the VDCC
Genesis 22 in the YALU
Genesis 22 in the YAPE
Genesis 22 in the YBVTP
Genesis 22 in the ZBP