Genesis 28 (BOICB)

1 Aịzik kpọrọ Jekọb gọzie ya, nye ya iwu sị ya, “Alụla nwunye site nʼala Kenan. 2 Kama bilie gaa Padan Aram nʼụlọ nna nne gị, Betuel, lụrụ nwunye site nʼụmụ ndị inyom Leban. 3 Ka Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, gọzie gị, mee ka ị mịa mkpụrụ, mụbaa, ghọọ ọtụtụ mba. 4 Ka Chineke nye gị na ụmụ ụmụ gị ngọzị ahụ o kwere nkwa inye Ebraham. Ka i nweta ala a, nke i bi nʼime ya ugbu a dịka ọbịa, bụ ala ahụ Chineke kwere Ebraham na nkwa inye ya.” 5 Mgbe ahụ Aịzik zipụrụ Jekọb nʼije ya, ọ gara Padan Aram, nʼụlọ Leban nwa Betuel onye Aram, nwanne Ribeka onye bụ nne Jekọb na Ịsọ. 6 Ịsọ hụrụ ka Aịzik siri gọzie Jekọb, ziga ya Padan Aram ka ọ gaa lụọ nwunye nʼebe ahụ, nyekwa ya iwu mgbe ọ na-agọzi ya sị, “Alụla nwanyị na Kenan,” 7 Jekọb rubekwara nna ya na nne ya isi gawa Padan Aram. 8 O dokwara Ịsọ anya na ndị inyom Kenan dị njọ nʼanya nna ya Aịzik. 9 Nʼihi ya, Ịsọ gakwuru Ishmel lụrụ Mahalat, ada Ishmel, nwa Ebraham, onye bụ nwanyị Nebaiot, tinyekwara ndị nwunye ọ lụrụ na mbụ. 10 Jekọb hapụrụ Bịasheba gawa Haran. 11 Mgbe chi na-eji, ọ kwụsịrị ebe ọ ga-anọ zuo ike abalị. Mgbe ọ chọrọ idina ala, o weere otu nʼime nkume ndị dị nʼebe ahụ hinye nʼisi ya, dinara ala ịrahụ ụra. 12 Nʼabalị ahụ, ọ rọrọ nrọ, hụ mbube e ji arị elu. E mere ka o guzo site nʼụwa ruo nʼeluigwe. Ọ hụkwara ndị mmụọ ozi Chineke ka ha si na ya na-arịgo na-arịdakwa. 13 Nʼelu ya, ọ hụrụ ONYENWE ANYỊ ka o guzo, nụkwa ka ọ na-agwa ya okwu sị, “Mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ, Chineke nna gị Ebraham, na Chineke Aịzik. Aga m enye gị na ụmụ ụmụ gị ala ahụ nke i dina nʼelu ya. 14 Ụmụ gị ga-adị ukwuu, dị ka aja dị nʼala. Ha ga-ejupụta ala a, site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ, sitekwa nʼugwu ruo na ndịda. A ga-esitekwa na gị na mkpụrụ gị, gọzie mba niile nke ụwa a. 15 Anọnyeere m gị. Aga m echebe gị ebe ọbụla ị na-aga. Aga m akpọghachite gị nʼala a. Agaghị m ahapụ gị tutu ruo mgbe m mezuoro gị ihe niile m kwere gị na nkwa.” 16 Jekọb tetara nʼụra sị, “Nʼezie ONYENWE ANYỊ nọ nʼebe a. Ma amaghị m ya.” 17 Ọ tụrụ egwu sị, “Lee ka ebe a si dị oke egwu, o nweghị ihe ebe a bụ karịa ụlọ Chineke, nʼezie ọ bụ ọnụ ụzọ ama eluigwe.” 18 Nʼisi ụtụtụ echi ya, Jekọb weere nkume ahụ o hinyere nʼisi ya guzo ya dịka ogidi, wụsa mmanụ nʼelu ya. 19 Ọ kpọrọ ebe ahụ Betel, ọ bụ ezie na Luz bụ aha obodo ahụ na mbụ. 20 Mgbe ahụ, Jekọb kwere nkwa sị, “Ọ bụrụ na Chineke ga-anọnyere m, chebe m nʼije m na-eje, ọ bụrụ na ọ ga-enye m ihe oriri m ga-eri na uwe m ga-eyi, 21 m lọghachi nʼụlọ nna m nʼudo, mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ ga-abụ Chineke m. 22 Nkume a m doziri elu dịka ogidi ga-abụ ụlọ Chineke. Aga m eke ihe niile i nyere m ụzọ iri, nyeghachi gị otu ụzọ.”

In Other Versions

Genesis 28 in the ANGEFD

Genesis 28 in the ANTPNG2D

Genesis 28 in the AS21

Genesis 28 in the BAGH

Genesis 28 in the BBPNG

Genesis 28 in the BBT1E

Genesis 28 in the BDS

Genesis 28 in the BEV

Genesis 28 in the BHAD

Genesis 28 in the BIB

Genesis 28 in the BLPT

Genesis 28 in the BNT

Genesis 28 in the BNTABOOT

Genesis 28 in the BNTLV

Genesis 28 in the BOATCB

Genesis 28 in the BOATCB2

Genesis 28 in the BOBCV

Genesis 28 in the BOCNT

Genesis 28 in the BOECS

Genesis 28 in the BOGWICC

Genesis 28 in the BOHCB

Genesis 28 in the BOHCV

Genesis 28 in the BOHLNT

Genesis 28 in the BOHNTLTAL

Genesis 28 in the BOILNTAP

Genesis 28 in the BOITCV

Genesis 28 in the BOKCV

Genesis 28 in the BOKCV2

Genesis 28 in the BOKHWOG

Genesis 28 in the BOKSSV

Genesis 28 in the BOLCB

Genesis 28 in the BOLCB2

Genesis 28 in the BOMCV

Genesis 28 in the BONAV

Genesis 28 in the BONCB

Genesis 28 in the BONLT

Genesis 28 in the BONUT2

Genesis 28 in the BOPLNT

Genesis 28 in the BOSCB

Genesis 28 in the BOSNC

Genesis 28 in the BOTLNT

Genesis 28 in the BOVCB

Genesis 28 in the BOYCB

Genesis 28 in the BPBB

Genesis 28 in the BPH

Genesis 28 in the BSB

Genesis 28 in the CCB

Genesis 28 in the CUV

Genesis 28 in the CUVS

Genesis 28 in the DBT

Genesis 28 in the DGDNT

Genesis 28 in the DHNT

Genesis 28 in the DNT

Genesis 28 in the ELBE

Genesis 28 in the EMTV

Genesis 28 in the ESV

Genesis 28 in the FBV

Genesis 28 in the FEB

Genesis 28 in the GGMNT

Genesis 28 in the GNT

Genesis 28 in the HARY

Genesis 28 in the HNT

Genesis 28 in the IRVA

Genesis 28 in the IRVB

Genesis 28 in the IRVG

Genesis 28 in the IRVH

Genesis 28 in the IRVK

Genesis 28 in the IRVM

Genesis 28 in the IRVM2

Genesis 28 in the IRVO

Genesis 28 in the IRVP

Genesis 28 in the IRVT

Genesis 28 in the IRVT2

Genesis 28 in the IRVU

Genesis 28 in the ISVN

Genesis 28 in the JSNT

Genesis 28 in the KAPI

Genesis 28 in the KBT1ETNIK

Genesis 28 in the KBV

Genesis 28 in the KJV

Genesis 28 in the KNFD

Genesis 28 in the LBA

Genesis 28 in the LBLA

Genesis 28 in the LNT

Genesis 28 in the LSV

Genesis 28 in the MAAL

Genesis 28 in the MBV

Genesis 28 in the MBV2

Genesis 28 in the MHNT

Genesis 28 in the MKNFD

Genesis 28 in the MNG

Genesis 28 in the MNT

Genesis 28 in the MNT2

Genesis 28 in the MRS1T

Genesis 28 in the NAA

Genesis 28 in the NASB

Genesis 28 in the NBLA

Genesis 28 in the NBS

Genesis 28 in the NBVTP

Genesis 28 in the NET2

Genesis 28 in the NIV11

Genesis 28 in the NNT

Genesis 28 in the NNT2

Genesis 28 in the NNT3

Genesis 28 in the PDDPT

Genesis 28 in the PFNT

Genesis 28 in the RMNT

Genesis 28 in the SBIAS

Genesis 28 in the SBIBS

Genesis 28 in the SBIBS2

Genesis 28 in the SBICS

Genesis 28 in the SBIDS

Genesis 28 in the SBIGS

Genesis 28 in the SBIHS

Genesis 28 in the SBIIS

Genesis 28 in the SBIIS2

Genesis 28 in the SBIIS3

Genesis 28 in the SBIKS

Genesis 28 in the SBIKS2

Genesis 28 in the SBIMS

Genesis 28 in the SBIOS

Genesis 28 in the SBIPS

Genesis 28 in the SBISS

Genesis 28 in the SBITS

Genesis 28 in the SBITS2

Genesis 28 in the SBITS3

Genesis 28 in the SBITS4

Genesis 28 in the SBIUS

Genesis 28 in the SBIVS

Genesis 28 in the SBT

Genesis 28 in the SBT1E

Genesis 28 in the SCHL

Genesis 28 in the SNT

Genesis 28 in the SUSU

Genesis 28 in the SUSU2

Genesis 28 in the SYNO

Genesis 28 in the TBIAOTANT

Genesis 28 in the TBT1E

Genesis 28 in the TBT1E2

Genesis 28 in the TFTIP

Genesis 28 in the TFTU

Genesis 28 in the TGNTATF3T

Genesis 28 in the THAI

Genesis 28 in the TNFD

Genesis 28 in the TNT

Genesis 28 in the TNTIK

Genesis 28 in the TNTIL

Genesis 28 in the TNTIN

Genesis 28 in the TNTIP

Genesis 28 in the TNTIZ

Genesis 28 in the TOMA

Genesis 28 in the TTENT

Genesis 28 in the UBG

Genesis 28 in the UGV

Genesis 28 in the UGV2

Genesis 28 in the UGV3

Genesis 28 in the VBL

Genesis 28 in the VDCC

Genesis 28 in the YALU

Genesis 28 in the YAPE

Genesis 28 in the YBVTP

Genesis 28 in the ZBP