Genesis 29 (BOICB)

1 Jekọb gara nʼihu nʼije ya rute nʼala dị nʼọwụwa anyanwụ. 2 NʼEbe Nsọ a, ọ hụrụ otu olulu mmiri, hụkwa ụzọ igwe atụrụ atọ ndị nọ nʼakụkụ olulu mmiri nʼihi na ndị na-elekọta ha na-enye ha mmiri site nʼolulu mmiri ahụ. Nkume e ji mechie ọnụ olulu mmiri ahụ buru ibu. 3 Nʼihi na mgbe igwe atụrụ niile bịazukọtara nʼolulu mmiri ahụ, ndị ọzụzụ atụrụ na-emeghepụ nkume ahụ nye ha mmiri. Emesịa, ha na-ejikwa nkume ahụ mechie ọnụ olulu mmiri ahụ. 4 Jekọb jekwuru ndị na-elekọta atụrụ ahụ jụọ ha sị, “Ụmụnna m, ebee ka unu si?”Ha zara sị ya, “Anyị si Haran.” 5 Ọ jụrụ ha sị, “Unu maara Leban, nwa Nahọ?”Ha zara sị, “Anyị ma ya.” 6 Ọzọ Jekọb jụrụ ha sị, “Ahụ ọ dịkwa ya mma?”Ha zara sị ya, “E, ahụ dị ya. Lee nwa ya nwanyị Rechel ka ọ chị atụrụ ya na-abịa.” 7 Jekọb kwuru sị, “Lee, anyanwụ ka na-acha. O rubeghị oge e ji achịbata igwe ụmụ anụ ụlọ. Nyenụ ha mmiri ka ha ṅụọ, ka ha laghachi gaa taa ahịhịa.” 8 Ha zara sị ya, “Anyị agaghị enye ha mmiri tutu ruo mgbe igwe atụrụ niile bịakọtara, mgbe e wepụrụ nkume e ji mechie ọnụ olulu mmiri, mgbe ahụ ka anyị ga-enye ha mmiri.” 9 Mgbe Jekọb na ndị ọzụzụ atụrụ ndị a kpụ okwu nʼọnụ, Rechel chịịrị atụrụ nna ya bịakwute ha, nʼihi na onye ọzụzụ atụrụ nwanyị ka ọ bụ. 10 Mgbe Jekọb hụrụ Rechel nwa Leban nwanne nne ya, hụkwa igwe atụrụ Leban, ọ meghepụrụ nkume ahụ e ji mechie ọnụ olulu mmiri ahụ nye igwe atụrụ Leban, nwanne nne ya mmiri ka ha ṅụọ. 11 Emesịa, Jekọb suturu Rechel ọnụ, kwaa akwa nʼoke olu. 12 Jekọb kọwaara Rechel na ọ bụ onye ikwu nna ya, bụrụkwa nwa Ribeka. Nʼihi ya Rechel ji ọsọ gbalaa nʼụlọ ha kọọrọ nna ya. 13 Mgbe Leban nụrụ maka Jekọb nwa nwanne ya nwanyị, o mere ngwangwa pụọ izute ya. Ọ makụrụ ya, sutu ya ọnụ, kpọrọ ya laa nʼụlọ. Nʼebe ahụ, Jekọb kọọrọ ya ihe ndị a niile. 14 Leban sịrị ya, “Nʼezie, ị bụ ọkpụkpụ m na anụ ahụ m.”Ọ nọnyeere ya otu ọnwa. 15 Leban sịrị Jekọb, “Ọ bụ nʼihi na ị bụ onye ikwu m ka ị na-agbara m odibo nʼefu? Gwa m ego ole m ga-akwụ gị nʼihi ọrụ ị na-arụrụ m?” 16 Leban mụrụ ụmụ ndị inyom abụọ. Aha nke okenye bụ Lịa. Aha nke nta bụ Rechel. 17 Ịma mma Lịa dị ya nʼanya, ma Rechel mara mma nʼahụ, maakwa mma ile anya. 18 Ọ bụ Rechel ka Jekọb hụrụ nʼanya. Nʼihi ya Jekọb gwara Leban sị, “Aga m arụrụ gị ọrụ afọ asaa ma ọ bụrụ na ị ga-ekwe ka m lụọ Rechel.” 19 Leban zara Jekọb sị ya, “Ọ dị mma na ị lụrụ Rechel karịa na onye ọzọ ga-alụ ya. Soro m nọdụ nʼebe a.” 20 Ya mere Jekọb gbara odibo afọ asaa maka Rechel. Ma afọ asaa ndị a dịka abalị ole na ole nʼanya Jekọb nʼihi ịhụnanya o nwere nʼebe Rechel nọ. 21 Jekọb gwara Leban, okwu sị ya, “Kpọnye m nwunye m nʼihi nʼụbọchị m ezuola. Achọrọ m ịbakwuru ya.” 22 Leban kpọkọtara ndị niile bi nʼebe ahụ mere ha nʼoke oriri. 23 Nʼanyasị ụbọchị ahụ, Leban kpọọrọ nwa ya nwanyị bụ Lịa kpọbara Jekọb, ọ bakwuuru ya. 24 Leban nyekwara Lịa odibo ya, Zilpa, ka ọ bụrụ odibo nwanyị ya. 25 Mgbe chi bọrọ, Jekọb hụrụ na ọ bụ Lịa ka Leban kpọnyere ya. Jekọb sịrị Leban, “Gịnị bụ ihe a i mere m? Ọ bụghị nʼihi Rechel ka m ji gbaara gị odibo? Gịnị mere i ji ghọgbuo m?” 26 Leban zara sị ya, “Ọ bụghị omenaala anyị ibu ụzọ kee nwantakịrị nwanyị nke nta di tupu nke ada. 27 Otu ọ dị, chere ka mmemme izu ụka nke onye nke a gafee. Mgbe ahụ, aga m akpọnyekwa gị onye nke ọzọ a maka odibo ị ga-agbara m afọ asaa ọzọ.” 28 Jekọb mere ka o si kwuo. O debezuru mmemme otu izu ụka onye nke a, Leban kpọnyere ya nwa ya Rechel ka ọ bụrụ nwunye ya. 29 Leban nyere nwa ya nwanyị, Rechel, odibo ya nwanyị bụ Bilha, ka ọ bụrụ odibo ya. 30 Jekọb bakwukwara Rechel. Ọ hụrụ Rechel nʼanya nke ukwuu karịa Lịa. Ọ gbakwaara Leban odibo afọ asaa ọzọ. 31 Mgbe ONYENWE ANYỊ hụrụ na Lịa bụ nwanyị a kpọrọ asị, o meghere akpanwa ya, ma Rechel bụ nwanyị aga. 32 Lịa tụrụ ime mụọ nwa nwoke, kpọọ ya Ruben. Nʼihi na o kwuru sị, “Ọ bụ nʼihi na ONYENWE ANYỊ ahụla nsogbu m, ugbu a di m ga-ahụ m nʼanya.” 33 Ọ tụụrụ ime ọzọ mụọkwa nwa nwoke. O kwuru sị, “ONYENWE ANYỊ anụla na m bụ nwanyị a kpọrọ asị, ọ bụ ya mere o ji nye m nwa nwoke ọzọ.” Ya mere ọ kpọrọ aha ya Simiọn. 34 Lịa tụrụ ime ọzọ, mgbe ọ mụrụ nwa nwoke, o kwuru sị, “Nʼezie, ugbu a ka di m ga-arapara m nʼahụ, nʼihi na amụọrala m ya ụmụ ndị ikom atọ.” Ya mere ọ kpọrọ aha ya Livayị. 35 Ọ tụụrụ ime ọzọ mụọ nwa nwoke. O kwuru sị, “Ugbu a aga m eto ONYENWE ANYỊ.” Ya mere, ọ kpọrọ aha ya Juda. Lịa mụsịrị nwa a kwụsị ịmụ ụmụ.

In Other Versions

Genesis 29 in the ANGEFD

Genesis 29 in the ANTPNG2D

Genesis 29 in the AS21

Genesis 29 in the BAGH

Genesis 29 in the BBPNG

Genesis 29 in the BBT1E

Genesis 29 in the BDS

Genesis 29 in the BEV

Genesis 29 in the BHAD

Genesis 29 in the BIB

Genesis 29 in the BLPT

Genesis 29 in the BNT

Genesis 29 in the BNTABOOT

Genesis 29 in the BNTLV

Genesis 29 in the BOATCB

Genesis 29 in the BOATCB2

Genesis 29 in the BOBCV

Genesis 29 in the BOCNT

Genesis 29 in the BOECS

Genesis 29 in the BOGWICC

Genesis 29 in the BOHCB

Genesis 29 in the BOHCV

Genesis 29 in the BOHLNT

Genesis 29 in the BOHNTLTAL

Genesis 29 in the BOILNTAP

Genesis 29 in the BOITCV

Genesis 29 in the BOKCV

Genesis 29 in the BOKCV2

Genesis 29 in the BOKHWOG

Genesis 29 in the BOKSSV

Genesis 29 in the BOLCB

Genesis 29 in the BOLCB2

Genesis 29 in the BOMCV

Genesis 29 in the BONAV

Genesis 29 in the BONCB

Genesis 29 in the BONLT

Genesis 29 in the BONUT2

Genesis 29 in the BOPLNT

Genesis 29 in the BOSCB

Genesis 29 in the BOSNC

Genesis 29 in the BOTLNT

Genesis 29 in the BOVCB

Genesis 29 in the BOYCB

Genesis 29 in the BPBB

Genesis 29 in the BPH

Genesis 29 in the BSB

Genesis 29 in the CCB

Genesis 29 in the CUV

Genesis 29 in the CUVS

Genesis 29 in the DBT

Genesis 29 in the DGDNT

Genesis 29 in the DHNT

Genesis 29 in the DNT

Genesis 29 in the ELBE

Genesis 29 in the EMTV

Genesis 29 in the ESV

Genesis 29 in the FBV

Genesis 29 in the FEB

Genesis 29 in the GGMNT

Genesis 29 in the GNT

Genesis 29 in the HARY

Genesis 29 in the HNT

Genesis 29 in the IRVA

Genesis 29 in the IRVB

Genesis 29 in the IRVG

Genesis 29 in the IRVH

Genesis 29 in the IRVK

Genesis 29 in the IRVM

Genesis 29 in the IRVM2

Genesis 29 in the IRVO

Genesis 29 in the IRVP

Genesis 29 in the IRVT

Genesis 29 in the IRVT2

Genesis 29 in the IRVU

Genesis 29 in the ISVN

Genesis 29 in the JSNT

Genesis 29 in the KAPI

Genesis 29 in the KBT1ETNIK

Genesis 29 in the KBV

Genesis 29 in the KJV

Genesis 29 in the KNFD

Genesis 29 in the LBA

Genesis 29 in the LBLA

Genesis 29 in the LNT

Genesis 29 in the LSV

Genesis 29 in the MAAL

Genesis 29 in the MBV

Genesis 29 in the MBV2

Genesis 29 in the MHNT

Genesis 29 in the MKNFD

Genesis 29 in the MNG

Genesis 29 in the MNT

Genesis 29 in the MNT2

Genesis 29 in the MRS1T

Genesis 29 in the NAA

Genesis 29 in the NASB

Genesis 29 in the NBLA

Genesis 29 in the NBS

Genesis 29 in the NBVTP

Genesis 29 in the NET2

Genesis 29 in the NIV11

Genesis 29 in the NNT

Genesis 29 in the NNT2

Genesis 29 in the NNT3

Genesis 29 in the PDDPT

Genesis 29 in the PFNT

Genesis 29 in the RMNT

Genesis 29 in the SBIAS

Genesis 29 in the SBIBS

Genesis 29 in the SBIBS2

Genesis 29 in the SBICS

Genesis 29 in the SBIDS

Genesis 29 in the SBIGS

Genesis 29 in the SBIHS

Genesis 29 in the SBIIS

Genesis 29 in the SBIIS2

Genesis 29 in the SBIIS3

Genesis 29 in the SBIKS

Genesis 29 in the SBIKS2

Genesis 29 in the SBIMS

Genesis 29 in the SBIOS

Genesis 29 in the SBIPS

Genesis 29 in the SBISS

Genesis 29 in the SBITS

Genesis 29 in the SBITS2

Genesis 29 in the SBITS3

Genesis 29 in the SBITS4

Genesis 29 in the SBIUS

Genesis 29 in the SBIVS

Genesis 29 in the SBT

Genesis 29 in the SBT1E

Genesis 29 in the SCHL

Genesis 29 in the SNT

Genesis 29 in the SUSU

Genesis 29 in the SUSU2

Genesis 29 in the SYNO

Genesis 29 in the TBIAOTANT

Genesis 29 in the TBT1E

Genesis 29 in the TBT1E2

Genesis 29 in the TFTIP

Genesis 29 in the TFTU

Genesis 29 in the TGNTATF3T

Genesis 29 in the THAI

Genesis 29 in the TNFD

Genesis 29 in the TNT

Genesis 29 in the TNTIK

Genesis 29 in the TNTIL

Genesis 29 in the TNTIN

Genesis 29 in the TNTIP

Genesis 29 in the TNTIZ

Genesis 29 in the TOMA

Genesis 29 in the TTENT

Genesis 29 in the UBG

Genesis 29 in the UGV

Genesis 29 in the UGV2

Genesis 29 in the UGV3

Genesis 29 in the VBL

Genesis 29 in the VDCC

Genesis 29 in the YALU

Genesis 29 in the YAPE

Genesis 29 in the YBVTP

Genesis 29 in the ZBP