Genesis 35 (BOICB)

1 Chineke sịrị Jekọb, “Bilie, gaa Betel, birikwa nʼebe ahụ. Wuo ebe ịchụ aja nye Chineke, onye mere ka ị hụ ya mgbe ị na-agbanarị Ịsọ nwanne gị nwoke.” 2 Ya mere, Jekọb gwara ndị ezinaụlọ ya na ndị niile so ya sị, “Wezuganụ chi ndị ala ọzọ dị nʼetiti unu. Doonụ onwe unu ọcha, gbanweekwanụ uwe unu. 3 Bilienụ, ka anyị gaa Betel, ebe m ga-ewu ebe ịchụ aja nye Chineke, onye zara m oku nʼụbọchị nsogbu m, ma nọnyekwara m na njem nke m gara.” 4 Ya mere, ha nyere Jekọb chi ndị ala ọzọ niile ha ji nʼaka, na ọla niile dị ha na ntị. Jekọb chịịrị ha niile lie ha nʼokpuru osisi ook dị na Shekem. 5 Ha biliri ije. Egwu Chineke dakwasịrị obodo niile gbara ha gburugburu. Ọ dịghị ndị chụsoro ha. 6 Jekọb na ndị niile so ya rutere Luz, nke a na-akpọkwa Betel nke dị na Kenan. 7 Jekọb wuru ebe ịchụ aja nʼebe a, kpọọ aha ebe ahụ El Betel, nʼihi na ọ bụ nʼebe ahụ ka Chineke gosiri ya onwe ya mgbe ọ na-agbanarị Ịsọ nwanne ya nwoke. 8 Mgbe nke a gasịrị, Debọra, nwanyị lekọtara Ribeka mgbe ọ bụ nwantakịrị, nwụrụ. E liri ya nʼokpuru osisi ook dị na Betel. A kpọkwara ebe ahụ, “Osisi ook ebe ịkwa akwa.” 9 Chineke gosiri Jekọb onwe ya ọzọ, mgbe o sitere na Padan Aram pụta, gọziekwa ya. 10 Chineke sịrị ya, “Aha gị bụ Jekọb ma a gaghị akpọkwa gị Jekọb ọzọ, kama aha gị ga-abụ Izrel.” Ya mere ọ kpọrọ ya Izrel. 11 Chineke sịrị ya, “Abụ m Chineke onye pụrụ ime ihe niile. Mụọ ọmụmụ, baakwa ụba nʼọnụọgụgụ. Otu mba na igwe mba ga-esi na gị pụta. Ndị eze ga-esitekwa gị nʼahụ pụta. 12 Ala ahụ m nyere Ebraham na Aịzik ka m na-enyekwa gị. Aga m enyekwa ya ụmụ ụmụ gị ndị ga-esote gị.” 13 Emesịa, Chineke si nʼebe ahụ ha nọ kparịtaa ụka pụọ. 14 Jekọb wuru ogidi nkume nʼebe ahụ Chineke nọ gwa ya okwu. Ọ wụsara onyinye ihe ọṅụṅụ wụkwasịkwa mmanụ nʼelu ogidi nkume ahụ. 15 Jekọb kpọrọ ebe ahụ ya na Chineke nọ kparịtaa ụka Betel. 16 Ha biliri ije, site na Betel. Ma mgbe ha ka nọ ebe dị anya site nʼobodo Efrat, Rechel mụrụ nwa, ma o nwere ihe mgbu ka ọ na-amụ nwa. 17 Mgbe o sitere nʼoke ihe mgbu na-amụpụta nwa ahụ, nwanyị na-aghọ nwa gwara ya, “Atụla egwu, nʼihi na ọ bụ nwa nwoke ọzọ ka ị mụtara.” 18 Ma tupu Rechel ekuo ume ikpeazụ, nʼihi na ọ na-anwụ, ọ kpọrọ aha nwa ọhụrụ ahụ Ben-Oni, ma nna ya kpọrọ ya Benjamin. 19 Rechel nwụrụ, e lie ya nʼakụkụ ụzọ gara Efrat, nke a na-akpọkwa Betlehem. 20 Jekọb wuru ogidi nʼelu ili ya, nke na-eguzokwa ruo taa, igosi ebe e liri Rechel. 21 Izrel malitere ije ya, tutu ruo ebe o wuru ebe izuike ya nʼala dị nʼofe ọzọ nke Migdal Eda. 22 Mgbe Izrel bi nʼala ahụ, Ruben gara dinakwuru Bilha, iko nwanyị nna ya. E mekwara ka Izrel nụ ihe a Ruben mere. Ụmụ ndị ikom Jekọb dị iri na abụọ. 23 Ụmụ Lịa bụ,Ruben, ọkpara Jekọb.Simiọn, Livayị, Juda, Isaka na Zebụlọn. 24 Ụmụ Rechel bụ,Josef na Benjamin. 25 Ụmụ Bilha, odibo nwanyị Rechel bụ,Dan na Naftalị. 26 Ụmụ Zilpa, odibo nwanyị Lịa bụ,Gad na Asha. Ụmụ ndị ikom ndị a ka a mụụrụ Jekọb na Padan Aram. 27 Nʼikpeazụ, Jekọb bịakwutere nna ya Aịzik na Mamre nke dị nso na Kiriat Arba (ebe a na-akpọ Hebrọn). Ebe ahụ ka Ebraham na Aịzik biri na mbụ. 28 Nʼoge ahụ Aịzik gbara narị afọ na iri afọ asatọ. 29 Ọ dịkwaghị anya site nʼoge a, Aịzik nwụrụ, mgbe o mere nnọọ agadi. Ụmụ ya ndị ikom abụọ, Ịsọ na Jekọb, liri ya.

In Other Versions

Genesis 35 in the ANGEFD

Genesis 35 in the ANTPNG2D

Genesis 35 in the AS21

Genesis 35 in the BAGH

Genesis 35 in the BBPNG

Genesis 35 in the BBT1E

Genesis 35 in the BDS

Genesis 35 in the BEV

Genesis 35 in the BHAD

Genesis 35 in the BIB

Genesis 35 in the BLPT

Genesis 35 in the BNT

Genesis 35 in the BNTABOOT

Genesis 35 in the BNTLV

Genesis 35 in the BOATCB

Genesis 35 in the BOATCB2

Genesis 35 in the BOBCV

Genesis 35 in the BOCNT

Genesis 35 in the BOECS

Genesis 35 in the BOGWICC

Genesis 35 in the BOHCB

Genesis 35 in the BOHCV

Genesis 35 in the BOHLNT

Genesis 35 in the BOHNTLTAL

Genesis 35 in the BOILNTAP

Genesis 35 in the BOITCV

Genesis 35 in the BOKCV

Genesis 35 in the BOKCV2

Genesis 35 in the BOKHWOG

Genesis 35 in the BOKSSV

Genesis 35 in the BOLCB

Genesis 35 in the BOLCB2

Genesis 35 in the BOMCV

Genesis 35 in the BONAV

Genesis 35 in the BONCB

Genesis 35 in the BONLT

Genesis 35 in the BONUT2

Genesis 35 in the BOPLNT

Genesis 35 in the BOSCB

Genesis 35 in the BOSNC

Genesis 35 in the BOTLNT

Genesis 35 in the BOVCB

Genesis 35 in the BOYCB

Genesis 35 in the BPBB

Genesis 35 in the BPH

Genesis 35 in the BSB

Genesis 35 in the CCB

Genesis 35 in the CUV

Genesis 35 in the CUVS

Genesis 35 in the DBT

Genesis 35 in the DGDNT

Genesis 35 in the DHNT

Genesis 35 in the DNT

Genesis 35 in the ELBE

Genesis 35 in the EMTV

Genesis 35 in the ESV

Genesis 35 in the FBV

Genesis 35 in the FEB

Genesis 35 in the GGMNT

Genesis 35 in the GNT

Genesis 35 in the HARY

Genesis 35 in the HNT

Genesis 35 in the IRVA

Genesis 35 in the IRVB

Genesis 35 in the IRVG

Genesis 35 in the IRVH

Genesis 35 in the IRVK

Genesis 35 in the IRVM

Genesis 35 in the IRVM2

Genesis 35 in the IRVO

Genesis 35 in the IRVP

Genesis 35 in the IRVT

Genesis 35 in the IRVT2

Genesis 35 in the IRVU

Genesis 35 in the ISVN

Genesis 35 in the JSNT

Genesis 35 in the KAPI

Genesis 35 in the KBT1ETNIK

Genesis 35 in the KBV

Genesis 35 in the KJV

Genesis 35 in the KNFD

Genesis 35 in the LBA

Genesis 35 in the LBLA

Genesis 35 in the LNT

Genesis 35 in the LSV

Genesis 35 in the MAAL

Genesis 35 in the MBV

Genesis 35 in the MBV2

Genesis 35 in the MHNT

Genesis 35 in the MKNFD

Genesis 35 in the MNG

Genesis 35 in the MNT

Genesis 35 in the MNT2

Genesis 35 in the MRS1T

Genesis 35 in the NAA

Genesis 35 in the NASB

Genesis 35 in the NBLA

Genesis 35 in the NBS

Genesis 35 in the NBVTP

Genesis 35 in the NET2

Genesis 35 in the NIV11

Genesis 35 in the NNT

Genesis 35 in the NNT2

Genesis 35 in the NNT3

Genesis 35 in the PDDPT

Genesis 35 in the PFNT

Genesis 35 in the RMNT

Genesis 35 in the SBIAS

Genesis 35 in the SBIBS

Genesis 35 in the SBIBS2

Genesis 35 in the SBICS

Genesis 35 in the SBIDS

Genesis 35 in the SBIGS

Genesis 35 in the SBIHS

Genesis 35 in the SBIIS

Genesis 35 in the SBIIS2

Genesis 35 in the SBIIS3

Genesis 35 in the SBIKS

Genesis 35 in the SBIKS2

Genesis 35 in the SBIMS

Genesis 35 in the SBIOS

Genesis 35 in the SBIPS

Genesis 35 in the SBISS

Genesis 35 in the SBITS

Genesis 35 in the SBITS2

Genesis 35 in the SBITS3

Genesis 35 in the SBITS4

Genesis 35 in the SBIUS

Genesis 35 in the SBIVS

Genesis 35 in the SBT

Genesis 35 in the SBT1E

Genesis 35 in the SCHL

Genesis 35 in the SNT

Genesis 35 in the SUSU

Genesis 35 in the SUSU2

Genesis 35 in the SYNO

Genesis 35 in the TBIAOTANT

Genesis 35 in the TBT1E

Genesis 35 in the TBT1E2

Genesis 35 in the TFTIP

Genesis 35 in the TFTU

Genesis 35 in the TGNTATF3T

Genesis 35 in the THAI

Genesis 35 in the TNFD

Genesis 35 in the TNT

Genesis 35 in the TNTIK

Genesis 35 in the TNTIL

Genesis 35 in the TNTIN

Genesis 35 in the TNTIP

Genesis 35 in the TNTIZ

Genesis 35 in the TOMA

Genesis 35 in the TTENT

Genesis 35 in the UBG

Genesis 35 in the UGV

Genesis 35 in the UGV2

Genesis 35 in the UGV3

Genesis 35 in the VBL

Genesis 35 in the VDCC

Genesis 35 in the YALU

Genesis 35 in the YAPE

Genesis 35 in the YBVTP

Genesis 35 in the ZBP