Genesis 6 (BOICB)
1 Mgbe ndị mmadụ bidoro mụbaa nʼụwa, mgbe a mụtakwaara ha ọtụtụ ụmụ ndị inyom, 2 ka ụmụ ndị ikom Chineke bidoro ilekwasị ụmụ ndị inyom ndị mmadụ anya, hụ na ha mara mma. Ha duuru ndị inyom ọbụla masịrị ha ka ha bụrụ nwunye ha. 3 Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ sịrị, “Mmụọ m na mmadụ agaghị anọgide nʼịgba mgba nʼime mmadụ ruo ebighị ebi, nʼihi na mmadụ efu ka ọ bụ. Ọnụọgụgụ ndụ ya ga-abụ narị afọ na iri afọ abụọ.” 4 Ndị Nefilim nọ nʼụwa nʼoge ahụ, ma nʼoge sotere ya mgbe ahụ, ụmụ ndị ikom Chineke na-abakwuru ndị inyom ụmụ mmadụ, site na mmekọrịta dị otu a mụọ ụmụ. Ndị a bụ ndị dike mgbe ochie ahụ, ndị a ma ama. 5 ONYENWE ANYỊ hụrụ otu ịba ụba nke ajọ omume mmadụ si dị ukwuu, hụkwa na echiche uche nke obi ya niile dị naanị nʼime ihe ọjọọ, mgbe niile. 6 O wutere ONYENWE ANYỊ nke ukwuu na o kere mmadụ, mkpụrụobi ya jupụtakwara nʼihe mgbu. 7 Nʼihi ya, ONYENWE ANYỊ sịrị, “Aga m esi nʼụwa kpochapụ mmadụ niile m kere eke. E e, mmadụ na anụmanụ niile, na ihe e kere eke na-akpụgharị nʼelu ala, na anụ ufe niile. Nʼihi na o wutere m na m kere ha.” 8 Ma Noa nwetara ihuọma nʼanya ONYENWE ANYỊ. 9 Nke a bụ akụkọ banyere usoro ndụ Noa na ezinaụlọ ya. Noa bụ onye ezi omume. Onye na-enweghị ịta ụta ọbụla nʼetiti ndị bi nʼoge ya. O mere ihe nʼụzọ Chineke chọrọ ya. 10 Noa mụtara ụmụ ndị ikom atọ aha ha bụ, Shem, Ham, na Jafet. 11 Ma nʼanya Chineke, ụwa bụ ihe rụrụ arụ, jupụtakwa nʼihe ike. 12 Chineke hụrụ otu ụwa si jọgbuo onwe ya na njọ, hụkwa na ụmụ mmadụ bụ ndị ihe ọjọọ riri ahụ. 13 Chineke sịrị Noa, “Aga m ebibi ihe niile bụ mmadụ, nʼihi na ụwa jupụtara nʼihe ike nʼihi omume mmadụ. E e, aga m ebibi ụwa na ndị niile nọ nʼime ya. 14 Ya mere, jiri osisi gofa wuore onwe gị ụgbọ mmiri. Rụnye ọtụtụ ọnụụlọ nʼime ya. Jiri korota techie elu ya na ime ya. 15 Otu a ka i ga-esi wuo ya: mee ka ogologo ụgbọ mmiri ahụ dịrị narị mita na iri mita anọ, obosara ya dịrị iri mita abụọ na atọ, ịdị elu ya dịrị mita iri na atọ na ọkara. 16 Meere ụgbọ mmiri ahụ ihe e ji ekpuchi elu ya. Mekwa oghere ga-adị ọkara mita site nʼebe ihe mkpuchi elu ụgbọ mmiri ahụ gbadata. Tinye ọnụ ụzọ nʼakụkụ ụgbọ mmiri ahụ, ma rụọkwa okpukpu nkwasa atọ, nke ala ala, nke etiti na nke elu elu. 17 Nʼihi na aga m eweta uju mmiri nʼụwa, ibibi ihe niile nwere ndụ dị nʼokpuru eluigwe. Ihe niile e kere eke na-eku ume ndụ ga-anwụ. Ihe niile nọ nʼụwa ga-ala nʼiyi. 18 Ma aga m eme ka ọgbụgba ndụ m dịrị gị. Ị ga-abanye nʼụgbọ mmiri ahụ, gị na ụmụ gị ndị ikom, na nwunye gị, na ndị nwunye ụmụ gị ndị ikom. 19 Ị ga-ewebata ihe niile e kere eke dị ndụ, abụọ abụọ, oke na nwunye, ichebe ha ndụ. 20 Ụdị nnụnụ dị iche iche, abụọ abụọ, na ụdị anụmanụ ọbụla dị iche iche, na ụdị anụ na-akpụ akpụ dị iche iche, ga-abịakwute gị ka i debe ha ndụ. 21 Ị ga-ewebata ụdị nri dị iche iche a na-eri eri, chịkọtaa ha ka ọ bụrụ nri nke gị na nke ha.” 22 Noa mere ihe niile dịka Chineke nyere ya iwu ime.
In Other Versions
Genesis 6 in the ANGEFD
Genesis 6 in the ANTPNG2D
Genesis 6 in the AS21
Genesis 6 in the BAGH
Genesis 6 in the BBPNG
Genesis 6 in the BBT1E
Genesis 6 in the BDS
Genesis 6 in the BEV
Genesis 6 in the BHAD
Genesis 6 in the BIB
Genesis 6 in the BLPT
Genesis 6 in the BNT
Genesis 6 in the BNTABOOT
Genesis 6 in the BNTLV
Genesis 6 in the BOATCB
Genesis 6 in the BOATCB2
Genesis 6 in the BOBCV
Genesis 6 in the BOCNT
Genesis 6 in the BOECS
Genesis 6 in the BOGWICC
Genesis 6 in the BOHCB
Genesis 6 in the BOHCV
Genesis 6 in the BOHLNT
Genesis 6 in the BOHNTLTAL
Genesis 6 in the BOILNTAP
Genesis 6 in the BOITCV
Genesis 6 in the BOKCV
Genesis 6 in the BOKCV2
Genesis 6 in the BOKHWOG
Genesis 6 in the BOKSSV
Genesis 6 in the BOLCB
Genesis 6 in the BOLCB2
Genesis 6 in the BOMCV
Genesis 6 in the BONAV
Genesis 6 in the BONCB
Genesis 6 in the BONLT
Genesis 6 in the BONUT2
Genesis 6 in the BOPLNT
Genesis 6 in the BOSCB
Genesis 6 in the BOSNC
Genesis 6 in the BOTLNT
Genesis 6 in the BOVCB
Genesis 6 in the BOYCB
Genesis 6 in the BPBB
Genesis 6 in the BPH
Genesis 6 in the BSB
Genesis 6 in the CCB
Genesis 6 in the CUV
Genesis 6 in the CUVS
Genesis 6 in the DBT
Genesis 6 in the DGDNT
Genesis 6 in the DHNT
Genesis 6 in the DNT
Genesis 6 in the ELBE
Genesis 6 in the EMTV
Genesis 6 in the ESV
Genesis 6 in the FBV
Genesis 6 in the FEB
Genesis 6 in the GGMNT
Genesis 6 in the GNT
Genesis 6 in the HARY
Genesis 6 in the HNT
Genesis 6 in the IRVA
Genesis 6 in the IRVB
Genesis 6 in the IRVG
Genesis 6 in the IRVH
Genesis 6 in the IRVK
Genesis 6 in the IRVM
Genesis 6 in the IRVM2
Genesis 6 in the IRVO
Genesis 6 in the IRVP
Genesis 6 in the IRVT
Genesis 6 in the IRVT2
Genesis 6 in the IRVU
Genesis 6 in the ISVN
Genesis 6 in the JSNT
Genesis 6 in the KAPI
Genesis 6 in the KBT1ETNIK
Genesis 6 in the KBV
Genesis 6 in the KJV
Genesis 6 in the KNFD
Genesis 6 in the LBA
Genesis 6 in the LBLA
Genesis 6 in the LNT
Genesis 6 in the LSV
Genesis 6 in the MAAL
Genesis 6 in the MBV
Genesis 6 in the MBV2
Genesis 6 in the MHNT
Genesis 6 in the MKNFD
Genesis 6 in the MNG
Genesis 6 in the MNT
Genesis 6 in the MNT2
Genesis 6 in the MRS1T
Genesis 6 in the NAA
Genesis 6 in the NASB
Genesis 6 in the NBLA
Genesis 6 in the NBS
Genesis 6 in the NBVTP
Genesis 6 in the NET2
Genesis 6 in the NIV11
Genesis 6 in the NNT
Genesis 6 in the NNT2
Genesis 6 in the NNT3
Genesis 6 in the PDDPT
Genesis 6 in the PFNT
Genesis 6 in the RMNT
Genesis 6 in the SBIAS
Genesis 6 in the SBIBS
Genesis 6 in the SBIBS2
Genesis 6 in the SBICS
Genesis 6 in the SBIDS
Genesis 6 in the SBIGS
Genesis 6 in the SBIHS
Genesis 6 in the SBIIS
Genesis 6 in the SBIIS2
Genesis 6 in the SBIIS3
Genesis 6 in the SBIKS
Genesis 6 in the SBIKS2
Genesis 6 in the SBIMS
Genesis 6 in the SBIOS
Genesis 6 in the SBIPS
Genesis 6 in the SBISS
Genesis 6 in the SBITS
Genesis 6 in the SBITS2
Genesis 6 in the SBITS3
Genesis 6 in the SBITS4
Genesis 6 in the SBIUS
Genesis 6 in the SBIVS
Genesis 6 in the SBT
Genesis 6 in the SBT1E
Genesis 6 in the SCHL
Genesis 6 in the SNT
Genesis 6 in the SUSU
Genesis 6 in the SUSU2
Genesis 6 in the SYNO
Genesis 6 in the TBIAOTANT
Genesis 6 in the TBT1E
Genesis 6 in the TBT1E2
Genesis 6 in the TFTIP
Genesis 6 in the TFTU
Genesis 6 in the TGNTATF3T
Genesis 6 in the THAI
Genesis 6 in the TNFD
Genesis 6 in the TNT
Genesis 6 in the TNTIK
Genesis 6 in the TNTIL
Genesis 6 in the TNTIN
Genesis 6 in the TNTIP
Genesis 6 in the TNTIZ
Genesis 6 in the TOMA
Genesis 6 in the TTENT
Genesis 6 in the UBG
Genesis 6 in the UGV
Genesis 6 in the UGV2
Genesis 6 in the UGV3
Genesis 6 in the VBL
Genesis 6 in the VDCC
Genesis 6 in the YALU
Genesis 6 in the YAPE
Genesis 6 in the YBVTP
Genesis 6 in the ZBP