Genesis 9 (BOICB)

1 Mgbe ihe ndị a gasịrị, Chineke gọziri Noa na ụmụ ya sị ha: “Mụọnụ, baanụ, jupụtanụ nʼụwa. 2 Egwu unu na ụjọ unu ga-adakwasị anụmanụ niile nke ụwa nke dị ndụ, na anụ ufe niile nke eluigwe, na ihe e kere eke niile na-akpụgharị nʼala, na azụ niile dị nʼosimiri. Ewerela m ha niile nyefee unu nʼaka. 3 Ihe ọbụla dị ndụ nke na-ejegharị ejegharị ga-abụ nri unu. Enyela m unu ihe niile ugbu a dịka m si nye unu ahịhịa ndụ niile. 4 “Ma unu agaghị eri anụ ọbụla nke ọbara ndụ ya dị ya nʼahụ. 5 Ma gbasara ọbara ndụ unu, unu ga-asara ọnụ unu nʼihu m. Anụmanụ ọbụla ga-asara ọnụ ya nʼihu m. Mmadụ ọbụla kwa ga-asara ọnụ ya nʼihu m banyere ndụ mmadụ ibe ya. 6 “Onye ọbụla wufuru ọbara mmadụ,nʼaka mmadụ ka a ga-awụfu ọbara nke ya,nʼihi nʼoyiyi Chinekeka Chineke mere mmadụ. 7 Ma unu onwe unu, mịanụ mkpụrụ, mụbaanụ, jupụtanụ ụwa, baakwanụ ụba nʼime ya.” 8 Chineke gwara Noa na ụmụ ya sị, 9 “Ugbu a, ana m ehiwe ọgbụgba ndụ nʼetiti mụ na unu, na nʼetiti agbụrụ unu ndị ga-anọchi unu, 10 na nʼetiti ihe niile nwere ndụ nke unu na ha so, ụmụ anụ ufe, na ụmụ anụ ụlọ, na ụmụ anụ ọhịa niile, ndị ahụ niile so unu si nʼụgbọ mmiri pụta, bụ ihe niile nwere ndụ nʼụwa. 11 Ebe ọ bụ na m ehiwela ọgbụgba ndụ m nʼetiti mụ na unu, ọ gaghị emekwa ọzọ na a ga-eji uju mmiri kpochapụ ihe niile e kere eke, ọ gaghị emekwa ọzọ na a ga-eji uju mmiri bibie ụwa.” 12 Chineke kwuru sị, “Nke a bụ ihe ama nke ọgbụgba ndụ nke m na-etinye nʼetiti mụ na unu, na nʼetiti ihe niile nwere ndụ so unu, ọgbụgba ndụ nke ga-adị nye ọgbọ niile na-abịa nʼihu. 13 Etinyela m eke na egwurugwu m na mbara eluigwe, ka ọ bụrụ ihe ama nke ọgbụgba ndụ dị nʼetiti mụ na ụwa. 14 Mgbe ọbụla m zitere igwe ojii nʼụwa, ọ bụrụ na eke na egwurugwu apụta ìhè na mbara eluigwe, 15 aga m echeta ọgbụgba ndụ m mere ka ọ dịrị nʼetiti mụ na unu, na nʼetiti mụ na ihe niile nwere ndụ site nʼihe niile e kere eke. Ọ gaghị emekwa ọzọ na mmiri ga-aghọ uju mmiri ibibi ihe niile nwere ndụ. 16 Mgbe ọbụla eke na egwurugwu pụtara nʼigwe ojii, aga m ahụ ya cheta ọgbụgba ndụ ebighị ebi nke dị nʼetiti Chineke na ihe niile nwere ndụ site nʼihe niile e kere eke nọ nʼelu ụwa.” 17 Chineke gwara Noa sị, “Nke a bụ ihe ama ọgbụgba ndụ ahụ m hiwere nʼetiti mụ na ihe niile nwere ndụ nʼụwa.” 18 Ụmụ ndị ikom Noa ndị si nʼụgbọ mmiri pụta bụ Shem, Ham na Jafet. (Ham bụ nna Kenan.) 19 Ndị a bụ ụmụ ndị ikom atọ Noa mụrụ. Ọ bụ site na ha ka ndị mmadụ niile gbasara nʼụwa niile si pụta. 20 Noa, onye ọrụ ubi, bidoro ịkụ ubi vaịnị a gbara ogige. 21 Mgbe ọ ṅụrụ mmanya si nʼubi a, ṅụbiga ya oke, ọ gbaara ọtọ dinaa ala nʼime ụlọ ikwu ya. 22 Ham, nna Kenan, hụrụ ọtọ nna ya, gaa kọọrọ ụmụnne ya abụọ nọ nʼezi ihe ọ hụrụ. 23 Ma Shem na Jafet weere akwa tụkwasị nʼubu ha, were azụ jere ije ruo nʼebe nna ha nọ, hapụ akwa ahụ ka ọ dakwasị nna ha kpuchikwaa ọtọ ya. Ma ha chepuru ihu nʼebe ọzọ mgbe ha na-eme nke a, nʼihi ya, ha elekwasịghị ọtọ nna ha anya. 24 Mgbe Noa si nʼụra mmanya ya bilie, chọpụta ihe nwa ya nwoke nke nta mere, 25 o kwuru sị,“Onye a bụrụ ọnụ ka Kenan bụ!Ohu ndị ohu,ka ọ ga-abụrụ ụmụnne ya.” 26 Ọ sịkwara,“Ngọzị dịrị ONYENWE ANYỊ Chineke Shem.Ka Kenan bụrụ ohu Shem. 27 Ka Chineke mee ka ebe obibi Jafet saa mbara,ka Jafet biri nʼụlọ ikwu Shem,meekwa ka Kenan bụrụ ohu ya.” 28 Mgbe uju mmiri ahụ gabigachara, Noa biri ndụ narị afọ atọ na iri afọ ise ọzọ. 29 Ọnụọgụgụ afọ Noa niile mgbe ọ nwụrụ, bụ narị afọ itoolu na iri afọ ise.

In Other Versions

Genesis 9 in the ANGEFD

Genesis 9 in the ANTPNG2D

Genesis 9 in the AS21

Genesis 9 in the BAGH

Genesis 9 in the BBPNG

Genesis 9 in the BBT1E

Genesis 9 in the BDS

Genesis 9 in the BEV

Genesis 9 in the BHAD

Genesis 9 in the BIB

Genesis 9 in the BLPT

Genesis 9 in the BNT

Genesis 9 in the BNTABOOT

Genesis 9 in the BNTLV

Genesis 9 in the BOATCB

Genesis 9 in the BOATCB2

Genesis 9 in the BOBCV

Genesis 9 in the BOCNT

Genesis 9 in the BOECS

Genesis 9 in the BOGWICC

Genesis 9 in the BOHCB

Genesis 9 in the BOHCV

Genesis 9 in the BOHLNT

Genesis 9 in the BOHNTLTAL

Genesis 9 in the BOILNTAP

Genesis 9 in the BOITCV

Genesis 9 in the BOKCV

Genesis 9 in the BOKCV2

Genesis 9 in the BOKHWOG

Genesis 9 in the BOKSSV

Genesis 9 in the BOLCB

Genesis 9 in the BOLCB2

Genesis 9 in the BOMCV

Genesis 9 in the BONAV

Genesis 9 in the BONCB

Genesis 9 in the BONLT

Genesis 9 in the BONUT2

Genesis 9 in the BOPLNT

Genesis 9 in the BOSCB

Genesis 9 in the BOSNC

Genesis 9 in the BOTLNT

Genesis 9 in the BOVCB

Genesis 9 in the BOYCB

Genesis 9 in the BPBB

Genesis 9 in the BPH

Genesis 9 in the BSB

Genesis 9 in the CCB

Genesis 9 in the CUV

Genesis 9 in the CUVS

Genesis 9 in the DBT

Genesis 9 in the DGDNT

Genesis 9 in the DHNT

Genesis 9 in the DNT

Genesis 9 in the ELBE

Genesis 9 in the EMTV

Genesis 9 in the ESV

Genesis 9 in the FBV

Genesis 9 in the FEB

Genesis 9 in the GGMNT

Genesis 9 in the GNT

Genesis 9 in the HARY

Genesis 9 in the HNT

Genesis 9 in the IRVA

Genesis 9 in the IRVB

Genesis 9 in the IRVG

Genesis 9 in the IRVH

Genesis 9 in the IRVK

Genesis 9 in the IRVM

Genesis 9 in the IRVM2

Genesis 9 in the IRVO

Genesis 9 in the IRVP

Genesis 9 in the IRVT

Genesis 9 in the IRVT2

Genesis 9 in the IRVU

Genesis 9 in the ISVN

Genesis 9 in the JSNT

Genesis 9 in the KAPI

Genesis 9 in the KBT1ETNIK

Genesis 9 in the KBV

Genesis 9 in the KJV

Genesis 9 in the KNFD

Genesis 9 in the LBA

Genesis 9 in the LBLA

Genesis 9 in the LNT

Genesis 9 in the LSV

Genesis 9 in the MAAL

Genesis 9 in the MBV

Genesis 9 in the MBV2

Genesis 9 in the MHNT

Genesis 9 in the MKNFD

Genesis 9 in the MNG

Genesis 9 in the MNT

Genesis 9 in the MNT2

Genesis 9 in the MRS1T

Genesis 9 in the NAA

Genesis 9 in the NASB

Genesis 9 in the NBLA

Genesis 9 in the NBS

Genesis 9 in the NBVTP

Genesis 9 in the NET2

Genesis 9 in the NIV11

Genesis 9 in the NNT

Genesis 9 in the NNT2

Genesis 9 in the NNT3

Genesis 9 in the PDDPT

Genesis 9 in the PFNT

Genesis 9 in the RMNT

Genesis 9 in the SBIAS

Genesis 9 in the SBIBS

Genesis 9 in the SBIBS2

Genesis 9 in the SBICS

Genesis 9 in the SBIDS

Genesis 9 in the SBIGS

Genesis 9 in the SBIHS

Genesis 9 in the SBIIS

Genesis 9 in the SBIIS2

Genesis 9 in the SBIIS3

Genesis 9 in the SBIKS

Genesis 9 in the SBIKS2

Genesis 9 in the SBIMS

Genesis 9 in the SBIOS

Genesis 9 in the SBIPS

Genesis 9 in the SBISS

Genesis 9 in the SBITS

Genesis 9 in the SBITS2

Genesis 9 in the SBITS3

Genesis 9 in the SBITS4

Genesis 9 in the SBIUS

Genesis 9 in the SBIVS

Genesis 9 in the SBT

Genesis 9 in the SBT1E

Genesis 9 in the SCHL

Genesis 9 in the SNT

Genesis 9 in the SUSU

Genesis 9 in the SUSU2

Genesis 9 in the SYNO

Genesis 9 in the TBIAOTANT

Genesis 9 in the TBT1E

Genesis 9 in the TBT1E2

Genesis 9 in the TFTIP

Genesis 9 in the TFTU

Genesis 9 in the TGNTATF3T

Genesis 9 in the THAI

Genesis 9 in the TNFD

Genesis 9 in the TNT

Genesis 9 in the TNTIK

Genesis 9 in the TNTIL

Genesis 9 in the TNTIN

Genesis 9 in the TNTIP

Genesis 9 in the TNTIZ

Genesis 9 in the TOMA

Genesis 9 in the TTENT

Genesis 9 in the UBG

Genesis 9 in the UGV

Genesis 9 in the UGV2

Genesis 9 in the UGV3

Genesis 9 in the VBL

Genesis 9 in the VDCC

Genesis 9 in the YALU

Genesis 9 in the YAPE

Genesis 9 in the YBVTP

Genesis 9 in the ZBP