Hebrews 2 (BOICB)
1 Ya mere, anyị aghaghị ilezi anya nke ọma banyere ihe anyị nụrụla, ka anyị hapụ isi na ha wezuga onwe anyị. 2 Nʼihi na ọ bụrụ na ozi ahụ e ziri site na ndị mmụọ ozi dị ire, ọ bụrụkwa na njehie maọbụ nnupu isi ọbụla natara ahụhụ kwesiri ya. 3 Anyị ga-esi aṅaa gbanarị ntaramahụhụ ma ọ bụrụ na anyị eleghara oke nzọpụta ahụ anya? Ọ bụ Onyenwe anyị kwupụtara ya, bụkwa nke ndị nụrụ ya gbaara anyị ama banyere ya. 4 Chineke nʼonwe ya tụkwasịrị ịgba ama nke ya, site nʼịrụ ọrụ ebube na ọrụ ịrịbama, na ọrụ ịtụnanya dị iche iche, nakwa ikesa ọtụtụ onyinye nke Mmụọ Nsọ, dị ka ọchịchọ ya siri dị. 5 Ọ dịghị mgbe Chineke nyere ndị mmụọ ozi ike ịchị elu ụwa a. Anyị na-ekwu banyere ụwa gaje ịbịa abịa. 6 Otu onye agbaala akaebe nʼebe ọzọ,“Gịnị ka mmadụ bụ i ji na-eche banyere ha?Gịnị ka nwa nke mmadụ bụ iji na-elekọta ya? 7 Nʼihi na i mere ka ha dị ala nwantakịrị nʼebe ndị mmụọ ozi nọ;i jikwa ebube na nsọpụrụ kpube ya nʼisi dịka okpueze, 8 dokwaa ihe niile nʼokpuru ụkwụ ya.”Mgbe o mere ka ihe niile dịrị nʼokpuru ya, o nwekwaghị ihe ọbụla ọ hapụrụ itinye nʼokpuru ya. Ma otu ọ dị, anyị ahụbeghị ka e doro ihe niile nʼokpuru ya. 9 Ma anyị na-ahụ Jisọs bụ onye e mere ka ọ dị ala nwantakịrị oge karịa ndị mmụọ ozi, ma ugbu a ejirila ebube na nsọpụrụ kpukwasị ya nʼisi, nʼihi ahụhụ ọnwụ nke ọ hụrụ, ka o site nʼamara Chineke detụ ọnwụ ire nʼihi mmadụ niile. 10 Ebe e sitere na ya kpọbata ọtụtụ ụmụ nʼebube, o ziri ezi ka Chineke, onye ihe niile dịrị na onye kere ihe niile, mee ka onyeisi nzọpụta ha bụrụ onye zuruoke site nʼahụhụ ọ hụrụ. 11 Onye ahụ na-eme mmadụ ka ọ dị nsọ, na ndị ahụ e mere ka ha dị nsọ si nʼotu ezinaụlọ. Nʼihi ya, ihere adịghị eme ya ịkpọ ha ụmụnna ya. 12 Ọ sịrị,“Aga m ekwupụta aha gị nye ụmụnna m,nʼetiti nzukọ ka m ga-anọ bụọrọ gị abụ otuto.” 13 Ọzọkwa,“Aga m atụkwasị obi m na ya.”Ọzọkwa, ọ sịrị,“Lee mụ onwe m, na ụmụ ndị Chineke nyere m.” 14 Ebe ọ bụ na ụmụ ndị ahụ ketara oke na anụ ahụ na ọbara, ya onwe ya sooro ha keta oke nʼụdịdị ahụ, ka o site nʼọnwụ ya laa onye ahụ nwere ike ọnwụ nʼiyi, onye ahụ bụ ekwensu. 15 Ma tọpụ ndị ahụ niile egwu nke ọnwụ mere ka ha bụrụ ohu na ndụ ha niile. 16 Nʼihi na nʼezie, ọ bụghị ndị mmụọ ozi ka ọ na-enyere aka kama ọ bụ ụmụ ụmụ Ebraham. 17 Nʼihi nke a, e mere ka o yie ụmụnna ya nʼihe niile, ka o nwe ike ghọọ onyeisi nchụaja kwesiri ntụkwasị obi ma na nke nwere obi ebere nʼijere Chineke ozi, ka o nweekwa ike chụọ aja ikpuchi mmehie mmadụ niile. 18 Ebe ọ bụ na ya onwe ya tara ahụhụ mgbe a na-anwa ya ọnwụnwa, o nwekwara ike inyere ndị a na-anwa ọnwụnwa aka.
In Other Versions
Hebrews 2 in the ANGEFD
Hebrews 2 in the ANTPNG2D
Hebrews 2 in the AS21
Hebrews 2 in the BAGH
Hebrews 2 in the BBPNG
Hebrews 2 in the BBT1E
Hebrews 2 in the BDS
Hebrews 2 in the BEV
Hebrews 2 in the BHAD
Hebrews 2 in the BIB
Hebrews 2 in the BLPT
Hebrews 2 in the BNT
Hebrews 2 in the BNTABOOT
Hebrews 2 in the BNTLV
Hebrews 2 in the BOATCB
Hebrews 2 in the BOATCB2
Hebrews 2 in the BOBCV
Hebrews 2 in the BOCNT
Hebrews 2 in the BOECS
Hebrews 2 in the BOGWICC
Hebrews 2 in the BOHCB
Hebrews 2 in the BOHCV
Hebrews 2 in the BOHLNT
Hebrews 2 in the BOHNTLTAL
Hebrews 2 in the BOILNTAP
Hebrews 2 in the BOITCV
Hebrews 2 in the BOKCV
Hebrews 2 in the BOKCV2
Hebrews 2 in the BOKHWOG
Hebrews 2 in the BOKSSV
Hebrews 2 in the BOLCB
Hebrews 2 in the BOLCB2
Hebrews 2 in the BOMCV
Hebrews 2 in the BONAV
Hebrews 2 in the BONCB
Hebrews 2 in the BONLT
Hebrews 2 in the BONUT2
Hebrews 2 in the BOPLNT
Hebrews 2 in the BOSCB
Hebrews 2 in the BOSNC
Hebrews 2 in the BOTLNT
Hebrews 2 in the BOVCB
Hebrews 2 in the BOYCB
Hebrews 2 in the BPBB
Hebrews 2 in the BPH
Hebrews 2 in the BSB
Hebrews 2 in the CCB
Hebrews 2 in the CUV
Hebrews 2 in the CUVS
Hebrews 2 in the DBT
Hebrews 2 in the DGDNT
Hebrews 2 in the DHNT
Hebrews 2 in the DNT
Hebrews 2 in the ELBE
Hebrews 2 in the EMTV
Hebrews 2 in the ESV
Hebrews 2 in the FBV
Hebrews 2 in the FEB
Hebrews 2 in the GGMNT
Hebrews 2 in the GNT
Hebrews 2 in the HARY
Hebrews 2 in the HNT
Hebrews 2 in the IRVA
Hebrews 2 in the IRVB
Hebrews 2 in the IRVG
Hebrews 2 in the IRVH
Hebrews 2 in the IRVK
Hebrews 2 in the IRVM
Hebrews 2 in the IRVM2
Hebrews 2 in the IRVO
Hebrews 2 in the IRVP
Hebrews 2 in the IRVT
Hebrews 2 in the IRVT2
Hebrews 2 in the IRVU
Hebrews 2 in the ISVN
Hebrews 2 in the JSNT
Hebrews 2 in the KAPI
Hebrews 2 in the KBT1ETNIK
Hebrews 2 in the KBV
Hebrews 2 in the KJV
Hebrews 2 in the KNFD
Hebrews 2 in the LBA
Hebrews 2 in the LBLA
Hebrews 2 in the LNT
Hebrews 2 in the LSV
Hebrews 2 in the MAAL
Hebrews 2 in the MBV
Hebrews 2 in the MBV2
Hebrews 2 in the MHNT
Hebrews 2 in the MKNFD
Hebrews 2 in the MNG
Hebrews 2 in the MNT
Hebrews 2 in the MNT2
Hebrews 2 in the MRS1T
Hebrews 2 in the NAA
Hebrews 2 in the NASB
Hebrews 2 in the NBLA
Hebrews 2 in the NBS
Hebrews 2 in the NBVTP
Hebrews 2 in the NET2
Hebrews 2 in the NIV11
Hebrews 2 in the NNT
Hebrews 2 in the NNT2
Hebrews 2 in the NNT3
Hebrews 2 in the PDDPT
Hebrews 2 in the PFNT
Hebrews 2 in the RMNT
Hebrews 2 in the SBIAS
Hebrews 2 in the SBIBS
Hebrews 2 in the SBIBS2
Hebrews 2 in the SBICS
Hebrews 2 in the SBIDS
Hebrews 2 in the SBIGS
Hebrews 2 in the SBIHS
Hebrews 2 in the SBIIS
Hebrews 2 in the SBIIS2
Hebrews 2 in the SBIIS3
Hebrews 2 in the SBIKS
Hebrews 2 in the SBIKS2
Hebrews 2 in the SBIMS
Hebrews 2 in the SBIOS
Hebrews 2 in the SBIPS
Hebrews 2 in the SBISS
Hebrews 2 in the SBITS
Hebrews 2 in the SBITS2
Hebrews 2 in the SBITS3
Hebrews 2 in the SBITS4
Hebrews 2 in the SBIUS
Hebrews 2 in the SBIVS
Hebrews 2 in the SBT
Hebrews 2 in the SBT1E
Hebrews 2 in the SCHL
Hebrews 2 in the SNT
Hebrews 2 in the SUSU
Hebrews 2 in the SUSU2
Hebrews 2 in the SYNO
Hebrews 2 in the TBIAOTANT
Hebrews 2 in the TBT1E
Hebrews 2 in the TBT1E2
Hebrews 2 in the TFTIP
Hebrews 2 in the TFTU
Hebrews 2 in the TGNTATF3T
Hebrews 2 in the THAI
Hebrews 2 in the TNFD
Hebrews 2 in the TNT
Hebrews 2 in the TNTIK
Hebrews 2 in the TNTIL
Hebrews 2 in the TNTIN
Hebrews 2 in the TNTIP
Hebrews 2 in the TNTIZ
Hebrews 2 in the TOMA
Hebrews 2 in the TTENT
Hebrews 2 in the UBG
Hebrews 2 in the UGV
Hebrews 2 in the UGV2
Hebrews 2 in the UGV3
Hebrews 2 in the VBL
Hebrews 2 in the VDCC
Hebrews 2 in the YALU
Hebrews 2 in the YAPE
Hebrews 2 in the YBVTP
Hebrews 2 in the ZBP