Isaiah 1 (BOICB)

1 Ọhụ Aịzaya nwa Emọz, nke ọ hụrụ banyere Juda na Jerusalem nʼoge ọchịchị Ụzaya, Jotam, Ehaz na Hezekaya, bụ ndị eze Juda. 2 Gee ntị, gị eluigwe, gee ntị, gị ụwa!Nʼihi na ONYENWE ANYỊ ekwuola okwu:“Azụrụ m ụmụntakịrị, zụlite ha,ma ha enupula isi megide m. 3 Ehi maara onyenwe ya,ịnyịnya ibu makwaara ebe onyenwe ya na-anọ azụ ya nri,ma Izrel amaghị m,ndị m adịghị aghọtakwa.” 4 Ahụhụ dịrị mba ndị mmehie,ndị ajọ omume riri ahụ,ụmụ ndị ajọ omume,ụmụ ndị nyefere onwe ha na mmerụ!Ha agbakụtala ONYENWE ANYỊ azụ,ha elelịala Onye dị Nsọ nke Izrel,ha agbakụtala ya azụ ha. 5 Gịnị mere a ga-eji nọgide na-eti unu ihe?Gịnị mere unu ji nọgide na nnupu isi?Lee ọnya juru unu isi,leekwa na ọrịa na-arịa obi unu. 6 O nweghị akụkụ ahụ unu zuruoke,site nʼọbọ ụkwụ unu ruo nʼopi isi unu;ọnya, na ntihịa ahụ,na ọnya mmerụ ahụ, jupụtara unu nʼahụ;e kechikwaghị ha,e tekwaghị ha mmanụ. 7 Ala unu tọgbọrọ nʼefu,agbaakwala obodo unu ọkụ.Ndị mbịarambịa ewerechaala ihe dị nʼubi ununʼihu unu,ha emeela ka ọ tọgbọrọ nʼefu dịka mgbe onye ọbịa kpochapụrụ ihe dị nʼime ya. 8 Ada Zayọn ka a hapụrụdịka ụlọ nche dị nʼubi vaịnị,dịka ụlọ nta dị nʼubi kukumba,dịka obodo ndị iro gbara gburugburu. 9 Ọ bụrụ na ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niileemeghị ka mmadụ ole na ole fọdụ ndụ nʼime anyị,anyị gara adị ka Sọdọm,anyị gaara adịkwa ka Gọmọra. 10 Nụrụnụ okwu ONYENWE ANYỊ,unu ndị na-achị Sọdọm;geenụ ntị nʼozizi Chineke anyị,unu ndị Gọmọra. 11 “Nʼihi gịnị ka unu ji na-achụrụ m ọtụtụ aja,gịnị ka ihe ndị a bụ nye m?”ka ONYENWE ANYỊ sịrị.“Afọ ejula m nʼaja nsure ọkụ niilenke eji ebule na anụmanụ e mere ka ha gbaa abụba chụọ;Ọbara oke ehi na nke ụmụ atụrụ na mkpiadịghị atọkwa m ụtọ. 12 Mgbe unu na-abịa ka ahụ unu nʼihu m,onye chọrọ nke a nʼaka unu?Kwụsịnụ ịzọtọ ogige m. 13 Kwụsị iweta onyinye niile na-enweghị isi.Ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ unu bụrụ m ihe arụ.Mmemme ọnwa ọhụrụ, na nke ụbọchị izuike, na nzukọta unu niile,apụghị m ịnagide mkpọkọta unu nke na-abaghị uru. 14 Mkpụrụobi m kpọrọ mmemme ọnwa ọhụrụ, na mmemme unu ndị ọzọa kara aka asị.Ha bụụrụ m ibu arọ,ike agwụkwala m ibu ha. 15 Mgbe unu na-agbasa aka unu nʼekpere,agaghị m aṅa unu ntị;ọ bụladị mgbe unu na-ekpe ọtụtụ ekpere,agaghị m aṅa ntị.” Nʼihi na aka unu jupụtara nʼọbara! 16 Sachapụnụ onwe unu, dịkwanụ ọcha.Wezuganụ ajọ omume unu niile site nʼihu m;kwụsịnụ ime ihe na-adịghị mma. 17 Mụtanụ otu e si eme ihe ziri ezi; chọọnụ ikpe ziri ezi,nyerenụ ndị a na-emegbu aka.Werenụ ọnọdụ nna nʼebe ndị na-enweghị nna nọ,ma kwuchitenụ ọnụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ. 18 “Bịanụ ka anyị kparịtaa ụka,”bụ ihe ONYENWE ANYỊ na-asị.“A sịkwarị na mmehie unu dị ka uwe uhie,ha ga-adị ọcha dịka akụmmiri igwe,a sịkwa na ha dị uhie uhie dịka ogho uhie,ha ga-adịkwa ka ajị anụ ọcha. 19 Ọ bụrụ na unu ga-ekwenye, ọ bụrụ na unu ga-erubere m isi,aga m eme ka unu nwee ezi ihe nke unu ga-eri nʼala a. 20 Ma ọ bụrụ na unu ajụ ma nupu isi,ọ bụ mma agha ka a ga-eji gbuchapụ unu.”Nʼihi na ọnụ ONYENWE ANYỊ ekwula ya. 21 Lee ka obodo ahụ kwesiri ntụkwasị obiaghọọla onye akwụna!Ọ bụ nke jupụtararị nʼikpe ziri ezi;ezi omume na-anọbu nʼime ya,ma ugbu a, ọ bụzi ndị ogbu mmadụ. 22 Ọlaọcha gị aghọọla unyi,ezi mmanya gị aghọọla nke a gwafere mmiri oke. 23 Ndị ndu gị niile bụ ndị nnupu isi,ndị bụkwa ndị enyi ndị ohi,onye ọbụla nʼime ha hụrụ iri ngarị nʼanya,na-agbasokwa onyinye.Ha adịghị echebe ndị na-enweghị nnaikpe gbasara ndị inyom di ha nwụrụ adịghị abịa nʼihu ha. 24 Nʼihi ya, Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile,Onye dị ike nke Izrel, kwubiri sị,“Aga m abọ ọbọ megide ndị iro m,ime ka unu gharakwa inye m nsogbu ọzọ. 25 Aka m ga-abịakwasị unu.Aga m anụcha unu dịka e si anụcha ọlaedo,si otu a wepụchaa unyi niile dị nʼime unu. 26 Emesịa, aga m enye unu ndị na-ekpe ikpe ziri ezi.Ndị na-adụ unu ọdụ ga-abụkwa ndị nwere uche dịka ndị unu nwere na mbụ.Ọzọ, a ga-akpọ obodo unuObodo Ezi Omume,Obodo kwesiri Ntụkwasị Obi.” 27 A ga-eji ikpe ziri ezi zọpụta Zayọn.Ọ ga-ejikwa ezi omume zọpụta ndị niile lọghachikwutere ya. 28 Ma ndị mmehie niile na ndị niile na-enupu isi ka ọ ga-ala nʼiyi;ọ ga-egbukwa ndị niile na-agbakụta ONYENWE ANYỊ azụ. 29 “Ihere ga-eme unu nʼihi osisi ook nsọ ndị ahụ niileobi unu na-enwe aṅụrị nʼime ha.Ihere ga-eme unu nʼihi ubi a gbara ogige ndị ahụunu jiri aka unu họrọ. 30 Unu ga-ala nʼiyi dịka osisi ook na-akpọnwụ akpọnwụmaọbụ ka ubi a gbara ogige nke mmiri kọrọ. 31 Onye kachasị ike nʼetiti unu ga-ala nʼiyi dịka ahịhịa na-ere ọkụ;ọrụ ya ga-abụ icheku ọkụnke ga-emenye ọkụ ahụ ga-erepịa unu.Ọ dịkwaghị onye pụrụ imenyụ ya.”

In Other Versions

Isaiah 1 in the ANGEFD

Isaiah 1 in the ANTPNG2D

Isaiah 1 in the AS21

Isaiah 1 in the BAGH

Isaiah 1 in the BBPNG

Isaiah 1 in the BBT1E

Isaiah 1 in the BDS

Isaiah 1 in the BEV

Isaiah 1 in the BHAD

Isaiah 1 in the BIB

Isaiah 1 in the BLPT

Isaiah 1 in the BNT

Isaiah 1 in the BNTABOOT

Isaiah 1 in the BNTLV

Isaiah 1 in the BOATCB

Isaiah 1 in the BOATCB2

Isaiah 1 in the BOBCV

Isaiah 1 in the BOCNT

Isaiah 1 in the BOECS

Isaiah 1 in the BOGWICC

Isaiah 1 in the BOHCB

Isaiah 1 in the BOHCV

Isaiah 1 in the BOHLNT

Isaiah 1 in the BOHNTLTAL

Isaiah 1 in the BOILNTAP

Isaiah 1 in the BOITCV

Isaiah 1 in the BOKCV

Isaiah 1 in the BOKCV2

Isaiah 1 in the BOKHWOG

Isaiah 1 in the BOKSSV

Isaiah 1 in the BOLCB

Isaiah 1 in the BOLCB2

Isaiah 1 in the BOMCV

Isaiah 1 in the BONAV

Isaiah 1 in the BONCB

Isaiah 1 in the BONLT

Isaiah 1 in the BONUT2

Isaiah 1 in the BOPLNT

Isaiah 1 in the BOSCB

Isaiah 1 in the BOSNC

Isaiah 1 in the BOTLNT

Isaiah 1 in the BOVCB

Isaiah 1 in the BOYCB

Isaiah 1 in the BPBB

Isaiah 1 in the BPH

Isaiah 1 in the BSB

Isaiah 1 in the CCB

Isaiah 1 in the CUV

Isaiah 1 in the CUVS

Isaiah 1 in the DBT

Isaiah 1 in the DGDNT

Isaiah 1 in the DHNT

Isaiah 1 in the DNT

Isaiah 1 in the ELBE

Isaiah 1 in the EMTV

Isaiah 1 in the ESV

Isaiah 1 in the FBV

Isaiah 1 in the FEB

Isaiah 1 in the GGMNT

Isaiah 1 in the GNT

Isaiah 1 in the HARY

Isaiah 1 in the HNT

Isaiah 1 in the IRVA

Isaiah 1 in the IRVB

Isaiah 1 in the IRVG

Isaiah 1 in the IRVH

Isaiah 1 in the IRVK

Isaiah 1 in the IRVM

Isaiah 1 in the IRVM2

Isaiah 1 in the IRVO

Isaiah 1 in the IRVP

Isaiah 1 in the IRVT

Isaiah 1 in the IRVT2

Isaiah 1 in the IRVU

Isaiah 1 in the ISVN

Isaiah 1 in the JSNT

Isaiah 1 in the KAPI

Isaiah 1 in the KBT1ETNIK

Isaiah 1 in the KBV

Isaiah 1 in the KJV

Isaiah 1 in the KNFD

Isaiah 1 in the LBA

Isaiah 1 in the LBLA

Isaiah 1 in the LNT

Isaiah 1 in the LSV

Isaiah 1 in the MAAL

Isaiah 1 in the MBV

Isaiah 1 in the MBV2

Isaiah 1 in the MHNT

Isaiah 1 in the MKNFD

Isaiah 1 in the MNG

Isaiah 1 in the MNT

Isaiah 1 in the MNT2

Isaiah 1 in the MRS1T

Isaiah 1 in the NAA

Isaiah 1 in the NASB

Isaiah 1 in the NBLA

Isaiah 1 in the NBS

Isaiah 1 in the NBVTP

Isaiah 1 in the NET2

Isaiah 1 in the NIV11

Isaiah 1 in the NNT

Isaiah 1 in the NNT2

Isaiah 1 in the NNT3

Isaiah 1 in the PDDPT

Isaiah 1 in the PFNT

Isaiah 1 in the RMNT

Isaiah 1 in the SBIAS

Isaiah 1 in the SBIBS

Isaiah 1 in the SBIBS2

Isaiah 1 in the SBICS

Isaiah 1 in the SBIDS

Isaiah 1 in the SBIGS

Isaiah 1 in the SBIHS

Isaiah 1 in the SBIIS

Isaiah 1 in the SBIIS2

Isaiah 1 in the SBIIS3

Isaiah 1 in the SBIKS

Isaiah 1 in the SBIKS2

Isaiah 1 in the SBIMS

Isaiah 1 in the SBIOS

Isaiah 1 in the SBIPS

Isaiah 1 in the SBISS

Isaiah 1 in the SBITS

Isaiah 1 in the SBITS2

Isaiah 1 in the SBITS3

Isaiah 1 in the SBITS4

Isaiah 1 in the SBIUS

Isaiah 1 in the SBIVS

Isaiah 1 in the SBT

Isaiah 1 in the SBT1E

Isaiah 1 in the SCHL

Isaiah 1 in the SNT

Isaiah 1 in the SUSU

Isaiah 1 in the SUSU2

Isaiah 1 in the SYNO

Isaiah 1 in the TBIAOTANT

Isaiah 1 in the TBT1E

Isaiah 1 in the TBT1E2

Isaiah 1 in the TFTIP

Isaiah 1 in the TFTU

Isaiah 1 in the TGNTATF3T

Isaiah 1 in the THAI

Isaiah 1 in the TNFD

Isaiah 1 in the TNT

Isaiah 1 in the TNTIK

Isaiah 1 in the TNTIL

Isaiah 1 in the TNTIN

Isaiah 1 in the TNTIP

Isaiah 1 in the TNTIZ

Isaiah 1 in the TOMA

Isaiah 1 in the TTENT

Isaiah 1 in the UBG

Isaiah 1 in the UGV

Isaiah 1 in the UGV2

Isaiah 1 in the UGV3

Isaiah 1 in the VBL

Isaiah 1 in the VDCC

Isaiah 1 in the YALU

Isaiah 1 in the YAPE

Isaiah 1 in the YBVTP

Isaiah 1 in the ZBP