Isaiah 11 (BOICB)
1 Ome ga-epupụta site nʼogwe osisi Jesi;otu Alaka ga-esitekwa na mgbọrọgwụ ya tolite ga-amịkwa mkpụrụ. 2 Mmụọ ONYENWE ANYỊ ga-enwekwa ọnọdụ nʼime ya,inye ya Mmụọ amamihe na Mmụọ nghọta,Mmụọ ndụmọdụ na ike,Mmụọ ihe ọmụma na nke ịtụ egwu ONYENWE ANYỊ. 3 Ihe ga-amasị ya bụ egwu ONYENWE ANYỊ. Ọ gaghị ekpe ikpe site naanị nʼihe o ji anya ya abụọ hụ,maọbụ gbubie ikpe site naanị nʼihe ọ nụrụ na ntị ya. 4 Kama ọ bụ ezi omume ka ọ ga-eji kpee ndị ogbenye ikpe;ọ bụkwa ikpe ziri ezi ka ọ ga-ekpere ndị na-adịghị ike nke ụwa.Okwu ọnụ ka ọ ga-eji nye ndị mmadụ ahụhụ,ọ bụ okwu ọnụ ka ọ ga-eji maa ndị ajọ omume ikpe ọnwụ. 5 Ezi omume ya ga-adị ka ihe ike nʼume,ma ikwesi ntụkwasị obi ga-abụ ihe okike ukwu ya. 6 Nʼụbọchị ahụ, nkịta ọhịa na nwa atụrụ ga-ebikọ nʼudo;agụ na nwa ewu ga-amakpukọkwa.Nwa ehi na ụmụ ọdụm na nwa ịnyịnya mara abụba ga-anọkọtakwa,ọ bụkwa nwantakịrị ga na-edugharị ha. 7 Nne ehi na anụ ọhịa bịa ga-atakọkwa ahịhịa nʼotu ebe,ụmụ ha ga-amakpukọkwa nʼudo nʼotu ebe.Ọdụm ga-atakwa ahịhịa dịka ehi. 8 Ụmụntakịrị ga-egwugharị egwu nʼakụkụ ọnụ ajụala;nwantakịrị ga-etinyekwa aka nʼakwụ ibi. 9 Ha agaghị eme ihe mmerụ maọbụ bibikwa ihe,nʼelu ugwu nsọ m niile.Nʼihi na ụwa niile ga-ejupụta na ihe ọmụmanke ONYENWE ANYỊ dịka mmiri si ekpuchi oke osimiri. 10 Nʼụbọchị ahụ, mgbọrọgwụ Jesi ga-eguzo ka ọkọlọtọ nye ndị dị iche iche. Mba niile ga-abịakwute ya; ebe izuike ya ga-ejupụtakwa nʼebube. 11 Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-esetikwa aka nke ugboro abụọ inwetaghachiri onwe ya ndị ya fọdụrụ site na Asịrịa, sitekwa na ndịda Ijipt, sitekwa na Mgbago Ijipt, sitekwa na Kush, sitekwa na Elam, sitekwa na Babilọn, bụ Shaịna, sitekwa na Hamat na obodo niile dị nʼala niile osimiri gbara gburugburu. 12 Ọ ga-ebuliri mba niile ọkọlọtọọ ga-akpọghachite ụmụ Izrel achụpụrụ achụpụ,ọ ga-esite na nsọtụ anọ nke ụwakpokọta ndị Juda niile site nʼebe a chụsasịrị ha. 13 Ekworo Ifrem ga-akwụsị,a ga-ebipụ ndị iro Juda.Nʼikpeazụ, ekworo ahụ nke dị nʼetiti Izrel na Juda ga-akwụsị;ha agaghị alụsokwa onwe ha ọgụ ọzọ. 14 Ha ga-ejikọta aka ha buso ndị Filistia nọ nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ala ha agha;ha ga-ebusokwa ndị bichiri nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ala ahụ agha.Ha ga-emeri ndị Edọm na Moab.Ndị Amọn ga-erubekwara ha isi. 15 ONYENWE ANYỊ ga-emeka warawara ọnụ osimiri Ijipt taa.Ọ ga-eji ifufe siri ike, nke na-ekpo ọkụmikọrọ mmiri dị nʼosimiri Yufretis.Ọ ga-ekewa ya ka ọ bụrụ isi iyi asaa,nke mmadụ nwere ike iji ụkwụ gafee. 16 Ọ ga-esite nʼAsịrịa kpawaa ụzọnʼihi ndị ya fọdụrụ nʼebe ahụ,dịka o si meere ndị Izrel nʼoge gara aga,mgbe ha si nʼIjipt na-alọta.
In Other Versions
Isaiah 11 in the ANGEFD
Isaiah 11 in the ANTPNG2D
Isaiah 11 in the AS21
Isaiah 11 in the BAGH
Isaiah 11 in the BBPNG
Isaiah 11 in the BBT1E
Isaiah 11 in the BDS
Isaiah 11 in the BEV
Isaiah 11 in the BHAD
Isaiah 11 in the BIB
Isaiah 11 in the BLPT
Isaiah 11 in the BNT
Isaiah 11 in the BNTABOOT
Isaiah 11 in the BNTLV
Isaiah 11 in the BOATCB
Isaiah 11 in the BOATCB2
Isaiah 11 in the BOBCV
Isaiah 11 in the BOCNT
Isaiah 11 in the BOECS
Isaiah 11 in the BOGWICC
Isaiah 11 in the BOHCB
Isaiah 11 in the BOHCV
Isaiah 11 in the BOHLNT
Isaiah 11 in the BOHNTLTAL
Isaiah 11 in the BOILNTAP
Isaiah 11 in the BOITCV
Isaiah 11 in the BOKCV
Isaiah 11 in the BOKCV2
Isaiah 11 in the BOKHWOG
Isaiah 11 in the BOKSSV
Isaiah 11 in the BOLCB
Isaiah 11 in the BOLCB2
Isaiah 11 in the BOMCV
Isaiah 11 in the BONAV
Isaiah 11 in the BONCB
Isaiah 11 in the BONLT
Isaiah 11 in the BONUT2
Isaiah 11 in the BOPLNT
Isaiah 11 in the BOSCB
Isaiah 11 in the BOSNC
Isaiah 11 in the BOTLNT
Isaiah 11 in the BOVCB
Isaiah 11 in the BOYCB
Isaiah 11 in the BPBB
Isaiah 11 in the BPH
Isaiah 11 in the BSB
Isaiah 11 in the CCB
Isaiah 11 in the CUV
Isaiah 11 in the CUVS
Isaiah 11 in the DBT
Isaiah 11 in the DGDNT
Isaiah 11 in the DHNT
Isaiah 11 in the DNT
Isaiah 11 in the ELBE
Isaiah 11 in the EMTV
Isaiah 11 in the ESV
Isaiah 11 in the FBV
Isaiah 11 in the FEB
Isaiah 11 in the GGMNT
Isaiah 11 in the GNT
Isaiah 11 in the HARY
Isaiah 11 in the HNT
Isaiah 11 in the IRVA
Isaiah 11 in the IRVB
Isaiah 11 in the IRVG
Isaiah 11 in the IRVH
Isaiah 11 in the IRVK
Isaiah 11 in the IRVM
Isaiah 11 in the IRVM2
Isaiah 11 in the IRVO
Isaiah 11 in the IRVP
Isaiah 11 in the IRVT
Isaiah 11 in the IRVT2
Isaiah 11 in the IRVU
Isaiah 11 in the ISVN
Isaiah 11 in the JSNT
Isaiah 11 in the KAPI
Isaiah 11 in the KBT1ETNIK
Isaiah 11 in the KBV
Isaiah 11 in the KJV
Isaiah 11 in the KNFD
Isaiah 11 in the LBA
Isaiah 11 in the LBLA
Isaiah 11 in the LNT
Isaiah 11 in the LSV
Isaiah 11 in the MAAL
Isaiah 11 in the MBV
Isaiah 11 in the MBV2
Isaiah 11 in the MHNT
Isaiah 11 in the MKNFD
Isaiah 11 in the MNG
Isaiah 11 in the MNT
Isaiah 11 in the MNT2
Isaiah 11 in the MRS1T
Isaiah 11 in the NAA
Isaiah 11 in the NASB
Isaiah 11 in the NBLA
Isaiah 11 in the NBS
Isaiah 11 in the NBVTP
Isaiah 11 in the NET2
Isaiah 11 in the NIV11
Isaiah 11 in the NNT
Isaiah 11 in the NNT2
Isaiah 11 in the NNT3
Isaiah 11 in the PDDPT
Isaiah 11 in the PFNT
Isaiah 11 in the RMNT
Isaiah 11 in the SBIAS
Isaiah 11 in the SBIBS
Isaiah 11 in the SBIBS2
Isaiah 11 in the SBICS
Isaiah 11 in the SBIDS
Isaiah 11 in the SBIGS
Isaiah 11 in the SBIHS
Isaiah 11 in the SBIIS
Isaiah 11 in the SBIIS2
Isaiah 11 in the SBIIS3
Isaiah 11 in the SBIKS
Isaiah 11 in the SBIKS2
Isaiah 11 in the SBIMS
Isaiah 11 in the SBIOS
Isaiah 11 in the SBIPS
Isaiah 11 in the SBISS
Isaiah 11 in the SBITS
Isaiah 11 in the SBITS2
Isaiah 11 in the SBITS3
Isaiah 11 in the SBITS4
Isaiah 11 in the SBIUS
Isaiah 11 in the SBIVS
Isaiah 11 in the SBT
Isaiah 11 in the SBT1E
Isaiah 11 in the SCHL
Isaiah 11 in the SNT
Isaiah 11 in the SUSU
Isaiah 11 in the SUSU2
Isaiah 11 in the SYNO
Isaiah 11 in the TBIAOTANT
Isaiah 11 in the TBT1E
Isaiah 11 in the TBT1E2
Isaiah 11 in the TFTIP
Isaiah 11 in the TFTU
Isaiah 11 in the TGNTATF3T
Isaiah 11 in the THAI
Isaiah 11 in the TNFD
Isaiah 11 in the TNT
Isaiah 11 in the TNTIK
Isaiah 11 in the TNTIL
Isaiah 11 in the TNTIN
Isaiah 11 in the TNTIP
Isaiah 11 in the TNTIZ
Isaiah 11 in the TOMA
Isaiah 11 in the TTENT
Isaiah 11 in the UBG
Isaiah 11 in the UGV
Isaiah 11 in the UGV2
Isaiah 11 in the UGV3
Isaiah 11 in the VBL
Isaiah 11 in the VDCC
Isaiah 11 in the YALU
Isaiah 11 in the YAPE
Isaiah 11 in the YBVTP
Isaiah 11 in the ZBP