Isaiah 17 (BOICB)
1 Nke a bụ amụma megide Damaskọs, isi obodo Siria.“Lee, Damaskọs agaghị adịkwa! Ọ gaghị abụkwa obodo ọzọ,kama ọ ga-aghọ mkpọmkpọ ebe, nke zedara ezeda. 2 Ọ dịkwaghị onye ga-ebi nʼime nʼobodo niile nke Aroea,ọ ga-adịrị igwe atụrụ na ehi dị iche iche, ndị ga-amakpu,ọ dịkwaghị onye ga-eme ka egwu tụọ ha nʼebe ahụ. 3 Ebe e wusiri ike nke Ifrem agaghị adịkwa,ya na ike alaeze nke sị Damaskọs,ndị fọdụrụ nke Aram ga-adị kaebube nke ndị Izrel,”otu a ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri ya. 4 “Nʼụbọchị ahụ, a ga-eme ka nsọpụrụ Jekọb nwere bụrụ ihe e wedara nʼala.Abụba dịkwa ya nʼahụ ga-atalata. 5 Ọ ga-adị ka ubi e si nʼime ya wee ihe mkpụrụ site nʼọka guzoro ọtọ,na-achịkọta mkpụrụ nʼogwe aka hadịka mgbe mmadụ na-atụtụkọta mkpụrụ site nʼigbo ọkanʼime Ndagwurugwu Refaim. 6 Ma ọ bụ ole na ole nʼime mkpụrụ ahụ ga-afọdụkwa,dịka mgbe a kuchasịrị osisi oliv,hapụ mkpụrụ abụọ maọbụ atọ, nke dị nʼalaka kachasị elu,maọbụ mkpụrụ anọ maọbụ ise a hapụrụ nʼọnụ ọnụ alaka nke ahụ mịrị mkpụrụ.”Otu a ka ONYENWE ANYỊ, Chineke Izrel kwubiri ya. 7 Nʼụbọchị ahụ, ha ga-echeta onye kere ha,nweekwa nsọpụrụ nʼebe Onye nsọ nke Izrel nọ. 8 Nʼụbọchị ahụ, ha agaghị elekwasịkwa chi ha dị iche iche anya ka ha nyere ha aka.Ha agakwaghị efe ihe ndị ahụ ha ji aka ha mee.Ha agakwaghị asọpụrụ chi nwanyị ha bụ Ashera,maọbụ ebe ịchụ aja ụda na-esi isi ụtọ nke mkpịsịaka kpụrụ. 9 Nʼụbọchị ahụ, obodo ha niile e wusiri ike, nke ha hapụrụ nʼihi ndị Izrel, ga-adị ka ebe ahapụrụ ahapụ nye oke ọhịa na ahịhịa nke ọhịa. Ebe niile ga-abụ nnọọ mkpọmkpọ ebe. 10 Nʼihi na ị chezọla Chineke onye na-azọpụta gị.I chetaghị Nkume ahụ, nke bụ ebe mgbaba gị.Ya mere, ọ masịkwa gị kụọ ihe ọkụkụ dị iche iche nke dị ụtọ,maọbụ manye alaka osisi vaịnị ị si nʼala ọzọ bubata, 11 ọ bụrụkwa na i mee ka ha too nʼụbọchị ahụ ị kụnyere ha nʼala,maọbụ na ha mara ifuru nʼụtụtụ ụbọchị ahụ ị kụnyere ha nʼala,ị gaghị aghọta mkpụrụ ọ mịrị,nʼihi na ọ bụ naanị ọrịa na ihe mgbu ka ha ga-ewetara gị. 12 Ahaa, lee ụzụ nke ọtụtụ mmadụ na-eme,nke yiri mkpọtụ oke osimiri.Ọ bụ mkpọtụ nke mba dị iche iche;ha na-eme mkpọtụ dị ka nnugharị nke ọtụtụ osimiri. 13 Ọ bụ ezie na ha na-agbọ ụja dịka mkpọtụ nke oke osimiri,ma Chineke ga-abara ha mba nke ga-eme ka ha gbaa ọsọ.A ga-achụsa ha dịka ifufe si efesa igbugbo ọka,na dịka mpempe akwụkwọ ifufe siri ike na-ebugharị gburugburu gburugburu. 14 Nʼanyasị, ha na-eme ka oke egwu dịrị,tutu ruo ụtụtụ, ha adịghịkwa.Nke a bụ ihe nketa dịịrị ndị ahụ na-apụnara anyị ihe anyị nwere nʼike.E, ọ bụ ihe nza ruru ndị ahụ ji ike na-anakọrọ anyị ihe anyị nwere.
In Other Versions
Isaiah 17 in the ANGEFD
Isaiah 17 in the ANTPNG2D
Isaiah 17 in the AS21
Isaiah 17 in the BAGH
Isaiah 17 in the BBPNG
Isaiah 17 in the BBT1E
Isaiah 17 in the BDS
Isaiah 17 in the BEV
Isaiah 17 in the BHAD
Isaiah 17 in the BIB
Isaiah 17 in the BLPT
Isaiah 17 in the BNT
Isaiah 17 in the BNTABOOT
Isaiah 17 in the BNTLV
Isaiah 17 in the BOATCB
Isaiah 17 in the BOATCB2
Isaiah 17 in the BOBCV
Isaiah 17 in the BOCNT
Isaiah 17 in the BOECS
Isaiah 17 in the BOGWICC
Isaiah 17 in the BOHCB
Isaiah 17 in the BOHCV
Isaiah 17 in the BOHLNT
Isaiah 17 in the BOHNTLTAL
Isaiah 17 in the BOILNTAP
Isaiah 17 in the BOITCV
Isaiah 17 in the BOKCV
Isaiah 17 in the BOKCV2
Isaiah 17 in the BOKHWOG
Isaiah 17 in the BOKSSV
Isaiah 17 in the BOLCB
Isaiah 17 in the BOLCB2
Isaiah 17 in the BOMCV
Isaiah 17 in the BONAV
Isaiah 17 in the BONCB
Isaiah 17 in the BONLT
Isaiah 17 in the BONUT2
Isaiah 17 in the BOPLNT
Isaiah 17 in the BOSCB
Isaiah 17 in the BOSNC
Isaiah 17 in the BOTLNT
Isaiah 17 in the BOVCB
Isaiah 17 in the BOYCB
Isaiah 17 in the BPBB
Isaiah 17 in the BPH
Isaiah 17 in the BSB
Isaiah 17 in the CCB
Isaiah 17 in the CUV
Isaiah 17 in the CUVS
Isaiah 17 in the DBT
Isaiah 17 in the DGDNT
Isaiah 17 in the DHNT
Isaiah 17 in the DNT
Isaiah 17 in the ELBE
Isaiah 17 in the EMTV
Isaiah 17 in the ESV
Isaiah 17 in the FBV
Isaiah 17 in the FEB
Isaiah 17 in the GGMNT
Isaiah 17 in the GNT
Isaiah 17 in the HARY
Isaiah 17 in the HNT
Isaiah 17 in the IRVA
Isaiah 17 in the IRVB
Isaiah 17 in the IRVG
Isaiah 17 in the IRVH
Isaiah 17 in the IRVK
Isaiah 17 in the IRVM
Isaiah 17 in the IRVM2
Isaiah 17 in the IRVO
Isaiah 17 in the IRVP
Isaiah 17 in the IRVT
Isaiah 17 in the IRVT2
Isaiah 17 in the IRVU
Isaiah 17 in the ISVN
Isaiah 17 in the JSNT
Isaiah 17 in the KAPI
Isaiah 17 in the KBT1ETNIK
Isaiah 17 in the KBV
Isaiah 17 in the KJV
Isaiah 17 in the KNFD
Isaiah 17 in the LBA
Isaiah 17 in the LBLA
Isaiah 17 in the LNT
Isaiah 17 in the LSV
Isaiah 17 in the MAAL
Isaiah 17 in the MBV
Isaiah 17 in the MBV2
Isaiah 17 in the MHNT
Isaiah 17 in the MKNFD
Isaiah 17 in the MNG
Isaiah 17 in the MNT
Isaiah 17 in the MNT2
Isaiah 17 in the MRS1T
Isaiah 17 in the NAA
Isaiah 17 in the NASB
Isaiah 17 in the NBLA
Isaiah 17 in the NBS
Isaiah 17 in the NBVTP
Isaiah 17 in the NET2
Isaiah 17 in the NIV11
Isaiah 17 in the NNT
Isaiah 17 in the NNT2
Isaiah 17 in the NNT3
Isaiah 17 in the PDDPT
Isaiah 17 in the PFNT
Isaiah 17 in the RMNT
Isaiah 17 in the SBIAS
Isaiah 17 in the SBIBS
Isaiah 17 in the SBIBS2
Isaiah 17 in the SBICS
Isaiah 17 in the SBIDS
Isaiah 17 in the SBIGS
Isaiah 17 in the SBIHS
Isaiah 17 in the SBIIS
Isaiah 17 in the SBIIS2
Isaiah 17 in the SBIIS3
Isaiah 17 in the SBIKS
Isaiah 17 in the SBIKS2
Isaiah 17 in the SBIMS
Isaiah 17 in the SBIOS
Isaiah 17 in the SBIPS
Isaiah 17 in the SBISS
Isaiah 17 in the SBITS
Isaiah 17 in the SBITS2
Isaiah 17 in the SBITS3
Isaiah 17 in the SBITS4
Isaiah 17 in the SBIUS
Isaiah 17 in the SBIVS
Isaiah 17 in the SBT
Isaiah 17 in the SBT1E
Isaiah 17 in the SCHL
Isaiah 17 in the SNT
Isaiah 17 in the SUSU
Isaiah 17 in the SUSU2
Isaiah 17 in the SYNO
Isaiah 17 in the TBIAOTANT
Isaiah 17 in the TBT1E
Isaiah 17 in the TBT1E2
Isaiah 17 in the TFTIP
Isaiah 17 in the TFTU
Isaiah 17 in the TGNTATF3T
Isaiah 17 in the THAI
Isaiah 17 in the TNFD
Isaiah 17 in the TNT
Isaiah 17 in the TNTIK
Isaiah 17 in the TNTIL
Isaiah 17 in the TNTIN
Isaiah 17 in the TNTIP
Isaiah 17 in the TNTIZ
Isaiah 17 in the TOMA
Isaiah 17 in the TTENT
Isaiah 17 in the UBG
Isaiah 17 in the UGV
Isaiah 17 in the UGV2
Isaiah 17 in the UGV3
Isaiah 17 in the VBL
Isaiah 17 in the VDCC
Isaiah 17 in the YALU
Isaiah 17 in the YAPE
Isaiah 17 in the YBVTP
Isaiah 17 in the ZBP