Isaiah 6 (BOICB)
1 Nʼafọ ahụ, mgbe eze bụ Ụzaya nwụrụ, ahụrụ m Onyenwe anyị ka ọ nọ nʼocheeze ya dị oke elu. Ọnụ ọnụ ala uwe ya jupụtara ụlọnsọ ukwuu ya. 2 Ndị na-erugharị nʼelu ocheeze ya bụ ndị mmụọ ozi a na-akpọ seraf, ndị nwere nku isii. Ha ji nku ha abụọ kpuchie ihu ha; abụọ ka ha ji kpuchie ụkwụ ha, abụọ nke fọdụrụ ka ha ji na-efegharị. 3 Ha na-abụrịtara onwe ha abụ, sị,“Nsọ, Nsọ, Nsọ, ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile dị.Ụwa niile jupụtara nʼebube ya.” 4 Nʼihi ụda olu ha, ọnụ ụzọ na mgbidi ụlọnsọ mara jijiji, ụlọ ahụ jupụtara nʼanwụrụ ọkụ. 5 Etiri m mkpu akwa sị. “Ewoo! Onye nwụrụ anwụ ka m bụ, nʼihi na onye mmehie ka m bụ, egbugbere ọnụ m bụ egbugbere ọnụ rụrụ arụ; ọ bụkwa nʼetiti ndị egbugbere ọnụ ha rụrụ arụ ka m bi. Ugbu a, ejirila m anya m hụ ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile, onye bụ Eze ukwu ahụ!” 6 Mgbe ahụ, otu nʼime seraf ndị ahụ sitere nʼebe ọ nọ fekwute m, were mkpa gụta otu icheku dị ọkụ site nʼebe ịchụ aja. 7 O weere icheku ọkụ ahụ sọtụ m nʼọnụ, sị m, “Ugbu a, a gụọla gị dịka onye dị ọcha, nʼihi na icheku a emetụla gị nʼọnụ. A gbagharakwala gị mmehie gị niile.” 8 Mgbe ahụ, anụrụ m olu Onyenwe anyị ka ọ na-ajụ, “Onye ka m ga-eziga? Onye ga-ejekwara anyị?”Asịrị m, “Lee m, ziga m.” 9 Ọ siri, “Gaa gwa ndị a sị,“ ‘Na-anụnụ, ma unu aghọtala,na-elenụ anya ma unu ahụla.’ 10 Mee ka obi ndị a maa abụba, dịkwa arọ,mee ka ntị ha kpọchie,mechiekwa anya ha.Ma ọ bụghị otu a, ha nwere ike iji anya ha hụ ụzọ,jiri ntị ha nụ ihe,jirikwa obi ha ghọta,ma chigharịa bụrụ ndị a gwọrọ.” 11 Ma ekwuru m sị, “Onyenwe m, ọ bụ ruo ole mgbe?”Ọ zara,“Ọ bụ ruo mgbe obodo ha tọgbọrọ nʼefu,mgbe ọ na-adịghị onye ga-afọdụ nʼime ya;mgbe ụlọ obibi ha niile ga-atọgbọrọ nʼefu,mgbe e bibisịrị ala ubi ha niile. 12 Ọ bụ ruo mgbe ONYENWE ANYỊ zigara onye ọbụla gaa ebe dị anya,ala niile atọgbọkwara nʼefu. 13 Ma ọ bụrụkwa na otu ụzọ nʼime ụzọ iri nʼime ha niile afọdụ nʼala a,a ga-eme ka ọ laa nʼiyi.Ma dịka osisi terebint na osisi ookna-ahapụ ogwe mgbe e gbujiri ha,ya mere mkpụrụ nsọ ahụ ga-abụ ogwe osisi nʼala ahụ.”
In Other Versions
Isaiah 6 in the ANGEFD
Isaiah 6 in the ANTPNG2D
Isaiah 6 in the AS21
Isaiah 6 in the BAGH
Isaiah 6 in the BBPNG
Isaiah 6 in the BBT1E
Isaiah 6 in the BDS
Isaiah 6 in the BEV
Isaiah 6 in the BHAD
Isaiah 6 in the BIB
Isaiah 6 in the BLPT
Isaiah 6 in the BNT
Isaiah 6 in the BNTABOOT
Isaiah 6 in the BNTLV
Isaiah 6 in the BOATCB
Isaiah 6 in the BOATCB2
Isaiah 6 in the BOBCV
Isaiah 6 in the BOCNT
Isaiah 6 in the BOECS
Isaiah 6 in the BOGWICC
Isaiah 6 in the BOHCB
Isaiah 6 in the BOHCV
Isaiah 6 in the BOHLNT
Isaiah 6 in the BOHNTLTAL
Isaiah 6 in the BOILNTAP
Isaiah 6 in the BOITCV
Isaiah 6 in the BOKCV
Isaiah 6 in the BOKCV2
Isaiah 6 in the BOKHWOG
Isaiah 6 in the BOKSSV
Isaiah 6 in the BOLCB
Isaiah 6 in the BOLCB2
Isaiah 6 in the BOMCV
Isaiah 6 in the BONAV
Isaiah 6 in the BONCB
Isaiah 6 in the BONLT
Isaiah 6 in the BONUT2
Isaiah 6 in the BOPLNT
Isaiah 6 in the BOSCB
Isaiah 6 in the BOSNC
Isaiah 6 in the BOTLNT
Isaiah 6 in the BOVCB
Isaiah 6 in the BOYCB
Isaiah 6 in the BPBB
Isaiah 6 in the BPH
Isaiah 6 in the BSB
Isaiah 6 in the CCB
Isaiah 6 in the CUV
Isaiah 6 in the CUVS
Isaiah 6 in the DBT
Isaiah 6 in the DGDNT
Isaiah 6 in the DHNT
Isaiah 6 in the DNT
Isaiah 6 in the ELBE
Isaiah 6 in the EMTV
Isaiah 6 in the ESV
Isaiah 6 in the FBV
Isaiah 6 in the FEB
Isaiah 6 in the GGMNT
Isaiah 6 in the GNT
Isaiah 6 in the HARY
Isaiah 6 in the HNT
Isaiah 6 in the IRVA
Isaiah 6 in the IRVB
Isaiah 6 in the IRVG
Isaiah 6 in the IRVH
Isaiah 6 in the IRVK
Isaiah 6 in the IRVM
Isaiah 6 in the IRVM2
Isaiah 6 in the IRVO
Isaiah 6 in the IRVP
Isaiah 6 in the IRVT
Isaiah 6 in the IRVT2
Isaiah 6 in the IRVU
Isaiah 6 in the ISVN
Isaiah 6 in the JSNT
Isaiah 6 in the KAPI
Isaiah 6 in the KBT1ETNIK
Isaiah 6 in the KBV
Isaiah 6 in the KJV
Isaiah 6 in the KNFD
Isaiah 6 in the LBA
Isaiah 6 in the LBLA
Isaiah 6 in the LNT
Isaiah 6 in the LSV
Isaiah 6 in the MAAL
Isaiah 6 in the MBV
Isaiah 6 in the MBV2
Isaiah 6 in the MHNT
Isaiah 6 in the MKNFD
Isaiah 6 in the MNG
Isaiah 6 in the MNT
Isaiah 6 in the MNT2
Isaiah 6 in the MRS1T
Isaiah 6 in the NAA
Isaiah 6 in the NASB
Isaiah 6 in the NBLA
Isaiah 6 in the NBS
Isaiah 6 in the NBVTP
Isaiah 6 in the NET2
Isaiah 6 in the NIV11
Isaiah 6 in the NNT
Isaiah 6 in the NNT2
Isaiah 6 in the NNT3
Isaiah 6 in the PDDPT
Isaiah 6 in the PFNT
Isaiah 6 in the RMNT
Isaiah 6 in the SBIAS
Isaiah 6 in the SBIBS
Isaiah 6 in the SBIBS2
Isaiah 6 in the SBICS
Isaiah 6 in the SBIDS
Isaiah 6 in the SBIGS
Isaiah 6 in the SBIHS
Isaiah 6 in the SBIIS
Isaiah 6 in the SBIIS2
Isaiah 6 in the SBIIS3
Isaiah 6 in the SBIKS
Isaiah 6 in the SBIKS2
Isaiah 6 in the SBIMS
Isaiah 6 in the SBIOS
Isaiah 6 in the SBIPS
Isaiah 6 in the SBISS
Isaiah 6 in the SBITS
Isaiah 6 in the SBITS2
Isaiah 6 in the SBITS3
Isaiah 6 in the SBITS4
Isaiah 6 in the SBIUS
Isaiah 6 in the SBIVS
Isaiah 6 in the SBT
Isaiah 6 in the SBT1E
Isaiah 6 in the SCHL
Isaiah 6 in the SNT
Isaiah 6 in the SUSU
Isaiah 6 in the SUSU2
Isaiah 6 in the SYNO
Isaiah 6 in the TBIAOTANT
Isaiah 6 in the TBT1E
Isaiah 6 in the TBT1E2
Isaiah 6 in the TFTIP
Isaiah 6 in the TFTU
Isaiah 6 in the TGNTATF3T
Isaiah 6 in the THAI
Isaiah 6 in the TNFD
Isaiah 6 in the TNT
Isaiah 6 in the TNTIK
Isaiah 6 in the TNTIL
Isaiah 6 in the TNTIN
Isaiah 6 in the TNTIP
Isaiah 6 in the TNTIZ
Isaiah 6 in the TOMA
Isaiah 6 in the TTENT
Isaiah 6 in the UBG
Isaiah 6 in the UGV
Isaiah 6 in the UGV2
Isaiah 6 in the UGV3
Isaiah 6 in the VBL
Isaiah 6 in the VDCC
Isaiah 6 in the YALU
Isaiah 6 in the YAPE
Isaiah 6 in the YBVTP
Isaiah 6 in the ZBP