Judges 11 (BOICB)

1 Otu ọ dị, Jefta, onye Gilead, bụ dimkpa nʼagha. Nna ya bụ Gilead; nne ya bụ akwụna. 2 Nwunye Gilead mụtaara ya ọtụtụ ụmụ ndị ikom ọzọ. Mgbe ha tolitere, ha chụpụrụ Jefta site nʼobodo ahụ, sị ya, “Ị gaghị eketa ihe ọbụla nʼezi nna anyị, nʼihi na nwa nwanyị ọzọ ka ị bụ.” 3 Nʼihi nke a, Jefta gbapụrụ site nʼụlọ nna ya, gaa biri nʼobodo Tob. Mgbe na-adịghị anya, ọtụtụ ndị isi na-anụ ọkụ bịara nọnyere ya ma sorokwa ya. 4 O ruo mgbe ọtụtụ oge gasịrị, ndị Amọn busoro ụmụ Izrel agha. 5 Ndị okenye Gilead jere ịkpọpụta Jefta site nʼala Tob. 6 Ha sịrị ya, “Bịa buru onyeisi agha anyị ka anyị nwee ike ibuso ndị Amọn agha.” 7 Jefta sịrị ha, “Unu akpọghị m asị, ma chụpụkwa m site nʼụlọ nna m? Gịnị mere unu ji na-achọ m ugbu a unu nọ nʼoke nsogbu?” 8 Ndị okenye Gilead sịrị ya, “na-agbanyeghị nke a, anyị abịaghachikwutela gị ugbu a, bịa ka anyị na gị lụso ndị Amọn agha. Ị ga-abụkwa onyeisi anyị niile bi na Gilead.” 9 Jefta zara, “A sịkwarị na m esoro unu gaa lụso ndị Amọn agha, ọ bụrụ na ONYENWE ANYỊ enyefee ha nʼaka m, m ga-abụ onyeisi unu nʼezie?” 10 Ndị okenye Gilead zara, “ONYENWE ANYỊ bụ onye akaebe, na anyị aghaghị ime dịka i kwuru.” 11 Ya mere, Jefta sooro ndị okenye Gilead, ha mekwara ya onyeisi ha na ọchịagha ha. O kwughachikwara okwu ya niile nʼihu ONYENWE ANYỊ nʼobodo Mizpa. 12 Mgbe ahụ, Jefta zipụrụ ndị ozi ka ha jekwuru eze ndị Amọn jụọ ya ajụjụ sị, “Gịnị bụ ihe i nwere megide anyị i ji ebuso ala anyị agha?” 13 Eze ndị Amọn zaghachiri ndị ozi Jefta, “Mgbe ụmụ Izrel si nʼala Ijipt pụta, ha ji aka ike napụ anyị ala anyị, site nʼosimiri Anọn ruo na Jabọk, rukwaa nʼosimiri Jọdan. Ugbu a nyeghachinụ anyị ala ahụ niile nʼudo.” 14 Jefta zighachiri ndị ozi ka ha jekwuru eze ndị Amọn, 15 na-asị,“Ihe ndị a ka Jefta sịrị: Izrel esiteghị nʼaka ike napụ Moab maọbụ Amọn ala ha. 16 Kama, mgbe ha si Ijipt rigopụta, Izrel sitere nʼọzara bịaruo Osimiri Uhie, sikwa nʼebe ahụ ruo Kadesh. 17 Mgbe ahụ, Izrel zipụrụ ndị ozi ka ha jekwuru eze Edọm sị ya, ‘Kwere ka anyị si nʼala gị gafere,’ ma eze Edọm jụrụ ajụ. Ha zipụkwara ozi nye eze Moab, ma o kwenyeghị. Nʼihi ya, Izrel nọgidere na Kadesh. 18 “Ọzọ, ha sitere nʼọzara gaa gburugburu Edọm na Moab, site nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ala Moab, maa ụlọ ikwu ha nʼofe Anọn. Ha abaghị nʼoke ala Moab, nʼihi na Anọn bụ oke ala ya. 19 “Mgbe ahụ, ụmụ Izrel zigara ndị ozi ka ha jekwuru Saịhọn eze ndị Amọrait, onye bi na Heshbọn, sị ya, ‘Biko, ka anyị site nʼala gị gafee ruo nʼala nke anyị.’ 20 Ma eze Saịhọn atụkwasịghị Izrel obi isite nʼoke ala ya gabiga. Nʼihi nke a, ọ chịkọtara usuu ndị agha ya, ma ụlọ ikwu na Jahaz, buso ụmụ Izrel agha. 21 “Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ, Chineke Izrel nyere Saịhọn na ndị agha ya niile nʼaka Izrel. Ha merikwara ha. Izrel nwetara ala niile nke ndị Amọrait, bụ ndị bi nʼala ahụ. 22 Ha nwetara ala niile ahụ, site nʼAnọn ruo Jabọk, sitekwa nʼọzara ruo Jọdan. 23 “Ma ugbu a, ONYENWE ANYỊ, Chineke Izrel achụpụla ndị Amọrait nʼihu ndị ya bụ Izrel. Olee ikike i nwere iwere ala ahụ? 24 Ọ bụghị ihe chi gị, Kemosh, nyere gị ka i ga-enweta? Otu aka ahụ kwa, ihe ọbụla ONYENWE ANYỊ Chineke anyị nyere anyị ka anyị ga-enweta. 25 Ị dị mma karịa Balak nwa Zipoa, eze Moab? O nwere mgbe ọ chọrọ Izrel okwu, maọbụ lụso ha agha? 26 Ọ bụ narị afọ atọ kemgbe ụmụ Izrel malitere ibi na Heshbọn na Aroea, na nʼime obodo ndị ọzọ gbara ha gburugburu ruo nʼiyi Anọn. Ọ bụkwa gịnị mere na ịnapụtaghị ala ndị a nʼoge ndị ahụ? 27 Emegideghị m gị, kama ọ bụ gị na-emejọ m, site nʼibuso m agha. Ka ONYENWE ANYỊ, onye na-ekpe ikpe ziri ezi kpebie ikpe a taa nʼetiti ndị Izrel na ndị Amọn.” 28 Ma eze Amọn egeghị ntị nʼozi Jefta ziri ka e zie ya. 29 Nʼoge ahụ, mmụọ ONYENWE ANYỊ dakwasịrị Jefta. Site nʼike mmụọ ahụ, o duuru ndị agha Izrel gafee obodo Gilead na Manase, gafeekwa Mizpa, nke dị nʼime Gilead, gaa lụso ndị Amọn agha. 30 Jefta kwere ONYENWE ANYỊ nkwa sị ya, “Ọ bụrụ na ị ga-enyefe ndị Amọn nʼaka m, 31 ihe ọbụla sitere nʼọnụ ụzọ ụlọ m pụta izute m mgbe m lọghachiri nʼọnọdụ mmeri megide ndị Amọn, ga-abụ nke ONYENWE ANYỊ. Aga m eji ya chụọ aja nsure ọkụ.” 32 Jefta duuru ndị agha ya gaa ibuso Amọn agha. ONYENWE ANYỊ nyekwara ya mmeri dị ukwuu. 33 O bibiri iri obodo abụọ site nʼAroea ruo nso nso Minit, ruokwa Ebel-Keramim. Otu a ka Izrel si merie ndị Amọn. 34 Mgbe Jefta lọghachiri nʼụlọ ya na Mizpa, ma lee ada ya nwanyị onye ji iti egwu na ite egwu pụta izute ya. Ọ bụ naanị ya ka nna ya mụtara. Ewezuga ya, nna ya amụtaghị nwa nwoke maọbụ nwa nwanyị ọzọ. 35 Mgbe Jefta hụrụ ya, ọ dọwara uwe ya, tie mkpu sị, “Ewoo, nwa m nwanyị! I wetarala obi m ihe mgbu, nʼihi na ekwela m ONYENWE ANYỊ nkwa, nke m na-aghaghị imezu.” 36 Ọ zara, “Nna m, lee, ị ghaghị imezu ihe i kwere ONYENWE ANYỊ na nkwa. Jiri m mee ihe i kwere ONYENWE ANYỊ na nkwa, nʼihi na o nyela gị mmeri dị ukwuu nʼebe ndị Amọn, ndị iro gị nọ. 37 Ma ọ dị otu ihe m chọrọ ịrịọ gị, biko kwere ka m soro ụmụ agbọghọ ibe m gaa wagharịa nʼugwu ndị a, ka mụ na ha kwaa akwa ọnwa abụọ, nʼihi na agaghị m alụ di.” 38 Nna ya zara sị ya, “E, nwa m, i nwere ike ịga.” Ọ pụrụ gaa, jegharịa, kwaakwa akwa, ya na ụmụ agbọghọ ndị enyi ya, ruo mgbe ọnwa abụọ ahụ zuru. 39 Mgbe ọnwa abụọ gasịrị, ọ laghachikwutere nna ya, onye ji ya mezuo nkwa ahụ o kwere. Ọ bụ nwaagbọghọ na-amatabeghị nwoke.Malite nʼoge ahụ ka ọ ghọrọ omenaala ndị Izrel, 40 na ụmụ agbọghọ na-apụ kwa afọ, gaa, nọọ abalị anọ nʼihi icheta ada Jefta, onye Gilead.

In Other Versions

Judges 11 in the ANGEFD

Judges 11 in the ANTPNG2D

Judges 11 in the AS21

Judges 11 in the BAGH

Judges 11 in the BBPNG

Judges 11 in the BBT1E

Judges 11 in the BDS

Judges 11 in the BEV

Judges 11 in the BHAD

Judges 11 in the BIB

Judges 11 in the BLPT

Judges 11 in the BNT

Judges 11 in the BNTABOOT

Judges 11 in the BNTLV

Judges 11 in the BOATCB

Judges 11 in the BOATCB2

Judges 11 in the BOBCV

Judges 11 in the BOCNT

Judges 11 in the BOECS

Judges 11 in the BOGWICC

Judges 11 in the BOHCB

Judges 11 in the BOHCV

Judges 11 in the BOHLNT

Judges 11 in the BOHNTLTAL

Judges 11 in the BOILNTAP

Judges 11 in the BOITCV

Judges 11 in the BOKCV

Judges 11 in the BOKCV2

Judges 11 in the BOKHWOG

Judges 11 in the BOKSSV

Judges 11 in the BOLCB

Judges 11 in the BOLCB2

Judges 11 in the BOMCV

Judges 11 in the BONAV

Judges 11 in the BONCB

Judges 11 in the BONLT

Judges 11 in the BONUT2

Judges 11 in the BOPLNT

Judges 11 in the BOSCB

Judges 11 in the BOSNC

Judges 11 in the BOTLNT

Judges 11 in the BOVCB

Judges 11 in the BOYCB

Judges 11 in the BPBB

Judges 11 in the BPH

Judges 11 in the BSB

Judges 11 in the CCB

Judges 11 in the CUV

Judges 11 in the CUVS

Judges 11 in the DBT

Judges 11 in the DGDNT

Judges 11 in the DHNT

Judges 11 in the DNT

Judges 11 in the ELBE

Judges 11 in the EMTV

Judges 11 in the ESV

Judges 11 in the FBV

Judges 11 in the FEB

Judges 11 in the GGMNT

Judges 11 in the GNT

Judges 11 in the HARY

Judges 11 in the HNT

Judges 11 in the IRVA

Judges 11 in the IRVB

Judges 11 in the IRVG

Judges 11 in the IRVH

Judges 11 in the IRVK

Judges 11 in the IRVM

Judges 11 in the IRVM2

Judges 11 in the IRVO

Judges 11 in the IRVP

Judges 11 in the IRVT

Judges 11 in the IRVT2

Judges 11 in the IRVU

Judges 11 in the ISVN

Judges 11 in the JSNT

Judges 11 in the KAPI

Judges 11 in the KBT1ETNIK

Judges 11 in the KBV

Judges 11 in the KJV

Judges 11 in the KNFD

Judges 11 in the LBA

Judges 11 in the LBLA

Judges 11 in the LNT

Judges 11 in the LSV

Judges 11 in the MAAL

Judges 11 in the MBV

Judges 11 in the MBV2

Judges 11 in the MHNT

Judges 11 in the MKNFD

Judges 11 in the MNG

Judges 11 in the MNT

Judges 11 in the MNT2

Judges 11 in the MRS1T

Judges 11 in the NAA

Judges 11 in the NASB

Judges 11 in the NBLA

Judges 11 in the NBS

Judges 11 in the NBVTP

Judges 11 in the NET2

Judges 11 in the NIV11

Judges 11 in the NNT

Judges 11 in the NNT2

Judges 11 in the NNT3

Judges 11 in the PDDPT

Judges 11 in the PFNT

Judges 11 in the RMNT

Judges 11 in the SBIAS

Judges 11 in the SBIBS

Judges 11 in the SBIBS2

Judges 11 in the SBICS

Judges 11 in the SBIDS

Judges 11 in the SBIGS

Judges 11 in the SBIHS

Judges 11 in the SBIIS

Judges 11 in the SBIIS2

Judges 11 in the SBIIS3

Judges 11 in the SBIKS

Judges 11 in the SBIKS2

Judges 11 in the SBIMS

Judges 11 in the SBIOS

Judges 11 in the SBIPS

Judges 11 in the SBISS

Judges 11 in the SBITS

Judges 11 in the SBITS2

Judges 11 in the SBITS3

Judges 11 in the SBITS4

Judges 11 in the SBIUS

Judges 11 in the SBIVS

Judges 11 in the SBT

Judges 11 in the SBT1E

Judges 11 in the SCHL

Judges 11 in the SNT

Judges 11 in the SUSU

Judges 11 in the SUSU2

Judges 11 in the SYNO

Judges 11 in the TBIAOTANT

Judges 11 in the TBT1E

Judges 11 in the TBT1E2

Judges 11 in the TFTIP

Judges 11 in the TFTU

Judges 11 in the TGNTATF3T

Judges 11 in the THAI

Judges 11 in the TNFD

Judges 11 in the TNT

Judges 11 in the TNTIK

Judges 11 in the TNTIL

Judges 11 in the TNTIN

Judges 11 in the TNTIP

Judges 11 in the TNTIZ

Judges 11 in the TOMA

Judges 11 in the TTENT

Judges 11 in the UBG

Judges 11 in the UGV

Judges 11 in the UGV2

Judges 11 in the UGV3

Judges 11 in the VBL

Judges 11 in the VDCC

Judges 11 in the YALU

Judges 11 in the YAPE

Judges 11 in the YBVTP

Judges 11 in the ZBP