Judges 14 (BOICB)
1 Samsin gbadara nʼobodo Timna ebe ọ hụrụ otu nwaagbọghọ onye Filistia. 2 Mgbe ọ lọtara nʼụlọ, ọ gwara nne na nna ya, “Ahụrụ m otu nwanyị nʼime Timna sitere nʼụmụ ndị inyom Filistia; ugbu a, lụtara m ya na nwunye.” 3 Nne na nna ya zara ya, “Ọ bụ na ọ dịghị nwanyị dị nʼetiti ndị inyom ụmụnne gị, maọbụ nʼetiti ndị anyị niile? Gịnị mere o ji bụrụ nʼetiti ndị Filistia a na-ebighị ugwu ka i si lụtara onwe gị nwunye?”Ma Samsin sịrị nna ya, “Gaa lụtara m ya. Nʼihi na o ziri ezi nʼanya m.” 4 (Nne na nna ya aghọtaghị na aka ONYENWE ANYỊ dị nʼọlụlụ nwunye a Samsin chọrọ ịlụ. Nʼihi na ONYENWE ANYỊ na-achọ ụzọ ọ ga-esi megide ndị Filistia, ndị na-achị ụmụ Izrel nʼoge ahụ.) 5 Samsin na nne na nna ya gawara obodo Timna maka ọlụlụ nwanyị a. Mgbe ha na-erute ubi vaịnị dị obodo Timna nso, otu nwa ọdụm sitere nʼọhịa mapụta, gbọrọ ụja na-abịakwute Samsin. 6 Nʼotu oge ahụ, Mmụọ ONYENWE ANYỊ bịakwasịrị Samsin nʼike. O jekwuuru ọdụm ahụ, were aka ya abụọ dọwaa ya ọnụ, dịka a ga-asị na ọ bụ nwa ewu. Ma Samsin agwaghị nne na nna ya ihe mere. 7 Ma mgbe ha bịaruru Timna, Samsin na nwaagbọghọ ahụ kparịtara ụka. Ihe banyere nwaagbọghọ ahụ dị Samsin ezi mma. 8 Ọ laghachiri mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị ka ọ kpọrọ ya. Ma mgbe ọ tụgharịrị ka ọ hụ ozu ọdụm ahụ, ọ hụrụ na igwe aṅụ bizi nʼime ozu ọdụm ahụ, na-emepụtakwa mmanụ aṅụ. 9 Ọ kọpụtara mmanụ aṅụ ahụ tinye nʼaka ya, malite ịracha ka ọ na-aga nʼụzọ. Mgbe ọ bịakwutere nne na nna ya, o nyebinyere ha ụfọdụ, ha onwe ha rachakwara ya. Ma ọ gwaghị ha na o wetara ya site nʼozu ọdụm. 10 Nna ya gara ịhụ nwanyị ahụ ma Samsin kpọkọtara ụmụ okorobịa obodo ahụ meere ha oriri dịka omenaala ha sị di. 11 Mgbe Samsin rutere, a kpọnyere ya ndị bịara mmemme ọnụọgụgụ ha dị iri atọ. 12 Mgbe ahụ, Samsin gwara ha okwu sị ha, “O nwere ajụjụ, gwa m, gwa m, gwa m, m chọrọ ka unu kọwaara m. Ọ bụrụ na unu enwee ike kọwaa ya, site taa ruo nʼụbọchị asaa nke mmemme a, aga m enye unu iri uwe mwụda atọ, nyekwa unu iri uwe mwụda atọ ọzọ akpara akpa. 13 Ọ bụrụkwanụ na unu enweghị ike kọwaa ya, unu ga-enye m iri uwe mwụda atọ, na iri uwe mwụda atọ akpara akpa.”Ha niile kwenyere sị, “Ọ dị mma. Kwuo ka anyị nụ.” 14 Ọ gwara ha sị,“Ihe oriri si nʼime onye na-eri eri na-apụta,ọzọkwa, ihe dị ụtọ si nʼime onye dị ike pụta.”Mgbe ụbọchị atọ gasịrị, ha enwebeghịkwa ike kọwaa ya. 15 Ma nʼụbọchị nke anọ, ha jekwuuru nwunye Samsin gwa ya okwu sị, “Chọọ ụzọ rafụta di gị ọnụ, ka ọ gwa gị ihe okwu a pụtara. Ma ọ bụghị ya, anyị ga-akpọ gị na ezinaụlọ nna gị ọkụ. Ọ bụ ịnapụ anyị ihe anyị nwere ka unu ji kpọọ anyị oku bịa nʼebe?” 16 Mgbe ahụ nwunye Samsin buuru onwe ya tụọ nʼelu ahụ ya, nʼebe akwa, sị, “Ị kpọrọ m asị! Nʼezie, ị hụghị m nʼanya. Ị tụụrụ ndị m ilu, ma ị gwaghị m ọsịsa ya.”Ọ sịrị ya, “Lee, agwaghị m nne na nna m, ọ bụkwa gị ka m ga akọwara ya?” 17 Ma nwanyị ahụ kwagidere akwa abalị asaa ha nọ na mmemme ahụ. Nʼikpeazụ, nʼụbọchị nke asaa, Samsin kọwaara ya okwu ahụ nʼihi na ọ nọgidere na-enye ya nsogbu. Nwanyị ahụ gakwara kọwaara ụmụ okorobịa obodo ihe okwu ahụ pụtara. 18 Ma tupu anwụ adaa nʼụbọchị nke asaa ahụ, ndị ikom obodo ahụ sịrị ya,“Olee ihe dị ụtọ karịa mmanụ aṅụ?Gịnị dịkwa ike karịa ọdụm?”Ma Samsin zara sị ha,“A sị na unu enyeghị nwa ehi m nsogbu,unu agaraghị enwe ike kọwaa ya.” 19 Otu mgbe ahụ kwa, Mmụọ ONYENWE ANYỊ bịakwasịrị ya. O sitere nʼebe ahụ pụọ, gaa nʼobodo Ashkelọn. Nʼebe ahụ ka ọ nọ tigbuo iri mmadụ atọ, napụ ha uwe ha niile, chịrị ha chịnye ndị ahụ kọwaara ya ilu ahụ. Ma site nʼoke iwe, o laghachiri nʼụlọ nna ya. 20 E duuru nwunye Samsin dunye enyi Samsin ka ha abụọ bụrụ di na nwunye.
In Other Versions
Judges 14 in the ANGEFD
Judges 14 in the ANTPNG2D
Judges 14 in the AS21
Judges 14 in the BAGH
Judges 14 in the BBPNG
Judges 14 in the BBT1E
Judges 14 in the BDS
Judges 14 in the BEV
Judges 14 in the BHAD
Judges 14 in the BIB
Judges 14 in the BLPT
Judges 14 in the BNT
Judges 14 in the BNTABOOT
Judges 14 in the BNTLV
Judges 14 in the BOATCB
Judges 14 in the BOATCB2
Judges 14 in the BOBCV
Judges 14 in the BOCNT
Judges 14 in the BOECS
Judges 14 in the BOGWICC
Judges 14 in the BOHCB
Judges 14 in the BOHCV
Judges 14 in the BOHLNT
Judges 14 in the BOHNTLTAL
Judges 14 in the BOILNTAP
Judges 14 in the BOITCV
Judges 14 in the BOKCV
Judges 14 in the BOKCV2
Judges 14 in the BOKHWOG
Judges 14 in the BOKSSV
Judges 14 in the BOLCB
Judges 14 in the BOLCB2
Judges 14 in the BOMCV
Judges 14 in the BONAV
Judges 14 in the BONCB
Judges 14 in the BONLT
Judges 14 in the BONUT2
Judges 14 in the BOPLNT
Judges 14 in the BOSCB
Judges 14 in the BOSNC
Judges 14 in the BOTLNT
Judges 14 in the BOVCB
Judges 14 in the BOYCB
Judges 14 in the BPBB
Judges 14 in the BPH
Judges 14 in the BSB
Judges 14 in the CCB
Judges 14 in the CUV
Judges 14 in the CUVS
Judges 14 in the DBT
Judges 14 in the DGDNT
Judges 14 in the DHNT
Judges 14 in the DNT
Judges 14 in the ELBE
Judges 14 in the EMTV
Judges 14 in the ESV
Judges 14 in the FBV
Judges 14 in the FEB
Judges 14 in the GGMNT
Judges 14 in the GNT
Judges 14 in the HARY
Judges 14 in the HNT
Judges 14 in the IRVA
Judges 14 in the IRVB
Judges 14 in the IRVG
Judges 14 in the IRVH
Judges 14 in the IRVK
Judges 14 in the IRVM
Judges 14 in the IRVM2
Judges 14 in the IRVO
Judges 14 in the IRVP
Judges 14 in the IRVT
Judges 14 in the IRVT2
Judges 14 in the IRVU
Judges 14 in the ISVN
Judges 14 in the JSNT
Judges 14 in the KAPI
Judges 14 in the KBT1ETNIK
Judges 14 in the KBV
Judges 14 in the KJV
Judges 14 in the KNFD
Judges 14 in the LBA
Judges 14 in the LBLA
Judges 14 in the LNT
Judges 14 in the LSV
Judges 14 in the MAAL
Judges 14 in the MBV
Judges 14 in the MBV2
Judges 14 in the MHNT
Judges 14 in the MKNFD
Judges 14 in the MNG
Judges 14 in the MNT
Judges 14 in the MNT2
Judges 14 in the MRS1T
Judges 14 in the NAA
Judges 14 in the NASB
Judges 14 in the NBLA
Judges 14 in the NBS
Judges 14 in the NBVTP
Judges 14 in the NET2
Judges 14 in the NIV11
Judges 14 in the NNT
Judges 14 in the NNT2
Judges 14 in the NNT3
Judges 14 in the PDDPT
Judges 14 in the PFNT
Judges 14 in the RMNT
Judges 14 in the SBIAS
Judges 14 in the SBIBS
Judges 14 in the SBIBS2
Judges 14 in the SBICS
Judges 14 in the SBIDS
Judges 14 in the SBIGS
Judges 14 in the SBIHS
Judges 14 in the SBIIS
Judges 14 in the SBIIS2
Judges 14 in the SBIIS3
Judges 14 in the SBIKS
Judges 14 in the SBIKS2
Judges 14 in the SBIMS
Judges 14 in the SBIOS
Judges 14 in the SBIPS
Judges 14 in the SBISS
Judges 14 in the SBITS
Judges 14 in the SBITS2
Judges 14 in the SBITS3
Judges 14 in the SBITS4
Judges 14 in the SBIUS
Judges 14 in the SBIVS
Judges 14 in the SBT
Judges 14 in the SBT1E
Judges 14 in the SCHL
Judges 14 in the SNT
Judges 14 in the SUSU
Judges 14 in the SUSU2
Judges 14 in the SYNO
Judges 14 in the TBIAOTANT
Judges 14 in the TBT1E
Judges 14 in the TBT1E2
Judges 14 in the TFTIP
Judges 14 in the TFTU
Judges 14 in the TGNTATF3T
Judges 14 in the THAI
Judges 14 in the TNFD
Judges 14 in the TNT
Judges 14 in the TNTIK
Judges 14 in the TNTIL
Judges 14 in the TNTIN
Judges 14 in the TNTIP
Judges 14 in the TNTIZ
Judges 14 in the TOMA
Judges 14 in the TTENT
Judges 14 in the UBG
Judges 14 in the UGV
Judges 14 in the UGV2
Judges 14 in the UGV3
Judges 14 in the VBL
Judges 14 in the VDCC
Judges 14 in the YALU
Judges 14 in the YAPE
Judges 14 in the YBVTP
Judges 14 in the ZBP