Judges 19 (BOICB)

1 Nʼoge a, Izrel enweghị eze na-achị ha.Nʼoge ahụ kwa, ọ dị otu nwoke, onye Livayị bi nʼebe dị anya nʼala ugwu ugwu Ifrem. Nwoke a gara Betlehem, nʼime Juda, kpọrọ otu nwaagbọghọ ka ọ bụrụ iko ya nwanyị. 2 Ma iko ya nwanyị ahụ kwara iko megide ya. Ọ hapụrụ ya laghachi nʼezinaụlọ nne na nna ya na Betlehem, Juda. Ọ nọrọ ọnwa anọ nʼebe ahụ. 3 Nwoke ahụ kpebiri ịga nʼụlọ nna nwaagbọghọ ahụ ịrịọ ya ka ọ lọghachi. Ọ kpọọrọ otu nʼime ndị ohu ya, duru ịnyịnya ibu abụọ. Mgbe nwoke ahụ bịaruru nʼụlọ ahụ, iko ya nwanyị kpọbatara ya nʼụlọ nna ya. Mgbe nna nwaagbọghọ ahụ hụrụ ya, o jiri ọṅụ kelee ya ekele. 4 Nna nwanyị ahụ rịọrọ ya ka ọ nọnyere ha ụfọdụ oge. Nʼihi nke a, ọ nọnyeere ha ụbọchị atọ. Ha niile nọrọ ọnọdụ obi ụtọ abalị atọ ahụ niile, rie ṅụọkwa. 5 Nʼụbọchị nke anọ, nwoke ahụ na iko ya jikeere nʼisi ụtụtụ ịlaghachi. Ma nna nwanyị ahụ rịọrọ ha sị ha, “Jirinụ ihe oriri gbaanụ onwe unu ume. Emesịa unu nwere ike ịlawa.” 6 Ya mere, ha abụọ nọdụrụ ala rie ihe, ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ. Mgbe e mesiri, nna nwaagbọghọ ahụ sịrị ha, “Biko, nọdụnụ rahụ ụra nʼabalị taa, meekwanụ onwe unu obi ụtọ.” 7 Ma mgbe nwoke ahụ biliri ka ọ laa, nna nwaagbọghọ ahụ, nọgidere ya, nke a mere ka o kwenye ịnọ ruo echi ya. 8 Nʼisi ụtụtụ ụbọchị nke ise, ha bilikwara ngwangwa jikere ịhapụ ma ịlaghachi. Ọzọkwa, nna nwaagbọghọ ahụ rịọkwara ha sị ha, “Biko, nọgidenụ nʼụtụtụ taa, ma nʼoge ehihie unu nwere ike laa.” Nʼihi nke a, ha nọgidekwara rie, ṅụọ. 9 Mgbe nwoke ahụ na iko ya nwanyị, na ohu ya, jikeere ịhapụ, nna nwaagbọghọ ahụ rịọkwara ha sị ha, “Biko, lee chi ebidola iji ugbu a, abalị adịkwala nso. Biko, nọgide nʼụlọ m naanị abalị taa. Anyị ga-emekwa onwe anyị obi ụtọ abalị taa niile. Ma unu ga-amalite ije unu nʼisi ụtụtụ echi. Mgbe ahụ, unu ga-ala nʼudo.” 10 Ma nwoke ahụ ekweghị ịnọ ọnọdụ abalị ọzọ, ọ hapụrụ gawa nʼụzọ ije Jebus (ya bụ Jerusalem), ya na ịnyịnya ibu ya abụọ akwadoro maka njem nakwa iko ya nwanyị. 11 Ha rutere ebe ahụ oge chi na-akwado iji. Ohu ya sịrị nna ya ukwu, “Bịa, ka anyị kwụsị nʼobodo ndị Jebus a, nọ ọnọdụ abalị.” 12 Ma nna ya ukwu zaghachiri, “Mba! Anyị agaghị aba nʼobodo ndị na abụghị ụmụ Izrel. Anyị ga-aga nʼihu ruo Gibea.” 13 O kwukwara sị, “Bịa ka anyị gbalịa iru Gibea maọbụ Rema, nọọ ọnọdụ abalị nʼotu nʼime ebe ndị a.” 14 Ya mere, ha gara nʼihu nʼije ha. Anwụ dara dịka ha na-eru Gibea dị na Benjamin. 15 Nʼebe ahụ ka ha kwụsịrị ịnọ ọnọdụ abalị. Ha gara nọrọ na mbara ama obodo ahụ, ma o nweghị onye ọbụla kpọbatara ha ka ha rahụ ụra nʼụlọ ya. 16 Nʼanyasị ahụ, otu agadi nwoke zutere ha ka o si ịrụ ọrụ nʼubi na-alọghachi, onye si nʼobodo ugwu ugwu Ifrem, ma o bi ka onye ọbịa na Gibea (ndị bi nʼebe a bụ ndị Benjamin). 17 Mgbe agadi nwoke a hụrụ ndị ije ahụ na mbara ama obodo ahụ, ọ jụrụ ha ajụjụ sị, “Ebee ka unu si bịa? Ebee ka unu na-aga?” 18 Nwoke ahụ zara sị ya, “Anyị si Betlehem dị na Juda na-alọghachi nʼụlọ anyị dị nʼebe dị anya nʼala ugwu ugwu Ifrem. Esi m ebe ahụ gaa Betlehem dị na Juda, ma ugbu a, ana m aga nʼụlọ ONYENWE ANYỊ. O nweghị onye kpọbatara anyị nʼụlọ ya. 19 Anyị nwere ihe oriri nke ịnyịnya ibu anyị ga-eri, achịcha na mmanya nke anyị bụ ndị ohu gị ga-eri, ya bụ, mụ onwe m na ohu gị nwanyị na nwokorobịa so anyị. Anyị achọghị ihe ọbụla nʼaka onye ọbụla.” 20 Agadi nwoke ahụ sịrị ha, “Batanụ nʼụlọ m dịka ndị ọbịa nke m. Ka m nye unu ihe niile bụ mkpa unu. Naanị unu anọla ọnọdụ abalị nʼama.” 21 Nʼihi nke a, ọ kpọbatara ha nʼụlọ ya. O duuru ịnyịnya ibu ha, nye ha ihe oriri. Emesịa, ha sara ụkwụ ha mmiri, nọdụ ala rie ma ṅụọkwa. 22 Ma mgbe ha risiri nri, nọrọ na-ezu ike, na-akpakọrịta ụka, na mberede, ndị ikom ụfọdụ sitere nʼobodo ahụ, ndị jọgburu onwe ha nʼomume gbara ụlọ ahụ gburugburu. Ha malitekwara iti aka nʼụzọ ahụ na iti mkpu na-akpọku agadi nwoke ahụ, sị ya, “Kpọpụta onye ọbịa ahụ nọ nʼime ụlọ gị ka anyị mara ya.” 23 Agadi nwoke ahụ bụ onyenwe ụlọ ahụ pụkwuuru ha nʼezi, sị ha, “Biko ụmụnna m, unu emela ihe ọjọọ dị otu a. Nwoke a nọ nʼụlọ m dịka ọbịa. Unu emela ihe ihere dị otu a. 24 Ka m kpọpụtara unu nwa m nwanyị na-amaghị nwoke, na iko nwanyị nwoke a ka unu jiri ha mee ihe ọbụla unu chọrọ ma hapụnụ nwoke a. Unu emela ihe ihere dị otu a.” 25 Ma ndị ikom ahụ egeghị ya ntị. Ya mere, nwoke ahụ kpọpụtara iko ya nwanyị zipụrụ ha ya nʼezi. Ha niile nʼotu na otu, dinakwuru nwanyị ahụ abalị ahụ niile. Mgbe chi na-achọ ịbọ, ha hapụrụ ya ka ọ laa. 26 Nʼisi ụtụtụ, nwanyị ahụ biliri laghachi azụ nʼụlọ ahụ iko ya nwoke nọ. Ma ọ dara nʼala nʼihu ọnụ ụzọ ụlọ ahụ tọgbọrọ nʼebe ahụ tutu chi abọzie. 27 Mgbe nwoke ahụ biliri nʼụtụtụ, meghee ụzọ ka ọ malite ije ya, ọ hụrụ iko ya nwanyị ahụ ka ọ tọgbọ nʼọnụ ụzọ ahụ. Aka ya abụọ dịkwa nʼọnụ ụzọ mbata ụlọ ahụ. 28 Nwoke ahụ kpọkuru ya sị ya, “Ngwa, bilie ka anyị laa.” Ma nwaagbọghọ ahụ ekwughị okwu ọbụla. Nwoke ahụ buliri ya, tụkwasị ya nʼelu ịnyịnya ibu ya, buru ya laa nʼobodo nke aka ya. 29 Mgbe ọ bịaruru obodo ya, ọ banyere nʼụlọ ya wepụta mma jiri ya bọwaa ozu iko ya nwanyị ahụ ụzọ iri na abụọ. O zigaara ebo iri na abụọ niile dị nʼIzrel otu ụzọ, otu ụzọ. 30 Nʼihi nke a, Onye ọbụla hụrụ ihe ọjọọ a kwuru sị, “O nwebeghị onye ọbụla mere ụdị ajọ omume dị otu a kemgbe ụmụ Izrel si nʼobodo Ijipt pụta. Chee echiche banyere ihe a. Tulee ya ma gwa anyị ihe anyị ga-eme?”

In Other Versions

Judges 19 in the ANGEFD

Judges 19 in the ANTPNG2D

Judges 19 in the AS21

Judges 19 in the BAGH

Judges 19 in the BBPNG

Judges 19 in the BBT1E

Judges 19 in the BDS

Judges 19 in the BEV

Judges 19 in the BHAD

Judges 19 in the BIB

Judges 19 in the BLPT

Judges 19 in the BNT

Judges 19 in the BNTABOOT

Judges 19 in the BNTLV

Judges 19 in the BOATCB

Judges 19 in the BOATCB2

Judges 19 in the BOBCV

Judges 19 in the BOCNT

Judges 19 in the BOECS

Judges 19 in the BOGWICC

Judges 19 in the BOHCB

Judges 19 in the BOHCV

Judges 19 in the BOHLNT

Judges 19 in the BOHNTLTAL

Judges 19 in the BOILNTAP

Judges 19 in the BOITCV

Judges 19 in the BOKCV

Judges 19 in the BOKCV2

Judges 19 in the BOKHWOG

Judges 19 in the BOKSSV

Judges 19 in the BOLCB

Judges 19 in the BOLCB2

Judges 19 in the BOMCV

Judges 19 in the BONAV

Judges 19 in the BONCB

Judges 19 in the BONLT

Judges 19 in the BONUT2

Judges 19 in the BOPLNT

Judges 19 in the BOSCB

Judges 19 in the BOSNC

Judges 19 in the BOTLNT

Judges 19 in the BOVCB

Judges 19 in the BOYCB

Judges 19 in the BPBB

Judges 19 in the BPH

Judges 19 in the BSB

Judges 19 in the CCB

Judges 19 in the CUV

Judges 19 in the CUVS

Judges 19 in the DBT

Judges 19 in the DGDNT

Judges 19 in the DHNT

Judges 19 in the DNT

Judges 19 in the ELBE

Judges 19 in the EMTV

Judges 19 in the ESV

Judges 19 in the FBV

Judges 19 in the FEB

Judges 19 in the GGMNT

Judges 19 in the GNT

Judges 19 in the HARY

Judges 19 in the HNT

Judges 19 in the IRVA

Judges 19 in the IRVB

Judges 19 in the IRVG

Judges 19 in the IRVH

Judges 19 in the IRVK

Judges 19 in the IRVM

Judges 19 in the IRVM2

Judges 19 in the IRVO

Judges 19 in the IRVP

Judges 19 in the IRVT

Judges 19 in the IRVT2

Judges 19 in the IRVU

Judges 19 in the ISVN

Judges 19 in the JSNT

Judges 19 in the KAPI

Judges 19 in the KBT1ETNIK

Judges 19 in the KBV

Judges 19 in the KJV

Judges 19 in the KNFD

Judges 19 in the LBA

Judges 19 in the LBLA

Judges 19 in the LNT

Judges 19 in the LSV

Judges 19 in the MAAL

Judges 19 in the MBV

Judges 19 in the MBV2

Judges 19 in the MHNT

Judges 19 in the MKNFD

Judges 19 in the MNG

Judges 19 in the MNT

Judges 19 in the MNT2

Judges 19 in the MRS1T

Judges 19 in the NAA

Judges 19 in the NASB

Judges 19 in the NBLA

Judges 19 in the NBS

Judges 19 in the NBVTP

Judges 19 in the NET2

Judges 19 in the NIV11

Judges 19 in the NNT

Judges 19 in the NNT2

Judges 19 in the NNT3

Judges 19 in the PDDPT

Judges 19 in the PFNT

Judges 19 in the RMNT

Judges 19 in the SBIAS

Judges 19 in the SBIBS

Judges 19 in the SBIBS2

Judges 19 in the SBICS

Judges 19 in the SBIDS

Judges 19 in the SBIGS

Judges 19 in the SBIHS

Judges 19 in the SBIIS

Judges 19 in the SBIIS2

Judges 19 in the SBIIS3

Judges 19 in the SBIKS

Judges 19 in the SBIKS2

Judges 19 in the SBIMS

Judges 19 in the SBIOS

Judges 19 in the SBIPS

Judges 19 in the SBISS

Judges 19 in the SBITS

Judges 19 in the SBITS2

Judges 19 in the SBITS3

Judges 19 in the SBITS4

Judges 19 in the SBIUS

Judges 19 in the SBIVS

Judges 19 in the SBT

Judges 19 in the SBT1E

Judges 19 in the SCHL

Judges 19 in the SNT

Judges 19 in the SUSU

Judges 19 in the SUSU2

Judges 19 in the SYNO

Judges 19 in the TBIAOTANT

Judges 19 in the TBT1E

Judges 19 in the TBT1E2

Judges 19 in the TFTIP

Judges 19 in the TFTU

Judges 19 in the TGNTATF3T

Judges 19 in the THAI

Judges 19 in the TNFD

Judges 19 in the TNT

Judges 19 in the TNTIK

Judges 19 in the TNTIL

Judges 19 in the TNTIN

Judges 19 in the TNTIP

Judges 19 in the TNTIZ

Judges 19 in the TOMA

Judges 19 in the TTENT

Judges 19 in the UBG

Judges 19 in the UGV

Judges 19 in the UGV2

Judges 19 in the UGV3

Judges 19 in the VBL

Judges 19 in the VDCC

Judges 19 in the YALU

Judges 19 in the YAPE

Judges 19 in the YBVTP

Judges 19 in the ZBP