Judges 21 (BOICB)

1 Mgbe ndị ikom Izrel niile zukọtara na Mizpa, ha ṅụrụ iyi sị, “O nweghị onye ọbụla nʼime anyị ga-ekwe ka nwoke ọbụla si nʼebo Benjamin lụọ ụmụ anyị ndị inyom.” 2 Ndị Izrel niile gara Betel, nọdụ ebe ahụ ruo mgbede nʼihu Chineke. Ha welitere olu bee akwa dara ụda. 3 “Ha sịrị, ONYENWE ANYỊ, Chineke Izrel, gịnị mere ihe dị otu a ji dakwasị Izrel? Gịnị mere a ga-eji na-achọ otu ebo Izrel achọ taa?” 4 Nʼisi ụtụtụ echi ya, ha biliri ngwangwa rụọ ebe ịchụ aja. Ha chụrụ aja nsure ọkụ, na aja udo nʼebe ahụ. 5 Emesịa, ha jụrịtara onwe ha ajụjụ sị, “O nwere ebo Izrel na-enweghị onye nọchiri anya ha nʼihu ONYENWE ANYỊ anyị mgbe anyị zukọrọ na Mizpa?” Nʼihi na ha ṅụrụ iyi kwuo na onye ọbụla jụrụ ịbịa nʼihu ONYENWE ANYỊ na Mizpa aghaghị ịnwụ. 6 Ma oke iru ụjụ dị nʼala Izrel dum nʼihi ihe dakwasịrị ụmụnna ha, bụ ndị Benjamin. Ha niile kwuru sị, “Taa, otu ebo Izrel alaala nʼiyi, e kpochapụla ya. 7 Olee otu anyị ga-esi nwetara ndị fọdụrụ nwunye ha ga-alụ ebe anyị ṅụrụ iyi site nʼaha ONYENWE ANYỊ na anyị agaghị enye ha ụmụ anyị ndị inyom?” 8 Mgbe ahụ, ha jụrụ ajụjụ sị, “O nwere ebo Izrel na-esoghị anyị zukọta mgbe anyị zukọtara nʼihu ONYENWE ANYỊ na Mizpa?” Ha chọpụtara na o nweghị onye ọbụla si na Jebesh Gilead bịa. 9 Nʼihi na mgbe ha gụrụ ndị zukọrọ ọnụ, ha chọpụtara na o nweghị ndị si Jebesh Gilead bịa. 10 Ya mere, nzukọ ahụ zipụrụ puku ndị agha iri na abụọ, ndị dị ike nʼetiti ha, ka ha gaa jiri mma agha gbuchapụ mmadụ niile bi na Jebesh Gilead, ndị nwoke, na ndị nwanyị, na ụmụntakịrị. 11 Nke a bụkwa ihe unu ga-eme, “Gbuonụ ndị ikom niile na ụmụ nwanyị niile matarala nwoke.” 12 Ọnụọgụgụ ụmụ agbọghọ na-amabeghị nwoke ha chọtara na Jebesh Gilead dị narị anọ. Ndị agha ahụ kpọtara ha na Shaịlo, nʼime Kenan, ebe ndị Izrel mara ụlọ ikwu ha. 13 Emesịa, ha zigara ụfọdụ mmadụ ka ha jekwuru ndị agha Benjamin na nkume Rimọn maka ime udo. 14 Mgbe ndị Benjamin lọghachiri, e dunyere ha narị ndị inyom anọ, ndị Jebesh Gilead, bụ ndị e mere ka ha dị ndụ. Ma ụmụ agbọghọ ndị a ezughị ọnụọgụgụ ha niile. 15 Oge ahụ bụ nnọọ oge iru ụjụ dị ukwuu nʼala Izrel maka ọnọdụ ndị Benjamin, nʼihi na ONYENWE ANYỊ emeela ka ebo ndị Izrel hapụ izu ezu. 16 Ndị okenye Izrel jụrịtara onwe ha sị, “Gịnị ka anyị ga-eme ịlụtara ụmụnna anyị nwunye ebe ọ bụ na ụmụ agbọghọ ndị Benjamin anwụchaala? 17 Ndị Benjamin fọdụrụ ndụ aghaghị inweta ndị ga-anọchi anya ha,” bụ ihe ha kwuru, “ka otu nʼime ebo Izrel ghara ịbụ ndị e kpochapụrụ ekpochapụ. 18 Ma anyị enweghị ike inye ha ndị nwunye site nʼụmụ anyị ndị inyom, nʼihi na ụmụ Izrel ṅụrụ iyi sị, ‘Onye abụrụ ọnụ ka ọ bụ, bụ onye ọbụla nke nyere onye Benjamin nwunye.’ 19 Ma lee, e nwere mmemme ONYENWE ANYỊ a na-eme afọ niile na Shaịlo, nʼakụkụ ugwu Betel, na mpaghara ọwụwa anyanwụ nke ụzọ ahụ sitere Betel gaa Shekem, na nʼakụkụ ndịda Lebona.” 20 Ya mere, ha gwara ndị ikom Benjamin, bụ ndị chọrọ nwunye okwu sị ha, “Gaanụ zoo onwe unu nʼubi vaịnị dị nʼagbata ụzọ ahụ, 21 ma na-elepụ anya. Mgbe ụmụ agbọghọ Shaịlo ga-apụta ite egwu ha, sitenụ nʼubi vaịnị gbapụtanụ jide ha, ka onye ọbụla nʼime unu jide otu nwaagbọghọ kpụrụ ya laa nʼala Benjamin, ka ha bụrụ nwunye unu. 22 Ọ bụrụ na nna ha maọbụ ụmụnne ha abịakwute anyị ịjụ ajụjụ banyere ha, anyị ga-agwa ha okwu sị, ‘Biko, gosinụ anyị amara, site nʼịhapụ ha ka ha lụọ ụmụ agbọghọ ahụ, nʼihi na anyị achọtaghị ụmụ agbọghọ ga-ezuru ha niile mgbe anyị gburu ndị niile bi na Jebesh Gilead. O nwekwaghị ụzọ ọzọ unu gaara esi nye ha ụmụ unu ndị nwanyị ghara ịbụ ndị ikpe mara.’ ” 23 Ya mere, ndị Benjamin mere dịka ndụmọdụ e nyere ha si dị. Onye ọbụla nʼime ha jidere otu nwaagbọghọ nʼike mgbe ha na-ete egwu nʼoge mmemme ahụ ka ọ bụrụ nwunye ya. Ha lara nʼihe nketa ha, wughachi obodo ha, biri nʼime ya. 24 Mgbe ihe ndị a gasịrị, ụmụ Izrel laghachiri nʼobodo ha, nʼotu nʼotu, onye ọbụla kwa laghachiri nʼebo ya, nʼikwu ya, nʼihe nketa nke aka ya. 25 Nʼụbọchị ndị a, Izrel enweghị eze na-achị ha. Nʼihi nke a, onye ọbụla na-eme ihe ọbụla ọ chọrọ, na ihe ọbụla dị ya mma nʼanya.

In Other Versions

Judges 21 in the ANGEFD

Judges 21 in the ANTPNG2D

Judges 21 in the AS21

Judges 21 in the BAGH

Judges 21 in the BBPNG

Judges 21 in the BBT1E

Judges 21 in the BDS

Judges 21 in the BEV

Judges 21 in the BHAD

Judges 21 in the BIB

Judges 21 in the BLPT

Judges 21 in the BNT

Judges 21 in the BNTABOOT

Judges 21 in the BNTLV

Judges 21 in the BOATCB

Judges 21 in the BOATCB2

Judges 21 in the BOBCV

Judges 21 in the BOCNT

Judges 21 in the BOECS

Judges 21 in the BOGWICC

Judges 21 in the BOHCB

Judges 21 in the BOHCV

Judges 21 in the BOHLNT

Judges 21 in the BOHNTLTAL

Judges 21 in the BOILNTAP

Judges 21 in the BOITCV

Judges 21 in the BOKCV

Judges 21 in the BOKCV2

Judges 21 in the BOKHWOG

Judges 21 in the BOKSSV

Judges 21 in the BOLCB

Judges 21 in the BOLCB2

Judges 21 in the BOMCV

Judges 21 in the BONAV

Judges 21 in the BONCB

Judges 21 in the BONLT

Judges 21 in the BONUT2

Judges 21 in the BOPLNT

Judges 21 in the BOSCB

Judges 21 in the BOSNC

Judges 21 in the BOTLNT

Judges 21 in the BOVCB

Judges 21 in the BOYCB

Judges 21 in the BPBB

Judges 21 in the BPH

Judges 21 in the BSB

Judges 21 in the CCB

Judges 21 in the CUV

Judges 21 in the CUVS

Judges 21 in the DBT

Judges 21 in the DGDNT

Judges 21 in the DHNT

Judges 21 in the DNT

Judges 21 in the ELBE

Judges 21 in the EMTV

Judges 21 in the ESV

Judges 21 in the FBV

Judges 21 in the FEB

Judges 21 in the GGMNT

Judges 21 in the GNT

Judges 21 in the HARY

Judges 21 in the HNT

Judges 21 in the IRVA

Judges 21 in the IRVB

Judges 21 in the IRVG

Judges 21 in the IRVH

Judges 21 in the IRVK

Judges 21 in the IRVM

Judges 21 in the IRVM2

Judges 21 in the IRVO

Judges 21 in the IRVP

Judges 21 in the IRVT

Judges 21 in the IRVT2

Judges 21 in the IRVU

Judges 21 in the ISVN

Judges 21 in the JSNT

Judges 21 in the KAPI

Judges 21 in the KBT1ETNIK

Judges 21 in the KBV

Judges 21 in the KJV

Judges 21 in the KNFD

Judges 21 in the LBA

Judges 21 in the LBLA

Judges 21 in the LNT

Judges 21 in the LSV

Judges 21 in the MAAL

Judges 21 in the MBV

Judges 21 in the MBV2

Judges 21 in the MHNT

Judges 21 in the MKNFD

Judges 21 in the MNG

Judges 21 in the MNT

Judges 21 in the MNT2

Judges 21 in the MRS1T

Judges 21 in the NAA

Judges 21 in the NASB

Judges 21 in the NBLA

Judges 21 in the NBS

Judges 21 in the NBVTP

Judges 21 in the NET2

Judges 21 in the NIV11

Judges 21 in the NNT

Judges 21 in the NNT2

Judges 21 in the NNT3

Judges 21 in the PDDPT

Judges 21 in the PFNT

Judges 21 in the RMNT

Judges 21 in the SBIAS

Judges 21 in the SBIBS

Judges 21 in the SBIBS2

Judges 21 in the SBICS

Judges 21 in the SBIDS

Judges 21 in the SBIGS

Judges 21 in the SBIHS

Judges 21 in the SBIIS

Judges 21 in the SBIIS2

Judges 21 in the SBIIS3

Judges 21 in the SBIKS

Judges 21 in the SBIKS2

Judges 21 in the SBIMS

Judges 21 in the SBIOS

Judges 21 in the SBIPS

Judges 21 in the SBISS

Judges 21 in the SBITS

Judges 21 in the SBITS2

Judges 21 in the SBITS3

Judges 21 in the SBITS4

Judges 21 in the SBIUS

Judges 21 in the SBIVS

Judges 21 in the SBT

Judges 21 in the SBT1E

Judges 21 in the SCHL

Judges 21 in the SNT

Judges 21 in the SUSU

Judges 21 in the SUSU2

Judges 21 in the SYNO

Judges 21 in the TBIAOTANT

Judges 21 in the TBT1E

Judges 21 in the TBT1E2

Judges 21 in the TFTIP

Judges 21 in the TFTU

Judges 21 in the TGNTATF3T

Judges 21 in the THAI

Judges 21 in the TNFD

Judges 21 in the TNT

Judges 21 in the TNTIK

Judges 21 in the TNTIL

Judges 21 in the TNTIN

Judges 21 in the TNTIP

Judges 21 in the TNTIZ

Judges 21 in the TOMA

Judges 21 in the TTENT

Judges 21 in the UBG

Judges 21 in the UGV

Judges 21 in the UGV2

Judges 21 in the UGV3

Judges 21 in the VBL

Judges 21 in the VDCC

Judges 21 in the YALU

Judges 21 in the YAPE

Judges 21 in the YBVTP

Judges 21 in the ZBP