Jeremiah 28 (BOICB)
1 O ruo, nʼọnwa nke ise nke otu afọ ahụ, nke bụ afọ nke anọ, na mmalite ọchịchị Zedekaya eze Juda, Hananaya, nwa Azoa, onye amụma si Gibiọn, gwara m okwu nʼụlọnsọ ONYENWE ANYỊ nʼihu ndị nchụaja na ndị mmadụ si m. 2 “Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, ‘Aga m agbaji agbụ nke eze Babilọn. 3 Tupu afọ abụọ agabiga, aga m esi Babilọn bulata ihe ndị ahụ niile Nebukadneza eze Babilọn si nʼụlọnsọ ONYENWE ANYỊ bupụ bulaa Babilọn. 4 Aga m akpọlatakwa Jehoiakin nwa Jehoiakim, na ndị niile ọzọ e si na Juda dọta nʼagha bulaa Babilọn, nʼihi na aga m agbaji agbụ ahụ eze Babilọn nyanyere ha nʼolu.’ ” Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri. 5 Mgbe ahụ, Jeremaya onye amụma zara Hananaya onye amụma nʼihu ndị nchụaja na ndị mmadụ niile guzo nʼụlọnsọ ONYENWE ANYỊ 6 Jeremaya onye amụma sịrị, “Amen! Ka ONYENWE ANYỊ mezuo okwu amụma a i buru site na ibughachite ngwongwo ụlọ ONYENWE ANYỊ na ịkpọghachite ndị niile e mere ka ha si nʼebe a gaa biri na Babilọn. 7 Ma gee ntị nụrụ ihe m ga-ekwu nʼihu gị na nʼihu ndị a niile guzo nʼebe a. 8 Site na mgbe ochie, ndị amụma ahụ bu mụ na gị ụzọ ebuola amụma banyere agha na mbibi na ọrịa na-efe efe megide ọtụtụ obodo dị iche iche, na ọtụtụ alaeze dị iche iche. 9 Ma ihe e ji amata na ọ bụ ONYENWE ANYỊ nʼezie, zitere onye amụma buru amụma kwuo na udo ga-adị, bụ naanị ma ọ bụrụ na amụma ya emezuo.” 10 Mgbe ahụ, Hananaya bụ onye amụma yipụrụ Jeremaya agbụ ahụ o yikwasịrị onwe ya nʼolu gbajie ya. 11 Ọ sịrị nʼihu ọha mmadụ ahụ niile, “Nke a ka ONYENWE ANYỊ kwuru: ‘Ọ bụ nʼotu aka ahụ ka m ga-agbajipụkwa agbụ ịyagba Nebukadneza, eze Babilọn nyanyere nʼolu mba niile tupu afọ abụọ agabiga.’ ” Mgbe o kwuru otu a, Jeremaya onye amụma hapụrụ ebe ahụ laa. 12 Mgbe Hananaya bụ onye amụma gbajisiri ịyagba ahụ Jeremaya, onye amụma nyanyere onwe ya nʼolu, okwu ONYENWE ANYỊ ruru Jeremaya ntị sị ya, 13 “Gaa gwa Hananaya okwu sị ya, ‘Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ kwuru: Ị gbajiela agbụ e ji osisi mee, ma nʼọnọdụ ya ihe ị ga-enweta bụ agbụ igwe. 14 Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel, kwuru. Aga m anyanye mba ndị a niile agbụ igwe, i mee ka ha fee Nebukadneza eze Babilọn. Ha ga-efekwa ya. Aga m enyekwa ya ike ọ bụladị nʼebe ụmụ anụ ọhịa dị.’ ” 15 Mgbe ahụ, Jeremaya onye amụma sịrị Hananaya onye amụma, “Gee ntị, Hananaya! Ọ bụghị ONYENWE ANYỊ zitere gị, ma ị ghọgbuola mba a mee ka ha tụkwasị uche nʼokwu ụgha. 16 Nʼihi nke a, otu a ka ONYENWE ANYỊ kwuru, ‘Ekpebiela m isite nʼụwa wepụ gị. Ị ga-anwụ nʼafọ a, nʼihi na i kwusaala nnupu isi megide ONYENWE ANYỊ.’ ” 17 Nʼọnwa asaa nke afọ ahụ Hananaya onye amụma nwụrụ.
In Other Versions
Jeremiah 28 in the ANGEFD
Jeremiah 28 in the ANTPNG2D
Jeremiah 28 in the AS21
Jeremiah 28 in the BAGH
Jeremiah 28 in the BBPNG
Jeremiah 28 in the BBT1E
Jeremiah 28 in the BDS
Jeremiah 28 in the BEV
Jeremiah 28 in the BHAD
Jeremiah 28 in the BIB
Jeremiah 28 in the BLPT
Jeremiah 28 in the BNT
Jeremiah 28 in the BNTABOOT
Jeremiah 28 in the BNTLV
Jeremiah 28 in the BOATCB
Jeremiah 28 in the BOATCB2
Jeremiah 28 in the BOBCV
Jeremiah 28 in the BOCNT
Jeremiah 28 in the BOECS
Jeremiah 28 in the BOGWICC
Jeremiah 28 in the BOHCB
Jeremiah 28 in the BOHCV
Jeremiah 28 in the BOHLNT
Jeremiah 28 in the BOHNTLTAL
Jeremiah 28 in the BOILNTAP
Jeremiah 28 in the BOITCV
Jeremiah 28 in the BOKCV
Jeremiah 28 in the BOKCV2
Jeremiah 28 in the BOKHWOG
Jeremiah 28 in the BOKSSV
Jeremiah 28 in the BOLCB
Jeremiah 28 in the BOLCB2
Jeremiah 28 in the BOMCV
Jeremiah 28 in the BONAV
Jeremiah 28 in the BONCB
Jeremiah 28 in the BONLT
Jeremiah 28 in the BONUT2
Jeremiah 28 in the BOPLNT
Jeremiah 28 in the BOSCB
Jeremiah 28 in the BOSNC
Jeremiah 28 in the BOTLNT
Jeremiah 28 in the BOVCB
Jeremiah 28 in the BOYCB
Jeremiah 28 in the BPBB
Jeremiah 28 in the BPH
Jeremiah 28 in the BSB
Jeremiah 28 in the CCB
Jeremiah 28 in the CUV
Jeremiah 28 in the CUVS
Jeremiah 28 in the DBT
Jeremiah 28 in the DGDNT
Jeremiah 28 in the DHNT
Jeremiah 28 in the DNT
Jeremiah 28 in the ELBE
Jeremiah 28 in the EMTV
Jeremiah 28 in the ESV
Jeremiah 28 in the FBV
Jeremiah 28 in the FEB
Jeremiah 28 in the GGMNT
Jeremiah 28 in the GNT
Jeremiah 28 in the HARY
Jeremiah 28 in the HNT
Jeremiah 28 in the IRVA
Jeremiah 28 in the IRVB
Jeremiah 28 in the IRVG
Jeremiah 28 in the IRVH
Jeremiah 28 in the IRVK
Jeremiah 28 in the IRVM
Jeremiah 28 in the IRVM2
Jeremiah 28 in the IRVO
Jeremiah 28 in the IRVP
Jeremiah 28 in the IRVT
Jeremiah 28 in the IRVT2
Jeremiah 28 in the IRVU
Jeremiah 28 in the ISVN
Jeremiah 28 in the JSNT
Jeremiah 28 in the KAPI
Jeremiah 28 in the KBT1ETNIK
Jeremiah 28 in the KBV
Jeremiah 28 in the KJV
Jeremiah 28 in the KNFD
Jeremiah 28 in the LBA
Jeremiah 28 in the LBLA
Jeremiah 28 in the LNT
Jeremiah 28 in the LSV
Jeremiah 28 in the MAAL
Jeremiah 28 in the MBV
Jeremiah 28 in the MBV2
Jeremiah 28 in the MHNT
Jeremiah 28 in the MKNFD
Jeremiah 28 in the MNG
Jeremiah 28 in the MNT
Jeremiah 28 in the MNT2
Jeremiah 28 in the MRS1T
Jeremiah 28 in the NAA
Jeremiah 28 in the NASB
Jeremiah 28 in the NBLA
Jeremiah 28 in the NBS
Jeremiah 28 in the NBVTP
Jeremiah 28 in the NET2
Jeremiah 28 in the NIV11
Jeremiah 28 in the NNT
Jeremiah 28 in the NNT2
Jeremiah 28 in the NNT3
Jeremiah 28 in the PDDPT
Jeremiah 28 in the PFNT
Jeremiah 28 in the RMNT
Jeremiah 28 in the SBIAS
Jeremiah 28 in the SBIBS
Jeremiah 28 in the SBIBS2
Jeremiah 28 in the SBICS
Jeremiah 28 in the SBIDS
Jeremiah 28 in the SBIGS
Jeremiah 28 in the SBIHS
Jeremiah 28 in the SBIIS
Jeremiah 28 in the SBIIS2
Jeremiah 28 in the SBIIS3
Jeremiah 28 in the SBIKS
Jeremiah 28 in the SBIKS2
Jeremiah 28 in the SBIMS
Jeremiah 28 in the SBIOS
Jeremiah 28 in the SBIPS
Jeremiah 28 in the SBISS
Jeremiah 28 in the SBITS
Jeremiah 28 in the SBITS2
Jeremiah 28 in the SBITS3
Jeremiah 28 in the SBITS4
Jeremiah 28 in the SBIUS
Jeremiah 28 in the SBIVS
Jeremiah 28 in the SBT
Jeremiah 28 in the SBT1E
Jeremiah 28 in the SCHL
Jeremiah 28 in the SNT
Jeremiah 28 in the SUSU
Jeremiah 28 in the SUSU2
Jeremiah 28 in the SYNO
Jeremiah 28 in the TBIAOTANT
Jeremiah 28 in the TBT1E
Jeremiah 28 in the TBT1E2
Jeremiah 28 in the TFTIP
Jeremiah 28 in the TFTU
Jeremiah 28 in the TGNTATF3T
Jeremiah 28 in the THAI
Jeremiah 28 in the TNFD
Jeremiah 28 in the TNT
Jeremiah 28 in the TNTIK
Jeremiah 28 in the TNTIL
Jeremiah 28 in the TNTIN
Jeremiah 28 in the TNTIP
Jeremiah 28 in the TNTIZ
Jeremiah 28 in the TOMA
Jeremiah 28 in the TTENT
Jeremiah 28 in the UBG
Jeremiah 28 in the UGV
Jeremiah 28 in the UGV2
Jeremiah 28 in the UGV3
Jeremiah 28 in the VBL
Jeremiah 28 in the VDCC
Jeremiah 28 in the YALU
Jeremiah 28 in the YAPE
Jeremiah 28 in the YBVTP
Jeremiah 28 in the ZBP