Jeremiah 36 (BOICB)

1 Nʼafọ anọ nke ọchịchị Jehoiakim nwa Josaya bụ eze Juda, okwu ONYENWE ANYỊ ndị a ruru Jeremaya ntị, 2 “Were akwụkwọ detuo okwu ahụ niile m gwarala gị banyere Izrel, na Juda, na banyere ndị mba ọzọ dị iche iche, bụ okwu ndị ahụ m bidoro ịgwa gị site nʼoge ọchịchị Josaya ruo ugbu a. 3 Ma eleghị anya mgbe ndị Juda nụrụ ka e kwupụtara ihe banyere ihe ọjọọ ndị ahụ m zubere, nke na-aga ịbịakwasị ha, onye ọbụla nʼime ha nʼotu nʼotu ga-esite nʼụzọ ọjọọ ya tụgharịa. Mgbe ahụ, aga m agbaghara ha ajọ omume ha na mmehie ha.” 4 Ya mere, Jeremaya kpọrọ Baruk nwa Neraya ka ọ bịakwute ya. Mgbe Jeremaya nọ na-akpọpụta okwu ahụ niile ONYENWE ANYỊ gwara ya, Baruk nọkwa na-edepụta ha nʼakwụkwọ. 5 Emesịa, Jeremaya gwara Baruk okwu sị ya, “Ọnọdụ nke m nọ nʼime ya ugbu a agaghị ekwe ka m site nʼebe a pụọ jeruo nʼụlọnsọ ONYENWE ANYỊ. 6 Nʼihi ya, gaa nʼụlọnsọ ONYENWE ANYỊ nʼụbọchị ibu ọnụ, nọdụ nʼebe ahụ gụpụtara ndị mmadụ okwu ONYENWE ANYỊ ndị a ị dere nʼakwụkwọ dịka m kpọpụtara ha. Gụpụtara ya ndị Juda si obodo niile bịa nʼụlọnsọ ahụ. 7 Ma eleghị anya, ha ga-arịọ ONYENWE ANYỊ arịrịọ. Ma eleghị anya onye ọbụla nʼime ha ga-esite nʼụzọ ọjọọ ya tụgharịa, ka iwe na ọnụma dị ukwuu nke ONYENWE ANYỊ ga-ekpughe megide ndị a ghara ịbịakwasị ha.” 8 Baruk nwa Neraya mere dịka Jeremaya onye amụma si gwa ya. Ọ gụpụtara okwu ONYENWE ANYỊ, nke dị nʼakwụkwọ ahụ, nʼụlọnsọ ONYENWE ANYỊ. 9 Nʼọnwa itoolu nke afọ ise nke ọchịchị Jehoiakim nwa Josaya eze Juda, e doro oge dị iche nye maka ibu ọnụ nʼihu ONYENWE ANYỊ. E kwusara ibu ọnụ a nye ndị niile nọ na Jerusalem, na ndị si nʼobodo Juda niile bịa na Jerusalem. 10 Baruk nọ nʼọnụụlọ Gemaraya nwa Shefan, bụ ode akwụkwọ, gụpụtara ndị niile nọ nʼụlọnsọ Onyenwe anyị okwu Jeremaya, nke dị nʼakwụkwọ a dị nsọ nʼọnụ ụzọ ama ọhụrụ nke ụlọnsọ ahụ. 11 Mgbe Mikaya nwa Gemaraya nwa Shefan nụrụ okwu ONYENWE ANYỊ nke e si nʼakwụkwọ ahụ gụpụta, 12 o si nʼebe ahụ pụọ, gaa nʼụlọ ode akwụkwọ dị nʼụlọeze, ebe ndịisi niile zukọrọ. Ndị a bụ ndị zukọrọ nʼebe ahụ; Elishama, ode akwụkwọ, na Delaya nwa Shemaya, na Elnatan nwa Akboa, na Gemaraya nwa Shefan, na Zedekaya nwa Hananaya, na ndịisi ọchịchị ndị ọzọ. 13 Mgbe Mikaya gwara ha ihe ọ nụrụ Baruk si nʼakwụkwọ ahụ gụpụtara ndị mmadụ, 14 ndịisi ahụ niile zipụrụ Jehudi nwa Netanaya, nwa Shelemaya, nwa Kushi, ka o jekwuru Baruk sị ya “Were akwụkwọ ahụ ị si na ya gụpụtara ndị mmadụ ihe, bịa.” Ya mere, Baruk, nwa Neraya, ji akwụkwọ a nʼaka ya jekwuru ha. 15 Mgbe o ruru nʼebe ahụ, ha gwara ya sị ya, “Biko, nọdụ ala gụọra anyị ihe dị nʼakwụkwọ a.”Ya mere, Baruk gụpụtara ha ihe dị nʼakwụkwọ ahụ. 16 Mgbe ha nụchasịrị okwu dị nʼakwụkwọ ahụ, ha lerịtara onwe ha anya nʼegwu, gwa Baruk okwu sị ya, “Anyị aghaghị ime ka okwu ndị a ruo eze ntị.” 17 Ha jụrụ Baruk sị ya, “Gwa anyị i si aṅaa detuo ihe ndị a niile? Ọ bụ Jeremaya kpọpụtaara gị ihe i dere?” 18 Baruk zara sị ha, “E, ọ bụ ya kpọpụtara m okwu ndị a niile m deturu. E ji m inki dee ha nʼakwụkwọ.” 19 Mgbe ahụ, ndịisi ahụ gwara Baruk okwu sị ya, “Ọsọ, gaa ka gị na Jeremaya zoo onwe unu. Unu ekwekwala ka onye ọbụla mata ebe unu zoro onwe unu.” 20 Mgbe ha zochasịrị akwụkwọ ahụ nʼọnụụlọ Elishama onye ode akwụkwọ, ha jekwuuru eze nʼogige ụlọ ya kọọrọ ya ihe niile. 21 Eze ziri Jehudi ka ọ gaa weta akwụkwọ ahụ. Mgbe Jehudi wetara ya site nʼọnụụlọ Elishama, ode akwụkwọ, ọ gụrụ ya nʼihu eze, na nʼihu ndịisi ọchịchị ahụ niile guzo nʼakụkụ eze. 22 Nʼọnwa nke itoolu ahụ, mgbe eze nọ nʼụlọ oyi ya, ọkụ na-enwukwa nʼime ite ọkụ dị nʼihu ya. 23 Mgbe ọbụla Jehudi gụsịrị ibe akwụkwọ atọ maọbụ anọ, eze na-anara ya akwụkwọ ndị ahụ were agụba ode akwụkwọ chakasịa ha, wụnye ha nʼọkụ. O megidere otu a tutu ruo mgbe ọ wụnyechara akwụkwọ ndị ahụ niile nʼọkụ. 24 Eze na ndị so ya nọdụ nʼoge a na-agụpụta akwụkwọ a atụghị egwu ọbụla; ha adọwakwaghị uwe ha igosi obi ọjọọ. 25 Ọ bụ ezie na Elnatan na Delaya na Gemaraya rịọrọ eze sị ya adọkasịla akwụkwọ ndị ahụ, ma o geghị ha ntị. 26 Kama eze nyere Jerameel otu nʼime ụmụ eze, na Seraya nwa Azriel, na Shelemaya nwa Abdeel iwu ijide Baruk ode akwụkwọ, na Jeremaya onye amụma, ma ONYENWE ANYỊ zoro ha. 27 Mgbe eze suresịrị akwụkwọ ahụ na okwu niile nke Baruk dere nʼime ya ọkụ, bụ okwu nke Jeremaya kpọpụtara site nʼọnụ ya, okwu ONYENWE ANYỊ ruru Jeremaya ntị sị ya: 28 “Werekwa akwụkwọ ọzọ dee okwu ndị ahụ niile e dere nʼakwụkwọ nke mbụ ahụ, nke Jehoiakim eze Juda kpọrọ ọkụ. 29 Ọzọkwa, gwa Jehoiakim eze Juda sị ya, ‘otu a ka ONYENWE ANYỊ kwuru, Ị kpọrọ akwụkwọ ndị ahụ ọkụ, kwuo sị, “Gịnị mere i ji dee nʼime ya na eze Babilọn aghaghị ịbịa bibie ala a, gbuchapụ ndị niile nọ nʼime ya, ma mmadụ ma anụmanụ?” 30 Nʼihi ya, ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ kwuru banyere Jehoiakim eze Juda; Ọ gaghị amụta onye ga-anọ nʼocheeze Devid. Ọzọ, a ga-atụfu ozu ya nʼebe igirigi nke abalị ga-adakwasị ya, ebe okpomọkụ nke ehihie ga-erute ya. 31 Aga m ata ya na ụmụ ya, na ndị ozi ya ahụhụ nʼihi ajọ omume ha. Aga m eme ka ihe ọjọọ ahụ m kwuru ihe banyere ya bịakwasị ha na ndị niile bi na Jerusalem, na ndị Juda niile, nʼihi na ha jụrụ ige m ntị.’ ” 32 Ya mere, Jeremaya weere akwụkwọ ọzọ nye Baruk ode akwụkwọ, bụ nwa Neraya, dịka Jeremaya na-akpọpụta okwu, Baruk depụtakwara nʼakwụkwọ okwu ndị ahụ niile, nke Jehoiakim eze Juda surere nʼọkụ. A tụkwasịkwara nʼelu ha ọtụtụ okwu ndị ọzọ nke dịka ha.

In Other Versions

Jeremiah 36 in the ANGEFD

Jeremiah 36 in the ANTPNG2D

Jeremiah 36 in the AS21

Jeremiah 36 in the BAGH

Jeremiah 36 in the BBPNG

Jeremiah 36 in the BBT1E

Jeremiah 36 in the BDS

Jeremiah 36 in the BEV

Jeremiah 36 in the BHAD

Jeremiah 36 in the BIB

Jeremiah 36 in the BLPT

Jeremiah 36 in the BNT

Jeremiah 36 in the BNTABOOT

Jeremiah 36 in the BNTLV

Jeremiah 36 in the BOATCB

Jeremiah 36 in the BOATCB2

Jeremiah 36 in the BOBCV

Jeremiah 36 in the BOCNT

Jeremiah 36 in the BOECS

Jeremiah 36 in the BOGWICC

Jeremiah 36 in the BOHCB

Jeremiah 36 in the BOHCV

Jeremiah 36 in the BOHLNT

Jeremiah 36 in the BOHNTLTAL

Jeremiah 36 in the BOILNTAP

Jeremiah 36 in the BOITCV

Jeremiah 36 in the BOKCV

Jeremiah 36 in the BOKCV2

Jeremiah 36 in the BOKHWOG

Jeremiah 36 in the BOKSSV

Jeremiah 36 in the BOLCB

Jeremiah 36 in the BOLCB2

Jeremiah 36 in the BOMCV

Jeremiah 36 in the BONAV

Jeremiah 36 in the BONCB

Jeremiah 36 in the BONLT

Jeremiah 36 in the BONUT2

Jeremiah 36 in the BOPLNT

Jeremiah 36 in the BOSCB

Jeremiah 36 in the BOSNC

Jeremiah 36 in the BOTLNT

Jeremiah 36 in the BOVCB

Jeremiah 36 in the BOYCB

Jeremiah 36 in the BPBB

Jeremiah 36 in the BPH

Jeremiah 36 in the BSB

Jeremiah 36 in the CCB

Jeremiah 36 in the CUV

Jeremiah 36 in the CUVS

Jeremiah 36 in the DBT

Jeremiah 36 in the DGDNT

Jeremiah 36 in the DHNT

Jeremiah 36 in the DNT

Jeremiah 36 in the ELBE

Jeremiah 36 in the EMTV

Jeremiah 36 in the ESV

Jeremiah 36 in the FBV

Jeremiah 36 in the FEB

Jeremiah 36 in the GGMNT

Jeremiah 36 in the GNT

Jeremiah 36 in the HARY

Jeremiah 36 in the HNT

Jeremiah 36 in the IRVA

Jeremiah 36 in the IRVB

Jeremiah 36 in the IRVG

Jeremiah 36 in the IRVH

Jeremiah 36 in the IRVK

Jeremiah 36 in the IRVM

Jeremiah 36 in the IRVM2

Jeremiah 36 in the IRVO

Jeremiah 36 in the IRVP

Jeremiah 36 in the IRVT

Jeremiah 36 in the IRVT2

Jeremiah 36 in the IRVU

Jeremiah 36 in the ISVN

Jeremiah 36 in the JSNT

Jeremiah 36 in the KAPI

Jeremiah 36 in the KBT1ETNIK

Jeremiah 36 in the KBV

Jeremiah 36 in the KJV

Jeremiah 36 in the KNFD

Jeremiah 36 in the LBA

Jeremiah 36 in the LBLA

Jeremiah 36 in the LNT

Jeremiah 36 in the LSV

Jeremiah 36 in the MAAL

Jeremiah 36 in the MBV

Jeremiah 36 in the MBV2

Jeremiah 36 in the MHNT

Jeremiah 36 in the MKNFD

Jeremiah 36 in the MNG

Jeremiah 36 in the MNT

Jeremiah 36 in the MNT2

Jeremiah 36 in the MRS1T

Jeremiah 36 in the NAA

Jeremiah 36 in the NASB

Jeremiah 36 in the NBLA

Jeremiah 36 in the NBS

Jeremiah 36 in the NBVTP

Jeremiah 36 in the NET2

Jeremiah 36 in the NIV11

Jeremiah 36 in the NNT

Jeremiah 36 in the NNT2

Jeremiah 36 in the NNT3

Jeremiah 36 in the PDDPT

Jeremiah 36 in the PFNT

Jeremiah 36 in the RMNT

Jeremiah 36 in the SBIAS

Jeremiah 36 in the SBIBS

Jeremiah 36 in the SBIBS2

Jeremiah 36 in the SBICS

Jeremiah 36 in the SBIDS

Jeremiah 36 in the SBIGS

Jeremiah 36 in the SBIHS

Jeremiah 36 in the SBIIS

Jeremiah 36 in the SBIIS2

Jeremiah 36 in the SBIIS3

Jeremiah 36 in the SBIKS

Jeremiah 36 in the SBIKS2

Jeremiah 36 in the SBIMS

Jeremiah 36 in the SBIOS

Jeremiah 36 in the SBIPS

Jeremiah 36 in the SBISS

Jeremiah 36 in the SBITS

Jeremiah 36 in the SBITS2

Jeremiah 36 in the SBITS3

Jeremiah 36 in the SBITS4

Jeremiah 36 in the SBIUS

Jeremiah 36 in the SBIVS

Jeremiah 36 in the SBT

Jeremiah 36 in the SBT1E

Jeremiah 36 in the SCHL

Jeremiah 36 in the SNT

Jeremiah 36 in the SUSU

Jeremiah 36 in the SUSU2

Jeremiah 36 in the SYNO

Jeremiah 36 in the TBIAOTANT

Jeremiah 36 in the TBT1E

Jeremiah 36 in the TBT1E2

Jeremiah 36 in the TFTIP

Jeremiah 36 in the TFTU

Jeremiah 36 in the TGNTATF3T

Jeremiah 36 in the THAI

Jeremiah 36 in the TNFD

Jeremiah 36 in the TNT

Jeremiah 36 in the TNTIK

Jeremiah 36 in the TNTIL

Jeremiah 36 in the TNTIN

Jeremiah 36 in the TNTIP

Jeremiah 36 in the TNTIZ

Jeremiah 36 in the TOMA

Jeremiah 36 in the TTENT

Jeremiah 36 in the UBG

Jeremiah 36 in the UGV

Jeremiah 36 in the UGV2

Jeremiah 36 in the UGV3

Jeremiah 36 in the VBL

Jeremiah 36 in the VDCC

Jeremiah 36 in the YALU

Jeremiah 36 in the YAPE

Jeremiah 36 in the YBVTP

Jeremiah 36 in the ZBP