Jeremiah 52 (BOICB)

1 Zedekaya gbara iri afọ abụọ na otu mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị dị ka eze na Jerusalem afọ iri na otu. Aha nne ya bụ Hamutal nwa Jeremaya, onye Libna. 2 O mere ihe jọrọ njọ nʼanya ONYENWE ANYỊ dịka Jehoiakim mere. 3 Ọ bụ nʼihi iwe ONYENWE ANYỊ ka ihe ndị a niile ji bịakwasị Jerusalem na Juda. Nʼikpeazụ, o sitere nʼihu ya chụpụ ha.Nʼoge a, Zedekaya nupuru isi nʼokpuru eze Babilọn. 4 Nʼihi ya, nʼafọ nke itoolu, nke ọchịchị Zedekaya, nʼụbọchị nke iri nʼọnwa nke iri, nke afọ ahụ, Nebukadneza, eze Babilọn, duuru usuu ndị agha ya niile bịa ibuso Jerusalem agha. Ha mara ụlọ ikwu ndị agha nʼazụ obodo ahụ, wuokwa mgbidi nnọchibido gburugburu obodo ahụ. 5 Anọchibidoro obodo a nʼagha ruo nʼafọ nke iri na otu nke ọchịchị eze Zedekaya. 6 Nʼabalị nke itoolu, nke ọnwa anọ nʼafọ ahụ, oke ụnwụ siri ike dị nʼobodo ahụ ruo na ọ dịkwaghị nri dị nke ndị mmadụ ga-eri. 7 Mgbe ahụ, e tipuru oghere nʼaja mgbidi obodo ahụ, ndị agha niile ji abalị gbapụ site nʼọnụ ụzọ ama nke dị nʼetiti mgbidi abụọ nʼakụkụ ubi eze a gbara ogige, nʼagbanyeghị na ndị Babilọn nọ obodo ahụ gburugburu. Ha gbapụrụ chee ihu nʼụzọ Araba. 8 Ma usuu ndị agha Babilọn chụsoro Zedekaya bụ eze nʼazụ, chụkwute ya na mbara ala Jeriko. Ndị agha ya niile sitere nʼebe ọ nọ gbasasịa, hapụ ya, 9 e jide ya.Ha kpụgara ya eze Babilọn, nʼobodo Ribla, nke dị nʼala Hamat, ebe a nọ maa ya ikpe. 10 Na Ribla ka eze Babilọn nọ gbuo ụmụ ndị ikom Zedekaya niile, nʼihu ya, o gbukwara ndịisi ọchịchị Juda niile. 11 Ọ ghụpụrụ anya Zedekaya abụọ, jiri ụdọ bronz kee ya agbụ, kpụrụ ya gaa Babilọn, ebe o tinyere ya nʼụlọ mkpọrọ tutu ruo ụbọchị ọnwụ ya. 12 Nʼụbọchị nke iri, nʼọnwa nke ise, nke afọ iri na itoolu, nke ọchịchị Nebukadneza eze Babilọn, Nebuzaradan ọchịagha ndị nche eze, onye na-ejere eze Babilọn ozi, bịarutere Jerusalem. 13 O sunyere ụlọnsọ ONYENWE ANYỊ ọkụ, ụlọeze na ụlọ niile dị na Jerusalem, ụlọ ọbụla bụ nke dị mkpa ka o surere ọkụ. 14 Usuu ndị agha Kaldịa niile bụ ndị nọ nʼokpuru onyeisi ndị nche eze ahụ, kwaturu mgbidi ahụ niile gbara Jerusalem gburugburu. 15 Nebuzaradan, ọchịagha ndị nche eze, buru ụfọdụ nʼime ndị dakarịsịrị nʼogbenye na ndị fọdụrụ nʼime obodo ahụ, ha na ndị ǹka niile fọdụrụ, na ndị ahụ ji aka ha gbakwuru eze Babilọn, bulaa ha Babilọn, ka ha ga biri nʼala ọzọ. 16 Ma Nebuzaradan, hapụrụ ndị ahụ bụ nnọọ ndị ogbenye ọnụ ntụ, ka ha na-elekọta ubi vaịnị niile a gbara ogige na ala ubi niile. 17 Ma ndị Babilọn tipịara ogidi bronz niile, ha na ihe ndọkwasị niile na Oke osimiri bronz ndị ahụ dị nʼụlọnsọ ONYENWE ANYỊ, buru bronz ahụ niile bulaa Babilọn. 18 Ha chịkọọrọ ite niile, na shọvel niile na ihe ịkpakepụ ọkụ niile, na efere ịkwọsa mmiri niile, na ngaji ukwu niile, na ihe bronz niile, bụ nke e ji eje ozi nʼime ụlọnsọ ahụ. 19 Ọchịagha ndị nche eze ahụ sikwa nʼụlọnsọ ahụ chịrị ihe ndị a: efere ukwu niile, ihe ịgụnye ọkụ niile, efere ịkwọsa mmiri niile, ite niile, ihe ịdọkwasị oriọna niile, ngaji ukwu niile na iko e ji enye onyinye ihe ọṅụṅụ, ya bụ ihe ndị ahụ niile e ji ọlaedo a nụchara anụcha maọbụ ọlaọcha kpụọ. 20 O burukwara bronz sitere nʼogidi abụọ ahụ, oke Osimiri ahụ na ehi iri na abụọ e ji bronz kpụọ, bụ nke dị nʼokpuru ya, na ihe ndọkwasị ya niile, nke eze bụ Solomọn mere nʼihi ụlọnsọ ONYENWE ANYỊ. Ha karịrị ihe a ga-eji ihe ọtụtụ tụọ. 21 Ị dị elu nke otu nʼime ogidi abụọ ndị a bụ mita asatọ na ụma nʼọtụtụ. Ị dị gburugburu ya bụkwa mita ise na ụma anọ, nke ọbụla nʼime ha bụ mkpịsịaka anọ. Oghere dịkwa nʼime ha. 22 Isi bronz nke e kpụkwasịrị nʼotu ogidi dị mita abụọ na ụma atọ nʼịdị elu. Ọ bụkwa ihe yiri mkpụrụ pomegranet e ji bronz kpaa, ka e ji chọọ ya mma gburugburu ya niile. Ogidi nke abụọ nwekwara pomegranet, yiri ibe ya. 23 Pomegranet ndị ahụ dị iri itoolu na isii, ọ bụkwa nʼakụkụ ọbụla ka ọ dị. Ọnụọgụgụ pomegranet niile dị nʼelu ihe ahụ a kpụrụ akpụ dị otu narị. 24 Ọchịagha ndị nche eze ahụ, kpụụrụ Seraya, onyeisi nchụaja, na Zefanaya, bụ onye nchụaja na-esote ya nʼọkwa, na ndị nche atọ na-eche ọnụ ụzọ mbata dịka ndị mkpọrọ. 25 O sitere nʼetiti ndị ahụ fọdụrụ nʼobodo kpụụrụ otu onyeisi na-ahụ maka ndị agha, na ndị ikom asaa na-enye eze ndụmọdụ. O kpukwaara ode akwụkwọ, onye isi ọrụ na-ahụ maka ịmanye ndị ga-aga agha, jidekwa iri ndị ikom isii bụ ndị a hụrụ nʼime obodo ahụ. 26 Nebuzaradan, bụ ọchịagha kpụụrụ ha niile, dute ha nʼihu eze Babilọn na Ribla. 27 Nʼebe ahụ na Ribla, dị nʼobodo Hamat, ka eze nọ nye iwu ka e gbuo ha niile.Ya mere, a dọọrọ Juda nʼagha, mee ka ọ ga biri nʼala ọzọ. 28 Nke a bụ ọnụọgụgụ ndị ahụ Nebukadneza mere ka ha gaa biri nʼala ọzọ. Nʼafọ nke asaa nke ọchịchị ya,puku atọ ndị Juu na iri abụọ na atọ, 3,023. 29 Nʼafọ nke iri na asatọ nke ọchịchị Nebukadneza,ka o mere ka narị mmadụ asatọ na iri atọ na abụọ, 832 si na Jerusalem gaa biri nʼala ọzọ. 30 Nʼafọ nke iri abụọ na atọ,Nebuzaradan, onyeisi ndị nche alaeze Babilọn bulara ndị dị narị ndị Juu asaa na iri anọ na ise, 745 ka ha ga biri nʼala ọzọ. Ọnụọgụgụ ha niile dị puku anọ na narị isii, 4,600. 31 Nʼafọ nke iri atọ na asaa, site na mgbe e mere ka Jehoiakin eze Juda gaa biri nʼala ọzọ, nʼafọ Awel-Maduk ghọrọ eze Babilọn. Mgbe ahụ, o mere ka Jehoiakin eze Juda, si nʼụlọ mkpọrọ pụta, nwere onwe ya. O mere nke a nʼụbọchị iri abụọ na ise nke ọnwa iri na abụọ. 32 Ọ gwara ya okwu ọma, nyekwa ya ọnọdụ ugwu dị elu karịa ọnọdụ ndị eze ndị ọzọ niile ha na ya nọ na Babilọn. 33 Nʼihi nke a, Jehoiakin gbanwere uwe mkpọrọ ya, wezuga ya. Sitekwa nʼoge ahụ tutu ruo mgbe ọ nwụrụ, ya na eze na-erikọ nri. 34 Site nʼụbọchị ruo nʼụbọchị, eze Babilọn na-enye Jehoiakin oke ihe ruru ya kwa ụbọchị niile nke ọ dị ndụ, ruokwa nʼụbọchị ọnwụ ya.

In Other Versions

Jeremiah 52 in the ANGEFD

Jeremiah 52 in the ANTPNG2D

Jeremiah 52 in the AS21

Jeremiah 52 in the BAGH

Jeremiah 52 in the BBPNG

Jeremiah 52 in the BBT1E

Jeremiah 52 in the BDS

Jeremiah 52 in the BEV

Jeremiah 52 in the BHAD

Jeremiah 52 in the BIB

Jeremiah 52 in the BLPT

Jeremiah 52 in the BNT

Jeremiah 52 in the BNTABOOT

Jeremiah 52 in the BNTLV

Jeremiah 52 in the BOATCB

Jeremiah 52 in the BOATCB2

Jeremiah 52 in the BOBCV

Jeremiah 52 in the BOCNT

Jeremiah 52 in the BOECS

Jeremiah 52 in the BOGWICC

Jeremiah 52 in the BOHCB

Jeremiah 52 in the BOHCV

Jeremiah 52 in the BOHLNT

Jeremiah 52 in the BOHNTLTAL

Jeremiah 52 in the BOILNTAP

Jeremiah 52 in the BOITCV

Jeremiah 52 in the BOKCV

Jeremiah 52 in the BOKCV2

Jeremiah 52 in the BOKHWOG

Jeremiah 52 in the BOKSSV

Jeremiah 52 in the BOLCB

Jeremiah 52 in the BOLCB2

Jeremiah 52 in the BOMCV

Jeremiah 52 in the BONAV

Jeremiah 52 in the BONCB

Jeremiah 52 in the BONLT

Jeremiah 52 in the BONUT2

Jeremiah 52 in the BOPLNT

Jeremiah 52 in the BOSCB

Jeremiah 52 in the BOSNC

Jeremiah 52 in the BOTLNT

Jeremiah 52 in the BOVCB

Jeremiah 52 in the BOYCB

Jeremiah 52 in the BPBB

Jeremiah 52 in the BPH

Jeremiah 52 in the BSB

Jeremiah 52 in the CCB

Jeremiah 52 in the CUV

Jeremiah 52 in the CUVS

Jeremiah 52 in the DBT

Jeremiah 52 in the DGDNT

Jeremiah 52 in the DHNT

Jeremiah 52 in the DNT

Jeremiah 52 in the ELBE

Jeremiah 52 in the EMTV

Jeremiah 52 in the ESV

Jeremiah 52 in the FBV

Jeremiah 52 in the FEB

Jeremiah 52 in the GGMNT

Jeremiah 52 in the GNT

Jeremiah 52 in the HARY

Jeremiah 52 in the HNT

Jeremiah 52 in the IRVA

Jeremiah 52 in the IRVB

Jeremiah 52 in the IRVG

Jeremiah 52 in the IRVH

Jeremiah 52 in the IRVK

Jeremiah 52 in the IRVM

Jeremiah 52 in the IRVM2

Jeremiah 52 in the IRVO

Jeremiah 52 in the IRVP

Jeremiah 52 in the IRVT

Jeremiah 52 in the IRVT2

Jeremiah 52 in the IRVU

Jeremiah 52 in the ISVN

Jeremiah 52 in the JSNT

Jeremiah 52 in the KAPI

Jeremiah 52 in the KBT1ETNIK

Jeremiah 52 in the KBV

Jeremiah 52 in the KJV

Jeremiah 52 in the KNFD

Jeremiah 52 in the LBA

Jeremiah 52 in the LBLA

Jeremiah 52 in the LNT

Jeremiah 52 in the LSV

Jeremiah 52 in the MAAL

Jeremiah 52 in the MBV

Jeremiah 52 in the MBV2

Jeremiah 52 in the MHNT

Jeremiah 52 in the MKNFD

Jeremiah 52 in the MNG

Jeremiah 52 in the MNT

Jeremiah 52 in the MNT2

Jeremiah 52 in the MRS1T

Jeremiah 52 in the NAA

Jeremiah 52 in the NASB

Jeremiah 52 in the NBLA

Jeremiah 52 in the NBS

Jeremiah 52 in the NBVTP

Jeremiah 52 in the NET2

Jeremiah 52 in the NIV11

Jeremiah 52 in the NNT

Jeremiah 52 in the NNT2

Jeremiah 52 in the NNT3

Jeremiah 52 in the PDDPT

Jeremiah 52 in the PFNT

Jeremiah 52 in the RMNT

Jeremiah 52 in the SBIAS

Jeremiah 52 in the SBIBS

Jeremiah 52 in the SBIBS2

Jeremiah 52 in the SBICS

Jeremiah 52 in the SBIDS

Jeremiah 52 in the SBIGS

Jeremiah 52 in the SBIHS

Jeremiah 52 in the SBIIS

Jeremiah 52 in the SBIIS2

Jeremiah 52 in the SBIIS3

Jeremiah 52 in the SBIKS

Jeremiah 52 in the SBIKS2

Jeremiah 52 in the SBIMS

Jeremiah 52 in the SBIOS

Jeremiah 52 in the SBIPS

Jeremiah 52 in the SBISS

Jeremiah 52 in the SBITS

Jeremiah 52 in the SBITS2

Jeremiah 52 in the SBITS3

Jeremiah 52 in the SBITS4

Jeremiah 52 in the SBIUS

Jeremiah 52 in the SBIVS

Jeremiah 52 in the SBT

Jeremiah 52 in the SBT1E

Jeremiah 52 in the SCHL

Jeremiah 52 in the SNT

Jeremiah 52 in the SUSU

Jeremiah 52 in the SUSU2

Jeremiah 52 in the SYNO

Jeremiah 52 in the TBIAOTANT

Jeremiah 52 in the TBT1E

Jeremiah 52 in the TBT1E2

Jeremiah 52 in the TFTIP

Jeremiah 52 in the TFTU

Jeremiah 52 in the TGNTATF3T

Jeremiah 52 in the THAI

Jeremiah 52 in the TNFD

Jeremiah 52 in the TNT

Jeremiah 52 in the TNTIK

Jeremiah 52 in the TNTIL

Jeremiah 52 in the TNTIN

Jeremiah 52 in the TNTIP

Jeremiah 52 in the TNTIZ

Jeremiah 52 in the TOMA

Jeremiah 52 in the TTENT

Jeremiah 52 in the UBG

Jeremiah 52 in the UGV

Jeremiah 52 in the UGV2

Jeremiah 52 in the UGV3

Jeremiah 52 in the VBL

Jeremiah 52 in the VDCC

Jeremiah 52 in the YALU

Jeremiah 52 in the YAPE

Jeremiah 52 in the YBVTP

Jeremiah 52 in the ZBP