Jeremiah 9 (BOICB)

1 Ọ gaara adị m mma ma a sị na isi m bụ isi iyi, ebe mmiri si asọpụta;ọ gaara adị m mma ma a sịkwa na anya mmiri akwa jupụtara m nʼanya.Agaara m akwagide akwa ehihie na abalịnʼihi ndị m niile e gburu egbu. 2 Ọ gaara adị m mmama a sị na m nwere ụlọ ndị ije e wuru nʼime ọzara.Ka m nwee ike hapụ ndị msite nʼebe ha nọ pụọ.Nʼihi na ha niile bụ ndị na-akwa iko,igwe ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi. 3 “Ha na-ekwe ire ha dịka ụta,ịgbapụ okwu ụgha dịka àkụ;Ọ bụghị site nʼeziokwuka ihe ji agara ha nke ọma nʼala ahụ.Ha na-esite nʼotu mmehie gaa nʼọzọ;ọ dịkwaghị mgbe ha ji mara m,”otu a ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara. 4 “Lezie anya, gbaara enyi gị ọsọ.Atụkwasịkwala nwanne gị obi.Nʼihi na nwanne ọbụla na-aghọ aghụghọ.Ndị enyi niile bụkwa ndị nkwutọ. 5 Enyi na-aghọgbu enyi ya,ọ dịkwaghị onye na-agwa ibe ya eziokwu.Ha azụọla ire ha ikwu naanị okwu ụgha;ha emeekwala ka ike gwụ anụ ahụ ha ime mmehie. 6 I bi nʼetiti aghụghọ.Ha jụkwara ịmara m nʼime aghụghọ ha.”Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara. 7 Ya mere, ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru,“Lee, aga m anụcha ha, nwaa ha ọnwụnwa.Gịnị ọzọ ka m kwesiri imenʼihi mmehie ndị m? 8 Ire ha na-egbu dịka àkụ.Ọ bụ naanị okwu aghụghọ si na ya apụta.Ha ji ọnụ ha na-agwarịta ibe ha okwu udo,ma nʼime obi ha, ha na-esirịtara onwe ha ọnya igbudu.” 9 Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara sị,“M ga-aghara ịta ha ahụhụ nʼihi ihe ndị a niile?M ga-ahapụ ịbọrọ onwe m ọbọmegide mba dị otu a?” 10 Aga m anọ nʼelu ugwu ukwu kwa akwa.Nʼebe ahụ ka m ga-anọ kwaa ụwa m nʼihi ebe ịta nri nke anụmanụ ndị ahụ dị nʼọzara.Ha tọgbọrọ nʼefu. Ọ dịghị onye na-ejegharị nʼime ya.A naghị anụkwa olu anụ ụlọ nʼebe ahụ.Ụmụ nnụnụ efefusịala.Otu a kwa, ụmụ anụmanụ alaala. 11 “Aga m eme ka Jerusalem ghọọ ebe a na-awụfu unyi.Ọ ga-aghọ ebe nkịta ọhịa na-awagharị na-achọ nri.Aga m ekposa obodo niile nke Juda.Ọ dịkwaghị onye ga-ebi na ya.” 12 Olee onye ahụ maara ihe, nke nwere ike ịghọta ihe ndị a niile? Onye ka ONYENWE ANYỊ ziri ihe ndị a, nke ga-akọwa ya? Gịnị mere e ji bibie ala a, kposaa ya, mee ka ọ tọgbọrọ nʼefu dịka ọzara mmadụ na-enweghị ike ịgafe? 13 ONYENWE ANYỊ kwuru sị, “Ọ bụ nʼihi na ha agbakụtala iwu ahụ m nyere ha idebe azụ. Ha jụrụ irubere m isi, jụkwa ịgbaso iwu m. 14 Kama, ha na-agbaso isiike nke obi ha, ha gbasoro chi Baal dịka nna nna ha si kuziere ha.” 15 Nʼihi ya, nke a bụ ihe ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile, Chineke nke Izrel kwuru, “Lee, aga m eme ka ndị a rie nri na-akụ ilu. Ha ga-aṅụkwa mmiri e tinyere nsi. 16 Aga m ekposa ha na mba niile nke ụwa. Ha ga-ebi na mba nke ha na nna ha na-amaghị. Aga m eji mma agha chụọ ha ọsọ tutu ruo mgbe m bibiri ha niile.” 17 Otu a ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru,“Tụgharịanụ uche unu ugbu a. Kpọọnụ ụmụ nwanyị ndị ọrụ ha bụ ịbụ abụ akwa.E, zienụ ozi ka ndị ọkachamara nʼetiti ha bịa. 18 Ha bịa ngwangwakwaa akwa nʼihi anyị,tutu anya mmiri akwa ejupụta ha nʼanya,tutu anya mmiri akwa esite anyị nʼanya na-asọda ruo na ntị anyị. 19 Olu ụzụ ịkwa akwa ka a nụrụ site na Zayọn‘Lee ka anyị si laa nʼiyi!Lee ka ihe ihere anyị si dị ukwuu!Nʼihi na anyị hapụrụ ala anyị,nʼihi na ha etikpọsịala ebe obibi anyị niile.’ ” 20 Ugbu a, nụrụnụ okwu ONYENWE ANYỊ, unu ụmụ nwanyị,megheenụ ntị unu nụrụ okwu si ya nʼọnụ.Kuzierenụ ụmụ unu ndị inyom otu e si eti mkpu akwa,kuziekwaranụ ibe unu abụ akwa. 21 Nʼihi na ọnwụ abatala nʼetiti anyị, o si na oghereikuku niile nke ụlọ anyịbata nʼebe niile e wusiri ike nke ala anyị.O gbuola ụmụntakịrị ndị na-ejegharị nʼokporoụzọ,gbukwaa ụmụ okorobịa ndị na-anọ nʼama. 22 Gwa ha, sị, “Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri,“ ‘Ozu ndị nwụrụ anwụ ga-atọgbọrọdịka unyi e kpofuru nʼọhịa,dịka ukwu ọka nke e gbuturu nʼazụ onye na-aghọ mkpụrụ ubi,nke ọ dịghị onye ga-achịkọta ha.’ ” 23 Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwuru,“Ka onye maara ihe hapụ ịnya isi nʼihi amamihe ya,ka onye dị ike ghara ịnya isi nʼihi ịdị ike ya,ka ọgaranya hapụkwa ịnya isi nʼihi ịba ụba nke akụ ya, 24 kama, onye ọbụla na-anya isi, ya nyaa isi nʼihi nke a:na o nwere uche ịghọta na mụ onwe m bụ, ONYENWE ANYỊ nke na-eme obi ebere,na-ekpe ikpe ziri ezi na ezi omume nʼụwa.Nʼihi nʼihe ndị a ka m na-enwe obi ụtọ,”ka ONYENWE ANYỊ kwubiri. 25 “Lee, ụbọchị ahụ na-abịa,” ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara, “mgbe m ga-ata ndị ahụ niile nke e biri ugwu naanị nʼanụ ahụ ha ahụhụ. 26 Ya bụ ndị Ijipt, Juda, Edọm, Amọn, na Moab, na ndị ahụ niile bi nʼọzara nʼebe dị anya. Nʼihi na, nʼezie, mba ndị a niile bụ ndị a na-ebighị ugwu. Ọ bụladị ụlọ Izrel niile bụ ndị a na-ebighị ugwu nʼime obi ha.”

In Other Versions

Jeremiah 9 in the ANGEFD

Jeremiah 9 in the ANTPNG2D

Jeremiah 9 in the AS21

Jeremiah 9 in the BAGH

Jeremiah 9 in the BBPNG

Jeremiah 9 in the BBT1E

Jeremiah 9 in the BDS

Jeremiah 9 in the BEV

Jeremiah 9 in the BHAD

Jeremiah 9 in the BIB

Jeremiah 9 in the BLPT

Jeremiah 9 in the BNT

Jeremiah 9 in the BNTABOOT

Jeremiah 9 in the BNTLV

Jeremiah 9 in the BOATCB

Jeremiah 9 in the BOATCB2

Jeremiah 9 in the BOBCV

Jeremiah 9 in the BOCNT

Jeremiah 9 in the BOECS

Jeremiah 9 in the BOGWICC

Jeremiah 9 in the BOHCB

Jeremiah 9 in the BOHCV

Jeremiah 9 in the BOHLNT

Jeremiah 9 in the BOHNTLTAL

Jeremiah 9 in the BOILNTAP

Jeremiah 9 in the BOITCV

Jeremiah 9 in the BOKCV

Jeremiah 9 in the BOKCV2

Jeremiah 9 in the BOKHWOG

Jeremiah 9 in the BOKSSV

Jeremiah 9 in the BOLCB

Jeremiah 9 in the BOLCB2

Jeremiah 9 in the BOMCV

Jeremiah 9 in the BONAV

Jeremiah 9 in the BONCB

Jeremiah 9 in the BONLT

Jeremiah 9 in the BONUT2

Jeremiah 9 in the BOPLNT

Jeremiah 9 in the BOSCB

Jeremiah 9 in the BOSNC

Jeremiah 9 in the BOTLNT

Jeremiah 9 in the BOVCB

Jeremiah 9 in the BOYCB

Jeremiah 9 in the BPBB

Jeremiah 9 in the BPH

Jeremiah 9 in the BSB

Jeremiah 9 in the CCB

Jeremiah 9 in the CUV

Jeremiah 9 in the CUVS

Jeremiah 9 in the DBT

Jeremiah 9 in the DGDNT

Jeremiah 9 in the DHNT

Jeremiah 9 in the DNT

Jeremiah 9 in the ELBE

Jeremiah 9 in the EMTV

Jeremiah 9 in the ESV

Jeremiah 9 in the FBV

Jeremiah 9 in the FEB

Jeremiah 9 in the GGMNT

Jeremiah 9 in the GNT

Jeremiah 9 in the HARY

Jeremiah 9 in the HNT

Jeremiah 9 in the IRVA

Jeremiah 9 in the IRVB

Jeremiah 9 in the IRVG

Jeremiah 9 in the IRVH

Jeremiah 9 in the IRVK

Jeremiah 9 in the IRVM

Jeremiah 9 in the IRVM2

Jeremiah 9 in the IRVO

Jeremiah 9 in the IRVP

Jeremiah 9 in the IRVT

Jeremiah 9 in the IRVT2

Jeremiah 9 in the IRVU

Jeremiah 9 in the ISVN

Jeremiah 9 in the JSNT

Jeremiah 9 in the KAPI

Jeremiah 9 in the KBT1ETNIK

Jeremiah 9 in the KBV

Jeremiah 9 in the KJV

Jeremiah 9 in the KNFD

Jeremiah 9 in the LBA

Jeremiah 9 in the LBLA

Jeremiah 9 in the LNT

Jeremiah 9 in the LSV

Jeremiah 9 in the MAAL

Jeremiah 9 in the MBV

Jeremiah 9 in the MBV2

Jeremiah 9 in the MHNT

Jeremiah 9 in the MKNFD

Jeremiah 9 in the MNG

Jeremiah 9 in the MNT

Jeremiah 9 in the MNT2

Jeremiah 9 in the MRS1T

Jeremiah 9 in the NAA

Jeremiah 9 in the NASB

Jeremiah 9 in the NBLA

Jeremiah 9 in the NBS

Jeremiah 9 in the NBVTP

Jeremiah 9 in the NET2

Jeremiah 9 in the NIV11

Jeremiah 9 in the NNT

Jeremiah 9 in the NNT2

Jeremiah 9 in the NNT3

Jeremiah 9 in the PDDPT

Jeremiah 9 in the PFNT

Jeremiah 9 in the RMNT

Jeremiah 9 in the SBIAS

Jeremiah 9 in the SBIBS

Jeremiah 9 in the SBIBS2

Jeremiah 9 in the SBICS

Jeremiah 9 in the SBIDS

Jeremiah 9 in the SBIGS

Jeremiah 9 in the SBIHS

Jeremiah 9 in the SBIIS

Jeremiah 9 in the SBIIS2

Jeremiah 9 in the SBIIS3

Jeremiah 9 in the SBIKS

Jeremiah 9 in the SBIKS2

Jeremiah 9 in the SBIMS

Jeremiah 9 in the SBIOS

Jeremiah 9 in the SBIPS

Jeremiah 9 in the SBISS

Jeremiah 9 in the SBITS

Jeremiah 9 in the SBITS2

Jeremiah 9 in the SBITS3

Jeremiah 9 in the SBITS4

Jeremiah 9 in the SBIUS

Jeremiah 9 in the SBIVS

Jeremiah 9 in the SBT

Jeremiah 9 in the SBT1E

Jeremiah 9 in the SCHL

Jeremiah 9 in the SNT

Jeremiah 9 in the SUSU

Jeremiah 9 in the SUSU2

Jeremiah 9 in the SYNO

Jeremiah 9 in the TBIAOTANT

Jeremiah 9 in the TBT1E

Jeremiah 9 in the TBT1E2

Jeremiah 9 in the TFTIP

Jeremiah 9 in the TFTU

Jeremiah 9 in the TGNTATF3T

Jeremiah 9 in the THAI

Jeremiah 9 in the TNFD

Jeremiah 9 in the TNT

Jeremiah 9 in the TNTIK

Jeremiah 9 in the TNTIL

Jeremiah 9 in the TNTIN

Jeremiah 9 in the TNTIP

Jeremiah 9 in the TNTIZ

Jeremiah 9 in the TOMA

Jeremiah 9 in the TTENT

Jeremiah 9 in the UBG

Jeremiah 9 in the UGV

Jeremiah 9 in the UGV2

Jeremiah 9 in the UGV3

Jeremiah 9 in the VBL

Jeremiah 9 in the VDCC

Jeremiah 9 in the YALU

Jeremiah 9 in the YAPE

Jeremiah 9 in the YBVTP

Jeremiah 9 in the ZBP