Joshua 10 (BOICB)

1 Mgbe Adoni-Zedek, eze Jerusalem nụrụ na Joshua emeriela Ai, laa ya nʼiyi, gbukwaa eze ya, dịka ọ lara Jeriko na eze ya nʼiyi, mgbe ọ hụkwara na ndị Gibiọn na ndị Izrel emeela udo, na ha bikwa nso ndị Izrel, 2 ọ tụrụ egwu nke ukwuu, ya na ndị ya. Nʼihi na Gibiọn bụ obodo a ma ama, dịka otu nʼime obodo ndị eze, ndị ikom ya bụkwa ndị dị ike, nʼihi na ọ dịkwa ukwuu karịa Ai. Ndị ikom ya niile maara otu e si ebu agha. 3 Ya mere, Adoni-Zedek, eze Jerusalem ziri ozi zigara eze ndị a: Homa, eze Hebrọn, Piram, eze Jamut, Jafia, eze Lakish, na Debịa, eze Eglọn, na-asị, 4 “Bịanụ nyere m aka, ka anyị gaa tigbuo Gibiọn, nʼihi na ha na Joshua na ụmụ Izrel emeela udo.” 5 Mgbe ahụ, eze ise ndị Amọrait ndị a, eze Jerusalem, na eze Hebrọn, na eze Jamut, na eze Lakish na eze Eglọn chịkọtara ndị agha. Ha na ndị agha ha gara were ọnọdụ ha imegide Gibiọn, ha lụsokwara ha ọgụ. 6 Ma ndị Gibiọn mere ngwangwa zigara Joshua ozi nʼụlọ ikwu dị na Gilgal sị ya, “Bịa nyere ndị ohu gị aka. Bịa ngwangwa zọpụta anyị, nʼihi na eze niile nke ndị Amọrait, ndị bi nʼugwu, abịala nʼebe a, ha na ndị agha ha ibuso anyị agha.” 7 Joshua na ndị agha ya niile, tinyere ndị ahụ niile ibu agha were anya, hapụrụ Gilgal gawa ịzọpụta Gibiọn. 8 Ma ONYENWE ANYỊ gwara Joshua okwu sị ya, “Atụla ha egwu! Nʼihi na ha bụ ndị e meriri emeri. Enyela m ha nʼaka unu ịla ha nʼiyi. Ọ dịkwaghị otu onye nʼetiti ha nwere ike iguzo nʼihu unu.” 9 Joshua bịakwutere ha na mberede, nʼihi na ogologo abalị niile ka o si Gilgal gaa njem. 10 Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ tinyere ha nʼọnọdụ ọgbaaghara mgbe ha zutere ndị Izrel. Nke a mere ka ndị agha Izrel lụgbuo ha na Gibiọn. Nʼezie, ọnụọgụgụ ndị ha tigburu na Gibiọn dị nnọọ ukwuu. Ma ha chụkwara ndị fọdụrụ ọsọ chụruo ha Bet-Horon, na Azeka, na Makeda, na-egbu ha nʼụzọ. 11 Mgbe ha si nʼihu Izrel gbapụ ọsọ nʼụzọ nrịda Bet-Horon na-aga Azeka, ONYENWE ANYỊ sitere nʼelu na-atụdakwasị ha ọtụtụ mkpụrụ mmiri. Ọnụọgụgụ ndị mkpụrụ mmiri ndị a dagburu dị ukwuu karịa ndị ụmụ Izrel ji mma agha ha gbuo. 12 Nʼụbọchị ahụ, ONYENWE ANYỊ mere ka ndị Izrel lụgbuo ndị Amọrait. Joshua gwara ONYENWE ANYỊ okwu nʼihu ndị Izrel niile sị,“Gị, anyanwụ, guzo nʼotu ebe na mbara eluigwe Gibiọn.Gị, ọnwa, guzokwa nʼotu ebe na mbara eluigwe na Ndagwurugwu Aijalon” 13 Anyanwụ guzoro,ọnwa guzokwa.Ha abụọ adaghị tutu ruo mgbe ndị agha mba ahụ gbuchasịrị ndị iro ha.Ihe banyere akụkọ agha a ka e dere nʼakwụkwọ Jasha.Ya mere, anyanwụ guzoro nʼotu ebe nʼetiti mbara eluigwe. Ọ nọkwa nʼotu ebe ihe dịka otu ụbọchị zuru ezu. 14 O nweghị ụbọchị ọzọ dịka ụbọchị ahụ nʼoge niile gara aga. Ọ dịbekwaghị ụbọchị yiri ụbọchị ahụ ruo taa. Ọ bụ ụbọchị ONYENWE ANYỊ mere ka anyanwụ na ọnwa kwụsị, nʼihi naanị ekpere otu nwoke. Nʼihi na ONYENWE ANYỊ na-eburu Izrel agha. 15 Joshua na ndị Izrel niile laghachiri nʼọmụma ụlọ ikwu dị na Gilgal. 16 Ma nʼoge ahụ a na-alụ agha ahụ, ndị eze ise ahụ si nʼọgbọ agha gbapụ, zoo onwe ha nʼime ọgba nkume dị na Makeda. 17 Mgbe ozi ruru Joshua ntị, na a chọtala eze ise ndị ahụ, ebe ha zoro onwe ha nʼime ọgba nkume dị na Makeda, 18 Joshua nyere iwu sị, “Werenụ nkume buru ibu mechie ọnụ ọgba nkume ahụ. Debekwanụ ndị nche nʼebe ahụ, ka ha chee ndị eze ahụ nche. 19 Ma unu eguzola nʼebe ahụ nʼonwe unu, chụsonụ ndị iro unu, na-egbukwanụ ha site nʼazụ. Unu ekwela ka ha gbaba nʼobodo ha dị iche iche, nʼihi na ONYENWE ANYỊ Chineke unu enyefeela ha nʼaka unu.” 20 Ya mere, Joshua na ndị Izrel tigbuchara ha kpamkpam nʼụzọ dị egwu, ọ bụ naanị mmadụ ole na ole nʼime ha nwere ike gbaba nʼime obodo ha e wusiri ike. 21 Ndị agha niile laghachikwuru Joshua nʼọmụma ụlọ ikwu ha dị na Makeda nʼudo. Ọ dịkwaghị onye ọbụla nwara anwa kwuo okwu megide ndị Izrel nʼala ahụ. 22 Mgbe ahụ Joshua sịrị, “Megheenụ ọnụ ọgba nkume ahụ, wepụtanụ ndị eze ise ahụ.” 23 Ya mere, ha kpọpụtara ndị eze ise ahụ site nʼọgba nkume ahụ, ha bụ eze Jerusalem, na eze Hebrọn, na eze Jamut, na eze Lakish, na eze Eglọn. 24 Mgbe a kpụtara ha nʼihu Joshua, ọ kpọrọ ndị ikom Izrel niile ka ha zụkọta, ọ gwara ndịisi agha bụ ndị so ya jee, “Bịanụ nso, zọkwasịnụ ụkwụ unu nʼolu eze ndị a.” Ya mere, ha bịara zọkwasị ụkwụ ha nʼolu ha. 25 Joshua sịrị ha, “Unu atụla egwu, maọbụ daa mba. Dịnụ ike, nweekwanụ ume, nʼihi na otu a ka ONYENWE ANYỊ ga-eme ndị iro unu niile bụ ndị na-ebuso unu agha.” 26 Emesịa, Joshua ji mma agha ya gbuo eze ise ndị a. Ọ kwụbara ha nʼelu osisi ise, ebe ha nọ ruo nʼoge anyasị. 27 Ma mgbe anwụ bidoro ịda, Joshua nyere iwu ka e site nʼosisi wedata ozu ndị eze ise ahụ, tụba ha nʼime ọgba nkume ahụ, ebe ha zoro onwe ha. Ha ji nkume dị ukwuu mechie ọnụ ọgba nkume ahụ. Nkume ukwuu ahụ dịkwa nʼebe ahụ ruo taa. 28 Nʼotu ụbọchị ahụ, Joshua lara obodo Makeda nʼiyi, jiri mma agha gbuo eze ya, na onye ọbụla bi nʼime ya. Ọ dịkwaghị onye ọbụla nọ nʼime obodo ahụ ọ hapụrụ ndụ. Otu ihe ahụ o mere eze Jeriko ka o mere eze Makeda. 29 Joshua na ndị Izrel niile so ya sitere na Makeda gaa na Libna lụso ya agha. 30 ONYENWE ANYỊ nyekwara obodo a na eze ya nʼaka Izrel. Joshua weere mma agha ya tigbuo mmadụ niile dị nʼime ya. O nweghị onye ọbụla nke ọ hapụrụ ndụ nʼebe ahụ. O mekwara eze obodo a ihe o mere eze Jeriko. 31 Site na Libna, Joshua na ndị Izrel gara ruo Lakish, lụso ha agha. 32 Ma ONYENWE ANYỊ nyefere Lakish nʼaka ụmụ Izrel. Joshua lụgburu ya nʼụbọchị nke abụọ ya. Ha weere mma agha ha tigbuo mmadụ niile bi nʼime ya, dịka ha mere Libna. 33 Ma mgbe a na-alụ agha na Lakish, Horam eze Gaza, duuru ndị agha ya bịa inyere ndị obodo Lakish aka, ka ha si otu a gbochie ndị agha Izrel ịbata nʼime ya. Ma ndị agha Joshua gburu ya, laa ndị agha ya niile nʼiyi, ruo na ọ fọdụghị otu onye. 34 Emesịa, nʼụbọchị ahụ kwa, Joshua na ndị Izrel hapụrụ Lakish gaa Eglọn lụgbuo ya. 35 Ha were obodo ahụ nʼotu ụbọchị ahụ, jiri mma agha ha tigbuo mmadụ niile dị nʼime obodo ahụ, dịka ha mere na Lakish. 36 Mgbe Joshua na ndị Izrel sitere nʼEglọn pụọ, ha gara Hebrọn buso ya agha. 37 Ha weere obodo ahụ, jiri mma agha gbuo eze ha, na obodo nta niile gbara ya gburugburu. Ha gburu ndị mmadụ niile bi nʼime ya dịka ha mere nʼEglọn. Ọ dịkwaghị otu onye a hapụrụ ndụ. 38 Joshua na ndị Izrel niile ya na ha so laghachiri azụ gaa busoo Debịa agha. 39 Ha meriri obodo a, na obodo nta niile gbara ya gburugburu, na eze ya, jiri mma agha gbuchapụ ha niile, mmadụ niile nọ nʼime ya ka ha gburu kpamkpam. Ha ahapụghị onye ọbụla ndụ, ha mere Debịa na eze ya dịka ha mere Libna na eze ya, na Hebrọn kwa. 40 Ya mere, Joshua na ndị agha ya meriri obodo ahụ niile, na ala ahụ niile. O meriri eze niile nke obodo ugwu ahụ, na ndị bi na Negeb, na mgbada ala ugwu dị nʼọdịda anyanwụ, na mgbada ala ugwu ugwu ahụ. O gbuchara mmadụ niile bi nʼala ahụ, dịka ONYENWE ANYỊ, Chineke Izrel si nye ya iwu. 41 Joshua tigburu ha niile site na Kadesh Banea ruo Gaza, sitekwa na Goshen ruo Gibiọn. 42 Eze ndị a niile, na ala ha niile, ka Joshua meriri nʼotu oge ibu agha, nʼihi na ONYENWE ANYỊ, Chineke Izrel na-alụrụ Izrel agha. 43 Emesịa, Joshua na ndị Izrel niile laghachiri nʼọmụma ụlọ ikwu ha dị na Gilgal.

In Other Versions

Joshua 10 in the ANGEFD

Joshua 10 in the ANTPNG2D

Joshua 10 in the AS21

Joshua 10 in the BAGH

Joshua 10 in the BBPNG

Joshua 10 in the BBT1E

Joshua 10 in the BDS

Joshua 10 in the BEV

Joshua 10 in the BHAD

Joshua 10 in the BIB

Joshua 10 in the BLPT

Joshua 10 in the BNT

Joshua 10 in the BNTABOOT

Joshua 10 in the BNTLV

Joshua 10 in the BOATCB

Joshua 10 in the BOATCB2

Joshua 10 in the BOBCV

Joshua 10 in the BOCNT

Joshua 10 in the BOECS

Joshua 10 in the BOGWICC

Joshua 10 in the BOHCB

Joshua 10 in the BOHCV

Joshua 10 in the BOHLNT

Joshua 10 in the BOHNTLTAL

Joshua 10 in the BOILNTAP

Joshua 10 in the BOITCV

Joshua 10 in the BOKCV

Joshua 10 in the BOKCV2

Joshua 10 in the BOKHWOG

Joshua 10 in the BOKSSV

Joshua 10 in the BOLCB

Joshua 10 in the BOLCB2

Joshua 10 in the BOMCV

Joshua 10 in the BONAV

Joshua 10 in the BONCB

Joshua 10 in the BONLT

Joshua 10 in the BONUT2

Joshua 10 in the BOPLNT

Joshua 10 in the BOSCB

Joshua 10 in the BOSNC

Joshua 10 in the BOTLNT

Joshua 10 in the BOVCB

Joshua 10 in the BOYCB

Joshua 10 in the BPBB

Joshua 10 in the BPH

Joshua 10 in the BSB

Joshua 10 in the CCB

Joshua 10 in the CUV

Joshua 10 in the CUVS

Joshua 10 in the DBT

Joshua 10 in the DGDNT

Joshua 10 in the DHNT

Joshua 10 in the DNT

Joshua 10 in the ELBE

Joshua 10 in the EMTV

Joshua 10 in the ESV

Joshua 10 in the FBV

Joshua 10 in the FEB

Joshua 10 in the GGMNT

Joshua 10 in the GNT

Joshua 10 in the HARY

Joshua 10 in the HNT

Joshua 10 in the IRVA

Joshua 10 in the IRVB

Joshua 10 in the IRVG

Joshua 10 in the IRVH

Joshua 10 in the IRVK

Joshua 10 in the IRVM

Joshua 10 in the IRVM2

Joshua 10 in the IRVO

Joshua 10 in the IRVP

Joshua 10 in the IRVT

Joshua 10 in the IRVT2

Joshua 10 in the IRVU

Joshua 10 in the ISVN

Joshua 10 in the JSNT

Joshua 10 in the KAPI

Joshua 10 in the KBT1ETNIK

Joshua 10 in the KBV

Joshua 10 in the KJV

Joshua 10 in the KNFD

Joshua 10 in the LBA

Joshua 10 in the LBLA

Joshua 10 in the LNT

Joshua 10 in the LSV

Joshua 10 in the MAAL

Joshua 10 in the MBV

Joshua 10 in the MBV2

Joshua 10 in the MHNT

Joshua 10 in the MKNFD

Joshua 10 in the MNG

Joshua 10 in the MNT

Joshua 10 in the MNT2

Joshua 10 in the MRS1T

Joshua 10 in the NAA

Joshua 10 in the NASB

Joshua 10 in the NBLA

Joshua 10 in the NBS

Joshua 10 in the NBVTP

Joshua 10 in the NET2

Joshua 10 in the NIV11

Joshua 10 in the NNT

Joshua 10 in the NNT2

Joshua 10 in the NNT3

Joshua 10 in the PDDPT

Joshua 10 in the PFNT

Joshua 10 in the RMNT

Joshua 10 in the SBIAS

Joshua 10 in the SBIBS

Joshua 10 in the SBIBS2

Joshua 10 in the SBICS

Joshua 10 in the SBIDS

Joshua 10 in the SBIGS

Joshua 10 in the SBIHS

Joshua 10 in the SBIIS

Joshua 10 in the SBIIS2

Joshua 10 in the SBIIS3

Joshua 10 in the SBIKS

Joshua 10 in the SBIKS2

Joshua 10 in the SBIMS

Joshua 10 in the SBIOS

Joshua 10 in the SBIPS

Joshua 10 in the SBISS

Joshua 10 in the SBITS

Joshua 10 in the SBITS2

Joshua 10 in the SBITS3

Joshua 10 in the SBITS4

Joshua 10 in the SBIUS

Joshua 10 in the SBIVS

Joshua 10 in the SBT

Joshua 10 in the SBT1E

Joshua 10 in the SCHL

Joshua 10 in the SNT

Joshua 10 in the SUSU

Joshua 10 in the SUSU2

Joshua 10 in the SYNO

Joshua 10 in the TBIAOTANT

Joshua 10 in the TBT1E

Joshua 10 in the TBT1E2

Joshua 10 in the TFTIP

Joshua 10 in the TFTU

Joshua 10 in the TGNTATF3T

Joshua 10 in the THAI

Joshua 10 in the TNFD

Joshua 10 in the TNT

Joshua 10 in the TNTIK

Joshua 10 in the TNTIL

Joshua 10 in the TNTIN

Joshua 10 in the TNTIP

Joshua 10 in the TNTIZ

Joshua 10 in the TOMA

Joshua 10 in the TTENT

Joshua 10 in the UBG

Joshua 10 in the UGV

Joshua 10 in the UGV2

Joshua 10 in the UGV3

Joshua 10 in the VBL

Joshua 10 in the VDCC

Joshua 10 in the YALU

Joshua 10 in the YAPE

Joshua 10 in the YBVTP

Joshua 10 in the ZBP