Joshua 13 (BOICB)

1 Nʼoge a, Joshua aghọọla agadi nwoke, ONYENWE ANYỊ kpọrọ ya sị ya, “Ugbu a, ị ghọọla agadi, ụbọchị ọgwụgwụ ndụ gị abịala nso, ma ọtụtụ ala fọdụrụ ndị a ga-emeri. 2 “Ndị a bụ ala nke fọdụrụ unu ga-enweta: “ala ndị Filistia niile na ala ndị Geshua niile, 3 site nʼosimiri Shaịho dị nʼọnụ Ijipt ruo nʼoke ala Ekrọn, nʼakụkụ ugwu ya, nke a gụnyere ndị Kenan, na ndịisi ise ndị Filistia: ndị Gaza, ndị Ashdọd, ndị Ashkelọn, ndị Gat, na ndị Ekrọn;nakwa ala ndị Ava, 4 site na ndịda ala ahụ niile dị nʼugwu;nʼala ndị Kenan, na Meara, nke bụ ala ndị Saịdọn, ruo nʼAfek, na oke ala ndị Amọrait; 5 na ala ndị Gebal niile;na Lebanọn niile ruo nʼọwụwa anyanwụ, site Baal-Gad nʼokpuru ugwu Hemon ruo na mbata Hamat. 6 “Ndị niile bi nʼala ugwu site na Lebanọn ruo Mizrefot Maim, ya bụ, ndị Saịdọn niile, Mụ onwe m ga-achụpụ ha site nʼihu ụmụ Izrel. Ihe dịrị gị bụ ike ala ahụ ka ọ bụrụ ihe nketa nye ndị Izrel, dịka mụ onwe m nyere gị iwu. 7 Ya mere, kere ebo itoolu, na ọkara Manase, ala ndị a niile, ka ọ bụrụ ihe nketa ha.” 8 Ọkara ebo Manase, na ebo Ruben, na Gad, enwetala ihe nketa ha nʼofe ọzọ nke Jọdan, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, dịka Mosis onyeozi ONYENWE ANYỊ nyere ha. 9 Ala ha gbatịrị site nʼAroea nke dị na ndagwurugwu Anọn, na site nʼobodo dị nʼetiti ndagwurugwu ahụ, ruo nʼala dị larịị nke gbatịrị site na Medeba ruo Dibọn. 10 Ọ gbatịkwara ruo nʼoke ala ndị Amọn, tinyere obodo niile nke Saịhọn, eze ndị Amọrait na-achị mgbe o bi na Heshbọn. 11 Ọ gụnyekwara Gilead, nʼoke ala ndị Geshua, na ndị Maaka, na ugwu Hemon niile, na Bashan niile, ruokwa Saleka. 12 Ya bụ, obodo niile nke Ọg eze ndị Bashan na-achị, mgbe isi alaeze ya dị nʼAshtarọt na Edrei. (Ọ bụ eze ikpeazụ nʼagbụrụ ndị Refaim.) Mosis busoro Saịhọn na Ọg agha, tigbuo ha, napụkwa ha ala ha. 13 Ma ndị Izrel achụpụghị ndị Geshua na ndị Maaka, ya mere, ha nọgidere na-ebi nʼetiti ụmụ Izrel ruo taa. 14 O nweghị ala o kenyere ebo Livayị. Nʼihi na ONYENWE ANYỊ kwere ha nkwa na ihe nketa ha ga-abụ ihe aja onyinye niile e si nʼọkụ na-ewetara Onyenwe anyị Chineke Izrel. 15 Nke a bụ ala Mosis nyere ebo Ruben dịka agbụrụ ha si dị, ka ọ bụrụ ihe nketa ha. 16 Ala ha gbatịrị site nʼAroea, na ndagwurugwu iyi Anọn, sitekwa nʼobodo dị nʼetiti ndagwurugwu ahụ na ala dị larịị gabiga gafee Medeba, 17 ruo Heshbọn, na obodo ndị ọzọ dị nʼala larịị ahụ, tinyere obodo Dibọn, na Bamot Baal, na Bet-Baal-Meon, 18 na Jahaz, na Kedemot, na Mefaat, 19 na Kiriatem, na Sibma, na Zeret Shaha, nke dị nʼugwu nta dị na ndagwurugwu ahụ; 20 na Bet-Peoa, na Bet-Jeshimọt, nke dị nʼebe dị na mgbada ugwu Pisga; 21 na obodo niile dị nʼala larịị ahụ, na ala Saịhọn niile, onye bụ eze ndị Amọrị nke chịrị na Heshbọn. Mosis lụgburu ya, lụgbukwaa ndịisi Midia bụ Evi, na nke Rekem, na nke Zua, na nke Hua, na nke Reba, ụmụ ndị eze ha na Saịhọn jikọtara aka buo agha. 22 Tinyere ndị ha gburu nʼọgbọ agha, ụmụ Izrel ji mma agha gbuo Belam nwa Beoa, onye na-agba aja. 23 Ya mere, oke ala ebo Ruben dị nʼọnụ mmiri osimiri Jọdan. Obodo ukwu na obodo nta ndị a bụ ihe ha nwetara dịka ihe nketa ha. Ezinaụlọ ọbụla nwetakwara oke nke ha dịka ikwu ha si dị. 24 Mosis nyekwara ebo Gad ala nke ha site nʼala ahụ ha lụgburu, dịka ikwu ha si dị. 25 Ndị a bụ ala ebo Gad nwetara: ala ahụ niile dị na Jeza, na obodo Gilead niile, na ọkara ala ndị Amọn nke ruru Areoa, nʼakụkụ Raba. 26 Na ala sitere Heshbọn ruo Ramat Mizpa, na Betonim, na sitekwa Mahanaim ruo oke ala Debịa. 27 Nʼime ndagwurugwu ala ha bụ Bet-Haram, na Bet-Nimra, na Sukọt, na Zafọn, na ala fọdụrụ nʼalaeze Saịhọn eze Heshbọn, nke dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan nʼoke ala ya ruokwa nsọtụ osimiri Galili. 28 Obodo ndị a na obodo nta ndị ọzọ bụ ihe nketa ụmụ Gad dịka agbụrụ ha si dị. 29 Mosis nyekwara ikwu ọbụla dị nʼọkara ebo Manase ala nke ha, dịka mkpa ha si dị. 30 Ala ha ketara gbatịrị ruo Mahanaim. Ọ bụ ha nwekwa ala Bashan niile, na ala niile Ọg, eze Bashan, na-achị, tinyere iri obodo nta isii dị na Bashan, nke Jaịa wuru. Ha nwetakwara 31 ọkara Gilead, na Ashtarọt, na Edrei bụ isi obodo alaeze Ọg nʼime Bashan.Ala ndị a niile ka e nyere ọkara ebo Manase, ya bụ ikwu niile e nwere site nʼụmụ Makia, ọkpara Manase. 32 Ndị a bụ otu Mosis si keere ụmụ Izrel ala dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan, mgbe ụmụ Izrel mara ụlọ ikwu ha nʼobosara ala Moab, na ncherita ihu obodo Jeriko. 33 Ma Mosis enyeghị ebo Livayị ala ọbụla, nʼihi na ọ gwara ha na ONYENWE ANYỊ, Chineke Izrel bụ ihe nketa ha nwere, dịka o kwere ha na nkwa.

In Other Versions

Joshua 13 in the ANGEFD

Joshua 13 in the ANTPNG2D

Joshua 13 in the AS21

Joshua 13 in the BAGH

Joshua 13 in the BBPNG

Joshua 13 in the BBT1E

Joshua 13 in the BDS

Joshua 13 in the BEV

Joshua 13 in the BHAD

Joshua 13 in the BIB

Joshua 13 in the BLPT

Joshua 13 in the BNT

Joshua 13 in the BNTABOOT

Joshua 13 in the BNTLV

Joshua 13 in the BOATCB

Joshua 13 in the BOATCB2

Joshua 13 in the BOBCV

Joshua 13 in the BOCNT

Joshua 13 in the BOECS

Joshua 13 in the BOGWICC

Joshua 13 in the BOHCB

Joshua 13 in the BOHCV

Joshua 13 in the BOHLNT

Joshua 13 in the BOHNTLTAL

Joshua 13 in the BOILNTAP

Joshua 13 in the BOITCV

Joshua 13 in the BOKCV

Joshua 13 in the BOKCV2

Joshua 13 in the BOKHWOG

Joshua 13 in the BOKSSV

Joshua 13 in the BOLCB

Joshua 13 in the BOLCB2

Joshua 13 in the BOMCV

Joshua 13 in the BONAV

Joshua 13 in the BONCB

Joshua 13 in the BONLT

Joshua 13 in the BONUT2

Joshua 13 in the BOPLNT

Joshua 13 in the BOSCB

Joshua 13 in the BOSNC

Joshua 13 in the BOTLNT

Joshua 13 in the BOVCB

Joshua 13 in the BOYCB

Joshua 13 in the BPBB

Joshua 13 in the BPH

Joshua 13 in the BSB

Joshua 13 in the CCB

Joshua 13 in the CUV

Joshua 13 in the CUVS

Joshua 13 in the DBT

Joshua 13 in the DGDNT

Joshua 13 in the DHNT

Joshua 13 in the DNT

Joshua 13 in the ELBE

Joshua 13 in the EMTV

Joshua 13 in the ESV

Joshua 13 in the FBV

Joshua 13 in the FEB

Joshua 13 in the GGMNT

Joshua 13 in the GNT

Joshua 13 in the HARY

Joshua 13 in the HNT

Joshua 13 in the IRVA

Joshua 13 in the IRVB

Joshua 13 in the IRVG

Joshua 13 in the IRVH

Joshua 13 in the IRVK

Joshua 13 in the IRVM

Joshua 13 in the IRVM2

Joshua 13 in the IRVO

Joshua 13 in the IRVP

Joshua 13 in the IRVT

Joshua 13 in the IRVT2

Joshua 13 in the IRVU

Joshua 13 in the ISVN

Joshua 13 in the JSNT

Joshua 13 in the KAPI

Joshua 13 in the KBT1ETNIK

Joshua 13 in the KBV

Joshua 13 in the KJV

Joshua 13 in the KNFD

Joshua 13 in the LBA

Joshua 13 in the LBLA

Joshua 13 in the LNT

Joshua 13 in the LSV

Joshua 13 in the MAAL

Joshua 13 in the MBV

Joshua 13 in the MBV2

Joshua 13 in the MHNT

Joshua 13 in the MKNFD

Joshua 13 in the MNG

Joshua 13 in the MNT

Joshua 13 in the MNT2

Joshua 13 in the MRS1T

Joshua 13 in the NAA

Joshua 13 in the NASB

Joshua 13 in the NBLA

Joshua 13 in the NBS

Joshua 13 in the NBVTP

Joshua 13 in the NET2

Joshua 13 in the NIV11

Joshua 13 in the NNT

Joshua 13 in the NNT2

Joshua 13 in the NNT3

Joshua 13 in the PDDPT

Joshua 13 in the PFNT

Joshua 13 in the RMNT

Joshua 13 in the SBIAS

Joshua 13 in the SBIBS

Joshua 13 in the SBIBS2

Joshua 13 in the SBICS

Joshua 13 in the SBIDS

Joshua 13 in the SBIGS

Joshua 13 in the SBIHS

Joshua 13 in the SBIIS

Joshua 13 in the SBIIS2

Joshua 13 in the SBIIS3

Joshua 13 in the SBIKS

Joshua 13 in the SBIKS2

Joshua 13 in the SBIMS

Joshua 13 in the SBIOS

Joshua 13 in the SBIPS

Joshua 13 in the SBISS

Joshua 13 in the SBITS

Joshua 13 in the SBITS2

Joshua 13 in the SBITS3

Joshua 13 in the SBITS4

Joshua 13 in the SBIUS

Joshua 13 in the SBIVS

Joshua 13 in the SBT

Joshua 13 in the SBT1E

Joshua 13 in the SCHL

Joshua 13 in the SNT

Joshua 13 in the SUSU

Joshua 13 in the SUSU2

Joshua 13 in the SYNO

Joshua 13 in the TBIAOTANT

Joshua 13 in the TBT1E

Joshua 13 in the TBT1E2

Joshua 13 in the TFTIP

Joshua 13 in the TFTU

Joshua 13 in the TGNTATF3T

Joshua 13 in the THAI

Joshua 13 in the TNFD

Joshua 13 in the TNT

Joshua 13 in the TNTIK

Joshua 13 in the TNTIL

Joshua 13 in the TNTIN

Joshua 13 in the TNTIP

Joshua 13 in the TNTIZ

Joshua 13 in the TOMA

Joshua 13 in the TTENT

Joshua 13 in the UBG

Joshua 13 in the UGV

Joshua 13 in the UGV2

Joshua 13 in the UGV3

Joshua 13 in the VBL

Joshua 13 in the VDCC

Joshua 13 in the YALU

Joshua 13 in the YAPE

Joshua 13 in the YBVTP

Joshua 13 in the ZBP