Joshua 15 (BOICB)

1 Ala ndị a ka e nyere ndị Juda dịka ikwu dị nʼebo ahụ si dị. Ikwu ọbụla ketara ala nke ha site nʼife nza. Ala Juda gbatịrị nnọọ ruo nʼoke ala Edọm, gbatịakwa ruo nʼọzara Zin, kwụsị nʼọnụ ọnụ ndịda ọzara a. 2 Nʼakụkụ ndịda, oke ala ha malitere nʼọnụ ọnụ ndịda osimiri Nnu. 3 Site nʼebe akụkụ ndịda nrigo Akrabim, gafee ruo nʼọzara Zin, ma rigoo nʼakụkụ nke ndịda Kadesh Banea, gafee Hezrọn rigoruo na Aada, gba gburugburu gaa Kaka; 4 site nʼebe ahụ ruo Azmọn, pụọ gbasoro iyi dị nʼoke ala ndị Ijipt gagide ruo nʼosimiri Mediterenịa. Nke a bụ oke ala nʼebe ndịda. 5 Oke ala ha nʼọwụwa anyanwụ bụ oke osimiri Nnu, ruo nʼọnụ mmiri osimiri Jọdan.Oke ala ha nʼakụkụ ugwu bidoro nʼọnụ mmiri osimiri Jọdan, 6 gbatịrị ruo Bet-Hogla, ma ruo nʼugwu Bet-Araba, rukwaa na nkume Bohan, nwa Ruben. 7 Site nʼebe ahụ, ọ gbatịrị ruo na Ndagwurugwu Akọ na Debịa, tụgharịa gbatịrịkwa ruo Gilgal, na ncherita ihu ala ala Adumim nke dị nʼakụkụ ndịda ndagwurugwu ahụ. Site nʼebe ahụ ọ gbatịrị ruo na mmiri En-Shemesh, kwụsị na En-Rogel. 8 Oke ala ahụ gbagoro Ndagwurugwu nke Ben Hinom, rukwaa nʼakụkụ ndịda Jebus nʼebe e wuru obodo Jerusalem. Oke ala ahụ sitekwara ebe ahụ gbagoo ruo nʼelu dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ nke Ndagwurugwu Hinom, na nsọtụ ugwu nke Ndagwurugwu Refaim. 9 Site nʼelu ugwu ebe ahụ, oke ala ahụ gbatịrị ruo na mmiri ime ala Neftoa, pụta site nʼebe ahụ ruo obodo niile dị nso ugwu Efrọn. Site nʼEfrọn, oke ala ahụ gbadara ruo Baala (nke aha ya ọzọ bụ Kiriat Jearim). 10 Oke ala ahụ mere dịka ọ ga-agba Baala gburugburu nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, site nʼebe ahụ pụta nʼugwu Sia, sitekwa nʼebe ahụ ruo nʼakụkụ ugwu Jearim (ya bụ Kesalon), gbatịa ruo na ndịda Bet-Shemesh, gafee ruo nʼọdịda anyanwụ oke ala Timna. 11 O sikwara ebe ahụ ruo ndịda ugwu Ekrọn, tụgharịa ruo Shikerọn, gafee ya, ruo nʼugwu Baala, sitekwa nʼebe ahụ ruo Jabneel, oke ala ahụ kwụsịrị nʼosimiri. 12 Oke ala ha nʼakụkụ ọdịda anyanwụ bụ ọnụ mmiri osimiri Mediterenịa. Ndị a bụ oke ala gbara ndị Juda gburugburu dịka ikwu ha niile si dị. 13 Dịka iwu ONYENWE ANYỊ nyere si dị, Joshua nyere Kaleb nwa Jefune oke nʼetiti ndị Juda. O kenyere ya Kiriat Aaba, ya bụ, Hebrọn. Aaba bụ nna nna Anak. 14 Kaleb sitere nʼobodo Hebrọn chụpụ ndị ikom atọ, bụ Sheshai, na Ahiman, na Talmai, ụmụ Anak nʼala ha. 15 O si nʼebe ahụ bilie ịlụso ndị bi na Debịa ọgụ. Nke a na-akpọ Kiriat Sefa nʼoge mbụ. 16 Kaleb sịrị, “Nwoke ọbụla ga-aga busoo Kiriat Sefa agha ma merie ya ka m ga-akpọnye Aksa, bụ nwa m nwanyị ka ọ bụrụ nwunye ya.” 17 Ya mere, Otniel, nwa Kenaz, nwa nwanne Kaleb, lụgburu obodo ahụ nʼagha. Nʼihi nke a, Kaleb kpọnyere ya Aksa, bụ nwa ya nwanyị ka ọ bụrụ nwunye ya. 18 Otu ụbọchị, mgbe Aksa bịakwutere Otniel, ọ kwagidere ya ka ọ rịọọ ala ubi site nʼaka nna ya. Mgbe Aksa si nʼelu ịnyịnya ibu ya rịdata, Kaleb jụrụ ya sị, “Gịnị ka ị chọrọ ka m mere gị?” 19 Ọ zaghachiri, “Nyem onyinye pụrụ iche. Ebe ọ bụ na i nyela m ala Negev, biko nyekwa m isi mmiri ụfọdụ.” Nʼihi nke a, Kaleb nyere ya isi mmiri mgbago na isi mmiri nke ndịda. 20 Nke a bụ ihe nketa ebo Juda dịka ikwu ha niile si dị. 21 Obodo niile nke ndị ebo Juda dị na Negev, nʼakụkụ ndịda nʼoke ala Edọm bụ ndị a:Kabzeel, Eda, Jaguo, 22 Kina, Dimona, Adada, 23 Kedesh, Hazọ, Itnan, 24 Zif, Telem, Bealot, 25 Hazọ Hadata, Keriọt Hezrọn (ya bụ Hazoa), 26 Amam, Shema, na Molada, 27 Haza Gada, Heshmọn, Bet-Pelet, 28 Haza Shual, Bịasheba, Biziotịa, 29 Baala, Iyim, Ezem, 30 Eltolad, Kesil, Homa, 31 Ziklag, Madmanna, Sansanna, 32 Lebaot, Shilhim, Ain na Rimọn. Ọnụọgụgụ obodo ndị a dị iri abụọ na itoolu. Obodo nta ndị ọzọ gbara ha niile gburugburu. 33 Obodo niile ndị a dị na ndịda ugwu ka e nyekwara ebo Juda. Obodo ndị a bụ,Eshtaol, Zora, Ashna, 34 Zanoa, En-Ganim, Tapụọa, Enam, 35 Jamut, Adulam, Soko, Azeka, 36 Shaaraim, Aditaịm na Gedera (maọbụ Gederotaịm). Ha niile dị obodo iri na anọ. Obodo nta ndị ọzọ gbakwara ha gburugburu. 37 Ebo Juda ketara Zenan, Hadasha, Migdal Gad, 38 Dilean, Mizpa, Jekteel, 39 Lakish, Bozkat, Eglọn, 40 Kabọn, Laamam, Kitlish, 41 Gederọt, Bet-Dagọn, Naama na Makeda. Obodo ndị a dị iri na isii, tinyekwara obodo nta ha. Ndị Juda ketakwara: 42 Libna, Eta, Ashan 43 Ifta, Ashna, Nezib, 44 Keila, Akzib na Maresha. Ha niile dị obodo itoolu, tinyekwara obodo nta ha niile. 45 Ha ketakwara Ekrọn, na obodo nta ya niile. 46 Ọ bụ ha nwekwa obodo niile dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ Ekrọn, ndị dị nso nso Ashdọd, na obodo nta niile dị ha nso. 47 Ma Ashdọd nʼonwe ya, na ụmụ obodo nta ya niile, na Gaza na obodo nta ya niile, ruo nʼiyi Ijipt, na ruo nʼoke osimiri Mediterenịa. 48 Ha nwetakwara ala ndị dị nʼugwu ugwu bụ,Shamia, Jatịa, Sokoh, 49 Dana, Kiriat-Sana (ya bụ Debịa), 50 Anab, Eshtemo, Anim, 51 Goshen, Họlọn na Gailo, ha niile dị obodo iri na otu tinyere obodo nta ha niile. 52 Obodo ndị ọzọ bụ Arab, Duma, Eshan, 53 Janim, Bet-Tapụọa, Afeka, 54 Humta, Kiriat Aba nke bụ Hebrọn na Zior, obodo itoolu tinyere obodo nta ha niile. 55 Maon, Kamel, Zif, Juta, 56 Jezril, na Jokdeam, Zanoa, 57 Kain, Gibea na Timna, obodo iri tinyere obodo nta ha niile. 58 Halhaul, Bet Zoa, Gedoa, 59 Maarat, Bet-Anot na Eltekọn, obodo isii tinyere obodo nta ha niile. 60 Kiriat Baal, ya bụ, Kiriat Jearim na Raba, obodo abụọ tinyere obodo nta ha niile. 61 Obodo ha ndị dị nʼọzara bụ ndị a:Bet-Araba, Midin, Sekaka, 62 Nibshan, Obodo Nnu na En-Gedi, obodo isii tinyere obodo nta ha niile. 63 Ma ebo Juda enweghị ike ịchụpụ ndị Jebus bi nʼime Jerusalem; ruo taa ndị Jebus bi na Jerusalem, nʼetiti ụmụ Juda.

In Other Versions

Joshua 15 in the ANGEFD

Joshua 15 in the ANTPNG2D

Joshua 15 in the AS21

Joshua 15 in the BAGH

Joshua 15 in the BBPNG

Joshua 15 in the BBT1E

Joshua 15 in the BDS

Joshua 15 in the BEV

Joshua 15 in the BHAD

Joshua 15 in the BIB

Joshua 15 in the BLPT

Joshua 15 in the BNT

Joshua 15 in the BNTABOOT

Joshua 15 in the BNTLV

Joshua 15 in the BOATCB

Joshua 15 in the BOATCB2

Joshua 15 in the BOBCV

Joshua 15 in the BOCNT

Joshua 15 in the BOECS

Joshua 15 in the BOGWICC

Joshua 15 in the BOHCB

Joshua 15 in the BOHCV

Joshua 15 in the BOHLNT

Joshua 15 in the BOHNTLTAL

Joshua 15 in the BOILNTAP

Joshua 15 in the BOITCV

Joshua 15 in the BOKCV

Joshua 15 in the BOKCV2

Joshua 15 in the BOKHWOG

Joshua 15 in the BOKSSV

Joshua 15 in the BOLCB

Joshua 15 in the BOLCB2

Joshua 15 in the BOMCV

Joshua 15 in the BONAV

Joshua 15 in the BONCB

Joshua 15 in the BONLT

Joshua 15 in the BONUT2

Joshua 15 in the BOPLNT

Joshua 15 in the BOSCB

Joshua 15 in the BOSNC

Joshua 15 in the BOTLNT

Joshua 15 in the BOVCB

Joshua 15 in the BOYCB

Joshua 15 in the BPBB

Joshua 15 in the BPH

Joshua 15 in the BSB

Joshua 15 in the CCB

Joshua 15 in the CUV

Joshua 15 in the CUVS

Joshua 15 in the DBT

Joshua 15 in the DGDNT

Joshua 15 in the DHNT

Joshua 15 in the DNT

Joshua 15 in the ELBE

Joshua 15 in the EMTV

Joshua 15 in the ESV

Joshua 15 in the FBV

Joshua 15 in the FEB

Joshua 15 in the GGMNT

Joshua 15 in the GNT

Joshua 15 in the HARY

Joshua 15 in the HNT

Joshua 15 in the IRVA

Joshua 15 in the IRVB

Joshua 15 in the IRVG

Joshua 15 in the IRVH

Joshua 15 in the IRVK

Joshua 15 in the IRVM

Joshua 15 in the IRVM2

Joshua 15 in the IRVO

Joshua 15 in the IRVP

Joshua 15 in the IRVT

Joshua 15 in the IRVT2

Joshua 15 in the IRVU

Joshua 15 in the ISVN

Joshua 15 in the JSNT

Joshua 15 in the KAPI

Joshua 15 in the KBT1ETNIK

Joshua 15 in the KBV

Joshua 15 in the KJV

Joshua 15 in the KNFD

Joshua 15 in the LBA

Joshua 15 in the LBLA

Joshua 15 in the LNT

Joshua 15 in the LSV

Joshua 15 in the MAAL

Joshua 15 in the MBV

Joshua 15 in the MBV2

Joshua 15 in the MHNT

Joshua 15 in the MKNFD

Joshua 15 in the MNG

Joshua 15 in the MNT

Joshua 15 in the MNT2

Joshua 15 in the MRS1T

Joshua 15 in the NAA

Joshua 15 in the NASB

Joshua 15 in the NBLA

Joshua 15 in the NBS

Joshua 15 in the NBVTP

Joshua 15 in the NET2

Joshua 15 in the NIV11

Joshua 15 in the NNT

Joshua 15 in the NNT2

Joshua 15 in the NNT3

Joshua 15 in the PDDPT

Joshua 15 in the PFNT

Joshua 15 in the RMNT

Joshua 15 in the SBIAS

Joshua 15 in the SBIBS

Joshua 15 in the SBIBS2

Joshua 15 in the SBICS

Joshua 15 in the SBIDS

Joshua 15 in the SBIGS

Joshua 15 in the SBIHS

Joshua 15 in the SBIIS

Joshua 15 in the SBIIS2

Joshua 15 in the SBIIS3

Joshua 15 in the SBIKS

Joshua 15 in the SBIKS2

Joshua 15 in the SBIMS

Joshua 15 in the SBIOS

Joshua 15 in the SBIPS

Joshua 15 in the SBISS

Joshua 15 in the SBITS

Joshua 15 in the SBITS2

Joshua 15 in the SBITS3

Joshua 15 in the SBITS4

Joshua 15 in the SBIUS

Joshua 15 in the SBIVS

Joshua 15 in the SBT

Joshua 15 in the SBT1E

Joshua 15 in the SCHL

Joshua 15 in the SNT

Joshua 15 in the SUSU

Joshua 15 in the SUSU2

Joshua 15 in the SYNO

Joshua 15 in the TBIAOTANT

Joshua 15 in the TBT1E

Joshua 15 in the TBT1E2

Joshua 15 in the TFTIP

Joshua 15 in the TFTU

Joshua 15 in the TGNTATF3T

Joshua 15 in the THAI

Joshua 15 in the TNFD

Joshua 15 in the TNT

Joshua 15 in the TNTIK

Joshua 15 in the TNTIL

Joshua 15 in the TNTIN

Joshua 15 in the TNTIP

Joshua 15 in the TNTIZ

Joshua 15 in the TOMA

Joshua 15 in the TTENT

Joshua 15 in the UBG

Joshua 15 in the UGV

Joshua 15 in the UGV2

Joshua 15 in the UGV3

Joshua 15 in the VBL

Joshua 15 in the VDCC

Joshua 15 in the YALU

Joshua 15 in the YAPE

Joshua 15 in the YBVTP

Joshua 15 in the ZBP