Joshua 23 (BOICB)
1 Ma mgbe ọtụtụ oge gasịrị, site nʼoge ONYENWE ANYỊ mere ka Izrel nwee ezumike nʼebe ndị iro gbara ha okirikiri nọ, Joshua aghọọla agadi, gbaa ọtụtụ afọ. 2 Ya mere, Joshua kpọrọ ndị Izrel niile, ndị okenye ha, ndị ndu ha, ndị odozi okwu ha na ndịisi ha, sị ha, “Emeela m agadi gbaakwa ọtụtụ afọ. 3 Unu onwe unu ejirila anya unu hụ ihe niile ONYENWE ANYỊ Chineke unu mere mba ndị a niile, nʼihi unu. Ọ lụụrụ unu ọgụ, nyere unu aka imeri ndị iro unu. 4 Unu hụrụ na ekekwarala m unu ala mba ahụ niile nke fọdụrụnụ ka ha bụrụ ihe nketa ebo unu, site na Jọdan, tinyekwara mba niile ndị ahụ m kpochapụrụ nʼakụkụ osimiri Mediterenịa dị na mpaghara ọdịda anyanwụ. 5 ONYENWE ANYỊ bụ Chineke unu ga-akwapụ ndị bi nʼime ha nʼihi unu. Ọ ga-achụpụ ha nʼihu unu, mee ka unu nweta ala ha, dịka ONYENWE ANYỊ Chineke unu kwere unu nkwa. 6 “Ya mere, dịnụ ike, lezienụ anya idebezu na irube isi nʼihe niile e dere nʼAkwụkwọ Iwu Mosis. Unu esila nʼime ya wezuga onwe unu nʼụzọ ọbụla. 7 Lezienụ anya ka unu na mba ndị a fọdụrụ nʼala a ghara inwe mmekọ ọbụla. Unu akpọtụkwala chi ha niile aha. Unu aṅụkwala iyi nʼaha ha, maọbụ fee ha ofufe, maọbụ kpọọ isiala nye ha. 8 Kama raparanụ nʼahụ ONYENWE ANYỊ Chineke unu dịka unu mere ruo taa. 9 “ONYENWE ANYỊ achụpụla mba dị ukwuu na mba siri ike site nʼebe unu nọ. O nwekwaghị otu mba nʼime ha o kwere ka ha merie unu. 10 Otu nwoke nʼime unu achụọla puku ndị ikom ndị iro unu ọsọ. Nʼihi na ONYENWE ANYỊ Chineke unu alụọlara unu ọgụ, dịka ya onwe ya kwere nkwa. 11 Nʼihi ya, lezienụ onwe unu anya nke ọma ka unu hụ ONYENWE ANYỊ Chineke unu nʼanya. 12 “Ma ọ bụrụ na unu alaghachi azụ, ma kwere ka e jikọọ unu na mba ndị a fọdụrụ nʼetiti unu. Ọ bụrụ na unu na ha ebido ịlụrịta di na nwunye, na-emekọrịta ihe ọnụ, 13 maranụ nke ọma, na ONYENWE ANYỊ Chineke unu agaghị achụpụrụ unu mba ndị a site nʼala unu. Kama ha ga-abụrụ unu igbudu na ọnya. Ha ga-abụkwara unu apịpịa nʼakụkụ unu, na ogwu nʼanya unu, ruo mgbe unu ga-ala nʼiyi nʼezi ala a, nke ONYENWE ANYỊ Chineke unu nyere unu. 14 “Mgbe na-adịghị anya, mụ onwe m ga-agbaso ụzọ ahụ ndị niile bi nʼụwa na-aghaghị ịgbaso. Unu niile maara nʼime obi unu na nʼime mkpụrụobi unu na o nweghị otu nʼime nkwa ọma ONYENWE ANYỊ Chineke unu kwere nye unu nke na-emezughị. E mezuola nkwa ndị a niile; o nweghị nke ọbụla a na-emezughị. 15 Ma dịka ezi nkwa niile ONYENWE ANYỊ Chineke unu kwere si bụrụ ihe e mezuru emezu, otu a kwa ka ONYENWE ANYỊ ga-esi mee ka ihe ọjọọ niile ọ bara mba ya mezuo nʼisi unu, tutu ruo mgbe o mere ka unu laa nʼiyi nʼezi ala ahụ ọ na-enye unu. 16 Ọ bụrụ na unu emebie ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYỊ Chineke unu, nke o nyere unu iwu idebe, tụgharịa malite ịgbaso na ife chi ndị ọzọ na ịkpọ isiala nye ha, iwe ONYENWE ANYỊ ga-adị ọkụ megide unu, unu ga-alakwa nʼiyi ngwangwa nʼala ọma ahụ o nyere unu.”
In Other Versions
Joshua 23 in the ANGEFD
Joshua 23 in the ANTPNG2D
Joshua 23 in the AS21
Joshua 23 in the BAGH
Joshua 23 in the BBPNG
Joshua 23 in the BBT1E
Joshua 23 in the BDS
Joshua 23 in the BEV
Joshua 23 in the BHAD
Joshua 23 in the BIB
Joshua 23 in the BLPT
Joshua 23 in the BNT
Joshua 23 in the BNTABOOT
Joshua 23 in the BNTLV
Joshua 23 in the BOATCB
Joshua 23 in the BOATCB2
Joshua 23 in the BOBCV
Joshua 23 in the BOCNT
Joshua 23 in the BOECS
Joshua 23 in the BOGWICC
Joshua 23 in the BOHCB
Joshua 23 in the BOHCV
Joshua 23 in the BOHLNT
Joshua 23 in the BOHNTLTAL
Joshua 23 in the BOILNTAP
Joshua 23 in the BOITCV
Joshua 23 in the BOKCV
Joshua 23 in the BOKCV2
Joshua 23 in the BOKHWOG
Joshua 23 in the BOKSSV
Joshua 23 in the BOLCB
Joshua 23 in the BOLCB2
Joshua 23 in the BOMCV
Joshua 23 in the BONAV
Joshua 23 in the BONCB
Joshua 23 in the BONLT
Joshua 23 in the BONUT2
Joshua 23 in the BOPLNT
Joshua 23 in the BOSCB
Joshua 23 in the BOSNC
Joshua 23 in the BOTLNT
Joshua 23 in the BOVCB
Joshua 23 in the BOYCB
Joshua 23 in the BPBB
Joshua 23 in the BPH
Joshua 23 in the BSB
Joshua 23 in the CCB
Joshua 23 in the CUV
Joshua 23 in the CUVS
Joshua 23 in the DBT
Joshua 23 in the DGDNT
Joshua 23 in the DHNT
Joshua 23 in the DNT
Joshua 23 in the ELBE
Joshua 23 in the EMTV
Joshua 23 in the ESV
Joshua 23 in the FBV
Joshua 23 in the FEB
Joshua 23 in the GGMNT
Joshua 23 in the GNT
Joshua 23 in the HARY
Joshua 23 in the HNT
Joshua 23 in the IRVA
Joshua 23 in the IRVB
Joshua 23 in the IRVG
Joshua 23 in the IRVH
Joshua 23 in the IRVK
Joshua 23 in the IRVM
Joshua 23 in the IRVM2
Joshua 23 in the IRVO
Joshua 23 in the IRVP
Joshua 23 in the IRVT
Joshua 23 in the IRVT2
Joshua 23 in the IRVU
Joshua 23 in the ISVN
Joshua 23 in the JSNT
Joshua 23 in the KAPI
Joshua 23 in the KBT1ETNIK
Joshua 23 in the KBV
Joshua 23 in the KJV
Joshua 23 in the KNFD
Joshua 23 in the LBA
Joshua 23 in the LBLA
Joshua 23 in the LNT
Joshua 23 in the LSV
Joshua 23 in the MAAL
Joshua 23 in the MBV
Joshua 23 in the MBV2
Joshua 23 in the MHNT
Joshua 23 in the MKNFD
Joshua 23 in the MNG
Joshua 23 in the MNT
Joshua 23 in the MNT2
Joshua 23 in the MRS1T
Joshua 23 in the NAA
Joshua 23 in the NASB
Joshua 23 in the NBLA
Joshua 23 in the NBS
Joshua 23 in the NBVTP
Joshua 23 in the NET2
Joshua 23 in the NIV11
Joshua 23 in the NNT
Joshua 23 in the NNT2
Joshua 23 in the NNT3
Joshua 23 in the PDDPT
Joshua 23 in the PFNT
Joshua 23 in the RMNT
Joshua 23 in the SBIAS
Joshua 23 in the SBIBS
Joshua 23 in the SBIBS2
Joshua 23 in the SBICS
Joshua 23 in the SBIDS
Joshua 23 in the SBIGS
Joshua 23 in the SBIHS
Joshua 23 in the SBIIS
Joshua 23 in the SBIIS2
Joshua 23 in the SBIIS3
Joshua 23 in the SBIKS
Joshua 23 in the SBIKS2
Joshua 23 in the SBIMS
Joshua 23 in the SBIOS
Joshua 23 in the SBIPS
Joshua 23 in the SBISS
Joshua 23 in the SBITS
Joshua 23 in the SBITS2
Joshua 23 in the SBITS3
Joshua 23 in the SBITS4
Joshua 23 in the SBIUS
Joshua 23 in the SBIVS
Joshua 23 in the SBT
Joshua 23 in the SBT1E
Joshua 23 in the SCHL
Joshua 23 in the SNT
Joshua 23 in the SUSU
Joshua 23 in the SUSU2
Joshua 23 in the SYNO
Joshua 23 in the TBIAOTANT
Joshua 23 in the TBT1E
Joshua 23 in the TBT1E2
Joshua 23 in the TFTIP
Joshua 23 in the TFTU
Joshua 23 in the TGNTATF3T
Joshua 23 in the THAI
Joshua 23 in the TNFD
Joshua 23 in the TNT
Joshua 23 in the TNTIK
Joshua 23 in the TNTIL
Joshua 23 in the TNTIN
Joshua 23 in the TNTIP
Joshua 23 in the TNTIZ
Joshua 23 in the TOMA
Joshua 23 in the TTENT
Joshua 23 in the UBG
Joshua 23 in the UGV
Joshua 23 in the UGV2
Joshua 23 in the UGV3
Joshua 23 in the VBL
Joshua 23 in the VDCC
Joshua 23 in the YALU
Joshua 23 in the YAPE
Joshua 23 in the YBVTP
Joshua 23 in the ZBP